Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Nsogbu Ndị Na-eme Ka E nwee Olileanya
    Ụlọ Nche—2011 | Mee 1
    • Nsogbu Ndị Na-eme Ka E nwee Olileanya

      “N’oge ikpeazụ, a ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ.”—2 TIMOTI 3:1.

      Ị̀ NỤTỤLA ma ọ bụkwanụ hụ ebe otu n’ime ihe ndị a na-agbawa obi mere?

      ● Ọrịa ọjọọ gburu ọtụtụ mmadụ.

      ● Ụkọ nri lara ndụ ọtụtụ narị mmadụ n’iyi.

      ● Ala ọma jijiji gburu ọtụtụ puku mmadụ ma mee ka ọtụtụ ndị ọzọ ghara inwe ebe ha bi.

      Na peeji ndị na-esonụ, ị ga-ahụ ihe ụfọdụ ga-eme ka i chebara ihe ndị ahụ na-eme n’ụwa echiche. Ị ga-ahụkwa na Baịbụl buru amụma na ihe ndị dị otú ahụ ga-eme n’oge a kpọrọ ‘oge ikpeazụ.’a

      Ma, ihe mere e ji dee isiokwu ndị a abụghị ime ka i kweta na ụwa jupụtara ná nsogbu. O nwere ike ịbụ na ị na-enwe ụfọdụ n’ime nsogbu ndị a. Ihe mere e ji dee ha bụ ka ha mee ka i nwee olileanya. Ha ga-eme ka ị ghọta na amụma isii ndị a na-emezunụ na-egosi na ‘oge ikpeazụ’ ahụ agwụwala. N’isiokwu ndị a, a ga-atụle ihe mmadụ ụfọdụ na-ekwukarị bụ́ ndị na-ekweghị na ihe ndị a na-eme n’ụwa taa bụ mmezu amụma, tụleekwa ezi ihe mere anyị ga-eji kwere na ihe ga-adị mma n’oge na-adịghị anya.

      [Ihe e dere n’ala ala peeji]

      a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịma ihe mere Chineke ji kwere ka ihe ọjọọ ndị a na-eme, gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ihe Ọjọọ na Ahụhụ Dịrị?” nke dị na peeji nke 16 na nke 17 na magazin a.

  • Amụma nke 1. Ala Ọma Jijiji
    Ụlọ Nche—2011 | Mee 1
    • Amụma nke 1. Ala Ọma Jijiji

      “A ga-enwekwa oké ala ọma jijiji.”—LUK 21:11.

      ● Mgbe e nwere ala ọma jijiji na Heiti, e si n’ụlọ ndị dakasịrị adakasị kupụta Winnie, bụ́ nwata dị otu afọ na ọnwa anọ. Ndị nta akụkọ otu ụlọ ọrụ tiivi, bụ́ ndị nọ na-egosi ọdachi ahụ, nụrụ ude ọ na-asụ. Nwata ahụ anwụghị, ma ndị mụrụ ya nwụrụ.

      GỊNỊ KA IHE NDỊ NA-EME EME NA-EGOSI? Mgbe ala ọma jijiji ahụ dị oké njọ mere na Heiti na Jenụwarị 2010, o gburu ihe karịrị narị puku mmadụ atọ. N’otu ntabi anya, o mere ka ihe karịrị otu nde mmadụ ghara inwekwa ebe obibi. Ọ bụ eziokwu na ala ọma jijiji ahụ mere na Heiti kpara ike dị egwu, ọ bụghị naanị ebe ahụ ka ala ọma jijiji metụrụla. N’agbata ọnwa Eprel afọ 2009 na ọnwa Eprel afọ 2010, ọ dịkarịa ala, ala ọma jijiji iri na asatọ kpara ike ọjọọ n’ebe dị iche iche n’ụwa.

      GỊNỊ KA NDỊ NA-EKWEGHỊ NÁ MMEZU AMỤMA A NA-EKWUKARỊ? Ala ọma jijiji ole na-eme taa akarịghị ndị mere n’oge gara aga. Ihe mere o ji dị ka ọ karịrị bụ na nkà na ụzụ e nwere ugbu a na-eme ka anyị mara banyere ha karịa otú ndị dịrị ndụ n’oge gara aga si mara banyere ha.

      IHE AHỤ HA KWURU Ò RIJURU AFỌ? Chebara ihe a echiche: Baịbụl ekwughị ala ọma jijiji ole ga-eme n’oge ikpeazụ. Kama, o kwuru na a ga-enwe “oké ala ọma jijiji” “n’ebe dị iche iche,” nke na-eme ka ọ bụrụ otu n’ime ihe ndị na-egosi na oge anyị a bụ oge pụrụ iche.—Mak 13:8; Luk 21:11.

      GỊNỊ KA I CHERE? Ànyị na-ahụ oké ala ọma jijiji otú ahụ Baịbụl kwuru?

      Mmadụ nwere ike ịsị na ala ọma jijiji ndị na-emenụ erughị ihe mmadụ ga-eji kwuo na anyị bi n’oge ikpeazụ. Ma, e nwekwara amụma ndị ọzọ na-emezu n’oge a. Ka anyị hụ nke abụọ.

      [Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]

      “Anyịnwa [bụ́ ndị ọkachamara na-amụ banyere ala] na-akpọ ya oké ala ọma jijiji. Ndị ọzọ na-akpọ ya ọdachi jọgburu onwe ya.”—KEN HUDNUT, ONYE NA-ARỤ N’ỤLỌ ỌRỤ AMERỊKA NKE NA-AMỤ BANYERE ALA.

      [Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 4]

      © William Daniels/Panos Pictures

  • Amụma nke 2. Ụkọ nri
    Ụlọ Nche—2011 | Mee 1
    • Amụma nke 2. Ụkọ nri

      “A ga-enwe ụkọ nri.”—MAK 13:8.

      ● Otu nwoke gbatara ọsọ ndụ n’obodo Kwarateji nke dị na Naịja. Ndị ikwu ya, ụmụnne ya ndị nwoke na ndị nwaanyị sikwa n’ime ime obodo ndị dị ná mba ahụ gbapụta n’ihi agụụ. Ma, nwoke ahụ gara ebe ọzọ dinara naanị ya n’ute. Gịnị mere o ji nọrọ naanị ya? Sidi, bụ́ chiif obodo ahụ, kwuru, sị: “O nweghị ike inye [ezinụlọ ya] nri, ọ chọghịkwa ịnọ na-ele ha n’anya n’anya.”

      GỊNỊ KA IHE NDỊ NA-EME EME NA-EGOSI? N’ụwa niile, ọ fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ na otu onye n’ime mmadụ asaa ọ bụla anaghị eriju afọ kwa ụbọchị. Ọ ka njọ n’ebe ndịda Ọzara Afrịka, bụ́ ebe otu onye n’ime mmadụ atọ ọ bụla na-anaghị eriju afọ. Iji ghọta nke a nke ọma, ka anyị were otu ezinụlọ nke nwere nna, nne, na obere nwa maa atụ. Ọ bụrụ na nri ha nwere ga-ezuru naanị mmadụ abụọ, ònye n’ime ha ga-akwụ agụụ? Ọ̀ bụ nna ahụ, nne, ka ọ̀ bụ obere nwa ahụ? Ọ bụ otú a ka ọ na-adị ezinụlọ ndị dị otú ahụ, otu onye n’ime ha ga-akwụrịrị agụụ n’ụbọchị.

      GỊNỊ KA NDỊ NA-EKWEGHỊ NÁ MMEZU AMỤMA A NA-EKWUKARỊ? Nri a na-akọpụta n’ụwa ga-ezuru onye ọ bụla. Naanị ihe dị mkpa bụ ime ka o rute onye ukwu na onye nta aka.

      IHE AHỤ HA KWURU Ò RIJURU AFỌ? N’eziokwu, ndị ọrụ ugbo nwere ike ịkọpụtakwu nri ugbu a ma buga ya n’ebe dị iche iche karịa otú e metụrụla kemgbe ụwa. E mezie ihe emezie, ndị ọchịchị kwesịrị ịhụ na nri a na-akọpụta n’ụwa zuuru onye ọ bụla. Ma n’agbanyeghị na ha agbalịala ime nke a kemgbe ọtụtụ iri afọ, ha enwebeghị ike ime ya.

      GỊNỊ KA I CHERE? Ihe e dere na Mak 13:8 ọ̀ na-emezu n’oge a? N’agbanyeghị na e nweela ụzọ ndị ka mma e si akọpụta nri, ụkọ nri ọ̀ ka na-akpa ụmụ mmadụ aka ọjọọ n’ụwa niile?

      E nwekwara nsogbu ọzọ e ji ama ụbọchị ikpeazụ bụ́ nke a na-enwekarị mgbe e nwechara ala ọma jijiji na ụkọ nri.

      [Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

      “Ihe karịrị otu nwata n’ime ụmụaka atọ ndị na-anwụ n’ihi na oyi bara ha ahụ́, n’ihi afọ ọsịsa nakwa n’ihi ọrịa ndị ọzọ, agaraghị anwụ ma ọ bụrụ na ha na-eriju afọ.”—ANN M. VENEMAN, ONYE BỤ́BU ONYEISI NGALABA ÒTÙ MBA ỤWA NKE NA-AHỤ MAKA ỤMỤAKA.

      [Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 5]

      © Paul Lowe/Panos Pictures

  • Amụma nke 3. Ọrịa
    Ụlọ Nche—2011 | Mee 1
    • Amụma nke 3. Ọrịa

      “Ndị mmadụ . . . ga na-arịa ọrịa ọjọọ.”—LUK 21:11, Contemporary English Version.

      ● Bonzali bụ onye ọrụ ahụ́ ike nke bi n’otu mba dị n’Afrịka nke agha obodo kparala aka ọjọọ. Ọrịa Mabọga nọ na-egbusị ndị na-egwupụta ọla n’obodo ya. Ọ nọkwa na-agbalị ike ya niile ịgwọ ha. Ọ rịọrọ ndị ọrụ ahụ́ ike nọ n’obodo mepere emepe ka ha bịa nyere ya aka, ma ha abịaghị ozugbo ahụ. Ha mechara bịa mgbe ọnwa anọ gaferela, ma ya abụrụ na Bonzali anwụọla. O si n’aka ndị ahụ ọ na-agwọ bute ọrịa Mabọg.

      GỊNỊ KA IHE NDỊ NA-EME EME NA-EGOSI? Ọrịa ndị dị ka oyi ịba mmadụ n’ahụ́, afọ ọsịsa, ọrịa o biri n’ájá ọcha, ụkwara nta, na ịba so n’ọrịa ndị kacha egbu ndị mmadụ. N’otu afọ na-adịbeghị anya, ọrịa ndị a gburu ihe dị ka nde mmadụ iri na narị puku asaa. Ihe ọ pụtara bụ na ọrịa ndị ahụ gburu ihe dị ka otu puku mmadụ na narị abụọ n’otu awa ọ bụla n’afọ ahụ.

      GỊNỊ KA NDỊ NA-EKWEGHỊ NÁ MMEZU AMỤMA A NA-EKWUKARỊ? Ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa na-ebuwanye ibu, n’ihi ya, e kwesịrị inwekwu ndị na-arịa ọrịa. E nwekwuola ndị nwere ike ibute ọrịa.

      IHE AHỤ HA KWURU Ò RIJURU AFỌ? N’eziokwu, ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa ebukwuola nnọọ ibu. Ma, ụmụ mmadụ amụtakwuola otú e si achọpụta ọrịa, otú e si eme ka ọrịa ghara ịgbasa, nakwa otú e si agwọ ọrịa. Ebe ọ dị otú ahụ, ọ̀ bụ na ọrịa ndị na-arịa ụmụ mmadụ ekwesịghị ibelata? Kama ibelata, ọ na-aka njọ.

      GỊNỊ KA I CHERE? Ndị mmadụ hà na-arịa ọrịa ọjọọ dị ka Baịbụl buru n’amụma?

      Ala ọma jijiji, ụkọ nri, na ọrịa bụ ihe ndị a na-anaghị ahụ anya, ma ha na-echi ọtụtụ nde mmadụ ọnụ n’ala. Ọtụtụ nde ndị ọzọ na-ata ahụhụ n’ihi na mmadụ ibe ha na-emekpọ ha ọnụ. Ndị na-echi ọtụtụ n’ime ndị a ọnụ n’ala bụ ndị kwesịrị inyere ha aka. Ka anyị hụ ihe Baịbụl buru n’amụma na ọ ga-eme.

      [Ihe e dere n’ala ala peeji]

      a Onye ọrịa Mabọg na-arịa na-enwe oké ahụ́ ọkụ, ọbara na-agbakwa ya n’ime ahụ́. Ọrịa a na ọrịa Ebola yiri.

      [Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

      “Ọ na-awụ akpata oyi n’ahụ́ ịhụ ebe ọdụm ma ọ bụ anụ ọzọ tagburu mmadụ, ma ọ na-awụkwa akpata oyi n’ahụ́ ịhụ ebe ọrịa ọjọọ gburu mmadụ ma na-ahụ ka ọ ka na-egbukwa ọtụtụ ndị ọzọ.”—MICHAEL OSTERHOLM BỤ́ ỌKACHAMARA N’IHE BANYERE ỌRỊA NA-EFE EFE.

      [Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 6]

      © William Daniels/Panos Pictures

  • Amụma nke 4. Ndị Mmadụ Agaghị Ahụ Ibe Ha N’anya
    Ụlọ Nche—2011 | Mee 1
    • Amụma nke 4. Ndị Mmadụ Agaghị Ahụ Ibe Ha N’anya

      “Ndị mmadụ . . . agaghị ahụ ndị ezinụlọ ha n’anya.”—2 TIMOTI 3:1-3, nsụgharị bụ́ God’s Word Bible

      ● Chris na-arụrụ otu òtù nọ na Briten ọrụ, bụ́ nke na-enyere ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha na-eti ihe aka. Chris kwuru, sị: “M na-echeta otu nwaanyị nke bịakwutere m otu ụbọchị, otú e si tikasịa ya ahụ́ mere ka m ghara ịmatazi onye ọ bụ. Ụmụ nwaanyị ndị ọzọ na-abịa n’ụlọ ọrụ anyị na-anọ ná mwute nke na ha anaghị enwe ike iwelite ihu elu.”

      GỊNỊ KA IHE NDỊ NA-EME EME NA-EGOSI? N’otu mba dị n’Afrịka, ihe dị ka otu nwaanyị n’ime ụmụ nwaanyị atọ ọ bụla enweela mgbe e metọrọ ya n’oge ọ bụ nwata. Otu nnyocha e mere ná mba ahụ gosiri na otu nwoke n’ime ụmụ nwoke atọ ọ bụla kwuru na o nweghị ihe dị njọ ma nwoke tie nwunye ya ihe. Ma, ọ bụghị naanị ụmụ nwoke na-eti ụmụ nwaanyị ihe. Dị ka ihe atụ, na Kanada, ihe dị ka ụmụ nwoke atọ n’ime ụmụ nwoke iri ọ bụla ka ndị nwunye ha na-eti ihe.

      GỊNỊ KA NDỊ NA-EKWEGHỊ NÁ MMEZU AMỤMA A NA-EKWUKARỊ? Ọ bụghị taa ka nwoke iti nwunye ya ihe ma ọ bụ nwaanyị iti di ya ihe malitere. Ọ bụ naanị na ndị mmadụ amatakwuola banyere nsogbu a n’oge a karịa ka ọ dị n’oge ndị gara aga.

      IHE AHỤ HA KWURU Ò RIJURU AFỌ? N’eziokwu, ndị mmadụ amatakwuola banyere nsogbu a n’oge ndị a. Ma, ndị mmadụ ịmatakwu nsogbu a ò meela ka ọ kwụsịlata? Mbanụ! Ndị na-ahụghị ndị ezinụlọ ha n’anya na-ebukwu ibu.

      GỊNỊ KA I CHERE? Ihe e kwuru na 2 Timoti 3:1-3 ọ̀ na-emezu? Ọ́ bụghị eziokwu na e nwere ọtụtụ ndị na-ahụghị ndị ezinụlọ ha n’anya?

      Amụma nke ise i ji anya gị na-ahụ ka ọ na-emezu metụtara ụwa anyị a. Ka anyị tụlee ihe Baịbụl kwuru banyere ya.

      [Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]

      “E kwuola na mmadụ iti di ya ma ọ bụ nwunye ya ihe bụ otu n’ime ihe ọjọọ ndị mmadụ kacha ezo ezo. Tupu nwaanyị agaa kọọrọ ndị uwe ojii na di ya na-eti ya ihe, ọ ga-abụ na di ya etielaya ihe ihe dị ka ugboro iri atọ na ise.”—OTU NWAANYỊ BỤ́ ỌNỤ NA-EKWUCHITERE ÒTÙ NỌ NA BRITEN NKE NA-ENYERE NDỊ DI HA MA Ọ BỤ NWUNYE HA NA-ETI IHE AKA.

  • Amụma nke 5. Ibibi Ụwa
    Ụlọ Nche—2011 | Mee 1
    • Amụma nke 5. Ibibi Ụwa

      “[Chineke ga-ebibi] ndị na-ebibi ụwa.” —MKPUGHE 11:18.

      ● Maazị Pirri na-akụ ngwọ n’obodo Kpor, nke dị na Naịjirịa. Mmanụ a na-egwute n’ala, bụ́ nke na-akwafusị n’obodo ndị dị n’akụkụ Osimiri Naịja, egbusịala osisi ngwọ ọ na-akụ. O kwuru, sị: “Ọ na-egbu azụ ndị dị na mmiri anyị, na-emebi akpụkpọ ahụ́ anyị, na-emebisị iyi anyị. O nwekwaghị ihe m ji akpata ihe mụ na ezinụlọ m ga-eri.”

      GỊNỊ KA IHE NDỊ NA-EME EME NA-EGOSI? Ụfọdụ ndị ọkachamara kwuru na kwa afọ, a na-awụba ihe ndị e kpofuru ekpofu ruru ihe dị ka nde tọn asaa n’oké osimiri ndị dị n’ụwa. E kwuru na ọkara ihe ndị ahụ a na-awụba n’oké osimiri bụ plastik. Ha ga na-esegharị n’elu mmiri ruo ọtụtụ narị afọ tupu ha agbazee. E wezụga otú a e si na-ebibi ụwa, ndị mmadụ na-egbukpọsị osisi ndị dị n’ụwa ma na-ewekọrọsị akụ̀ ndị dị n’ime ala n’ike n’ike. Nchọpụta ndị e mere na-egosi na ọ ga-ewe ụwa otu afọ na ọnwa ise tupu ya enweghachi ihe ụmụ mmadụ wepụrụ na ya n’otu afọ. Akwụkwọ akụkọ ndị Ọstrelia bụ́ Sydney Morning Herald kọrọ, sị: “Ọ bụrụ na ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ ana-amụba otú a o si na-amụba, a na-ewekọrọsịkwa ihe ndị dị n’ụwa otú e si na-eme ugbu a, anyị ga-achọkwu ụwa ọzọ tupu afọ 2035.”

      GỊNỊ KA NDỊ NA-EKWEGHỊ NÁ MMEZU AMỤMA A NA-EKWUKARỊ? Ụmụ mmadụ nwere ike ichepụta ihe ha ga-eme banyere nsogbu a. Anyị nwere ike idozi nsogbu ndị ahụ ma mee ka ụwa anyị dịghachi mma.

      IHE AHỤ HA KWURU Ò RIJURU AFỌ? Ọtụtụ ndị mmadụ na òtù dị iche iche ekwusiela okwu ike ka e mee ihe banyere otú e si emebisị ụwa. Ma, a ka na-ebibi ụwa n’ike n’ike.

      GỊNỊ KA I CHERE? Ọ̀ dị mkpa ka Chineke gbatara anyị ọsọ enyemaka ma kwụsị mbibi a na-ebibi ụwa anyị a, dị ka o kwere ná nkwa na ọ ga-eme?

      E wezụga amụma ise ndị a anyị lebarala anya, Baịbụl bukwara amụma banyere ezigbo ihe ndị ga na-eme n’ụbọchị ikpeazụ. Ka anyị tụlee otu n’ime ha nke bụ́ amụma nke isii.

      [Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

      “Ebe m bi bụbu paradaịs, ma ọ ghọziela ebe e kpofuru ihe na-egbu mmadụ.”—ERIN TAMBER, ONYE BI N’AKỤKỤ OTU OKÉ OSIMIRI DỊ N’AMERỊKA. O KWURU NKE A N’IHI NSOGBU E NWERE MGBE MMANỤ A NA-EGWUPỤTA N’ALA WỤBARA N’ỌWARA OKÉ OSIMIRI MEKSIKO N’AFỌ 2010.

      [Igbe dị na peeji nke 8]

      Ọ̀ Bụ Chineke Na-akpata Ha?

      Ebe ọ bụ na Baịbụl buru amụma na ihe ọjọọ ndị na-eme taa ga-eme, ọ̀ pụtara na ọ bụ Chineke na-akpata ha? Ọ̀ bụ ya na-eme ka anyị na-ata ahụhụ? Ị ga-ahụ ebe a zara ajụjụ ndị a nke ọma n’isi nke 11 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

      [Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 8]

      U.S. Coast Guard photo

  • Amụma nke 6. Ikwusa Ozi Ọma N’ụwa Niile
    Ụlọ Nche—2011 | Mee 1
    • Amụma nke 6. Ikwusa Ozi Ọma N’ụwa Niile

      “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi.”—MATIU 24:14.

      ● Vaiatea bi n’otu agwaetiti dị n’ime ime obodo Tuamotu, nke dị n’Oké Osimiri Pasifik. Ọ bụ ezie na Tuamotu nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ agwaetiti iri asatọ ndị dịcha anya n’ibe ha, ndị bi na ha dị naanị ihe dị ka puku mmadụ iri na isii. N’agbanyeghị nke ahụ, Ndịàmà Jehova agaala ebe ahụ zie Vaiatea na ndị agbata obi ya ozi ọma. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Ndịàmà Jehova chọrọ izi mmadụ niile ozi ọma Alaeze Chineke, n’agbanyeghị ebe ha bi.

      GỊNỊ KA IHE NDỊ NA-EME EME NA-EGOSI? A na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ n’ebe niile n’ụwa. Naanị n’afọ 2010, Ndịàmà Jehova ji ihe karịrị otu ijeri awa na narị nde isii kwusaa ozi ọma na narị ala abụọ na iri atọ na isii. Ihe nke a pụtara bụ na otu Onyeàmà ji ihe dị ka nkeji iri atọ kwusaa ozi ọma kwa ụbọchị n’afọ ahụ. N’ime afọ iri gara aga, akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl ha bipụtara ma kesaa karịrị ijeri iri abụọ.

      GỊNỊ KA NDỊ NA-EKWEGHỊ NÁ MMEZU AMỤMA A NA-EKWUKARỊ? O ruola ọtụtụ puku afọ e kwusawara ozi ọma.

      IHE AHỤ HA KWURU Ò RIJURU AFỌ? N’eziokwu, e nweela ọtụtụ ndị kwusarala ozi ọma. Ma, ọtụtụ n’ime ha kwusara ya obere oge, ebe ndị ha kwusara ya ebughịkwa ibu. Ma, Ndịàmà Jehova haziri ozi ọma ha na-ekwusa ahazi, nke mere ha ji ekwusara ya ọtụtụ narị nde mmadụ n’ebe niile n’ụwa. N’agbanyeghị na ụfọdụ ndị ọchịchị kacha kpaa ike n’ụwa, bụ́ ndị obi tara mmiri, akpagbuola Ndịàmà mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ, ha ka na-ekwusa ozi ọma a.a (Mak 13:13) Ihe ọzọ bụ na a naghị akwụ Ndịàmà Jehova ụgwọ maka ozi ọma ha na-ekwusa. Ha na-eji oge ha aga ekwusara ndị mmadụ ozi ọma, ha anaghịkwa ere akwụkwọ ha ere. Ọ bụ onyinye si ndị mmadụ n’obi ka ha ji akwado ọrụ ha.

      GỊNỊ KA I CHERE? À na-ekwusa ‘ozi ọma alaeze ahụ’ n’ụwa niile? Ọ̀ ga-abụ na mmezu amụma a na-egosi anyị na ihe ga-adị mma n’oge na-adịghị anya n’ọdịnihu?

      [Ihe e dere n’ala ala peeji]

      a Ị chọọ ịmatakwu banyere nke a, kirie vidio atọ bụ́ “Faithful Under Trials,” “Purple Triangles,” na “Jehovah’s Witnesses Stand Firm Against Nazi Assault.” Ọ bụ Ndịàmà Jehova na-ekesa ha.

      [Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

      “Anyị ga-eji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ, si n’ụzọ ọ bụla anyị nwere ike na-ekwusara ya ndị mmadụ, ruo mgbe Jehova ga-asị na o zuola.”—2010 YEARBOOK OF JEHOVAH’S WITNESSES.

  • Ihe Ga-adị mma N’oge Na-adịghị Anya!
    Ụlọ Nche—2011 | Mee 1
    • Ihe Ga-adị mma N’oge Na-adịghị Anya!

      “N’oge na-adịghị anya, onye ajọomume agakwaghị anọ . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”—ABỤ ỌMA 37:10, 11.

      Ị̀ GA-ACHỌ ịhụ mgbe amụma a ga-emezu? O doro anya na ị ga-achọ. E nwere ezigbo ihe ndị mere ị ga-eji kwere na ọ ga-emezu n’oge na-adịghị anya.

      Isiokwu ndị bú nke a ụzọ lebara anya n’ụfọdụ amụma Baịbụl ndị na-egosi nnọọ na anyị bi “n’oge ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1-5) Chineke ji mmụọ ya mee ka ụfọdụ ndị so dee Baịbụl buo ihe ndị ahụ n’amụma ka anyị wee nwee ike inwe olileanya. (Ndị Rom 15:4) Mmezu amụma ndị ahụ na-egosi na nsogbu ndị anyị na-enwe ugbu a ga-akwụsị n’oge na-adịghị anya.

      Gịnịzi ga-eme ma oge ikpeazụ a gwụ? Alaeze Chineke ga-amalite ịchị mmadụ niile. (Matiu 6:9) Ka anyị tụlee otú Baịbụl kwuru ụwa ga-adị n’oge ahụ:

      ● Agụụ agaghị adịkwa. “Ọka ga-ejupụta n’elu ụwa; ọ ga-ejubiga ókè n’elu ugwu dị iche iche.”—Abụ Ọma 72:16.

      ● Ọrịa agaghị adịkwa. “Ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’”—Aịzaya 33:24.

      ● A ga-eme ka ụwa dị ọhụrụ. “Ala ịkpa na ógbè mmiri na-adịghị ga-enwe aṅụrị, mbara ọzara ga-aṅụrị ọṅụ, waakwa okooko dị ka okooko safrọn.”—Aịzaya 35:1.

      Ihe ndị a bụ naanị amụma Baịbụl ole na ole na-agba ume bụ́ ndị ga-emezu n’oge na-adịghị anya. Ọ́ gaghị adị mma ka ị gwa Ndịàmà Jehova ka ha kọọrọ gị ihe mere obi ji sie ha ike na ihe ga-adị mma n’oge na-adịghị anya?

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya