Chineke Ò Kere Obere Ihe Dị Ndụ, Ihe Ahụ Aghọzie Ihe Ndị Ọzọ Dị Ndụ?
Ihe Baịbụl kwuru
Mba. Baịbụl mere ka o doo anya na Chineke kere ụmụ mmadụ, keekwa ụmụ anụmanụ na ahịhịa ndụ “n’ụdị ha dị iche iche.”a (Jenesis 1:12, 21, 25, 27; Mkpughe 4:11) O kwuru na mmadụ niile bi n’ụwa si ná nne na nna anyị mbụ bụ́ Adam na Iv. (Jenesis 3:20; 4:1) Ihe ahụ ndị mmadụ na-ekwu na Chineke kere obere ihe dị ndụ, ihe ahụ aghọzie ihe ndị ọzọ dị ndụ adịghị na Baịbụl. Nke bụ́ eziokwu bụ na Baịbụl anaghị agbagha ihe ndị sayensị chọpụtara na ihe ndị e kere eke dị ndụ nwere ụdị ha dị iche iche.
Chineke ò kere obere ihe dị ndụ, ihe ahụ emechazie ghọọ ihe ndị ọzọ dị ndụ?
Ndị kweere na Chineke kere obere ihe dị ndụ, ihe ahụ aghọzie ihe ọzọ dị ndụ enweghị otu olu banyere ihe ha kweere. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica kwuru na “ụfọdụ ndị kweere na otu n’ime ụzọ Chineke si kee ihe ndị dị n’ụwa bụ ike otu obere ihe dị ndụ, ihe ahụ emechazie ghọọ ihe ọzọ dị ndụ.”
Ndị kweere na Chineke kere obere ihe dị ndụ, ihe ahụ emechazie ghọọ ihe ọzọ dị ndụ kwekwaara ihe ndị a na-esonụ:
Ihe niile dị ndụ nwere ihe dịrị ndụ ọtụtụ afọ gara aga ha si na ya malite ịdị.
Otu ihe dị ndụ nwere ike ịgbanwe ghọọ ihe ọzọ dị ndụ dị nnọọ iche.
Mee elu, mee ala, aka Chineke dị n’ihe ndị a niile na-agbanwe, ghọọ ihe ọzọ.
Ozizi evolushọn ọ̀ dabara n’ihe Baịbụl kwuru?
Ndị kweere na Chineke kere obere ihe dị ndụ, ihe ahụ emechazie ghọọ ihe ọzọ dị ndụ na-ekwu na ihe ahụ Baịbụl kọrọ n’akwụkwọ Jenesis banyere otú e si kee ihe abụchaghị eziokwu. Ma, ihe Jizọs kwuru gosiri na ihe ahụ a kọrọ na Jenesis bụ ihe mere eme. (Jenesis 1:26, 27; 2:18-24; Matiu 19:4-6) Baịbụl kwuru na tupu Jizọs abịa n’ụwa, ya na Chineke bi n’elugwe, o nyekwaara Chineke aka mee ka “ihe niile” dịrị. (Jọn 1:3) N’ihi ya, ozizi ahụ bụ́ na Chineke kere obere ihe dị ndụ, ihe ahụ emechazie ghọọ ihe ọzọ dị ndụ adabaghị n’ihe Baịbụl kwuru.
Na ụmụ anụmanụ na ihe ọkụkụ na-enwe ike ịnọ ebe ọ bụla ha nwetara onwe ha na-eme nke ọma ọ̀ pụtara na ha na-esi n’otu ihe aghọ ihe ọzọ?
Baịbụl ekwughị ụdị ole a ga-enwe otu ihe dị ndụ. O kwughịkwanụ na anụmanụ abụọ bụ́ otu ụdị ma ọ bụ ihe ọkụkụ abụọ bụ́ otu ụdị Chineke kere emekataghị dịtụ iche n’ibe ha ka ha na-amụ ụmụ ma ọ bụ n’ihi ebe ha pulitere. Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị na-ekwu na ihe a na-egosi na ihe dị ndụ nwere ike imecha ghọọ ihe ọzọ dị ndụ, ma, na ihe dịtụ iche n’ibe ya apụtaghị na ihe ahụ ghọrọ ụdị ihe ọzọ dị ndụ.
a Ndị sayensị na-asị na otu ihe aghọọla ihe ọzọ ma ha hụ ụdị ọzọ nke otu ihe Chineke kere. Ma, ọ bụ ụdị ihe a ka akwụkwọ Jenesis kwuru gbasara ya.