Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 14 p. 40-p. 41 para. 1
  • Otu Ohu nke Rubeere Chineke Isi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otu Ohu nke Rubeere Chineke Isi
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Olee Otú M Ga-esi Mee Oké Ihe Ọjọọ A?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ụmụnne Josef Akpọ Ya Asị
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Jehova Na-eme Ka Ihe Anyị Na-eme Na-aga Nke Ọma
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • A Tụọ Josef Mkpọrọ
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 14 p. 40-p. 41 para. 1
Ebe Josef na-agba ọsọ ka nwunye Pọtịfa ghara ijide ya

ISI NKE 14

Otu Ohu Nke Rubeere Chineke Isi

Josef bụ otu n’ime ụmụ ikpeazụ Jekọb mụrụ. Ụmụnne ya ndị tọrọ ya hụrụ na nna ha hụrụ ya n’anya karịa ha. Olee otú i chere obi dị ha maka ihe a? Ha nweere Josef anyaụfụ, kpọọkwa ya asị. Josef rọrọ ụfọdụ nrọ pụrụ iche ma kọọrọ ya ụmụnne ya. Ha ghọtara na nrọ ndị ahụ pụtara na otu ụbọchị, ha ga-akpọrọ Josef isiala. Ihe a mere ka ha kpọkwuo ya asị.

Mgbe ụmụnne Josef chọrọ ịtụba ya n’olulu

Otu ụbọchị, ụmụnne Josef nọ na-azụ atụrụ n’ebe dị nso na Shikem. Jekọb zigara Josef ka ọ gaa mata ma ahụ́ ọ̀ dịkwa ha. Mgbe ha hụrụ ya n’ebe dị anya ka ọ na-abịa, ha gwara ibe ha, sị: “Lee, ọrọ nrọ abịawala. Bịanụ ka anyị gbuo ya.” Ha jidere ya ma tụba ya n’otu olulu miri emi. Ma otu n’ime ụmụnne ya aha ya bụ Juda sịrị: ‘Ka anyị ghara igbu ya. Kama, ka anyị ree ya ka ọ gaa gbawa ohu.’ N’ihi ya, ha resịrị ya ndị ahịa si Midian na-aga Ijipt. Ha rere ya mkpụrụ ego ọlaọcha iri abụọ.

Ụmụnne Josef chịịrị uwe ya, bịanye ya n’ọbara ewu ma chịgara ya nna ha. Ha gwara nna ha, sị: ‘Ihe a ọ́ bụghị uwe nwa gị?’ N’ihi ya, Jekọb chere na anụ ọhịa adọgbuola Josef. Obi gbawara ya. E nweghị onye na-akasili ya obi.

Ebe Josef nọ n’ụlọ mkpọrọ

Mgbe Josef na ndị ahụ zụụrụ ya ruru Ijipt, otu onye a ma ama aha ya bụ Pọtịfa zụụrụ ya ka ọ gbawara ya ohu. Ma Jehova nọnyeere Josef. Pọtịfa chọpụtara na Josef na-arụsi ọrụ ike nakwa na ọ bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi. Obere oge, Pọtịfa mere ya onye na-elekọta ihe niile o nwere.

Nwunye Pọtịfa hụrụ na Josef mara mma ma gbasie ike. Kwa ụbọchị, ọ na-agwa Josef ka ya na ya kwaa iko. Olee ihe Josef ga-eme? O kweghị eme ihe a o kwuru. Josef gwara ya, sị: ‘Mba. Ọ bụ ihe ọjọọ. Nna m ukwu tụkwasịrị m obi, ị bụkwa nwunye ya. Ọ bụrụ na mụ na gị akwaa iko, m ga-emehie Chineke.’

Otu ụbọchị, nwunye Pọtịfa chọrọ ịmanye Josef ka ya na ya kwaa iko. O jidere Josef n’uwe. Ma, ọ hapụụrụ ya uwe ya gbaa ọsọ. Mgbe Pọtịfa lọtara, nwunye ya gwara ya na Josef chọrọ idina ya n’ike. Ihe a ọ gwara ya abụghị eziokwu. Ihe a mere ka ezigbo iwe wee Pọtịfa, ya atụba Josef n’ụlọ mkpọrọ. Ma, Jehova echefughị Josef.

“N’ihi ya, wedanụ onwe unu ala otú Chineke, onye dị ike, chọrọ, ka o bulie unu elu mgbe oge ruru.”​—1 Pita 5:6

Ajụjụ: Olee ihe ụmụnne Josef mere ya? Gịnị mere e ji tụọ Josef mkpọrọ?

Jenesis 37:1-36, 39:1-23; Ọrụ Ndịozi 7:9

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya