Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 7/1 p. 31
  • Ọ Chọtara Nzube ná Ndụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ Chọtara Nzube ná Ndụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 7/1 p. 31

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Ọ Chọtara Nzube ná Ndụ

JISỌS sịrị na ya maara atụrụ ya. (Jọn 10:14) Ọ bụrụ na mmadụ nwere ezi obi nakwa ịhụnanya maka udo na ezi omume, a ga-adọta onye ahụ bịa n’ebe ndị na-eso ụzọ Jisọs nọ. Onye dị otú ahụ ga-achọta nzube ná ndụ, dị ka otu nwanyị mere na Belgium. Nke a bụ akụkọ ya:

“Mgbe Ndịàmà Jehova kụrụ aka n’ọnụ ụzọ m, enwere m nkụda mmụọ ma na-eche banyere igbu onwe m. Ihe Ndịàmà ahụ kwuru banyere ihe ngwọta nye nsogbu ndị e nwere n’ụwa nke a nọ n’ọrịa masịrị m, ma echiche ahụ bụ na aka Chineke dị na ya amasịghị m. Akwụsịwo m ije chọọchị afọ asatọ tupu mgbe ahụ ebe ọ bụ na m kpọrọ ihu abụọ m hụrụ n’ebe ahụ asị. Otú ọ dị, n’ebe Ndịàmà ahụ nọ, achọpụtara m ụda nke eziokwu n’ihe ha kwuru ma bịakwa mata na, e kwuwerị, o siri ike ịdị ndụ ma ọ bụrụ na Chineke adịghị.

“N’ụzọ dị mwute, mgbe e nwesịrị nleta ole na ole, mkpakọrịta mụ na Ndịàmà ahụ kwụsịrị. Obi erughị m ala. Esere m mkpọ siga abụọ n’ụbọchị, ọbụnakwa malite ịṅụ ọgwụ ọjọọ. N’ihi ịchọ isoro nna m ochie nwụworo anwụ kwurịta okwu, e tinyere m aka ná mgbaasị. Lee ka egwu si tụọ m nke ukwuu mgbe m nwere mwakwasị nke ndị mmụọ ọjọọ ka m nọ nanị m n’abalị, n’ihi nke a! Nke a dịrị otú a ruo ọtụtụ ọnwa. Kwa uhuruchi egwu na-atụ m n’echiche nke ịnọ nanị m.

“Mgbe ahụ, otu ụbọchị apụrụ m ime mkpagharị, na-esi ụzọ dị iche na nke m na-esibu, m bịarutekwara n’otu ụlọ ukwu a ka na-ewu ewu. O juru m anya ịhụ oké ìgwè ndị mmadụ n’ebe ahụ. N’ịbịaru nso, ahụrụ m na ọ bụ Ndịàmà Jehova ebe ha na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Echetara m nleta nke Ndịàmà bịaworo n’ụlọ m, echekwara m banyere ihe dị ebube ọ gaara abụworị ma a sị na ụwa nile ga-adị ndụ dị ka ndị a si adị.

“Ọ gụkwara m agụụ ka ọ bụrụ na Ndịàmà ahụ ga-abịa n’ụlọ m ọzọ, ya mere agwara m ụfọdụ n’ime ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ nzukọ ahụ okwu. Ekpegaara m Chineke ekpere, ụbọchị iri n’ihukwa, nwoke ahụ zutere m na nke mbụ bịara n’ọnụ ụzọ m. Ọ tụrụ aro ka anyị maliteghachi ọmụmụ Bible ahụ, ejikwa m ọṅụ kwere. Ozugbo ahụ ọ kpọrọ m òkù ịbịa nzukọ ndị a na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ekwetara m. Ọ dịtụbeghị mgbe m hụrụ ihe dị otú ahụ mbụ! Ọ dịwo anya m nọ na-achọ ndị hụrụ onwe ha n’anya ma nwee obi ụtọ. Leekwa ebe ha nọ n’ikpeazụ!

“Mgbe nke ahụ gasịrị, m gara nzukọ nile. Mgbe ihe dị ka izu atọ gafesịrị, akwụsịrị m àgwà ọjọọ nke ise siga. Atụfuru m akwụkwọ ndị na-akụzi ịgụ kpakpando na rekọd m ndị egwu Setan dị na ha, m na-enwekwa mmetụta na aka ndị mmụọ ọjọọ na-atọghepụ n’ojiji ha ji m. M haziri ndụ m n’usoro n’ụzọ kwesịrị ụkpụrụ Jehova ndị dị na Bible, mgbe ọnwa atọ gasịkwara, amalitere m ikwusa ozi ọma. Mgbe ọnwa isii gasịrị, e mere m baptism. Ụbọchị abụọ mgbe e mesịrị m baptism, m malitere ọsụ ụzọ inye aka.

“Ana m ekele Jehova maka ihe ọma nile o mewooro m. Ndụ m nwere nzube n’ikpeazụ. Ee, aha Jehova bụ ụlọ elu dị ike ebe m chọtara ebe mgbaba na ebe nchebe. (Ilu 18:10) N’ezie m na-enwe mmetụta ka onye ọbụ abụ ahụ mgbe o dere n’Abụ Ọma 84:10, sị: ‘Otu ụbọchị n’ogige gị nile dị mma karịa [otu puku ụbọchị] n’ebe ọzọ. Ahọpụtawo m iguzo ná mbata ụzọ n’ụlọ Chineke m, karịa ibi n’ụlọ ikwuu nile nke mmebi iwu.’”

Nwanyị nke a dị umeala n’obi chọtara nzube ná ndụ. Otú ahụ ka ọ ga-adịkwa onye ọ bụla na-achọ Jehova n’ezi obi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya