Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 99 p. 230-p. 231 para. 4
  • Onye Na-elekọta Ụlọ Mkpọrọ Ghọrọ Onye Kraịst

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Onye Na-elekọta Ụlọ Mkpọrọ Ghọrọ Onye Kraịst
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Bịa na Masedonia Nyere Anyị Aka”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Saịlas—Onye Na-enye Agbamume
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • “Udo nke Chineke . . . Karịrị Echiche Niile”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Okwu Jehova Na-Enwe Mmeri!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 99 p. 230-p. 231 para. 4
Ebe onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ dị na Filipaị hụrụ ka ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ niile meghechara emeghe, ma ndị mkpọrọ niile ka nọ n’ime ya

ISI NKE 99

Onye Na-elekọta Ụlọ Mkpọrọ Ghọrọ Onye Kraịst

Na Filipaị, e nwere otu nwa agbọghọ na-eje ozi mmụọ ọjọọ ji. Mmụọ ọjọọ a mere ka ọ na-akọrọ ndị mmadụ ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Ihe a ọ na-eme na-enyekwa ndị nwe ya nnukwu ego. Mgbe Pọl na Saịlas bịara na Filipaị, o so ha na-agagharị ruo ọtụtụ ụbọchị. Mmụọ ọjọọ ahụ mere ka ọ na-eti mkpu, sị: “Ndị a bụ ndị ohu Chineke Onye Kacha Elu.” Pọl gwara mmụọ ọjọọ ahụ, sị: ‘Ana m enye gị iwu n’aha Jizọs ka i si n’ime ya pụta.’ Mmụọ ọjọọ ahụ esi n’ime nwa agbọghọ ahụ pụta.

Mgbe ndị nwe nwa agbọghọ ahụ hụrụ na ha agaghịzi na-eji ya enweta ego, ezigbo iwe were ha. Ha kpụụrụ Pọl na Saịlas gakwuru ndị isi obodo. Ha gwara ha, si: ‘Ndị a na-emebi iwu obodo anyị, na-enyekwa obodo anyị niile nsogbu.’ Ndị isi obodo ahụ nyere iwu ka a pịa Pọl na Saịlas ihe ma tụba ha n’ụlọ mkpọrọ. Onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ tụbara ha n’ọnụ ụlọ mkpọrọ dị n’ime ime nke kacha gbaa ọchịchịrị ma tụọ ha ọtọsị n’ụkwụ.

Pọl na Saịlas bụwara abụ ma na-eto Jehova, ndị mkpọrọ ndị ọzọ ana-ege ha ntị. N’etiti abalị, oké ala ọma jijiji mere na mberede, ụlọ mkpọrọ ahụ niile amawa jijiji. Ibo ụzọ ya niile meghere, agbụ e kere ndị mkpọrọ ahụ tọpụkwara. Onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ ji ọsọ gbaba n’ime ime ma hụ na ụzọ ya niile meghechara emeghe. O chere na ndị mkpọrọ ahụ niile agbaala ọsọ, ya amịrị mma agha ka o gbuo onwe ya.

Ozugbo ahụ, Pọl tiri mkpu, sị: ‘Emerụla onwe gị ahụ́! Anyị niile nọ n’ebe a!’ Onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ gbabara n’ime ime ụlọ mkpọrọ ahụ ma daa n’ihu Pọl na Saịlas. Ọ jụrụ ha, sị: “Gịnị ka m ga-eme ka a zọpụta m?” Ha gwara ya, sị: ‘Gị na ndị ezinụlọ gị kwere na Jizọs.’ Pọl na Saịlas maliteziri ịkụziri ha okwu Jehova. E mekwara nwoke ahụ na ndị ezinụlọ ya niile baptizim.

“Ndị mmadụ ga-ejide unu ma kpagbuo unu, kpụrụ unu gaa n’ụlọ nzukọ, tụbakwa unu n’ụlọ mkpọrọ. A ga-akpụgakwa unu n’ihu ndị eze na ndị gọvanọ n’ihi aha m. Unu ga-eji ohere ahụ gbaara ndị ọzọ àmà.”​—Luk 21:12, 13

Ajụjụ: Gịnị mere e ji tụba Pọl na Saịlas n’ụlọ mkpọrọ? Olee otú onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ si ghọọ Onye Kraịst?

Ọrụ Ndịozi 16:16-34

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya