-
Olileanya—Ọ̀ Na-enwe Mmetụta n’Ezie?Teta!—2004 | Mee 8
-
-
Olileanya—Ọ̀ Na-enwe Mmetụta n’Ezie?
DANIEL dị nanị afọ iri, ma ya na ọrịa cancer anọwo na-alụ ruo otu afọ. Ndị dọkịta ya nakwa ndị enyi ya enweghịzi olileanya ọ bụla. Ma Daniel nọgidere na-enwe olileanya. O kweere na ya ga-eto ma ghọọ onye nchọpụta ma nye aka n’ịchọpụta ọgwụ ọrịa cancer otu ụbọchị. O nwere olileanya karịsịa banyere ọbịbịa nke otu dọkịta nke bụ́ ọkà n’ịgwọ ụdị ọrịa cancer ọ na-arịa. Otú ọ dị, mgbe ụbọchị ahụ ruru, ọnọdụ ihu igwe na-adịghị mma manyere ọkachamara ahụ ịkagbu njem ahụ. Daniel bịara nwee nkụda mmụọ. Na nke mbụ ya, ọ ghọrọ onye na-enweghịzi mmasị n’ihe ọ bụla. Ọ nwụrụ mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị.
Ọ bụ otu onye ọrụ ahụ́ ike nke mụrụ banyere òkè olileanya na-ekere n’ahụ́ ike, kọrọ akụkọ ahụ banyere Daniel. Ị pụrụ ịnụwo akụkọ ndị yiri nke ahụ. Dị ka ihe atụ, onye meworo agadi nọ n’ọnụ ọnwụ ma na-enwe ọchịchọ siri ike ịnọ ndụ hụ otu ihe omume dị mkpa bụ́ nke a tụworo anya ya eri oge—nleta nke onye a hụrụ n’anya ma ọ bụ ememe mgbaafọ nkịtị. Mgbe ihe omume ahụ gasịrị, ọnwụ esu. Gịnị nọ n’ọrụ n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ? Olileanya ọ̀ pụrụ ịbụ n’ezie ikike siruru ike otú ụfọdụ ndị kweere?
Ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị nnyocha ahụ́ ike na-enye echiche na inwe nchekwube, olileanya, na mmetụta uche ndị ọzọ dị mma na-enwe mmetụta dị ike n’ezie ná ndụ nakwa n’ahụ́ ike mmadụ. Ma ọ bụghị ha nile kwenyere n’echiche ndị dị otú ahụ. Ndị nnyocha ụfọdụ na-ewere nzọrọ nile dị otú ahụ dị ka akụkọ ọdịnala ndị na-ekwekọghị na nkà mmụta sayensị. Ha na-ahọrọ ịdị na-eche na ọrịa anụ ahụ́ nwere nanị ihe anụ ahụ́ ndị na-akpata ha.
N’eziokwu, obi abụọ a na-enwe banyere mkpa olileanya dị amaliteghị taa. Ọtụtụ puku afọ gara aga, a gwara onye ọkà ihe ọmụma Gris bụ́ Aristotle ka ọ kọwaa olileanya, ọ zaghachikwara, sị: “Ọ bụ nrọ a mụ anya na-arọ.” Na nso nso a kwa, onye America ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị, bụ́ Benjamin Franklin, dewere ọnụ n’ụzọ na-adịghị mma kwuo, sị: “Onye ndụ ya dabeere n’olileanya ga-anwụ n’agụụ.”
Gịnịzi bụ eziokwu banyere olileanya? Ọ̀ na-abụ mgbe nile atụmanya nkịtị na-enweghị isi, ụzọ ndị mmadụ si achọ inweta nkasi obi ná nrọ efu ha? Ka è nwere ezi ihe mere a ga-eji na-ele olileanya anya dị ka ihe karịrị nke ahụ—ihe dị anyị nile mkpa iji nwee ahụ́ ike na obi ụtọ, ihe nwere ezi ihe ndabere ma baa ezigbo uru?
-
-
N’ihi Gịnị Ka Olileanya Ji Dị Anyị Mkpa?Teta!—2004 | Mee 8
-
-
N’ihi Gịnị Ka Olileanya Ji Dị Anyị Mkpa?
GỊNỊ ma a sị na Daniel, bụ́ nwatakịrị ahụ na-arịa ọrịa cancer, bụ́ onye a kọwara ná mmalite nke isiokwu bu ụzọ, nọgidere na-enwe olileanya siri ike? Ọrịa cancer ya ọ̀ gaara alawo? Ọ̀ gaara adị ndụ ruo taa? Ọbụna ndị kasị akwado olileanya agaghị eme nzọrọ ndị dị otú ahụ. Nke a na-emekwa ka otu isi ihe pụta ìhè. E kwesịghị ibulibiga ike nke olileanya elu ókè. Ọ bụghị ọgwọ nnụ ọrịa.
N’otu ajụjụ ọnụ a gbara ya n’Akụkọ Ụwa CBS, Dr. Nathan Cherney dọrọ aka ná ntị banyere ihe ize ndụ dị ná mmadụ ibulibiga ike nke olileanya elu ókè mgbe ọ na-emeso ndị ọrịa ji aka ọjọọ ihe: “Anyị enwewo ọnọdụ ebe ndị bụ́ di na-agwakasị ndị nwunye ha okwu ahụ́ na ha enwewabeghị ntụgharị uche n’ụzọ zuru ezu, na ha echewebeghị echiche ziri ezi n’ụzọ zuru ezu.” Dr. Cherney gbakwụnyere, sị: “Ụzọ iche echiche dị otú a mere ka e nwee echiche hiere ụzọ nke bụ́ na mmadụ pụrụ ịchịkwa akpụ na-eto ya n’ahụ́, mgbe ọrịa ndị ahụ kara njọ, ọ na-adị ka à ga-asị na ha achịkwalighị akpụ ha n’ụzọ dị nnọọ mma, echiche dị otú ahụ adịghịkwa mma.”
N’eziokwu, ndị na-arịa ọrịa nke ga-emesị gbuo ha nọ n’ọgụ siri ike nke na-agwụ ike. Itinyekwu obi amamikpe n’ibu dị arọ ha dị mbụ buru bụ n’ezie ihe ndị hụrụ ha n’anya na-agatụghị achọ ime. Ànyị kwesịrị ikwubizi na olileanya abaghị uru ọ bụla?
Ọ dịghị ma ọlị. Dị ka ihe atụ, otu dọkịta ahụ bụ ọkà n’usoro ọgwụgwọ nke na-elekwasị anya, ọ bụghị n’ịlụso ọrịa ọgụ kpọmkwem ma ọ bụ ọbụna n’ịgbatịkwu ndụ, kama n’ime ka onye ọrịa nwekwuo ntụsara ahụ́ na obi ụtọ ruo ogologo oge ọrịa ahụ ga-adịru. Ndị dọkịta dị otú ahụ kwenyesiri ike n’abamuru nke usoro ọgwụgwọ ndị na-eme ka ọbụna onye ọrịa jisiri aka ike nwekwuo obi ụtọ. E nwere ihe àmà dị ukwuu na olileanya pụrụ ime nke ahụ—ọbụnakwa karịa.
Uru Olileanya Bara
“Olileanya bụ ọgwụ dị ike,” ka odeakụkọ banyere ahụ́ ike, bụ́ Dr. W. Gifford-Jones, na-ekwu. Ọ tụlere nnyocha dị iche iche e mere iji chọpụta uru nkwado mmetụta uche ndị e nyere ndị na-arịa ọrịa ndị ga-emesị gbuo ha, bara. A na-ewere ya na ụdị nkwado a na-enyere ndị mmadụ aka ịnọgide na-enwekwu olileanya na echiche ziri ezi. Otu nnyocha e mere n’afọ 1989 gosiri na ndị ọrịa bụ́ ndị nwetara nkwado dị otú ahụ dịtekwuru ndụ aka, ebe nnyocha e mere na nso nso a na-egosichabeghị ihe doro anya n’okwu ahụ. Otú ọ dị, nnyocha ndị e mere egosiwo na ndị ọrịa bụ́ ndị nwetara nkwado n’ụzọ mmetụta uche na-enwe ịda mbà n’obi na ihe mgbu dị nta karịa ka ndị na-enwetaghị ya na-enwe.
Tụlee banyere nnyocha ọzọ e mere bụ́ nke lekwasịrị anya n’òkè inwe nchekwube na enweghị nchekwube na-ekere n’ọrịa akwara obi. E ji nlezianya nyochaa otu ìgwè nke ndị ikom dị ihe karịrị 1,300 mejupụtara iji chọpụta ma hà nwere nchekwube ná ndụ ma ọ bụ na ha enweghị. Mgbe e meghachiri nnyocha ahụ afọ iri ka e mesịrị, a chọpụtara na ihe karịrị pasent 12 n’ime ndị ikom a arịawo ọrịa akwara obi. N’ime ha, ndị na-adịghị enwe nchekwube ji ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpu abụọ karịa ndị na-adị enwe nchekwube. Laura Kubzansky, bụ́ osote prọfesọ ahụ́ ike na akparamàgwà ndị mmadụ n’Ụlọ Akwụkwọ Harvard Maka Ahụ́ Ike Ọha na Eze, na-ekwu, sị: “Ihe ka ọtụtụ n’ihe àmà ndị e nwere banyere echiche bụ́ na ‘iche echiche nke ọma’ dị mma maka ahụ́ ike gị dabeere n’akụkọ a nụrụ anụ—nnyocha nke a na-enye ihe àmà ahụ́ ike ụfọdụ ndị bụ́ eziokwu maka echiche a ma a bịa n’ihe banyere ọrịa obi.”
Nnyocha ụfọdụ egosiwo na ndị na-ewere onwe ha dị ka ndị na-enweghị ezi ahụ́ ike adịghị agbake ngwa ngwa mgbe a wasịrị ha ahụ́ otú ndị na-ewere onwe ha dị ka ndị nwere ezi ahụ́ ike si agbake. Ọbụna e kwuwo na ịdị ogologo ndụ na inwe nchekwube nwere njikọ. N’otu nnyocha, e lebara anya n’otú inwe echiche ndị dị mma na ndị na-adịghị mma banyere ịka nká na-esi emetụta ndị agadi. Mgbe e mere ka ndị agadi gụọ ọtụtụ ozi ndị na-aga ngwa ngwa bụ́ ndị na-ejikọ ịka nká na inwekwu amamihe na ahụmahụ, a hụziri ha ka ha ji ike na ume ka ukwuu na-aga ije. N’eziokwu, ha malitere ime ihe n’ụzọ ka mma dị ka à ga-asị na ha nwere mmega ahụ́ ruo izu 12!
N’ihi gịnị ka mmetụta uche ndị dị ka olileanya, inwe nchekwube, na echiche dị mma na-eji eyi ka hà na-adị ahụ́ mma? Ikekwe ndị ọkà mmụta sayensị na ndị dọkịta aghọtabeghị uche na ahụ́ mmadụ nke ọma iji nye azịza ndị doro anya. Ka o sina dị, ndị ọkachamara bụ́ ndị na-amụ banyere ya pụrụ ịdabere n’ihe ọmụma kwuo ihe ha chere. Dị ka ihe atụ, otu prọfesọ nke nkà mmụta akwara ozi na-ekwu, sị: “Ọ na-adị mma inwe obi ụtọ na olileanya. Ọ bụ ọnọdụ dị ụtọ nke na-eme ka nrụgide a na-enwe dị nnọọ nta, ọnọdụ ndị ahụ na-adịkwa ahụ́ mma. Ọ bụ otu ihe ọzọ ndị mmadụ pụrụ imere onwe ha iji gbalịa ịnọgide na-enwe ezi ahụ́ ike.”
Echiche a pụrụ ịda ụfọdụ ndị dọkịta, ndị ọkà mmụta akparamàgwà mmadụ, na ndị ọkà mmụta sayensị dị ka ihe ọhụrụ, ma ọ bụtụghị ihe ọhụrụ nye ndị na-amụ Bible. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 3,000 gara aga, e nyere Eze Solomọn maara ihe ike mmụọ nsọ ide echiche a ede: “Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ́ dị mma: ma mmụọ mmadụ nke e tigburu etigbu na-amịkọ ọkpụkpụ.” (Ilu 17:22) Rịba ama otú a na-esighị kwubiga okwu ókè n’ebe a. Amaokwu a asịghị na obi nke na-aṅụrị ọṅụ ga-agwọ ọrịa ọ bụla kama na ọ “na-eme ka ahụ́ dị mma.”
N’eziokwu, ọ pụrụ ịbụ ihe ezi uche dị na ya ịjụ, sị, A sị na olileanya bụ ọgwụ, olee dọkịta nke na-agaghị edepụtara ya onye ọrịa ya? Ọzọkwa, olileanya nwere abamuru ndị karịrị nnọọ inwe ezi ahụ́ ike.
Inwe Nchekwube, Enweghị Nchekwube, na Ndụ Gị
Ndị nnyocha achọpụtawo na ndị na-enwe nchekwube na-erite uru n’ọtụtụ ụzọ. O yiri ka hà na-eme nke ọma karị n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe ọrụ, nakwa ọbụna n’ọgbọ egwuregwu. Dị ka ihe atụ, e mere otu nnyocha n’ebe ụmụ nwanyị na-eme egwuregwu ndị dị ka ịgba ọsọ nọ. Ndị na-enye ha ọzụzụ tụlere n’ụzọ zuru ezu, ikike ime egwuregwu nke ụmụ nwanyị ahụ nwere. N’otu oge ahụ, e nyochara ụmụ nwanyị ahụ n’onwe ha, jirikwa nlezianya tụlee ókè ha nweruru olileanya. Ihe si ná nchọpụta ahụ pụta gosiri na ókè ụmụ nwanyị ahụ nweruru olileanya ka gosi ókè ha ga-enweru ihe ịga nke ọma n’egwuregwu karịa ka ikike ime egwuregwu ha bụ́ nke ndị na-enye ha ọzụzụ nyochara, gosiri. N’ihi gịnị ka olileanya ji enwe mmetụta dị ike otú ahụ?
A mụtawo ihe dị ukwuu site n’ịmụ banyere ihe na-emegide inwe nchekwube—enweghị nchekwube. N’afọ ndị 1960, nnyocha ndị e mere mere ka a chọpụta ihe ndị a na-atụghị anya ha banyere akparamàgwà ụmụ anụmanụ, bụ́ nke mere ka ndị nchọpụta chepụta nkebi ahịrịokwu bụ́ “enweghị enyemaka a mụtara amụta.” Ha chọpụtara na ụmụ mmadụ kwa pụrụ inwe ụdị nsogbu a. Dị ka ihe atụ, mgbe e ji ụmụ mmadụ mee nnyocha a, e mere ka ha nọrọ n’ebe ụzụ na-adachi ha ntị, a gwakwara ha na ha pụrụ ịmụta ịkwụsị ụzụ ahụ site n’ịpị usoro bọtịn dị iche iche. Ha nwere ihe ịga nke ọma n’ịkwụsị ụzụ ahụ.
A gwara ìgwè nke abụọ otu ihe ahụ—ma ịpị bọtịn ndị ahụ emeghị ihe ọ bụla. Dị ka ị pụrụ ichewo n’echiche, ọtụtụ n’ime ndị nọ n’ìgwè nke abụọ ahụ malitere inwe mmetụta nke enweghị enyemaka. Ná nnwale e mere mgbe nke ahụ gasịrị, obi akaghị ha ime ihe ọ bụla. Ha kwenyere na ọ dịghị ihe ha ga-eme nke ga-agbanwe ọnọdụ ahụ. Otú ọ dị, ọbụna n’ìgwè nke abụọ ahụ, ndị nwere nchekwube jụrụ inwe mmetụta dị otú ahụ nke enweghị enyemaka.
A kpaliri Dr. Martin Seligman, bụ́ onye nyere aka n’ịkwadebe ụfọdụ n’ime nchọpụta ndị mbụ ahụ, itinye oge ya n’ịmụ banyere inwe nchekwube na enweghị nchekwube. O mere nchọpụta miri emi banyere ụdị echiche ndị na-adị elekarị onwe ha anya dị ka ndị na-enweghị enyemaka na-enwe. O kwubiri na enweghị nchekwube dị otú ahụ na-egbochi ndị mmadụ inwe ihe ịga nke ọma n’ọtụtụ mgbalị ndị a na-eme ná ndụ ma ọ bụ ọbụna na-eme ka ha ghara ime ihe ọ bụla. Seligman si otú a chịkọta enweghị nchekwube na mmetụta ọ na-enwe: “Nnyocha m mere ruo afọ iri abụọ na ise emewo ka m kwenye na ọ bụrụ na anyị na-ekwere mgbe nile, dị ka ndị na-enweghị nchekwube na-ekwere, na ọdachi si anyị n’aka, nakwa na ọ gaghị akwụsị akwụsị, nakwa na ọ ga-emebi ihe ọ bụla anyị na-eme, ihe ka ukwuu n’ime ya ga-adakwasị anyị karịa ka ọ gaara adakwasị anyị ma ọ bụrụ na anyị ekweghị na ọ ga-adị otú ahụ.”
Ọzọkwa, nkwubi okwu ndị dị otú ahụ pụrụ iyi ihe ọhụrụ nye ụfọdụ ndị taa, ma ha na-ada ka ihe ndị na-amụ Bible ma ama. Rịba ilu a ama: “Ọ bụrụ na ị dị umengwụ n’ụbọchị ahụhụ, ike gị pere mpe.” (Ilu 24:10) Ee, Bible na-akọwa n’ụzọ doro anya na nkụda mmụọ, na echiche ndị na-ezighị ezi na-eso ya abịa, ga-eme ka ị ghara inwe ike ime ihe. Otú ọ dị, gịnị ka ị pụrụ ime iji lụsoo enweghị nchekwube ọgụ ma nwekwuo nchekwube na olileanya ná ndụ gị?
[Foto dị na peeji nke 14, 15]
Olileanya pụrụ ịrụpụta ihe dị nnọọ mma
-
-
Ị Pụrụ Imeri Enweghị NchekwubeTeta!—2004 | Mee 8
-
-
Ị Pụrụ Imeri Enweghị Nchekwube
OLEE otú i si ele ihe ndọghachi azụ ndị ị na-enwe anya? Ọtụtụ ndị ọkachamara kweere ugbu a na azịza gị ga-egosi nnọọ ma ị̀ bụ onye na-enwe nchekwube ma ọ bụ na ị bụghị. Anyị nile na-enwe ihe isi ike dịgasị iche iche ná ndụ, ụfọdụ n’ime anyị na-enwe ya karịa ndị ọzọ. Ma, n’ihi gịnị ka o ji adị ka ụfọdụ ndị hà na-enwetaghachi onwe ha ngwa ngwa ha nwesịrị ihe isi ike, na-adị njikere ime mgbalị ọzọ, ebe ndị ọzọ na-eyi ka hà na-akwụsị ime mgbalị mgbe ha nwesịrị ọbụna obere ihe isi ike?
Dị ka ihe atụ, were ya na ị na-achọ ọrụ. Ị gaa maka ajụjụ ọnụ e wee jụ iwe gị n’ọrụ. Olee echiche ị na-enwe banyere nke a mgbe e mesịrị? Ị pụrụ iwere ya na ọ bụ gị ka a jụrụ, ma na-ele ya anya dị ka nsogbu na-adịgide adịgide, na-agwa onwe gị, sị, ‘Ọ dịghị onye ga-ewe onye dị ka m n’ọrụ. Ọ dịghị mgbe m ga-enweta ọrụ.’ Ma ọ bụkwanụ, nke ka njọ, ị pụrụ ikwe ka otu ndọghachi azụ a metụta otú i si ele akụkụ nile nke ndụ gị anya, na-eche, sị, ‘Ọ dịghị ihe m na-emeli. Ọ dịghị uru m baara onye ọ bụla.’ N’ọnọdụ nke ọ bụla, echiche dị otú ahụ na-egosipụta enweghị nchekwube n’ezie.
Ịlụso Enweghị Nchekwube Ọgụ
Olee otú ị pụrụ isi lụsoo ya ọgụ? Ịmata echiche ndị dị otú ahụ na-ezighị ezi bụ nzọụkwụ mbụ dị oké mkpa. Nzọụkwụ ọzọ bụ ịlụso ha ọgụ. Chọọ nkọwa ndị ọzọ ezi uche dị na ha. Dị ka ihe atụ, ọ̀ bụ eziokwu na a jụrụ iwe gị n’ọrụ n’ihi na ọ dịghị onye ga-achọ iwe gị n’ọrụ? Ka ọ̀ pụrụ ịbụ na onye ahụ na-ewe ndị mmadụ n’ọrụ nọ na-achọ nnọọ onye nwere iru eru ndị ọzọ?
Ọ bụrụ na i lekwasị anya n’ihe ụfọdụ ndị bụ́ eziokwu kpọmkwem, ọ ga-ekpughe echiche ndị ahụ na-eme ka ị ghara inwe nchekwube, ndị bụ́ mmeghachi omume gabigara ókè. Na a jụrụ iwe gị n’ọrụ otu ebe ọ̀ pụtara na ọ dịghị uru ị bara, ka ị̀ pụrụ iche echiche banyere akụkụ ndị ọzọ nke ndụ gị—dị ka nchụso ime mmụọ gị, mmekọrịta ezinụlọ gị, ma ọ bụ ndị enyi gị—bụ́ ebe i nwere ihe ịga nke ọma ruo n’ókè ụfọdụ? Mụta ịdị na-ewepụ n’obi gị echiche bụ́ na ihe ọ bụla ị na-eme ga-akụ afọ n’ala. E kwuwerị, olee otú i si mara n’ezie na ị gaghị achọta ọrụ ọzọ ma ọlị? E nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ ị pụrụ ime iji jụ echiche na-ezighị ezi.
Echiche Dị Mma, nke Dabeere n’Iru Ihe Mgbaru Ọsọ
N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ndị nnyocha akọwawo olileanya n’ụzọ na-akpali akpali, n’agbanyeghị na ọ saghị mbara. Ha na-ekwu na olileanya na-agụnye nkwenye bụ́ na ị ga-enwe ike iru ihe mgbaru ọsọ gị. Dị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi, olileanya gụnyere ihe karịrị nnọọ nke ahụ n’ezie, ma nkọwa a yiri ka ọ̀ bara uru n’ọtụtụ ụzọ. Ilekwasị anya n’akụkụ a nke mmadụ inwe olileanya n’ime onwe ya pụrụ inyere anyị aka ịzụlitekwu echiche dị mma, nke dabeere n’iru ihe mgbaru ọsọ.
Iji kwere na anyị ga-eru ihe mgbaru ọsọ ndị anyị ga-esetịpụ n’ọdịnihu, ọ dị anyị mkpa inweta ahụmahụ n’isetịpụ ihe mgbaru ọsọ nakwa n’iru ha. Ọ bụrụ na i chere na i nweghị ahụmahụ dị otú ahụ, ọ pụrụ ịbụ ihe bara uru ichesi echiche ike banyere ihe mgbaru ọsọ ndị ị na-esetịpụrụ onwe gị. Nke mbụ, ọ̀ dị nke i nwere enwe? Ọ dị nnọọ mfe imikpu onwe anyị ná ndụ gbalụ gbalụ, n’akwụsịghị iji chee echiche banyere ihe anyị chọrọ ná ndụ n’ezie, banyere ihe kasị dị anyị mkpa. Banyere ụkpụrụ a bara uru nke inwe ihe ndị doro anya anyị na-ebute ụzọ, anyị na-achọpụtakwa na Bible kwutere ya eri ogologo oge gara aga mgbe ọ sịrị: “Jide ihe ndị ka mkpa n’aka.”—Ndị Filipaị 1:10.
Ozugbo anyị chọpụtara ihe ndị ka mkpa, ọ na-aka adị mfe isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ụfọdụ bụ́ isi n’akụkụ ndị dịgasị iche iche, dị ka ná ndụ ime mmụọ anyị, n’ezinụlọ anyị, n’ebe ọrụ anyị. Otú ọ dị, ọ dị anyị mkpa ịghara isetịpụ ihe mgbaru ọsọ gabigara ókè ná mbido, dịkwa anyị mkpa ịhọrọ ihe mgbaru ọsọ ndị anyị maara dị mfe oruru. Ọ bụrụ na ihe mgbaru ọsọ bụ nke siri ike iru, ọ pụrụ ịgwụ anyị ike, anyị pụkwara ịda mbà. N’ihi ya, ọ na-aka mma mgbe mgbe igbubilata nnukwu ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewe ogologo oge iji ruo ha gaa ná ndị obere a pụrụ iru na nwa oge.
“E nwee ọchịchọ ime ihe, a ga-ahụrịrị ụzọ a ga-esi mee ya.” Otú ahụ ka e si atụ otu ilu ochie, o yikwara ka eziokwu ọ̀ dị na ya. Ozugbo anyị bu ihe mgbaru ọsọ ndị bụ́ isi n’uche, ọ dị anyị mkpa inwe ọchịchọ ime ihe—ọchịchọ na mkpebi siri ike—iji gbalịsie ike iru ha. Anyị pụrụ ime ka mkpebi ahụ sikwuo ike site n’ịtụgharị uche n’uru ihe mgbaru ọsọ anyị ga-aba nakwa n’ụgwọ ọrụ anyị ga-enweta site n’iru ha. N’ezie, a ga na-enwe ihe mkpọbi ụkwụ, ma ọ dị anyị mkpa ịdị na-ele ha anya dị ka ihe ịma aka kama ịdị na-ele ha anya dị ka ebe ọkụ nyụrụ.
Otú ọ dị, ọ dịkwa anyị mkpa iche banyere ụzọ ndị anyị pụrụ isi ruo ihe mgbaru ọsọ anyị. Onye edemede bụ́ C. R. Snyder, bụ́ onye meworo nnyocha sara mbara banyere uru olileanya bara, na-atụ aro ka mmadụ na-eche banyere ọtụtụ ụzọ a pụrụ isi ruo ihe mgbaru ọsọ ọ bụla. Ya mere, ọ bụrụ na otu ụzọ echie, anyị pụrụ isizi n’ụzọ nke abụọ, nke atọ, ma ọ bụ nke . . . .
Snyder na-atụkwa aro banyere ịmata mgbe ọ dị mkpa iji otu ihe mgbaru ọsọ dochie ọzọ. Ọ bụrụ na anyị nwere ihe mgbochi n’ezie n’iru ihe mgbaru ọsọ anyị, nanị ihe ịnọ na-echegbu onwe anyị banyere ya ga-eme agwụla ịkụda anyị mmụọ. N’aka nke ọzọ, iji ihe mgbaru ọsọ a pụrụ iru eru karị dochie ya ga-eme ka anyị nwee ihe ọzọ anyị ga-enwere olileanya.
Bible nwere ihe atụ na-enye ihe ọmụma n’akụkụ a. Eze Devid ji ihe mgbaru ọsọ nke iwuru Chineke ya, bụ́ Jehova, ụlọ nsọ kpọrọ oké ihe. Ma Chineke gwara Devid na ọ bụ nwa ya nwoke bụ́ Solomọn ga-enwe ihe ùgwù ahụ kama ịbụ ya onwe ya. Kama ịnọ na-ewe iwe ma ọ bụ ịgbalị ịnọgide na-achụso ihe mgbaru ọsọ ahụ n’agbanyeghị ọnọdụ a na-akpata ndakpọ olileanya, Devid gbanwere ihe mgbaru ọsọ ya. O tinyere ume ya n’ịkpakọba ego na ngwá ọrụ ndị ga-adị nwa ya mkpa iji rụchaa ọrụ ahụ.—1 Ndị Eze 8:17-19; 1 Ihe E Mere 29:3-7.
Ọ bụrụgodị na anyị enwee ihe ịga nke ọma n’inwekwu olileanya site n’ịlụso enweghị nchekwube ọgụ nakwa site n’ịzụlite echiche dị mma, nke dabeere n’iru ihe mgbaru ọsọ, anyị ka pụkwara ịbụ ndị olileanya kọrọ n’akụkụ dị ukwuu. Olee otú ọ ga-esi dị otú ahụ? Ihe ka ukwuu n’ụkọ olileanya ndị anyị na-enwe n’ụwa a na-abịa site n’ihe ndị anyị na-apụghị ịchịkwa ma ọlị. Mgbe anyị tụlere ụbara nsogbu ndị na-emekpọ ihe a kpọrọ mmadụ ọnụ—ịda ogbenye, agha, ikpe na-ezighị ezi, egwu ọrịa na ọnwụ nọgidere na-eyi anyị—olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-enwe olileanya?
[Foto dị na peeji nke 17]
Ọ bụrụ na a jụ iwe gị n’ọrụ ị chọrọ, ị̀ na-ewere ya na ị gaghị enweta ọrụ ọzọ ma ọlị?
[Foto dị na peeji nke 18]
Eze Devid gosiri na ya pụrụ ime mgbanwe ma a bịa n’ihe mgbaru ọsọ
-
-
Olee Ebe Ị Pụrụ Inweta Olileanya Bụ́ Ezigbo Ya?Teta!—2004 | Mee 8
-
-
Olee Ebe Ị Pụrụ Inweta Olileanya Bụ́ Ezigbo Ya?
ELEKERE gị akwụsịla ịga ma yie ka ọ̀ kụwaala. Mgbe ị chọrọ ịrụzi ya, gị echee ọtụtụ nhọrọ ihu. A na-eme mkpọsa n’ebe nile maka ịrụzi elekere, ha nile na-azọrọ na ha ga-arụta ya, ihe ụfọdụ n’ime ha na-ekwu na-emegiderịta ibe ha. Ma gịnị ma ọ bụrụ na ị chọpụta na ọ bụ onye agbata obi gị rụrụ elekere ahụ ọtụtụ afọ gara aga? Tụkwasị na nke ahụ, gị amata na ọ dị njikere inyere gị aka, n’anaghị gị ego. O doro anya ihe ị ga-ekpebi ime, ọ́ bụghị ya?
Ugbu a, were elekere ahụ tụnyere ikike i nwere inwe olileanya. Ị chọpụta na i nwechaghịzi olileanya—dị ka ọ dị n’ebe ọtụtụ ndị nọ n’oge nsogbu ndị a—olee ebe ị ga-echigharịkwuru maka enyemaka? Ọtụtụ mmadụ na-azọrọ na ha nwere ike idozi nsogbu ahụ, ma imerime aro ndị ha na-atụ pụrụ ịdị mgbagwoju anya ma na-emegiderịta ibe ha. Ya mere, gịnị ma i jekwuru Onye ahụ kere ihe a kpọrọ mmadụ ma kenye ha ikike nke inwe olileanya? Bible na-ekwu na “ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ” nakwa na o nwere nnọọ ọchịchọ inye aka.—Ọrụ 17:27; 1 Pita 5:7.
Nkọwa Ka Saa Mbara nke Olileanya
Echiche Bible banyere olileanya sara mbara ma mie emi karịa echiche ndị dọkịta, ndị ọkà mmụta sayensị, na ndị ọkà mmụta akparamàgwà mmadụ na-enwekarị banyere ya taa. Okwu ndị mbụ e ji mee ihe n’ime Bible bụ́ ndị a sụgharịrị ịbụ “olileanya” pụtara iji oké atụmanya na-echere ihe na ịtụ anya ihe ọma. N’ụzọ bụ́ isi, ọ bụ ihe abụọ mejupụtara olileanya. Ọ na-agụnye ọchịchọ maka ihe ọma nakwa ihe ndabere maka ikwere na ihe ọma ga-abịa. Olileanya Bible na-enye abụghị atụmanya nkịtị na-enweghị isi. Ọ bụ nke dabesiiri ike n’ihe bụ́ eziokwu na n’ihe pụtara ìhè.
N’akụkụ a, olileanya yiri okwukwe, bụ́ nke na-aghaghị ịdabere n’ihe pụtara ìhè—ọ bụghị ikwere ihe okpukpe kwuru n’ajụghị ase. (Ndị Hibru 11:1) Otú ọ dị, Bible na-egosi ọdịiche dị n’etiti okwukwe na olileanya.—1 Ndị Kọrint 13:13.
Iji maa atụ: Mgbe ị rịọrọ ezigbo enyi gị maka enyemaka, ị pụrụ inwe olileanya na ọ ga-enyere gị aka. Olileanya gị abụghị nke na-enweghị isi n’ihi na i nwere okwukwe n’ebe enyi gị nọ—ị maara ya nke ọma, ị hụwokwa ebe o ji obiọma na mmesapụ aka mee ihe n’oge gara aga. Okwukwe na olileanya gị nwere njikọ chiri anya, ọbụna ha na-agakọ, ma ha abụghị otu ihe. Olee otú ị pụrụ isi nwee olileanya dị otú ahụ n’ebe Chineke nọ?
Ihe Ndabere Maka Olileanya
Olileanya bụ́ ezigbo ya na-esite n’aka Chineke. N’oge Bible, a kpọrọ Jehova “olileanya Izrel.” (Jeremaịa 14:8) Olileanya ọ bụla a pụrụ ịdabere na ya bụ́ nke ndị ya nwere sitere n’aka ya; n’ihi ya, ọ bụụrụ olileanya ha. Olileanya dị otú ahụ abụghị ọchịchọ nkịtị. Chineke nyere ha ihe ndabere siri ike maka inwe olileanya. Ka o so ha mekọrịta ihe n’ime narị afọ ndị gafeworonụ, ọ bịara nwee aha ọma nke ịbụ o kwere nkwa mee nkwa. Onye ndú ha bụ́ Jọshụa gwara Izrel, sị: “Unu amawo . . . na ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova, bụ́ Chineke unu, kwuru banyere unu.”—Joshua 23:14.
Mgbe ọtụtụ puku afọ gasịrị, ọ ka nwere aha ọma ahụ. Bible jupụtara ná nkwa ndị dị ịrịba ama Chineke kwere nakwa ihe ndekọ ziri ezi banyere mmezu ha. Nkwa ndị o kwere n’ụzọ amụma bụ nnọọ ndị a pụrụ ịdabere na ha nke na mgbe ụfọdụ, a na-ede ha dị ka à ga-asị na ha emezuworị n’oge e kwere ha.
Ọ bụ ya mere anyị pụrụ iji kwuo na Bible bụ akwụkwọ olileanya. Ka ị na-atụle ihe ndekọ banyere ụzọ Chineke siworo mesoo ụmụ mmadụ, ị ga-enwekwu nnọọ ihe mere ị ga-eji nwee olileanya n’ebe ọ nọ. Pọl onyeozi dere, sị: “Ihe nile e dere tupu oge ha eruo ka e dere iji nye anyị ntụziaka, ka anyị wee site ná ntachi obi anyị na site ná nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.”—Ndị Rom 15:4.
Olileanya Dị Aṅaa Ka Chineke Na-enye Anyị?
Olee mgbe olileanya na-akasị adị anyị mkpa? Ọ́ bụghị mgbe anyị chere ọnwụ ihu? Otú ọ dị, nye ọtụtụ ndị, ọ bụ kpọmkwem n’oge dị otú ahụ—dị ka ihe atụ, mgbe ọnwụ gburu onye a hụrụ n’anya—ka olileanya na-eyikarịsị ihe aka na-apụghị iru. E kwuwerị, olee ihe pụrụ ịkpata ndakpọ olileanya karịa ọnwụ? Ọ na-achụ onye ọ bụla n’ime anyị na-esepụghị aka. Anyị pụrụ izere ya nanị ruo oge ụfọdụ, anyị enweghịkwa ike ịgbanwe ya. N’ụzọ dabara adaba, Bible na-akpọ ọnwụ “onye iro ikpeazụ.”—1 Ndị Kọrint 15:26.
Oleezi otú anyị pụrụ isi nwee olileanya mgbe ọnwụ chere anyị ihu? Amaokwu Bible ahụ nke kpọrọ ọnwụ onye iro ikpeazụ na-ekwukwa na a gaje ime ka ọ “ghara ịdị irè.” Jehova Chineke ka ọnwụ ike. O gosipụtawo ya ọtụtụ oge. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Bible na-akọwa oge itoolu dịgasị iche iche mgbe Chineke ji ike ya mee ihe n’ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.
N’otu ihe atụ pụtara ìhè, Jehova nyere Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, ike ịkpọlite ezigbo enyi ya aha ya bụ Lazarọs n’ọnwụ, bụ́ onye nwụworonụ eri ụbọchị anọ. Jizọs mere nke a, ọ bụghị na nzuzo, kama n’ihu ọha, n’ihu ìgwè ndị mmadụ nọ na-ekiri ihe na-emenụ.—Jọn 11:38-48, 53; 12:9, 10.
Ị pụrụ iche, sị, ‘N’ihi gịnị ka e ji si n’ọnwụ kpọlite ndị mmadụ? Ọ̀ bụ na ha emeghị agadi ma mesịakwarị nwụọ ọzọ?’ Ha mere agadi ma mesịa nwụọ. Ma, n’ihi ihe ndekọ ndị dị otú a a pụrụ ịdabere adabere banyere mbilite n’ọnwụ, anyị pụrụ inwe ihe karịrị nnọọ ọchịchọ na ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ; anyị nwere ihe mere anyị ga-eji kwere na ha ga-adị ndụ ọzọ. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, anyị nwere ezi olileanya.
Jizọs kwuru, sị: “Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ.” (Jọn 11:25) Ọ bụ ya ka Jehova ga-enye ike ịkpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ n’ụwa nile. Jizọs kwuru, sị: “Oge awa na-abịa mgbe ndị nile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu [Kraịst] wee pụta.” (Jọn 5:28, 29) Ee, ndị nile nọ n’ụra n’ili nwere atụmanya nke ịbụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ gaa ná ndụ n’ime ụwa paradaịs.
Aịzaịa onye amụma sere onyinyo a na-emetụ n’ahụ́ banyere mbilite n’ọnwụ: “Ndị anyị nile nwụrụ anwụ ga-adị ndụ. Ha ga-esite n’ọnwụ bilie ọzọ. Ndị nile ghọrọla aja ga-ebili bụọ abụ ọṅụ. N’ihi na dị ka igirigi si ewetara ala mmiri, otú a ka Jehova ga-esi tutee ndị ahụ nile nwụrụ anwụ.”—Aịsaịa 26:19, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.
Nke ahụ ọ́ bụghị ihe na-akasi obi? Ndị nwụrụ anwụ nọ n’ọnọdụ kasị nchebe ị pụrụ ichetụ n’echiche, dị nnọọ ka nwa ọhụrụ nke e chebere n’akpa nwa nne ya. N’ezie, ndị na-ezu ike n’ili nọ ná nchebe zuru ezu n’ikike ncheta a na-akparaghị ókè nke Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile. (Luk 20:37, 38) N’oge na-adịghịkwa anya, a ga-eme ka ha dịghachi ndụ ma bata n’ụwa obi ụtọ nke a ga-anabata ha, dị nnọọ ka ezinụlọ na-ahụ n’anya ma na-atụ anya nwa ọhụrụ na-esi anabata ya! Ya mere, olileanya dị ọbụna mgbe ọnwụ chere anyị ihu.
Ihe Olileanya Pụrụ Imere Gị
Pọl na-akụziri anyị ihe dị ukwuu banyere uru olileanya bara. O kwuru banyere olileanya dị ka akụkụ dị oké mkpa nke ekike agha ime mmụọ—okpu ígwè. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:8) Gịnị ka o bu n’uche kwuo nke ahụ? N’oge Bible, onye agha na-ekpu okpu ígwè aga agha, mgbe mgbe, ọ na-ekpukwasị ya n’elu okpu e ji ajị anụ ma ọ bụ akpụkpọ anụ mee. N’ihi okpu ígwè ahụ, ihe ka ọtụtụ n’akụ́ ndị a na-agba ya n’isi na-adapụ kama igbu ya. Gịnị ka Pọl na-ekwu? Dị nnọọ ka okpu ígwè si echebe isi, otú ahụ ka olileanya si echebe uche, ike iche echiche. Ọ bụrụ na i nwere olileanya siri ike n’ụzọ kwekọrọ ná nzube Chineke, udo nke obi gị agaghị abụ nke oké egwu na ịda mbà n’obi ga-akpaghasị mgbe i nwere ihe isi ike. Ònye n’ime anyị ka okpu ígwè dị otú ahụ na-adịghị mkpa?
Pọl ji ihe atụ ọzọ doro anya mee ihe maka olileanya nke e jikọrọ n’uche Chineke. O dere, sị: “Olileanya a ka anyị nwere dị ka arịlịka maka mkpụrụ obi, bụ́ ma nke e ji n’aka ma nke guzosiri ike.” (Ndị Hibru 6:19) N’ịbụ onye lanarịrị ihe karịrị otu ụgbọ okpukpu, Pọl maara nke ọma uru arịlịka bara. Mgbe oké ifufe malitere, ndị ọrụ ụgbọ mmiri na-atụda arịlịka ụgbọ ahụ. Ọ bụrụ na o ruo n’ala oké osimiri ma kogidesie ike n’ihe n’ebe ahụ, ụgbọ mmiri ahụ na-enwe ohere nke ịlanarị oké ifufe ahụ kama ịbụ nke oké ifufe ga-akwaga n’ikpere mmiri ma mee ka ọ kpọkaa na nkume ndị dị n’ebe ahụ.
N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ bụrụ na nkwa ndị Chineke kwere bụụrụ anyị olileanya ‘e ji n’aka na nke guzosiri ike,’ olileanya ahụ pụrụ inyere anyị aka ịnagide ọgba aghara nke oge a jupụtara ná nsogbu. Jehova na-ekwe nkwa na oge ga-eru n’isi nso mgbe ihe a kpọrọ mmadụ na-agaghịzi abụ ndị agha, mpụ, iru újú, ma ọ bụ ọbụna ọnwụ ga na-emekpa ahụ́. (Lee igbe dị na peeji nke 10.) Ịnọgidesi ike na-enwe olileanya ahụ pụrụ inyere anyị aka izere ọdachi, na-enye anyị ihe mkpali dị anyị mkpa iji na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke kama ịdaba n’inwe àgwà ime aghara na nke rụrụ arụ bụ́ nke jupụtara ebe nile n’ụwa taa.
Olileanya nke Jehova na-enye na-emetụtakwa gị n’onwe gị. Ọ chọrọ ka ị na-ebi ndụ otú o si chọọ ka i si na-ebi ya. Ọchịchọ ya bụ ka “a zọpụta ụdị mmadụ nile.” N’ụzọ dị aṅaa? Nke mbụ, onye nke ọ bụla aghaghị ‘ịbịaru ezi ihe ọmụma nke eziokwu.’ (1 Timoti 2:4) Ndị na-ebipụta magazin a na-agba gị ume inweta ihe ọmụma ahụ nke na-enye ndụ banyere eziokwu nke Okwu Chineke. Olileanya nke Chineke ga-esi otú ahụ nye gị karịrị nnọọ olileanya ọ bụla ị pụrụ ịchọta n’ụwa a.
Ọ bụrụ na i nwee olileanya dị otú ahụ, ọ dịghị gị mkpa ma ọlị inwe mmetụta nke ịbụ onye na-enweghị enyemaka, n’ihi na Chineke pụrụ inye gị ume nke dị gị mkpa iji ruo ihe mgbaru ọsọ ọ bụla ị pụrụ isetịpụ bụ́ nke kwekọrọ n’uche ya. (2 Ndị Kọrint 4:7; Ndị Filipaị 4:13) Nke ahụ ọ́ bụghị ụdị olileanya dị gị mkpa? Ya mere, ọ bụrụ na olileanya dị gị mkpa, ọ bụrụ na ị nọwo na-achọ ya, kara obi. Olileanya dị n’ebe aka gị ga-eru. Ị pụrụ ịchọta ya!
[Igbe/Foto dị na peeji nke 20]
Ihe Ndị Mere Ị Ga-eji Nwee Olileanya
Echiche ndị a sitere n’Akwụkwọ Nsọ pụrụ inye aka mee ka i nwekwuo olileanya:
◼ Chineke na-ekwe nkwa ọdịnihu obi ụtọ.
Okwu ya na-ekwu na ụwa ga-aghọ paradaịs zuru ụwa ọnụ, nke ezinụlọ mmadụ nke nwere obi ụtọ ma dị n’otu, ga-ebi na ya.—Abụ Ọma 37:11, 29; Aịsaịa 25:8; Mkpughe 21:3, 4.
◼ Chineke apụghị ịgha ụgha.
Ọ kpọrọ ịgha ụgha asị n’ụdị ya nile. Jehova na-adị nsọ n’ụzọ na-enweghị nkwụsị, bụrụkwa onye na-enweghị ntụpọ, n’ihi ya, ọ pụghị ịgha ụgha.—Ilu 6:16-19; Aịsaịa 6:2, 3; Taịtọs 1:2; Ndị Hibru 6:18.
◼ Chineke nwere ike a na-akparaghị ókè.
Nanị Jehova bụ onye pụrụ ime ihe nile. Ọ dịghị ihe ọ bụla dị n’eluigwe na ala nke pụrụ igbochi ya imezu nkwa ya nile.—Ọpụpụ 15:11; Aịsaịa 40:25, 26.
◼ Chineke chọrọ ka ị dị ndụ ebighị ebi.
◼ Chineke na-enwe olileanya n’ebe anyị nọ.
Ọ na-ahọrọ ilekwasị anya, ọ bụghị ná mmejọ anyị, kama n’ebe ndị anyị na-eme nke ọma nakwa ná mgbalị nile anyị. (Abụ Ọma 103:12-14; 130:3; Ndị Hibru 6:10) Ọ na-enwe olileanya na anyị ga-eme ihe ziri ezi, ọ na-enwekwa obi ụtọ mgbe anyị mere otú ahụ.—Ilu 27:11.
◼ Chineke na-ekwe nkwa inyere gị aka iru ihe mgbaru ọsọ ndị kwekọrọ ná nzube ya.
Ọ dịghị ndị ohu ya mkpa iche na ha bụ ndị na-enweghị enyemaka. Chineke na-enye mmụọ nsọ ya n’ụba, bụ́ ike kasịnụ e nwere, iji nyere anyị aka.—Ndị Filipaị 4:13.
◼ Olileanya e nwere n’ebe Chineke nọ ehieghị ụzọ ma ọlị.
Ebe ọ bụ onye a pụrụ ịdabere n’ebe ọ nọ nakwa onye a pụrụ ịtụkwasị obi kpam kpam, ọ gaghị emechu gị ihu ma ọlị.—Abụ Ọma 25:3.
[Foto dị na peeji nke 22]
Dị ka okpu ígwè na-esi echebe isi, otú ahụ ka olileanya si echebe uche
[Foto dị na peeji nke 22]
Dị ka arịlịka, olileanya nwere ntọala siri ike pụrụ ime ka ị kwụrụ chịm
[Ebe E Si Nweta Foto]
Site n’ikike nke René Seindal/Su concessione del Museo Archeologico Regionale A. Salinas di Palermo
-