-
Ihe Mere O Ji Esiri Ndị Mmadụ Ike Ịhụ Chineke n’AnyaỤlọ Nche—2013 | Nọvemba 1
-
-
ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ MERE O JI ESIRI ỤFỌDỤ NDỊ IKE ỊHỤ CHINEKE N’ANYA?
Ihe Mere O Ji Esiri Ndị Mmadụ Ike Ịhụ Chineke n’Anya
“‘Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’ Ọ bụ ya bụ iwu kasị ukwuu, bụrụkwa nke mbụ.”—Jizọs Kraịst kwuru ihe a n’afọ 33 Oge Ndị Kraịst.a
Ọ na-esiri ụfọdụ ndị ike ịhụ Chineke n’anya. Ihe kpatara ya bụ na ha chere na obi tara Chineke mmiri ma ọ bụ na ha agaghị amatali onye ọ bụ. Lee ihe ụfọdụ ndị kwuru banyere Chineke:
“M na-ekpegara Chineke ekpere ka o nyere m aka, ma m na-echekwa na ọ gaghị anụ ekpere m n’ihi na ọ na-adị m ka ọ̀ nọ n’ebe dị ezigbo anya. M chere na ihe anaghị emetụ Chineke n’obi.”—Marco, Ịtali.
“Ọ bụ eziokwu na m ji obi m niile chọọ ife Chineke, ma ọ dị m ka o nweghị ihe ga-ejikọtali mụ na ya. M chere na ọ bụ Chineke obi ọjọọ nke ọrụ ya bụ naanị ịta ndị mmadụ ahụhụ. Ekwetaghị m na ọ na-eme ebere.”—Rosa, Gụatemala.
“Mgbe m bụ nwata, echere m na ihe Chineke na-achọ bụ ka ọ hụ ihe ọjọọ anyị mere ka ọ taa anyị ahụhụ. M mechara chewe na ya na ụmụ mmadụ enweghị ike ịdị ná mma nakwa na ọ dị ka onyeisi ala nke na-achọghị ịma gbasara ndị ọ na-achị.”—Raymonde, Kanada.
Olee ihe gịnwa chere? Ọ̀ bụ eziokwu na Chineke abụghị onye anyị ga-ahụli n’anya? Ndị Kraịst ajụọla ajụjụ a kemgbe ọtụtụ narị afọ. N’oge ụwa na-emepechabeghị anya, ọtụtụ ndị bi ná mba ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst ekwedịghị ekpegara Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ekpere. Gịnị kpatara ya? Ọ bụ n’ihi na ndị mmadụ na-atụ Chineke ụjọ. Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Will Durant sịrị: “Onye chere na ya bụ onye mmehie ọ̀ ga-anwa anwa kpegara onye a ndị mmadụ na-atụ ụjọ ekpere, bụ́ onye na-achọdịghị ịma gbasara anyị?”
Gịnị mere ndị mmadụ ji ‘tụwa Chineke ụjọ’ ma were ya ka onye “na-achọdịghị ịma gbasara anyị”? Gịnị ka Baịbụl na-akụzi gbasara Chineke? Ọ bụrụ na ị mata nke bụ́ eziokwu gbasara Chineke, ò nwere ike ime ka ị hụ Chineke n’anya?
-
-
Ụgha nke Mbụ: Chineke Enweghị AhaỤlọ Nche—2013 | Nọvemba 1
-
-
ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ MERE O JI ESIRI ỤFỌDỤ NDỊ IKE ỊHỤ CHINEKE N’ANYA?
Ụgha nke Mbụ: Chineke Enweghị Aha
IHE ỌTỤTỤ NDỊ KWEERE
“Anyị ekwekọrịtabeghị ma ànyị kwesịrị ịkpọ Chineke aha, ma ya fọdụzie aha a ga-akpọ ya.”—Ọkachamara aha ya bụ David Cunningham kwuru ihe a n’akwụkwọ bụ́ Theological Studies.
IHE BAỊBỤL KWURU
Chineke sịrị: “Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m.” (Aịzaya 42:8) Aha a bụ́ Jehova bụ okwu Hibru. Ihe ọ pụtara bụ “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.”—Jenesis 2:4.
Jehova chọrọ ka anyị na-akpọ ya aha ya. Baịbụl gwara anyị, sị: “Kpọkuonụ aha ya. Meenụ ka a mara ọrụ ya n’etiti ndị dị iche iche. Kpọsaanụ na aha ya dị elu.”—Aịzaya 12:4.
Jizọs kpọrọ aha Chineke. Mgbe Jizọs na-ekpegara Jehova ekpere, ọ sịrị ya: “Emewokwa m ka ha [ya bụ, ndị na-eso ụzọ Jizọs] mara aha gị, m ga-emekwa ka a mara ya.” Gịnị mere Jizọs ji mee ka ndị na-eso ụzọ ya mara aha Chineke? Jizọs sịrị na ọ bụ “ka ịhụnanya i [ya bụ, Chineke] nwere n’ebe m nọ wee dịrị n’ime ha, mụ na ha adịkwa n’otu.”—Jọn 17:26.
IHE MERE AHA CHINEKE JI DỊ MKPA
Otu ọkà mmụta n’ihe gbasara okpukpe, onye aha ya bụ Walter Lowrie, dere n’akwụkwọ ya, sị: “Onye na-amaghị aha Chineke amaghị onye Chineke bụ. Onye ahụ enweghịkwa ike ịhụ Chineke n’anya ma ọ bụrụ na o weere Chineke ka onye na-adịghị adị.”
Ịhapụ ịkpọ aha Chineke ma ọ bụ iwere aha ọzọ dochie ya yiri ebe mmadụ ji ihe na-achapụ aha ahụ na Baịbụl
Otu nwoke aha ya bụ Victor na-aga chọọchị kwa izu, ma ọ na-adị ya ka ya amatabeghị onye Chineke bụ. Ọ sịrị: “Ma mgbe m mụtara na aha Chineke bụ Jehova, ọ bịara dị m ka m̀ matala Chineke ahụ m nụrụla ọtụtụ ihe gbasara ya. Ọ bịara doo m anya na Chineke dị adị, mụ na ya ghọkwara enyi.”
Ọ bụrụ na anyị na-akpọ aha Jehova, anyị na ya ga-adị ná mma. O nwere nkwa Chineke kwere “ndị na-echebara aha ya echiche.” Ọ sịrị na ya ga-enwere “ha ọmịiko, dị nnọọ ka mmadụ na-enwere nwa ya nke na-ejere ya ozi ọmịiko.” (Malakaị 3:16, 17) Chineke na-agọzikwa ndị na-akpọku aha ya. Baịbụl sịrị: “Onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.”—Ndị Rom 10:13.
-
-
Ụgha nke Abụọ: Ụmụ Mmadụ Agaghị Amatali Onye Chineke BụỤlọ Nche—2013 | Nọvemba 1
-
-
ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ MERE O JI ESIRI ỤFỌDỤ NDỊ IKE ỊHỤ CHINEKE N’ANYA?
Ụgha nke Abụọ: Ụmụ Mmadụ Agaghị Amatali Onye Chineke Bụ
IHE ỌTỤTỤ NDỊ KWEERE
“E nwere okpukpe atọ Ndị Kraịst na-ekpekarị, ya bụ, Chọọchị Katọlik, Chọọchị Ọtọdọks, na nke Protestant. Ha niile na-ekwu na e nwere Pesịn atọ n’otu Chukwu, ya bụ, Chukwu Nna, Chukwu Nwa, na Chukwu Mmụọ Nsọ. Ndị na-akụzi gbasara okpukpe Ndị Kraịst na-ekwu na pesịn atọ a abụghị chi atọ, kama na ha atọ bụ otu.”—The New Encyclopædia Britannica.
IHE BAỊBỤL KWURU
O nweghị mgbe Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs, kwuru na ya na Chineke hà ma ọ bụ na ya na Nna ya bụ otu onye. Kama, ọ sịrị: “M na-alakwuru Nna m, n’ihi na Nna m ka m ukwuu.” (Jọn 14:28) Ọ gwadịrị otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ana m arịgokwuru Nna m na Nna unu nakwa Chineke m na Chineke unu.”—Jọn 20:17.
O nweghị onye dị adị a na-akpọ mmụọ nsọ. Baịbụl kwuru na Ndị Kraịst oge mbụ ‘jupụtara na mmụọ nsọ.’ Jehova kwukwara na ya ‘ga-awụkwasị mmụọ ya n’ahụ́ ụdị anụ ahụ́ ọ bụla.’ (Ọrụ Ndịozi 2:1-4, 17) Ebe ọ bụ na mmụọ nsọ abụghị onye, o nweghị otú ọ ga-esi mezuo Jizọs na Chineke atọ. Mmụọ nsọ bụ ike Chineke nke na-arụ ọrụ mgbe niile.
IHE MERE IHE A BAỊBỤL KWURU JI DỊ MKPA
Karl Rahner na Herbert Vorgrimler, bụ́ ndị ọkachamara n’ihe gbasara okpukpe Katọlik, kwuru gbasara nkụzi Atọ n’Ime Otu, sị: “Mmadụ enweghị ike ịghọta ya ma ọ bụrụ na e kpughereghị ya onye ahụ, e kpughegodịrị ya onye ahụ, ọ gaghị aghọtacha ya.” Ọ bụrụ na ị matalighị onye mmadụ bụ ma ọ bụ ghọta onye ọ bụ, ị̀ ga-ahụli ya n’anya? N’ihi ya, nkụzi Atọ n’Ime Otu emeela ka ndị mmadụ ghara ịmata onye Chineke bụ, meekwa ka ha ghara ịhụ ya n’anya.
Marco, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya n’isiokwu bu nke a ụzọ, chọpụtara na nkụzi Atọ n’Ime Otu mere ka ọ ghara ịmata onye Chineke bụ. Ọ sịrị: “Echere m na Chineke achọghị ka m mata onye ọ bụ. Nke a mekwara ka m chee na Chineke nọ n’ebe dị anya n’ebe m nọ nakwa na ọ dị omimi nke na ya na ụmụ mmadụ agaghị adịli ná mma.” Ma nke bụ́ eziokwu bụ na Chineke ‘anọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.’ (Ọrụ Ndịozi 17:27) Ọ naghị ezoro anyị onwe ya ezo. Ọ chọrọ ka anyị mata onye ọ bụ. Jizọs sịrị: “Anyị na-efe ihe anyị maara.”—Jọn 4:22.
Marco sịrị: “Mgbe m matara na Chineke abụghị Atọ n’Ime Otu, mụ na ya dịwaziri ná mma.” Ọ bụrụ na anyị ewere Jehova ka onye dị adị, kama iwere ya ka onye dị omimi nke anyị na ya na-agaghị adịli ná mma, ọ ga-adịrị anyị ezigbo mfe ịhụ ya n’anya. Baịbụl sịrị: “Onye na-enweghị ịhụnanya amaghị Chineke, n’ihi na Chineke bụ ịhụnanya.”—1 Jọn 4:8.
-
-
Ụgha nke Atọ: Obi Fere Chineke AzụỤlọ Nche—2013 | Nọvemba 1
-
-
ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ MERE O JI ESIRI ỤFỌDỤ NDỊ IKE ỊHỤ CHINEKE N’ANYA?
Ụgha nke Atọ: Obi Fere Chineke Azụ
IHE ỌTỤTỤ NDỊ KWEERE
‘Ozugbo ndị niile mere njọ ogbugbu nwụrụ, mkpụrụ obi ha na-aga na hel, bụ́ ebe ọkụ ga na-agba ha ebeebe.’ (Katkizim Chọọchị Katọlik) Ụfọdụ ndị isi okpukpe kwuru na ọ bụrụ na mmadụ agaa na hel, o nwekwaghị ihe jikọrọ ya na Chineke.
IHE BAỊBỤL KWURU
“Mkpụrụ obi ọ bụla nke na-emehie, ọ bụ ya ga-anwụ.” (Ezikiel 18:4) “Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” (Ekliziastis 9:5) Ọ bụrụ na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ, ya abụrụkwa na o nweghị ihe ọ bụla ọ ma mgbe ọ nwụrụ, olee otú ọ ga-esi mara na ọkụ “na-agba ya ebeebe” ma ọ bụkwanụ ya ana-ewute ya na o nwekwaghị ihe jikọrọ ya na Chineke ruo mgbe ebighị ebi?
Na Baịbụl, ihe okwu Hibru na okwu Grik a sụgharịrị “hel” pụtara bụ ili. Dị ka ihe atụ, mgbe Job nọ na-arịa ajọ ọrịa, o kpere ekpere, sị: “Ọ dị m ka ya bụrụ na ị ga-ezobe m n’ili [“n’ime hel,” Douay-Rheims Version].” (Job 14:13, Holy Bible—Easy-to-Read Version) Job chọrọ ịga zuru ike n’ili, ọ bụghị ịga n’ebe ọ ga-ata ahụhụ ma ọ bụ n’ebe ọ na-enwekwaghị ihe ga-ejikọta ya na Chineke.
IHE MERE IHE A BAỊBỤL KWURU JI DỊ MKPA
Ọ bụrụ na anyị kweere na obi fere Chineke azụ, anyị agaghị achọ ka anyị na ya dịrị ná mma, kama anyị ga na-eze ya eze. Otu nwaanyị bi na Meksiko, onye aha ya bụ Rocío, sịrị: “Malite mgbe m dị obere, a na-akụziri m na Chineke na-ata ndị mmadụ ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ. Ihe a a kụziiri m mere ka ụjọ jide m nke na m chere na Chineke enweghị àgwà ọma ọ bụla. M chere na Chineke bụ onye iwe, bụrụkwa eze onye agwala m.”
Mgbe Rocío ghọtara ihe Baịbụl kwuru gbasara otú Chineke sirila meso ndị ajọ omume ihe na ihe na-eme ndị mmadụ ma ha nwụọ, ọ kwụsịrị iwere Chineke otú o sibu were ya. Rocío sịrị: “Ahụ́ ruru m ala, ya adị m ka e bupụrụ ibu na-anyịgbu m. Obi maliteziri isi m ike na Chineke chọrọ ka ihe dịrị anyị ná mma, na ọ hụrụ anyị n’anya, nakwa na m nwere ike ịhụ ya n’anya. Chineke dị ka nna nke se ụmụ ya n’aka, nke chọkwara ka ihe gaziere ha.”—Aịzaya 41:13.
Ọtụtụ ndị agbalịala ka ha na-eme ezi omume maka na ha na-atụ ụjọ ịga ọkụ ala mmụọ. Ma, Chineke achọghị ka ị na-efe ya maka na ị na-atụ ya ụjọ. Kama nke ahụ, ihe Jizọs kwuru bụ: “Hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Mak 12:29, 30) Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na anyị aghọta na Chineke anaghị ekpe ikpe na-ezighị ezi, obi ga-esi anyị ike na ihe ọ ga-eme n’ọdịnihu ziri ezi. Obi ga-esikwa anyị ike ikwu ihe enyi Job, bụ́ Elaịhu, kwuru. Ọ sịrị: “Ya bụrụ Chineke ihe arụ ime ihe ọjọọ, ya bụrụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ihe arụ ime ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.”—Job 34:10.
-
-
Eziokwu Ga-eme Ka I Nwere Onwe GịỤlọ Nche—2013 | Nọvemba 1
-
-
ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ MERE O JI ESIRI ỤFỌDỤ NDỊ IKE ỊHỤ CHINEKE N’ANYA?
Eziokwu Ga-eme Ka I Nwere Onwe Gị
Otu ụbọchị, mgbe Jizọs nọ na Jeruselem, ọ kụziiri ndị mmadụ banyere Nna ya, bụ́ Jehova, ma mee ka ha mata na ihe ndị isi okpukpe e nwere n’oge ahụ na-akụzi bụ ụgha. (Jọn 8:12-30) Ihe Jizọs kwuru n’ụbọchị ahụ na-akụziri anyị otú anyị ga-esi amata ma ihe ọtụtụ ndị kweere banyere Chineke n’oge anyị a hà bụ eziokwu. Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m, unu bụ n’ezie ndị na-eso ụzọ m, unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”—Jọn 8:31, 32.
Ọ bụ ihe a Jizọs kwuru, ya bụ, ‘nọgide n’okwu m’ ga-enyere anyị aka ịmata ma ihe okpukpe dị iche iche na-akụzi hà bụ “eziokwu.” Mgbe ọ bụla ị nụrụ ihe ndị mmadụ kwuru gbasara Chineke, jụọ onwe gị, sị: ‘Ihe a ha kwuru ọ̀ dabara n’ihe Jizọs kwuru na ihe ndị ọzọ Akwụkwọ Nsọ kwuru?’ Gbalịa ka ị na-eme ihe ndị Beria mere mgbe Pọl onyeozi kụziiri ha ihe. Baịbụl sịrị na ha ‘nyochara Akwụkwọ Nsọ nke ọma kwa ụbọchị iji mara ma ihe ndị a [ya bụ, ihe ndị a na-akụziri ha] hà dị otú ahụ.’—Ọrụ Ndịozi 17:11.
Marco, Rosa, na Raymonde, bụ́ ndị e kwuru okwu ha n’isiokwu nke mbụ n’Ụlọ Nche a, gụrụ Akwụkwọ Nsọ nke ọma ka ha mata ma ihe ndị ha kweere hà bụkwa eziokwu. Otú ha si mee ya bụ na ha na Ndịàmà Jehova bidoro ịmụ Baịbụl. Ma gịnị ka ha mụtara?
Marco: “Onye na-akụziri mụ na nwunye m Baịbụl si na Baịbụl zaa ajụjụ niile anyị jụrụ ya. Nke a mere ka anyị malite ịhụ Jehova n’anya, mụ na nwunye m malitekwara ịdịkwu ná mma.”
Rosa: “M na-echebu na Baịbụl bụ akwụkwọ nkịtị ndị mmadụ dere ihe ha chere gbasara Chineke. Ma, m ji nke nta nke nta hụ azịza nke ajụjụ m niile na Baịbụl. Ugbu a, amatala m onye Jehova bụ. Ọ bụ Onye m nwere ike ịtụkwasị obi.”
Raymonde: “M kpegaara Chineke ekpere ka o nyere m aka ka m mata onye ọ bụ. O teghị aka, mụ na di m ebido ịmụ Baịbụl. Anyị mechara mata nke bụ́ eziokwu banyere Jehova. Obi tọrọ anyị ezigbo ụtọ mgbe anyị mụtara ụdị Chineke ọ bụ.”
Ihe Baịbụl mere ka anyị mata abụghị naanị ụgha dị iche iche a na-akụzi gbasara Chineke, o mekwara ka anyị mata àgwà ọma ndị Chineke nwere. Baịbụl bụ Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ. Ọ na-enyere anyị aka ‘ka anyị mara ihe niile Chineke ji obiọma nye anyị.’ (1 Ndị Kọrịnt 2:12) Ọ́ gaghị adị mma ka i jiri aka gị chọpụta otú Baịbụl si zaa ajụjụ ndị dị ezigbo mkpa ndị mmadụ na-ajụkarị gbasara Chineke, gbasara ihe ndị o bu n’obi ime nakwa ihe ga-eme anyị n’ọdịnihu? I nwere ike ịgụ azịza nke ụfọdụ ajụjụ ndị a na www.jw.org/ig. N’ebe ahụ, ị ga-ahụ ebe e dere “Ihe Ndị Baịbụl Na-akụzi.” Pịa ebe e dere “Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara.” I nwekwara ike ịnọ n’ebe ahụ kwuo ka a bịa kụziwere gị Baịbụl ma ọ bụkwanụ gị agwa Onyeàmà Jehova ọ bụla ị hụrụ ka ọ bịa kụziwere gị Baịbụl. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, obi siri anyị ike na ọ ga-adịrị gị mfe ịhụ Chineke n’anya karịa otú i chere.
-