Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 102 p. 236-p. 237 para. 2
  • Mkpughe E Kpugheere Jọn

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mkpughe E Kpugheere Jọn
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịdị Ebube nke Ocheeze Eluigwe Jehova
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Ọhụụ Ndị Mere Ka A Mata Ndị Bí n’Eluigwe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Ịbụ Abụ Mmeri Ọhụrụ Ahụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Jọn Hụrụ Jisọs ahụ E Meworo Ka Ọ Dị Ebube
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 102 p. 236-p. 237 para. 2
Ebe Jọn onyeozi na-ede akwụkwọ Mkpughe

ISI NKE 102

Mkpughe E Kpugheere Jọn

Mgbe Jọn onyeozi nọ n’ụlọ mkpọrọ n’agwaetiti Patmọs, Jizọs mere ka ọ hụ ọhụụ iri na isii gosiri ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Ọhụụ ndị ahụ gosiri otú a ga-esi doo aha Jehova nsọ, otú Alaeze ya ga-esi bịa, nakwa otú uche ya ga-esi mee n’ụwa otú o si eme n’eluigwe.

N’otu n’ime ọhụụ ndị ahụ, Jọn hụrụ Jehova ka ọ nọ n’ocheeze ya dị ebube n’eluigwe, ndị okenye iri abụọ na anọ agbaa ya gburugburu. Ndị okenye ahụ yi ákwà ọcha, kpurukwa okpueze ọlaedo. Àmụ̀mà si n’ocheeze ahụ na-egbu, égbè eluigwe esikwa na ya na-agba. Ndị okenye iri abụọ na anọ ahụ na-akpọrọ Jehova isiala, na-efekwa ya. N’ọhụụ ọzọ, Jọn hụrụ oké igwe mmadụ ndị si ná mba niile, ndị niile, na asụsụ niile ka ha na-efe Jehova. Jizọs bụ́ Nwa Atụrụ ahụ na-azụ ha ka atụrụ, durukwa ha na-aga na mmiri nke ndụ. O mechara hụ ọhụụ ọzọ. N’ọhụụ a, Jizọs ghọrọ Eze, malite ịchị n’eluigwe, ndị okenye iri abụọ na anọ ahụ sokwa ya na-achị. N’ọhụụ ọzọ, Jọn hụrụ ka Jizọs na-alụso dragọn bụ́ Setan na ndị mmụọ ọjọọ agha. Jizọs si n’eluigwe chụda ha n’ụwa.

Ebe Jizọs na 144,000 nọ n’Ugwu Zayọn

Jọn hụrụ ọhụụ ọzọ mara mma nke gosiri ebe Nwa Atụrụ ahụ na otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ (144,000) guzo n’Ugwu Zayọn. Ọ hụkwara ebe otu mmụọ ozi na-efegharị n’ụwa ma na-agwa ndị mmadụ ka ha tụọ egwu Chineke ma nye ya otuto.

Ọ hụkwara ọhụụ ọzọ gosiri ebe a na-alụ agha Amagedọn. N’agha ahụ, Jizọs na ndị agha ya meriri Setan na ndị niile na-akwado ya. N’ọhụụ nke ikpeazụ, Jọn hụrụ na udo dịzi ma n’eluigwe ma n’ụwa. E bibiela Setan na ndị niile so ya na-enupụrụ Chineke isi. Ndị niile nọ n’eluigwe nakwa n’ụwa na-edo aha Jehova nsọ ma na-efe naanị ya.

“M ga-eme ka gị na nwaanyị ahụ dịrị n’iro, meekwa ka nwa gị na nwa ya dịrị n’iro. Nwa ya ga-egwepịa gị isi, ị ga-emerụkwa ya ahụ́ n’ikiri ụkwụ.”​—Jenesis 3:15

Ajụjụ: Ọhụụ ole ka e gosiri Jọn? Gịnị ka Jizọs ga-eme n’agha Amagedọn?

Mkpughe 1:1-3; 4:1-11; 7:4, 9-17; 11:15-18; 12:5-12; 14:1, 6, 7; 16:14, 16; 21:5

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya