Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ndị Niile Na-asị na Ha Bụ Ndị Kraịst Hà Bụ Ndị Kraịst n’Eziokwu?
    Ụlọ Nche—2012 | Mach 1
    • Ndị Niile Na-asị na Ha Bụ Ndị Kraịst Hà Bụ Ndị Kraịst n’Eziokwu?

      NDỊ KRAỊST e nwere n’ụwa hà dị ole? N’afọ 2010, akwụkwọ bụ́ Atlas of Global Christianity kwuru na ọ fọrọ obere ka ha ruo ijeri mmadụ abụọ na nde atọ n’ụwa niile. Otu akwụkwọ ahụ kwukwara na ndị na-asị na ha bụ Ndị Kraịst nọ n’ihe karịrị puku chọọchị iri anọ na otu. Chọọchị nke ọ bụla nwere iwu nke ya, nke ọ bụla n’ime ha na-akụzikwa ihe dị iche n’ihe chọọchị ndị ọzọ na-akụzi. Ụfọdụ ndị amaghịzi chọọchị nke ha ga-eso eso n’ihi imirikiti chọọchị e nwere n’ụwa niile. Nke a emeekwala ka ike ịga chọọchị gwụ ụfọdụ ndị. Ha nwere ike ịna-ajụ, sị, ‘Ndị niile na-asị na ha bụ Ndị Kraịst hà bụ Ndị Kraịst n’eziokwu?’

      Ka anyị leba anya n’ihe atụ ga-enyere anyị aka ịghọta okwu a nke ọma. Ọ bụrụ na mmadụ na-aga mba ọzọ, ya ruo ebe e si abanye ná mba ọ na-aga, ọ na-agwa ndị na-arụ ọrụ ebe ahụ onye ọ bụ na mba o si. Ma, ọ ga-egosikwa ha akwụkwọ ga-egosi na ihe ahụ o kwuru bụ eziokwu. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị ezigbo Ndị Kraịst. Ha ekwesịghị ịna-ekwu naanị n’ọnụ na ha bụ Ndị Kraịst. Ha kwesịrị inwe ihe ndị ọzọ ga-egosi na ha bụ ezigbo Ndị Kraịst. Gịnị bụ ihe ndị ahụ?

      Ọ bụ n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ itoolu na iri asaa gara aga ka a malitere ịkpọ ndị na-efe Chineke “Ndị Kraịst.” Luk, bụ́ onye so dee Baịbụl, kwuru, sị: “Ọ bụkwa n’Antiọk ka e bu ụzọ site ná nduzi Chineke gụọ ndị na-eso ụzọ Jizọs aha bụ́ Ndị Kraịst.” (Ọrụ 11:26) Ị̀ hụrụ na ọ bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst ka a kpọrọ Ndị Kraịst? Gịnị ka e ji ama onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst? Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru, sị: “Mmadụ ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs pụtara na onye ahụ ji obi ya niile na-eso Jizọs . . . ná ndụ ya niile.” N’ihi ya, ezigbo Onye Kraịst bụ onye ji obi ya niile na-eme ihe niile Jizọs kụziri.

      N’ime ndị niile na-asị na ha bụ Ndị Kraịst taa, è nwere ndị ji obi ha niile na-eme ihe niile Jizọs kụziri? Gịnị ka Jizọs kwuru e ji amata ndị bụ́ ezigbo ndị na-eso ụzọ ya? Anyị ga-achọ ka i leba anya n’otú Baịbụl si zaa ajụjụ ndị a. N’isiokwu ndị na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’ihe ise Jizọs kwuru e ji amata ndị bụ́ ezigbo ndị na-eso ụzọ ya. Anyị ga-achọpụta ma Ndị Kraịst oge mbụ hà mere ihe ndị ahụ Jizọs kwuru e ji amata ezigbo Ndị Kraịst. Anyị ga-achọpụtakwa ndị na-eme ihe ahụ Jizọs kwuru n’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ ndị na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst taa.

  • ‘Nọgidenụ n’Okwu M’
    Ụlọ Nche—2012 | Mach 1
    • ‘Nọgidenụ n’Okwu M’

      “Ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m, unu bụ n’ezie ndị na-eso ụzọ m, unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”—JỌN 8:31, 32.

      Gịnị Ka Ihe A Jizọs Kwuru Pụtara? “Okwu” Jizọs na-ekwu okwu ya n’ebe a bụ ihe ndị ọ kụziiri ndị mmadụ. Ihe ndị ahụ si n’aka Chineke. Jizọs sịrị: “Nna m bụ́ onye zitere m nyere m iwu ihe m ga-akọ na ihe m ga-ekwu.” (Jọn 12:49) Jizọs gwara Nna ya nke eluigwe, bụ́ Jehova Chineke, n’ekpere, sị: “Okwu gị bụ eziokwu.” Jizọs na-ejikarị ihe dị n’Okwu Chineke akwado ihe ọ na-akụziri ndị mmadụ. (Jọn 17:17; Matiu 4:4, 7, 10) N’ihi ya, ezigbo Ndị Kraịst ‘na-anọgide n’okwu Jizọs,’ ya bụ, ha kwetara na Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, bụ “eziokwu,” bụrụkwa ebe ihe niile ha na-akụzi na ihe niile ha na-eme ga na-esi.

      Ndị Kraịst Oge Mbụ Hà Kwetara Ihe ahụ Jizọs Kwuru? Pọl onyeozi kwetara na Okwu Chineke bụ eziokwu otú ahụ Jizọs kwuru. O dere, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru.” (2 Timoti 3:16) Ụmụ nwoke ndị a họpụtara ka ha na-akụziri Ndị Kraịst ibe ha ihe gbara mbọ ‘jidesie okwu Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi ike.’ (Taịtọs 1:7, 9) A gwara Ndị Kraịst oge gboo ka ha jụ “nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu, dị ka ọdịnala mmadụ si dị, dị ka ihe ndị mbụ nke ụwa si dị.”—Ndị Kọlọsi 2:8.

      N’oge Anyị A, Ole Ndị Na-eme Ihe ahụ Jizọs Kwuru? Akwụkwọ bụ́ Katikizim nke Okwukwe Nzukọ Katọlik kwuru banyere ‘nkụzi ọdịbendị nke nzukọ Katọlik,’ sị: ‘Ọ bụ Okwu nke Chukwu a na-edeghị n’ime Akwụkwọ Nsọ, nke si n’aka fere aka wee ruo anyị aka.’ Akwụkwọ ahụ kwukwara na ‘ọ bụụrụ ndị Katọlik iwu ikwere ihe nkụzi ọdịbendị kụziiri ha.’ Otu isiokwu gbara na magazin a na-akpọ Maclean’s kọrọ ihe otu pastọ bi na Toronto, nke dị na Kanada, kwuru. Pastọ ahụ sịrị: “Gịnị mere anyị ga-eji kwe ka ‘ihe e kwuru’ puku afọ abụọ gara aga na-atụrụ anyị ihe anyị ga-eme n’oge a? Anyịnwa bụ́ ndị oge a ekwesịghị ikwe ka ihe ndị Jizọs kụziri na ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ na-adọghachi anyị azụ n’ihi na anyị makwanụ ihe.”

      Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia kwuru banyere Ndịàmà Jehova, sị: “Ọ bụ naanị na Baịbụl ka ihe niile ha na-eme na ihe niile ha kweere si.” N’oge na-adịbeghị anya, mgbe otu nwaanyị bụ́ Onyeàmà Jehova chọrọ izi otu nwoke bi na Kanada ozi ọma, tupu ya agwa nwoke ahụ na ya bụ Onyeàmà Jehova, nwoke ahụ tụrụ aka na Baịbụl nwaanyị ahụ ji, sị: “Ama m onye ị bụ. I ji ihe e ji mara unu.”

  • “Ha Abụghị nke Ụwa”
    Ụlọ Nche—2012 | Mach 1
    • “Ha Abụghị nke Ụwa”

      “Ụwa kpọrọ ha asị, n’ihi na ha abụghị nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị nke ụwa.”—JỌN 17:14.

      Gịnị Ka Ihe A Jizọs Kwuru Pụtara? Jizọs etinyeghị aka ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa n’esemokwu ndị mmadụ na-ese n’oge ọ nọ n’ụwa n’ihi na ọ bụghị nke ụwa. O kwuru, sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara alụ ọgụ ka a ghara inyefe m n’aka ndị Juu. Otú ọ dị, alaeze m esighị n’ebe a.” (Jọn 18:36) Ọ gwakwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara ịna-eme omume rụrụ arụ ma na-ekwu okwu ndị Baịbụl kwuru na ha adịghị mma.—Matiu 20:25-27.

      Ndị Kraịst Oge Mbụ Hà Mere Ka Jizọs? Otu nwoke nke na-ede ihe gbasara okpukpe, nke aha ya bụ Jonathan Dymond, kwuru na “ihe ọ sọkwara ndị mmadụ mee [Ndị Kraịst oge gboo], ma à kparịrị ha, ma à tụrụ ha mkpọrọ ma ọ bụ gbuo ha, ha ekweghị aga [agha].” Ọ na-akara ha mma ịta ahụhụ kama ha ga-aga agha. Omume ọma ha mekwara ka ha dị iche ná ndị ọzọ. A gwara Ndị Kraịst, sị: “Ebe ọ bụ na unu esoghị ha na-ebi ndụ ịla n’iyi a, ọ na-eju ha anya, ha ewee na-ekwujọ unu.” (1 Pita 4:4) Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme, nke aha ya bụ Will Durant, dere na otú Ndị Kraịst oge gboo si “na-eme omume ọma nọ na-agbawa ndị na-ekpere arụsị, bụ́ ndị ihe ọjọọ na-atọ ụtọ, obi.”

      N’oge Anyị A, Ole Ndị Na-eme Ihe ahụ Jizọs Kwuru? Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia kwuru banyere Ndị Kraịst na-ekweghị aga agha, sị: “Mmadụ ịjụ ịga agha n’ihi na akọnuche ya anabataghị ya bụ ihe ọjọọ.” Otu akwụkwọ nke kọrọ banyere agha a lụrụ na Rụwanda n’afọ 1994, bụ́ mgbe otu agbụrụ chọrọ igbukpọ agbụrụ ibe ya, kwuru na chọọchị niile so lụọ agha ahụ “ma e wezụga Ndịàmà Jehova.”

      Mgbe otu onye nkụzi ụlọ akwụkwọ sekọndrị na-ekwu banyere otú ndị ọchịchị Nazi si chọọ igbuchapụ ndị Juu na ndị okpukpe ụfọdụ n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, ọ sịrị na “ọ dịghị òtù ọ bụla kwuru na ụgha niile a ghara na arụrụala niile a rụrụ mgbe ahụ adịghị mma.” Ma mgbe onye nkụzi a kpọtụchaara otu ụlọ ọrụ dị n’Amerịka, bụ́ ebe e debere ihe ndị e ji echeta ihe mere n’oge ọchịchị ndị Nazi chọrọ igbuchapụ ndị Juu na ndị okpukpe ụfọdụ, ọ chọpụtara na n’agbanyeghị otú e si chie Ndịàmà Jehova ọnụ n’ala n’oge ahụ, ha akwadoghị ihe ndị ọchịchị Nazi na-eme. O deziri, sị: “Amatala m na o nwere ndị kwuru na ihe e mere n’oge ahụ adịghị mma.”

      Oleekwanụ otú ezigbo Ndị Kraịst kwesịrị isi na-ele omume rụrụ arụ anya? Otu magazin a na-akpọ U.S. Catholic kwuru, sị: “Ọtụtụ ụmụ okoro na agbọghọ bụ́ ndị Katọlik ekweghị n’ihe chọọchị Katọlik kwuru banyere ịkwa iko na nwoke na nwaanyị ibi mgbe ha na-alụbeghị.” Magazin ahụ kwukwara na otu onye dikin na chọọchị ahụ kwuru, sị: “E kee ndị na-abịa ịgba akwụkwọ na chọọchị Katọlik ụzọ iri, ihe karịrị ụzọ ise n’ime ha ebirila ebiri tupu ha abịa ịgba akwụkwọ.” Ma, akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica kwuru na Ndịàmà Jehova “anaghị etinye aka n’omume rụrụ arụ.”

  • ‘Nweenụ Ịhụnanya n’Etiti Onwe Unu’
    Ụlọ Nche—2012 | Mach 1
    • ‘Nweenụ Ịhụnanya n’Etiti Onwe Unu’

      “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—JỌN 13:34, 35.

      Gịnị Ka Ihe A Jizọs Kwuru Pụtara? Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ahụ ibe ha n’anya otú yanwa si hụ ha n’anya. Olee otú Jizọs hụruru ndị mmadụ n’anya? N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ndị Izrel kpọrọ ndị mba ọzọ asị, o nweghịkwa ihe ha ji ụmụ nwaanyị kpọrọ. Ma, Jizọs emeghị otú ahụ. (Jọn 4:7-10) Otú Jizọs si hụ ndị mmadụ n’anya mere ka o jiri oge ya na ike ya nyere ha aka. Ọ na-eme nke a mgbe niile, ma mgbe ike gwụchara ya. (Mak 6:30-34) Kraịst mekwara ihe kacha gosi na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya. Jizọs kwuru, sị: “Abụ m onye ọzụzụ atụrụ ọma; onye ọzụzụ atụrụ ọma na-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi atụrụ ya.”—Jọn 10:11.

      Ndị Kraịst Oge Mbụ Hà Mere Ihe ahụ Jizọs Kwuru? Ndị Kraịst oge mbụ na-akpọ ibe ha “nwanna nwoke” ma ọ bụ “nwanna nwaanyị.” (Faịlimọn 1, 2) Ha nabatara ndị si ná mba ọ bụla n’ọgbakọ Ndị Kraịst, n’ihi na ha kweere na “ọ dịghị ihe dị iche n’etiti onye Juu na onye Grik, n’ihi na e nwere otu Onyenwe mmadụ niile.” (Ndị Rom 10:11, 12) Mgbe e mechara ememme Pentikọst nke afọ 33 Oge Anyị, ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na Jeruselem ‘rere ihe onwunwe ha na akụ̀ ha ma kesaara mmadụ niile ihe ha retara n’ihe ndị a, dị nnọọ ka mkpa onye ọ bụla si dị.’ Gịnị mere ha ji mee otú ahụ? Ọ bụ ka ha nyere ndị e mere baptizim ọhụrụ aka ka ha nwee ike ịnọtụkwu na Jeruselem “na-ege ntị n’ozizi ndịozi.” (Ọrụ 2:41-45) Gịnị mere ha ji nyere ha aka? Mgbe ọ na-eruchabeghị narị afọ abụọ ndịozi Jizọs nwụchara, Tertullian dere ihe ndị mmadụ nọ na-ekwu banyere Ndị Kraịst oge ahụ, sị: “Ha hụrụ nnọọ ibe ha n’anya . . . ha dịkwa njikere ịnwụchitere ibe ha ọnwụ.”

      N’oge Anyị A, Ole Ndị Na-eme Ihe ahụ Jizọs Kwuru? Akwụkwọ bụ́ The History of the Decline and Fall of the Roman Empire (1837) kwuru na kemgbe ọtụtụ narị afọ, otú ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst “si mesie ibe ha ike karịdịrị otú ndị na-abụghị Ndị Kraịst sirila mesie ha ike.” Otu nchọpụta e mere ná mba Amerịka gosiri na ọ bụ ndị sịrị na ha nwere okpukpe ha na-ekpe, karịchaa ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst, na-akpọ ndị agbụrụ ọzọ asị. Ndị nọ n’otu chọọchị n’otu mba anaghị enwe ihe jikọrọ ha na ndị chọọchị ha nọ ná mba ọzọ. Nke a na-eme ka ọ ghara imetụ ha n’obi inyere ndị chọọchị ha nọ ná mba ọzọ aka ma ha nwee mkpa.

      N’afọ 2004, ajọ ifufe kpara mkpamkpa n’obodo Flọrịda. Onyeisi oche kọmitii hụrụ maka ịgbatara ndị ọdachi ahụ dakwasịrị ọsọ enyemaka gara n’ebe njinji ahụ jiri ka ọ mara ma è nyekwara ndị ọdachi ahụ dakwasịrị ihe ndị e wetara. O kwuru na Ndịàmà Jehova haziri otú ha si na-ekesara ndị ọdachi ahụ dakwasịrị ihe ahazi karịa ndị ọ bụla ọzọ, ọ gwakwara Ndịàmà Jehova na ọ bụrụ na e nwere ihe ọzọ ha chọrọ, na ya ga-enye ha ya. N’afọ 1997, Ndịàmà Jehova nọ na Yurop gbatakwaara ụmụnna ha na ndị ọzọ nọ na Kọngo Kinshasa ọsọ enyemaka. Ha bugaara ha ọgwụ, nri, na uwe. Ihe niile ha bugaara ha karịrị otu narị nde naịra.

  • ‘Emewo M Ka Ha Mara Aha Gị’
    Ụlọ Nche—2012 | Mach 1
    • ‘Emewo M Ka Ha Mara Aha Gị’

      “Emewo m ka aha gị pụta ìhè nye ndị i si n’ụwa nye m. . . . Emewokwa m ka ha mara aha gị, m ga-emekwa ka a mara ya.”—JỌN 17:6, 26.

      Gịnị Ka Ihe A Jizọs Kwuru Pụtara? Jizọs mere ka ndị mmadụ mara aha Chineke mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma. Ọ ga-abụ na Jizọs kpọrọ aha Chineke n’oge ndị ọ na-agụpụta ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ. (Luk 4:16-21) N’ekpere ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya, ọ gwara ha ka ha na-arịọ Chineke, sị: “Nna, ka e doo aha gị nsọ.”—Luk 11:2.

      Ndị Kraịst Oge Mbụ Hà Mere Ihe ahụ Jizọs Mere? Pita onyeozi gwara ndị okenye nọ na Jeruselem na Chineke si n’etiti ndị mba ọzọ “wepụtara aha ya otu ndị.” (Ọrụ 15:14) Ndịozi Jizọs na ndị ọzọ gwara ndị mmadụ mgbe ha na-ekwusa ozi ọma na ọ bụ “onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.” (Ọrụ 2:21; Ndị Rom 10:13) Ha dekwara aha Chineke n’akwụkwọ Baịbụl ndị ha dere. Otu akwụkwọ iwu ndị Juu, nke e dechara n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ asaa gara aga, kọrọ otú ndị na-emegide Ndị Kraịst si kpọọ akwụkwọ Ndị Kraịst oge ochie dere ọkụ. Akwụkwọ ahụ sịrị: ‘Ha anaghị ewepụta akwụkwọ Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma dere na akwụkwọ ndị e chere na ha bụ nke Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu ka ọkụ ghara ịgba ha. Kama, ha na-ahapụ ha ka ọkụ gbaa ha n’ebe ha dị, gbaakwa Aha Chineke e dere na ha.’

      N’oge Anyị A, Ole Ndị Na-eme Ihe ahụ Jizọs Mere? Ihe e dere ná mmalite Baịbụl bụ́ Revised Standard Version sịrị: “Ebe ọ bụ na e nwere naanị otu Chineke, ịkpọ aha ya ga-eme ka o yie ka à ga-asị na e nwere chi ndị ọzọ a chọrọ igosi na ha na Chineke abụghị otu. N’ihi ya, ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu kwụsịrị ịkpọ aha Chineke tupu oge Ndị Kraịst, Chọọchị Ndị Kraịst niile e nwere n’ụwa ekwesịghịkwa ịkpọ aha ahụ.” Ọ bụ ya mere e ji were okwu bụ́ “ONYENWE ANYỊ” dochie aha Chineke na Baịbụl ahụ. N’oge na-adịchabeghị anya, ndị isi chọọchị Katọlik si na Vatịkan gwa ndị bishọp Katọlik, sị: “E kwesịghị ịna-akpọ tetragramatọn ahụ, ya bụ, YHWHa nke bụ́ aha Chineke, mgbe a na-abụ abụ ma ọ bụ mgbe a na-ekpe ekpere.”

      Ole ndị taa na-akpọ aha Chineke ma na-akụziri ya ndị ọzọ? E nwere otu nwoke aha ya bụ Sergey bụ́ onye Kegịstan. Mgbe ọ dị afọ iri na ise, o lere otu fim nke kwuru na aha Chineke bụ Jehova. Ọ nụghịzi aha ahụ ọzọ ruo ihe dị ka afọ iri. Sergey mechara kwaga Amerịka. Otu ụbọchị, Ndịàmà Jehova abụọ bịara n’ụlọ ya ma gosi ya aha Chineke na Baịbụl. Obi tọrọ Sergey ụtọ na e nwere ndị na-akpọ aha ahụ bụ́ Jehova ma na-akụziri ya ndị ọzọ. Ọ dị mma ịmara ihe akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ Webster’s Third New International Dictionary kwuru mgbe ọ na-akọwa aha ahụ bụ́ “Jehova Chineke.” O kwuru na “ọ bụ chi Ndịàmà Jehova weere ka chi kachanụ, bụrụkwa naanị chi ha na-efe.”

      [Ihe e dere n’ala ala peeji]

      a Otú e si asụgharịkarị aha Chineke n’asụsụ Igbo bụ “Jehova.”

  • ‘A Ga-ekwusa Ozi Ọma Alaeze’
    Ụlọ Nche—2012 | Mach 1
    • ‘A Ga-ekwusa Ozi Ọma Alaeze’

      “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—MATIU 24:14.

      Gịnị Ka Ihe A Jizọs Kwuru Pụtara? Luk, bụ́ onye so dee Baịbụl, kọrọ na Jizọs “na-aga site n’obodo ukwu ruo n’obodo ukwu, sitekwa n’obodo nta ruo n’obodo nta, na-ekwusa ma na-ezisa ozi ọma alaeze Chineke.” (Luk 8:1) Jizọs kwuru, sị: “Aghaghịkwa m izisara obodo ndị ọzọ ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.” (Luk 4:43) O zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa kwusaa ozi ọma n’obodo ukwu nakwa n’obodo nta dị iche iche. O mechakwara nye ha iwu, sị: ‘Unu ga-abụkwa ndị àmà m ruo n’ebe kasị anya n’ụwa.’—Ọrụ 1:8; Luk 10:1.

      Ndị Kraịst Oge Mbụ Hà Mere Ihe ahụ Jizọs Kwuru? Ndị na-eso ụzọ Jizọs mere ihe Jizọs gwara ha n’egbughị oge. “Kwa ụbọchị, n’ụlọ nsọ na site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ha nọ na-akụzi ihe n’akwụsịghị akwụsị, na-ezisa ozi ọma banyere Kraịst.” (Ọrụ 5:42) Ndị na-eso ụzọ Jizọs niile kwusara ozi ọma, ha ahapụrụghị ya ụfọdụ ndị ka ha kwusawa. Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme, nke aha ya bụ Neander, kwuru na “Celsus, bụ́ onye mbụ dere akwụkwọ iji kwugide Ndị Kraịst, kwara Ndị Kraịst emo maka na ndị na-akpacha ajị anụ, ndị na-edozi akpụkpọ ụkwụ, ndị na-esiji akpụkpọ anụ, ndị itibọrịbọ na ndị ọ na-enweghị ihe ha bụ socha na-ekwusasi ozi ọma ike.” N’akwụkwọ bụ́ The Early Centuries of the Church, otu nwoke aha ya bụ Jean Bernardi, dere banyere Ndị Kraịst, sị: “A gwara [ha] ka ha gaa kwusaara ndị mmadụ ozi ọma n’ebe niile. Ha ga-ekwusa ya n’okporo ụzọ, n’obodo ukwu, n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị, nakwa n’ụlọ ndị mmadụ. Ma ndị mmadụ hà nabatara ha ma hà anabataghị ha. . . . Ha ga-ekwusa ya n’ebe niile n’ụwa.”

      N’oge Anyị A, Ole Ndị Na-eme Ihe ahụ Jizọs Kwuru? Otu ụkọchukwu ndị Anglịkan, nke aha ya bụ David Watson, dere, sị: “Otu ihe mere na ọtụtụ ndị achọghịzi ife Chineke taa bụ na chọọchị ejighị ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ ihe kpọrọ ihe.” Otu nwoke aha ya bụ José Luis Pérez Guadalupe, dere n’akwụkwọ ya bụ́ Why Are the Catholics Leaving? na “chọọchị dị iche iche anaghị aga n’ụlọ ndị mmadụ ekwusa ozi ọma.” Ma, o dere banyere Ndịàmà Jehova, sị: “Ha na-aga n’ụlọ n’ụlọ na-ekwusa ozi ọma, ha na-ahazikwa otú ha si ekwusa ya ahazi.”

      N’akwụkwọ bụ́ Cato Supreme Court Review, 2001-2002, e dere ihe otu nwoke aha ya bụ Jonathan Turley chọpụtara banyere Ndịàmà Jehova. Nwoke ahụ sịrị: “E kwutehaala okwu Ndịàmà Jehova, ihe na-agbatakarị ndị mmadụ n’obi bụ ndị na-aga n’ụlọ ndị mmadụ ekwusa ozi ọma n’oge ndị mmadụ na-achọghị ka ha bịa. Ihe mere Ndịàmà Jehova ji aga ozi ọma n’ụlọ ndị mmadụ abụghị naanị ka ndị mmadụ sowe ha, kama ha weere na iwu ji ha ikwusa ozi ọma.”

      [Igbe dị na peeji nke 9]

      Olee Ndị I Chere Bụ́ Ezigbo Ndị Kraịst?

      Ugbu a anyị lebachara anya n’ihe ndị Akwụkwọ Nsọ kwuru e ji amata ezigbo Ndị Kraịst, olee ndị i chere na ọ bụ ha na-eme ihe ndị ahụ Kraịst kwuru? Ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ puku chọọchị ndị sịrị na ha bụ ezigbo Ndị Kraịst, cheta na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-aba n’alaeze eluigwe, kama ọ bụ onye na-eme uche Nna m nke nọ n’eluigwe ga-aba na ya.” (Matiu 7:21) Ọ bụrụ na mmadụ achọpụta ndị na-eme uche Nna anyị, ya bụ, ndị na-eme ihe ndị ahụ e ji amata ezigbo Ndị Kraịst, ọ bụrụkwa na onye ahụ esoro ha na-efe Chineke, ọ ga-eso ná ndị ga-adị ndụ ebighị ebi mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa ụwa. Ọ ga-adị mma ka ị gwa Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị wetaara gị magazin a, ka ha kọwakwuoro gị ihe Alaeze Chineke bụ na ihe ọ ga-emere ndị mmadụ.—Luk 4:43.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya