Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwyp isiokwu 69
  • Gịnị Mere M Kwesịrị Iji Na-ekpe Ekpere?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Mere M Kwesịrị Iji Na-ekpe Ekpere?
  • Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị bụ ekpere?
  • Chineke ọ̀ na-anụ ekpere?
  • Gịnị ka m nwere ike ikpe n’ekpere?
  • Ekpere Ga-enyere Gị Aka Ịbịaru Chineke Nso
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Chineke Meere Anyị Ihe Ọma Kwe Ka Anyị Na-ekpegara Ya Ekpere
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Otú Ị Pụrụ Isi Bịaruo Chineke Nso
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Bịaruo Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
ijwyp isiokwu 69
Ebe otu nwa agbọghọbịa nọ ọdụ n’akụkụ ọdọ mmiri

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Mere M Kwesịrị Iji Na-ekpe Ekpere?

Otu nchọpụta e mere n’Amerịka gosiri na mmadụ asatọ n’ime ndị na-eto eto iri ọ bụla nọ n’obodo ahụ na-ekpe ekpere. Mana, ọ bụ naanị mmadụ anọ n’ime ha na-ekpe ya kwa ụbọchị. O doro anya na ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ò nwere uru ọzọ ikpe ekpere bara ka ọ̀ bụ naanị ihe mmadụ na-eme ka o wee nweta onwe ya?’

  • Gịnị bụ ekpere?

  • Chineke ọ̀ na-anụ ekpere?

  • Gịnị ka m nwere ike ikpe n’ekpere?

  • Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Gịnị bụ ekpere?

Ekpere bụ ụzọ mmadụ si agwa Onye kere ihe niile okwu. Chegodị ihe ọ pụtara. Jehova ka ụmụ mmadụ n’ihe niile. Ma, “ọ nọ onye ọ bụla n’ime anyị nso.” (Ọrụ Ndịozi 17:27) Baịbụl gwadịrị anyị, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”​—Jems 4:8.

Olee otú i nwere ike isi bịaruo Chineke nso?

  • Otu bụ Ekpere. Ọ bụ otú anyị si agwa Chineke okwu.

  • Nke ọzọ bụ ịmụ Baịbụl. Chineke na-esi na Baịbụl agwa anyị okwu.

Ọ bụrụ na anyị ana-agwa Chineke okwu n’ekpere, na-amụkwa Baịbụl iji nụ ihe ndị ọ na-agwa anyị, ọ ga-eme ka anyị na ya bụrụ ezigbo enyi.

“Otu n’ime ihe ọma kachanụ meere anyị bụ na anyị nwere ike ịgwa Jehova, onye Kacha Elu, okwu.”​—Jeremy.

“Ịkọrọ Jehova obi m n’ekpere na-eme ka mụ na ya dịkwuo ná mma.”​—Miranda.

Chineke ọ̀ na-anụ ekpere?

O nwere ike isiri mmadụ ike ikwere na Chineke na-anụ ekpere n’eziokwu ọ bụrụgodị na onye ahụ kweere na Chineke, na-ekpekwa ekpere. Ma, Baịbụl kwuru na Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) Ọ gwara gị ka ị ‘na-akọrọ ya ihe niile na-echegbu gị.’ N’ihi gịnị? Ọ bụ ‘n’ihi na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’​—1 Pita 5:7.

Ihe ị ga-echebara echiche: Ị̀ na-ewepụta oge kọọrọ ndị ezigbo enyi gị otú obi dị gị mgbe niile? Ọ bụrụ na ị na-eme ya, sikwa otú ahụ na-ewepụta oge na-akọrọ Chineke otú obi dị gị. Na-ekpe ekpere mgbe niile. I kpewe ekpere, na-akpọ ya aha ya bụ́ Jehova. (Abụ Ọma 86:​5-7; 88:9) Nke bụ́ eziokwu bụ na Baịbụl kwuru ka ị ‘na-ekpe ekpere mgbe niile.’​—1 Ndị Tesalonaịka 5:17.

“M na-ekpe ekpere. Ọ bụ otú m si agwa Nna m nke eluigwe okwu. M na-agwa ya ihe niile dị m n’obi.”​—Moises.

“M na-agwa Jehova obi m otú ahụ m ga-esi agwa mama m ma ọ bụ ezigbo enyi m.”​—Karen.

Gịnị ka m nwere ike ikpe n’ekpere?

Baịbụl kwuru, sị: “N’ihe niile, na-ekpenụ ekpere, na-arịọsikwanụ Chineke arịrịọ ike ma na-ekele ya. Ọ bụ otú unu ga-esi mee ka ọ mara ihe unu na-arịọ.”​—Ndị Filipaị 4:6.

Ọ̀ pụtara na i nwere ike ịkọrọ Jehova nsogbu gị? Eenụ. Baịbụl kwudịrị, sị: “Bunye Jehova ibu na-anyịgbu gị. Ọ ga-enyere gị aka.”​—Abụ Ọma 55:22.

E wezụga nsogbu gị, i kwesịkwara ịkọrọ Jehova ihe ndị ọzọ ma i kpewe ekpere. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Chantelle sịrị: “Ọ bụrụ na ihe m na-eme bụ naanị ịrịọ Jehova ka o nyere m aka, gị amara na mụ abụghị ezigbo enyi ya. Ekwesịrị m ibu ụzọ kelee ya. E nwekwara ọtụtụ ihe ọ na-emere m, m ga-eji maka ha na-ekele ya.”

Ihe ị ga-echebara echiche: Olee ihe ndị merela ná ndụ gị i kwesịrị ikele Chineke maka ha? Ì nwere ike iche banyere ihe atọ ị ga-eji maka ha kelee Jehova taa?

“Ihe ndị na-abụghị oké ihe, dị ka ọmarịcha okooko osisi masịrị anyị, nwere ike ime ka anyị kpee ekpere kelee Jehova.”​—Anita.

“Ị hụ otu ihe Chineke kere nke masịrị gị ma ọ bụ otu amaokwu Baịbụl ruru gị n’obi, chebara ya echiche ma kelee Jehova maka ya.”​—Brian.

Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Moises

“Anyị kwesịrị ịna-esi n’ala ala obi anyị ekpe ekpere. Anyị ekwesịghị ịna-ekpe ya elu elu. Jehova chọrọ inyere anyị aka. Ọ bụ eziokwu na ọ ma ihe ndị bụ́ mkpa anyị tupudị anyị arịọ ya ka o gbooro anyị ha, anyị ka kwesịrị ịna-esi n’ala ala obi anyị ekpe ekpere. Ime otú a ga-egosi na anyị tụkwasịrị ya obi.”​—Moises.

Miranda

“Ekpere dị ka ụdọ. Jehova ji otu isi, mụnwa ejide isi ya nke ọzọ. M gwa Jehova ihe dị m n’obi, ọ dị ka m̀ na-ejidesi ụdọ ahụ ike, Jehova ana-adọtakwu m n’ebe ọ nọ, ya emee ka adịm ná mma mụ na ya na-esikwu ike.”​—Miranda.

Jeremy

“Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, ihe anyị ga na-eme n’ekpere anyị bụ naanị ịrịọ Jehova ka o meere anyị nke a, meere anyị nke ọzọ. Ma, ọ bụrụ na anyị ana-ekele Jehova, obi ga na-adị anyị ụtọ maka ọtụtụ ihe ndị o meere anyị. Ọ ga-emekwa ka ihe anyị na-ekpe n’ekpere ghara ịbụ naanị meere m nke a, meere m nke ọzọ.​—Jeremy.

Shelby

“Ọ bụrụ na anyị ana-ewepụtakwu oge na-ekele Jehova, anyị ga na-enwekwu obi ụtọ. Ịna-ekele Jehova ma anyị kpewe ekpere ga-enyere anyị aka ilekwasị anya n’otú Jehova si na-agọzi anyị kama ilekwasị anya ná nsogbu ndị anyị nwere.”​—Shelby.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya