-
Olee Uru Ịgụ Baịbụl Bara?Ụlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2017 | Nke 1
-
-
ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE IHE Ị GA-EME KA ỊGỤ BAỊBỤL NA-ATỌ GỊ ỤTỌ?
Olee Uru Ịgụ Baịbụl Bara?
“Echere m na agaghị m aghọtali Baịbụl.”—Jovy
“Ọ dịcha m ka ịgụ Baịbụl ga na-agwụ ike.”—Queennie
“Ọ na-abụ m leechaa otú Baịbụl hà, ike ịgụ ya ana-agwụ m.”—Ezekiel
È nwetụla mgbe ị chọrọ ịgụ Baịbụl, ya adị gị otú ọ dị otu n’ime ndị a? E nwere ndị ịgụ Baịbụl na-esiri ezigbo ike. Ọ bụrụ na ị bụ otu n’ime ha, gị amata na Baịbụl nwere ike ime ka ndụ na-atọkwu gị ụtọ, olee ihe ị ga-eme? Ọ bụrụkwanụ na ị chọpụta na o nwere otú i nwere ike isi na-agụ Baịbụl, ya ana-atọkwu gị ụtọ, ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ịgụ ya? Gbalịanụ gụọ Baịbụl ka ị hụ ihe ndị o kwuru ga-abara gị uru.
Ka anyị legodị uru ụfọdụ ndị kwuru na ha ritere mgbe ha gụwara Baịbụl.
E nwere ihe otu nwa okorobịa aha ya bụ Ezekiel kwuru. Ọ dị ihe dị ka afọ iri abụọ na abụọ. Ọ sịrị: “Na mbụ, m na-ebi ndụ ka onye bu ụgbọala na-aga n’enweghị ebe o bu n’uche ịga. Ma, mgbe m gụwara Baịbụl, ndụ m bịara nwee isi. Ihe e dere na Baịbụl na-enyere m aka kwa ụbọchi.”
E nwekwara ihe otu nwa agbọghọ dịkwa ihe dị ka afọ iri abụọ na abụọ aha ya bụ Frieda kwuru. Ọ sịrị: “M na-ewebu iwe ọkụ. Ma, ihe ndị m gụtara na Baịbụl emeela ka m na-ejide onwe m. O meekwala ka mụ na ndị mmadụ na-adịkwu ná mma.”
Otu nwaanyị aha ya bụ Eunice dị ihe dị ka afọ iri ise kwuru na Baịbụl na-enyere ya aka ịbụ ezigbo mmadụ, na-enyekwara ya aka ịgbanwe àgwà ndị na-adịchaghị mma ọ na-akpa.
Ihe a ndị a kwuru, nakwa ihe ọtụtụ ndị ọzọ gụrụla Baịbụl chọpụtara, gosiri na ịgụ Baịbụl nwere ike ime ka ndụ na-atọ gị ụtọ. (Aịzaya 48:17, 18) Ịgụ Baịbụl nwekwara ike inyere gị aka (1) ime mkpebi ndị dị mma, (2) imete ezigbo ndị enyi, (3) idi nsogbu, (4) nakwa ịmụta gbasara Chineke, bụ́ ihe kacha mkpa ná ndụ. E nweghị mgbe ime ihe Baịbụl kwuru ga-aghọ gị ahịa n’ihi na ọ bụ Chineke mere ka e dee ha. Chineke agaghị agwa gị mee ihe na-adịghị mma.
Ihe dị mkpa bụ ka i bidogodị gụwa Baịbụl. Olee ihe ụfọdụ i nwere ike ime ka ịgụ Baịbụl gụwa gị agụụ, nakwa ka ọ na-atọ gị ụtọ?
-
-
Olee Otú M Ga-esi Malite Ịgụ Baịbụl?Ụlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2017 | Nke 1
-
-
ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE IHE Ị GA-EME KA ỊGỤ BAỊBỤL NA-ATỌ GỊ ỤTỌ?
Olee Otú M Ga-esi Malite Ịgụ Baịbụl?
Olee ihe ị ga-eme ka ịgụ Baịbụl na-atọ gị ụtọ? Legodị ihe ise nyerela ụfọdụ ndị aka.
Nọrọ n’ebe ahụ́ ga-eru gị ala. Gbalịa nọrọ ebe dị jụụ. Gbaa mbọ ka a ghara inwe ihe ga na-adọpụ gị uche. Ịnọ ebe ị ga na-ahụ ihe ị na-agụ nke ọma, nakwa ebe ezigbo ikuku ga na-ekusa gị ga-eme ka ị na-aghọta ihe ị na-agụ.
Jiri obi ọcha gụọ ya. Ebe ọ bụ Nna anyị bi n’eluigwe nwe Baịbụl, ọ ga-abara gị uru ma i mee ka nwatakịrị chọrọ ịmụta ihe n’aka nne ma ọ bụ nna ya hụrụ ya n’anya. Ọ bụrụ na e nwere ihe na-adịghị mma ị na-eche gbasara Baịbụl, ọ ga-adị mma ka ị hapụ ya ka Chineke nwee ike ịkụziri gị ihe.—Abụ Ọma 25:4.
Kpee ekpere tupu gị agụwa Baịbụl. Ọ bụ uche Chineke ka e dere na Baịbụl. Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ịrịọ ya ka o nyere anyị aka ịghọta ya. Chineke kwuru na ọ ga-enye “ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ.” (Luk 11:13) Mmụọ nsọ ga-enyere gị aka ịghọta uche Chineke. Nwayọọ nwayọọ, ọ ga-emekwa ka ị ghọta “ihe ndị miri emi nke Chineke.”—1 Ndị Kọrịnt 2:10.
Gụọ ya otú ị ga-aghọta ya. Agụla ya naanị ka ị gụchaa isi ole i kpebiri ịgụ otu mgbe. Chebara ihe ị na-agụ echiche. I nwere ike ịjụ onwe gị ajụjụ ndị dị ka: ‘Olee àgwà ọma onye a na-ekwu gbasara ya ebe a nwere? Olee otú m ga-esi na-eme ka ya?’
Nwee ihe i bu n’obi Baịbụl ị na-achọ ịgụ ga-enyere gị aka na ya. Ị chọọ ka Baịbụl ị na-achọ ịgụ na-atọ gị ụtọ, i kwesịrị ibu n’obi na ị ga-amụta ihe ga-abara gị ezigbo uru. I nwere ike ibu n’obi ịmụtakwu gbasara Chineke, ma ọ bụkwanụ otú ị ga-esi bụrụ ezigbo mmadụ, ezigbo di ma ọ bụ ezigbo nwunye. Gazie ebe Baịbụl kwuru ihe ndị ga-enyere gị aka ime ihe ndị a ị chọrọ ime, gụwa ha.a
Ime ihe ise a ga-eme ka ịgụ Baịbụl na-atọ gị ụtọ. Ma, olee otú ị ga-esi eme ka ọ na-atọkwu gị ụtọ? Isiokwu na-eso nke a ga-akọrọ gị ihe ụfọdụ ị ga-eme.
a Ọ bụrụ na ị maghị ebe e kwuru ihe ndị ahụ na Baịbụl, i nwere ike ịgwa Ndịàmà Jehova ka ha nyere gị aka.
-
-
Ihe Ga-eme Ka Ịgụ Baịbụl Na-atọkwu Gị ỤtọỤlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2017 | Nke 1
-
-
ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE IHE Ị GA-EME KA ỊGỤ BAỊBỤL NA-ATỌ GỊ ỤTỌ?
Ihe Ga-eme Ka Ịgụ Baịbụl Na-atọkwu Gị Ụtọ
Ịgụ Baịbụl ọ̀ na-atọ gị ụtọ, ka ọ̀ na-agwụ gị ike? Nke ọ bụla ọ bụ nwere ike ịbụ n’ihi otú i si na-agụ ya. Ka anyị leba anya n’ihe ndị ga na-eme ka ịgụ Baịbụl na-agụ gị agụụ, ma na-atọkwu gị ụtọ.
Jiri Baịbụl a sụgharịrị nke ọma na nke e ji asụsụ a na-ede n’oge a na-agụ ya. Ọ bụrụ na ị na-agụ akwụkwọ, gụta ọtụtụ okwu na-esiri gị ike ịghọta, ma ọ bụkwanụ okwu ndị mgbe ochie ị na-amaghị ihe ha pụtara, akwụkwọ ahụ nwere ike ịgbụ gị. Ọ bụ ya mere o ji dị mma ka ị chọta Baịbụl e ji asụsụ dị mfe ga-eru gị n’obi sụgharịa. O kwesịkwara ịbụ nke a sụgharịrị nke ọma.a
Danloduo ya n’ekwentị na ihe ndị yiri ya, ma ọ bụ gị ana-agụ ya n’Ịntanet. N’oge anyị a, e nwere Baịbụl ndị e biri ebi, nweekwa ndị nke dị n’Ịntanet, kọmputa, ekwentị na ihe ndị yiri ya. E nwekwara ihe ndị dị na kọmputa ma ọ bụ n’ekwentị ụfọdụ nwere ike inyere gị aka ịchọta amaokwu Baịbụl ndị ọzọ kwuru banyere ihe ị na-agụ. Ha nwekwara ike inyere gị aka ịhụ otú e si sụgharịa amaokwu ị na-agụ ná nsụgharị Baịbụl ndị ọzọ. E nwekwara Baịbụl ndị a gụrụ agụ i nwere ike igere egere. Ụfọdụ na-egere ya ma ha nọrọ n’ụgbọala na-eme njem, ma ha na-asa ákwà, ma ọ bụkwanụ na-eme ihe ndị ọzọ. Leenụ ma ò nwere nke ọ bụla n’ime ụzọ ndị a ga-akara gị mma isi gụọ Baịbụl.
Jiri ihe ndị e ji amụ Baịbụl na-agụ Baịbụl. E nwere ihe ndị e ji amụ Baịbụl nwere ike inyere gị aka ịghọtakwu Baịbụl ị na-agụ. Otu n’ime ha bụ map ndị na-egosi obodo ndị e kwuru okwu ha na Baịbụl. Ha nwere ike inyere gị aka ịmata ebe ihe ndị ị na-agụ mere, meekwa ka ị ghọtakwuo ihe ị na-agụ. Isiokwu ndị gbara n’akwụkwọ anyị ụfọdụ dị ka ndị dị n’Ụlọ Nche a nwere ike inyere gị aka ịghota ọtụtụ ihe e kwuru na Baịbụl. E nwekwara ndị dị na jw.org/ig, n’ebe e dere “Ihe Baịbụl Na-akụzi.”
Gbanwee otú i si na-agụ ya. Ọ bụrụ na isi n’isi gụrụ Baịbụl ruo ná ngwụcha na-esiri gị ike, i nwere ike ịmalite n’akwụkwọ Baịbụl ndị kacha atọ gị ụtọ. Ị chọọ ịmatakwu ụfọdụ ndị a na-anụkarị aha ha na Baịbụl, i nwere ike malite ịgụ gbasara ha. E nwere igbe dị n’isiokwu a nwere ike inyere gị aka ma ị chọọ ịgụ gbasara ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. Isiokwu ya bụ “Gụọ Gbasara Ndị A Kọrọ Akụkọ Ha na Baịbụl Ka Ị Ghọtakwuo Baịbụl.” I nwekwara ike ịgụ Baịbụl n’isiokwu n’isiokwu ma ọ bụ otú ihe ndị a kọrọ na ya si mee. Gbalịa mee otu n’ime ihe ndị a ka ịgụ Baịbụl na-atọkwu gị ụtọ.
a Ọtụtụ ndị achọpụtala na a sụgharịrị Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ nke ọma, nakwa na ọ dị mfe ọgụgụ. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. Ọ dịkwa n’ihe karịrị asụsụ otu narị na iri atọ. I nwere ike ịdanlodu ya na jw.org/ig ma ọ bụkwanụ na JW Library app. Ị chọọkwa nke e biri ebi, Ndịàmà Jehova nwere ike iwetara gị ya n’ụlọ gị.
-
-
Olee Otú Baịbụl Nwere Ike Isi Nyere M Aka ná Ndụ?Ụlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2017 | Nke 1
-
-
ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE IHE Ị GA-EME KA ỊGỤ BAỊBỤL NA-ATỌ GỊ ỤTỌ?
Olee Otú Baịbụl Nwere Ike Isi Nyere M Aka ná Ndụ?
Baịbụl bụ akwụkwọ pụrụ iche. Ihe e dere na ya bụ ihe Onye kere anyị kwuru ga-abara anyị uru. (2 Timoti 3:16) Ihe ndị o kwuru nwere ike inyere anyị ezigbo aka. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo, sị: “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.” (Ndị Hibru 4:12) E nwere ụzọ abụọ dị mkpa Baịbụl nwere ike isi nyere anyị aka ná ndụ. Otu bụ na ọ ga-eme ka ndụ anyị ka mma ugbu a. Nke abụọ abụrụ na ọ ga-enyere anyị aka ịmata Chineke na ihe ndị o kwuru ọ ga-emere anyị.—1 Timoti 4:8; Jems 4:8.
Otú ọ ga-esi eme ka ndụ gị ka mma ugbu a. Baịbụl ga-abara gị ezigbo uru. O kwuru ihe ndị ga-enyere gị aka n’ihe ndị a na-esonụ:
Otú gị na ndị ezinụlọ gị na ndị ọzọ ga-esi na-adị ná mma.—Ndị Efesọs 4:31, 32; 5:22, 25, 28, 33.
Otú ahụ́ ga-esi esi gị ike, na otú ị ga-esi na-enwe obi ụtọ.—Abụ Ọma 37:8; Ilu 17:22.
Otú ị ga-esi na-akpa àgwà.—1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10.
Otú ị ga-esi akpa afọ gị.—Ilu 10:4; 28:19; Ndị Efesọs 4:28.a
E nwere otu di na nwunye bi n’Eshia ihe ha gụtara na Baịbụl baara ezigbo uru. Aha ha bụ Vicent na Annalou. Mgbe ha lụrụ ọhụrụ, o siiri ha ike ịghọta ibe ha, nakwa ịna-agwa ibe ha obi ha, otú ahụ ọ na-adị ọtụtụ ndị lụrụ ọhụrụ. Ma, ha bidoro mewe ihe ha na-agụta na Baịbụl. Olee uru ọ baara ha? Vicent kwuru, sị: “Ihe ndị m gụrụ na Baịbụl enyerela m aka iji obiọma na-edozi nsogbu mụ na nwunye m na-enwe. O nyekwarala anyị aka ịna-ebi n’udo.” Annalou, nwunye ya kwetara ihe a di ya kwuru. Ọ sịrị: “Ịgụ gbasara ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl fere Chineke nyeere anyị aka. Obi na-atọ m ụtọ ugbu a maka otú mụ na di m si biri n’udo, nakwa maka ihe anyị ji ndụ anyị na-eme.”
Ịmata Chineke. Vicent kwukwara uru ọzọ ịgụ Baịbụl baara ya. Ọ sịrị: “Ịgụ Baịbụl emeela ka mụ na Jehova dịrị ná mma ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ.” Ihe a Vicent kwuru na-egosi na Baịbụl na-enyere anyị aka ịmata Chineke nke ọma. Ọ bụrụ na ị mata Chineke nke ọma, ime ihe o kwuru ga na-abara gị uru, gị na ya ga-abụkwa enyi. Ị ga-achọputa na ọ gwara anyị na ọ ga-emere anyị ọtụtụ ihe ọma n’ọdịnihu. N’oge ahụ, anyị ga-adị ‘ndụ nke bụ́ ndụ n’ezie,’ ya bụ, ndụ ebighị ebi. (1 Timoti 6:19) E nweghị akwụkwọ ọzọ nwere ike ịkọrọ anyị ihe ndị a ma e wezụga Baịbụl.
Ọ bụrụ na i bido gụwa Baịbụl ma nọgide na-agụ ya, ọ ga-eme ka ndụ gị ka mma ugbu a, gị amatakwa Chineke. Ma ka ị na-agụ Baịbụl, i nwere ike inwe ọtụtụ ihe ga-agbagwoju gị anya ị ga-achọ ịjụ ajụjụ gbasara ya. Ọ bụrụ na i nwee ajụjụ, ihe otu nwoke onye Itiopia dịrị ndụ ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga mere nwere ike inyere gị aka. O nwere ọtụtụ ajụjụ gbasara ihe ọ gụtara na Baịbụl. Mgbe otu onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Filip, jụrụ ya ma ọ̀ ma ihe ihe ọ na-agụ pụtara, ọ sịrị: “Olee otú m ga-esi mara, ma ọ bụrụ na mmadụ eduzighị m?”b O kwetaziri ka Filip, bụ́ onye ma Baịbụl nke ọma nyere ya aka ịghọta ihe ọ na-agụ. (Ọrụ Ndịozi 8:30, 31, 34) Ọ bụrụkwa na ị chọrọ ịmụtakwu Baịbụl, gaa na jw.org/ig pịa ebe e dere “Gwa Anyị Ka Anyị na Gị Mụwa Baịbụl,” dejuo fọm dị ebe ahụ. I nwekwara ike iji adres anyị dị n’Ụlọ Nche a detara anyị akwụkwọ ozi. Jiri nke kacha dị nso n’ebe i bi deta ya. I nwekwara ike ịgwa Onyeàmà Jehova ọ bụla ị hụrụ na ị ga-achọ ka a bịa mụwara gị Baịbụl ma ọ bụkwanụ gị agaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị dị gị nso. Gbalịa bido taa gụwa Baịbụl ka o nyere gị aka ime ka ndụ gị ka mma.
Ọ bụrụ na ị na-enwe obi abụọ ma ihe Baịbụl kwuru ọ̀ bụ eziokwu, biko lee vidio bụ́ Olee Ihe Ndị Gosiri na Baịbụl Na-ekwu Eziokwu? Ị ga-ahụ vidio a ma ị gaa na jw.org/ig, pịa ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE, pịa VIDIO, pịzie BAỊBỤL.
a Ị chọọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka, gaa na jw.org/ig. Pịa ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịzie AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA.
b Gụọkwa isiokwu bụ́ “Mmadụ Ịghọtahie Ihe Baịbụl Kwuru, Ọ̀ Bụ Obere Ihe?” Ọ dị n’Ụlọ Nche a.
-