Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 8 p. 26-p. 27 para. 1
  • Ebreham na Sera Rubeere Chineke Isi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ebreham na Sera Rubeere Chineke Isi
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ònye Bụ Ebreham?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Ebreham​—⁠Enyi Chineke
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Jehova Kpọrọ Ya “Enyi M”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ebreham na Sera—Ị Pụrụ Iṅomi Okwukwe Ha!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 8 p. 26-p. 27 para. 1
Ebe Ebreham na Sera na-akwakọta ihe ha mgbe ha chọrọ ịhapụ Ọọ

ISI NKE 8

Ebreham na Sera Rubeere Chineke Isi

E nwere otu obodo a na-akpọ Ọọ. Ọ dị nso na Babel. Ndị bi n’obodo Ọọ anaghị efe Jehova, kama ha nwere ọtụtụ chi ha na-efe. Ma, e nwere otu nwoke bi n’obodo Ọọ nke na-efe Jehova. Aha ya bụ Ebreham.

Otu ụbọchị, Jehova gwara Ebreham, sị: ‘Kwapụ n’obodo gị, hapụkwa ndị ikwu gị, kwaga n’obodo m ga-egosi gị.’ Chineke kwekwara ya nkwa, sị: ‘M ga-eme ka ị bụrụ nnukwu mba, m ga-emere ọtụtụ mmadụ n’ụwa niile ihe ọma n’ihi gị.’

Ebreham amaghị ebe Jehova sịrị ya gaa, ma ọ tụkwasịrị Jehova obi. N’ihi ya, Ebreham na nwunye ya Sera, nna ya Tira, na Lọt, nwa nwanne ya mere ihe Jehova kwuru. Ha buuru ihe ha malite ogologo njem ahụ.

Ebreham dị afọ iri asaa na ise mgbe ya na ndị ezinụlọ ya kwagara n’obodo ahụ Jehova chọrọ ka ha gaa. Aha obodo ahụ bụ Kenan. Ọ bụ n’obodo a ka Chineke kwere Ebreham nkwa, sị: ‘M ga-enye ụmụ gị ala a niile ị na-ahụ.’ Ma, Ebreham na Sera emeela agadi, ha amụtaghịkwa nwa ọ bụla. N’ihi ya, oleekwanụ otú Jehova ga-esi mezuo nkwa a?

Ebe Ebreham na ezinụlọ ya na-aga Kenan

“Ọ bụ okwukwe mere Ebreham ji rube isi . . . wee gaa n’ebe Chineke kwere nkwa na ọ ga-enye ya. Ọ gawara, n’agbanyeghị na ọ maghị ebe ọ na-aga.” ​—Ndị Hibru 11:8

Ajụjụ: Gịnị ka Jehova gwara Ebreham ka o mee? Olee nkwa Jehova kwere ya?

Jenesis 11:29–12:9; Ọrụ Ndịozi 7:2-4; Ndị Galeshia 3:6; Ndị Hibru 11:8

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya