Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w23 Nọvemba p. 2-7
  • Otú Jehova Si Mee Ka Obi Sie Anyị Ike na Ụwa Ga-aghọ Paradaịs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Jehova Si Mee Ka Obi Sie Anyị Ike na Ụwa Ga-aghọ Paradaịs
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • GỊNỊ KA JEHOVA KWERE ANYỊ NÁ NKWA?
  • JEHOVA NA-EME KA OBI SIE ANYỊ IKE NA NKWA YA GA-EMEZU
  • “ANA M EME IHE NIILE KA HA DỊ ỌHỤRỤ”
  • “E KWESỊRỊ ỊTỤKWASỊ OKWU NDỊ A OBI, HA BỤKWA EZIOKWU. . . . HA EMEZUOLA”
  • “ABỤ M ALFA NA OMEGA”
  • IHE ANYỊ GA-EME KA OBI SIKWUO ANYỊ IKE NA JEHOVA GA-EMEZU NKWA O KWERE IWETA PARADAỊS
  • Ònye ma Ọ Bụ Gịnị Bụ “Alfa na Omega”?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Eluigwe Ọhụrụ na Ụwa Ọhụrụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Gịnị Ka Chineke Bu n’Obi Kee Ụmụ Mmadụ?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
w23 Nọvemba p. 2-7

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 46

Otú Jehova Si Mee Ka Obi Sie Anyị Ike na Ụwa Ga-aghọ Paradaịs

“Onye ọ bụla nke chọrọ ka a gọzie ya n’ụwa rịọ Chineke, onye na-ekwu eziokwu, ka ọ gọzie ya.”​—AỊZA. 65:16.

ABỤ NKE 3 Ị Bụ Ike Anyị, Olileanya Anyị, na Obi Ike Anyị

IHE ISIOKWU A NA-EKWUa

1. Gịnị ka Aịzaya onye amụma gwara ndị Izrel ibe ya?

AỊZAYA onye amụma kwuru na Jehova bụ “Chineke, onye na-ekwu eziokwu.” Okwu Hibru a sụgharịrị “eziokwu” bụ “amen.” (Ihe e dere n’ala ala peeji Aịza. 65:16.) “Amen” pụtara “ka ọ dị otú ahụ.” Na Baịbụl, e kwuo “amen” n’ihe gbasara Jehova ma ọ bụ Jizọs, ọ na-eme ka obi sie anyị ike na ihe ha kwuru bụ eziokwu. N’ihi ya, ihe Aịzaya na-agwa ndị Izrel bụ: Mgbe ọ bụla Jehova kwuru ihe ga-eme, ọ na-emezu. Jehova egosila na ihe a bụ eziokwu n’ihi na ọ na-emezu ihe ọ bụla o kwere ná nkwa.

2. Gịnị mere obi ji sie anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa o kwere maka ọdịnihu? Oleekwa ajụjụ ndị anyị ga-aza?

2 Obi ọ̀ ga-esili anyị ike na nkwa ndị Jehova kwere maka ọdịnihu ga-emezu? Ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ narị afọ asatọ (800) mgbe oge Aịzaya gafechara, Pọl onyeozi kọwara ihe mere e ji kwesị ịtụkwasị nkwa Jehova obi mgbe niile. Ọ sịrị: ‘Chineke emekataghị ghaa ụgha.’ (Hib. 6:18) Otu isi iyi agaghị na-asọpụta mmiri dị mma na mmiri na-atọ nnu nnu. Otú ahụ ka Jehova bụ́ onye eziokwu na-agaghị agha ụgha. N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na ihe ọ bụla Jehova kwuru ga-emezu, ma nkwa niile o kwere maka ọdịnihu. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ajụjụ ndị a: Olee ihe Jehova kwere nkwa imere anyị n’ọdịnihu? Oleekwa otú Jehova si mee ka obi sie anyị ike na nkwa ya ga-emezu?

GỊNỊ KA JEHOVA KWERE ANYỊ NÁ NKWA?

3. (a) Olee nkwa na-atọgbu ndị ohu Jehova atọgbu? (Mkpughe 21:3, 4) (b) Gịnị ka ụfọdụ ndị na-eme ma anyị gụọrọ ha nkwa ahụ?

3 Nkwa Jehova anyị ga-eleba anya na ya bụ nkwa ndị na-efe Jehova n’ụwa niile ma nke ọma. (Gụọ Mkpughe 21:3, 4.) Jehova kwere nkwa na oge na-abịa mgbe ‘ọnwụ na-agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị.’ Ọtụtụ n’ime anyị na-agụrụ ndị mmadụ amaokwu Baịbụl ndị a na-agba ume n’ozi ọma iji gosi ha otú ibi na Paradaịs ga-adị. Olee ihe ụfọdụ ndị na-eme ma anyị gụọrọ ha nkwa a? Ha nwere ike ịsị, “Ihe ndị a magburu onwe ha, ma ha yiri ihe na-agaghị ekwe omume.”

4. (a) Mgbe Jehova kwere nkwa ime ka ụwa ghọọ Paradaịs, olee ihe ọ ma ga-eme n’oge anyị? (b) E wepụ ikwe nkwa, olee ihe ọzọ Jehova mere?

4 N’eziokwu, mgbe Jehova mere ka Jọn onyeozi dee gbasara nkwa o kwere maka otú ndụ ga-adị na Paradaịs, ọ ma na anyị ga na-akọrọ ndị mmadụ gbasara nkwa a ma anyị na-ezi ha ozi ọma. Jehova makwa na ọ ga-esiri ọtụtụ ndị ike ikweta “ihe ndị ọhụrụ” o kwere nkwa imere anyị. (Aịza. 42:9; 60:2; 2 Kọr. 4:3, 4) N’ihi ya, olee otú anyị ga-esi eme ka obi sie ndị ọzọ ike, siekwa anyịnwa ike, na ihe ndị e dere ná Mkpughe 21:3, 4 ga-emezu? Ihe Jehova mere abụghị naanị ikwe anyị nkwa na-eme anyị obi ụtọ, kama ọ gwakwara anyị ihe ndị mere anyị ga-eji tụkwasị ya obi na ọ ga-emezu nkwa ya. Olee ihe ndị ọ bụ?

JEHOVA NA-EME KA OBI SIE ANYỊ IKE NA NKWA YA GA-EMEZU

5. Olee ihe ndị kwesịrị ime ka obi sie anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa o kwere ime ka ụwa ghọọ Paradaịs, oleekwa ebe e dere ha?

5 Amaokwu nke 5 na nke 6 na-eme ka anyị tụkwasị Jehova obi na nkwa o kwere na ụwa ga-aghọ Paradaịs ga-emezu. Ebe ahụ sịrị: “Chineke, onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ, sịkwara: ‘Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.’ Ọ sịkwara: ‘Dee ha edee, n’ihi na e kwesịrị ịtụkwasị okwu ndị a obi, ha bụkwa eziokwu.’ Ọ sịkwara m: ‘Ha emezuola. Abụ m Alfa na Omega, mmalite na ọgwụgwụ.’​—Mkpu. 21:5, 6a.

6. Gịnị mere ihe e kwuru ná Mkpughe 21:5, 6 ji eme ka anyị tụkwasịkwuo nkwa Jehova kwere obi?

6 Olee ihe mere ihe ndị e kwuru n’amaokwu Baịbụl ndị a ji eme ka anyị tụkwasị nkwa Chineke obi? Akwụkwọ Mmezu Mkpughe kwuru gbasara amaokwu ndị ahụ, sị: “Ọ bụ nnọọ dị ka à ga-asị na Jehova n’onwe ya na-abịanyere ihe a kpọrọ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi aka n’akwụkwọ ikwe nkwa, ma ọ bụ akwụkwọ na-enye ike, inweta ngọzi ndị a n’ọdịnihu.”b E dere nkwa Chineke kwere anyị ná Mkpughe 21:3, 4. Ma, n’amaokwu nke 5 na nke 6, anyị na-ahụ ihe Jehova mere nke dị ka à ga-asị na ọ bịanyere aka n’akwụkwọ, na-emesi anyị obi ike na nkwa ya ga-emezu. Ka anyị lee otú Jehova si mee ka obi sie anyị ike na nkwa ya ga-emezu.

7. Olee onye malitere ikwu okwu n’amaokwu nke 5, oleekwa ihe mere ihe o kwuru ji pụọ iche?

7 Ihe amaokwu nke 5 ji bido bụ: “Chineke, onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ, sịkwara.” (Mkpu. 21:5a) Ihe ndị e kwuru ebe a pụrụ iche n’ihi na ọ bụ otu ugboro n’ime naanị ugboro atọ akwụkwọ Mkpughe kwuru ihe Jehova n’onwe ya kwuru. N’ihi ya, ọ bụghị mmụọ ozi dị ike ma ọ bụ Jizọs mere ka obi sie anyị ike na nkwa a ga-emezu, kama ọ bụ Jehova n’onwe ya. Ihe a gosiri na anyị kwesịrị ịtụkwasị ihe ọzọ o kwuru obi. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jehova ‘enweghị ike ịgha ụgha.’ (Taị. 1:2) Ihe a mere ka obi sie anyị ezigbo ike na ihe e kwuru ná Mkpughe 21:5, 6 ga-emezurịrị.

“ANA M EME IHE NIILE KA HA DỊ ỌHỤRỤ”

8. Olee otú Jehova si mee ka obi sie anyị ike na ọ ga-emezu nkwa ọ bụla o kwere? (Aịzaya 46:10)

8 Ihe ọzọ Chineke kwuru bụ: “Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.” N’eziokwu, Jehova na-ekwu gbasara ihe ndị ga-agbanwe n’ọdịnihu. Ma, obi siri ya ezigbo ike na ihe ndị ahụ ga-emezu nke na mgbe ọ na-ekwu gbasara ha, o kwuru ha ka à ga-asị na ha emewela emewe.​—Gụọ Aịzaya 46:10.

9. (a) Olee ihe abụọ ‘ime ihe niile ka ha dị ọhụrụ’ gosiri na Jehova ga-eme? (b) Gịnị ga-eme “eluigwe” na “ụwa” dị ugbu a?

9 Ka anyị leba anya n’ihe ọzọ Jehova kwuru ná Mkpughe 21:5. Ọ sịrị: “Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.” Gịnị ka ọ pụtara? Ọ pụtara na e nwere ihe abụọ Jehova ga-eme. Nke mbụ, Jehova ga-ebibi ihe ochie. Nke abụọ, ọ ga-eweta ihe ọhụrụ. Mkpughe 21:1 sịrị: “Eluigwe mbụ na ụwa mbụ alaala n’iyi.” “Eluigwe mbụ” bụ ọchịchị ụmụ mmadụ dị n’aka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. (Mat. 4:8, 9; 1 Jọn 5:19) Na Baịbụl, “ụwa” nwere ike ịpụta ụmụ mmadụ bi n’ụwa. (Jen. 11:1; Ọma 96:1) N’ihi ya, “ụwa mbụ” bụ ndị ajọ omume nọ n’ụwa taa. Ihe Jehova ga-eme abụghị imezi “eluigwe” na “ụwa” dị ugbu a, kama, ọ ga-ebibi ha kpamkpam. Ihe ọ ga-eji dochie ha bụ “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ,” nke pụtara na a ga-enwe ọchịchị ọhụrụ nke ga-achị ndị ezi omume.

10. Olee ihe Jehova ga-eme ka ọ dị ọhụrụ?

10 Mkpughe 21:5 kwuru ihe ọzọ Jehova kwuru gbasara ihe ndị ọ ga-eme ka ha dị ọhụrụ. N’ebe a, Jehova asịghị: “Ana m eme ihe ọhụrụ niile.” Kama, ọ sịrị: “Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.” Jehova ga-eme ka ụwa na ụmụ mmadụ dị ọhụrụ, n’ihi na ọ ga-eme ka ha zuo okè. Dị ka Aịzaya kwuru, a ga-eme ka ụwa niile bụrụ ebe mara mma nke ga-adị ka ogige Iden. A ga-emekwa ka anyịnwa dị ọhụrụ, ya bụ, a ga-agwọ onye ọ bụla n’ime anyị ọrịa ọ bụla na-arịa ya kpamkpam. A ga-agwọ ndị ngwọrọ, ndị ìsì, na ndị ntị chiri, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.​—Aịza. 25:8; 35:1-7.

“E KWESỊRỊ ỊTỤKWASỊ OKWU NDỊ A OBI, HA BỤKWA EZIOKWU. . . . HA EMEZUOLA”

11. Gịnị ka Jehova gwara Jọn ka o mee, maka gịnị?

11 Olee ihe ọzọ Jehova kwuru iji mee ka obi sie anyị ike na anyị ga-atụkwasịli ya obi? Jehova gwara Jọn, sị: “Dee ha edee, n’ihi na e kwesịrị ịtụkwasị okwu ndị a obi, ha bụkwa eziokwu.” (Mkpu. 21:5) Ihe Jehova gwara Jọn abụghị naanị ka o “dee ha edee,” o kwukwara ihe mere ọ ga-eji mee ya. Ọ sịrị: “N’ihi na e kwesịrị ịtụkwasị okwu ndị a obi, ha bụkwa eziokwu,” ya bụ, na a ga-atụkwasịli ihe Jehova kwuru obi. Obi dị anyị ụtọ na Jọn rubere isi “dee” ihe ndị ahụ. Ọ bụ ya mere na anyị nwere ike ịgụ nkwa ndị Chineke kwere gbasara Paradaịs ma tụgharịa uche n’ihe ọma ndị ga-abịara anyị n’ọdịnihu.

12. Gịnị mere Jehova ji sị: “Ha emezuola”?

12 Olee ihe ọzọ Chineke kwuru? Ọ sịrị: “Ha emezuola.” (Mkpu. 21:6) N’ebe a, Jehova na-ekwu ka à ga-asị na ihe niile e kwuru gbasara Paradaịs emezuola. O nwekwara ikike ime otú ahụ n’ihi na e nweghị ihe ọ bụla ga-egbochi ya imezu nzube ya. Jehova kwukwara ihe ọzọ ga-emesi anyị obi ike na nkwa ya ga-emezurịrị. Olee ihe ọ bụ?

“ABỤ M ALFA NA OMEGA”

13. Olee ihe mere Jehova ji kwuo, sị: “Abụ m Alfa na Omega”?

13 Dị ka anyị kwuburu, Jehova kwuru okwu ugboro atọ n’ọhụụ ndị ahụ Jọn hụrụ. (Mkpu. 1:8; 21:5, 6; 22:13) Na nke ọ bụla n’ime ha, Jehova kwuru, sị: “Abụ m Alfa na Omega.” Ihe bidoro abịịdịị ndị Grik bụ alfa, nke ikpeazụ ya abụrụ omega. Mgbe Jehova kwuru “Alfa na Omega,” ihe ọ na-ekwu bụ na mgbe ọ bụla ọ malitere ime ihe, ọ na-emecharịrị ya.

Foto ndị na-egosi: Otú nzube Jehova si emezu. 1. “Alfa.” Ebe Adam na Iv nọ n’ogige Iden. 2. Ihe nnupụisi kpatara. Foto ndị na-egosi ya bụ Setan, mgbe Adam na Iv kara nká, ụlọ elu Babel, ili, ndị agha, ụgbọala e ji alụ agha, ụgbọelu ndị e ji alụ agha, otú ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ihe si emebi ikuku, na ndị na-eme ngagharị iwe. E nwere foto abụọ ọzọ na-egosi otú nzube Jehova si na-emezu: Ebe a kpọgidere Jizọs n’osisi ịta ahụhụ, nke na-egosi otú Jehova si gbapụta ụmụ mmadụ, nakwa ndị ohu Jehova ma n’oge gara aga ma n’oge a, ndị nọchiri anya ụmụ Adam na Iv bụ́ ndị ezi omume. 3. “Omega.” Ebe ndị mmadụ na-arụkọ ọrụ ọnụ ma na-ekpori ndụ na Paradaịs.

Mgbe ọ bụla Jehova malitere ime ihe, ọ na-emeru ya n’isi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 na nke 17)

14. (a) Olee mgbe e nwere ike ikwu na Jehova sịrị “Alfa,” oleekwa mgbe ọ ga-adị ka ọ̀ sịrị “Omega”? (b) Olee ihe e kwuru na Jenesis 2:1-3 na-eme ka obi sie anyị ike?

14 Mgbe Jehova kechara Adam na Iv, o kwuru ihe bụ́ nzube ya maka ụmụ mmadụ na ụwa. Baịbụl sịrị: “Chineke gọziri ha. Chineke sịkwara ha: ‘Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, junụ n’ụwa, na-elekọtakwanụ ya.’” (Jen. 1:28) N’oge ahụ, e nwere ike ikwu na Jehova sịrị “Alfa.” O mere ka nzube ya doo anya, ya bụ, na oge na-abịa mgbe ụmụ Adam na Iv na-erube isi ma zuo okè ga-eju n’ụwa, mee ka ọ ghọọ paradaịs. Mgbe Jehova mezuchara nzube ya a, ọ ga-adị ka ebe ọ sịrị “Omega.” Mgbe o kechara “eluigwe na ụwa na ihe niile dị na ha,” o kwuru ihe gosiri na nzube ya ga-emezurịrị. E dere ya na Jenesis 2:1-3. (Gụọ ya.) Jehova kwuru na ụbọchị nke asaa dị nsọ. Olee ihe ọ pụtara? Jehova mere ka obi sie anyị ike na e nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara imezu nzube ya maka ụmụ mmadụ na ụwa. Ọ ga-emezucha ya ná ngwụcha ụbọchị nke asaa ahụ.

15. Gịnị mere o ji yie ka Setan ò gbochiri Jehova imezu nzube ya maka ụmụ mmadụ?

15 Mgbe Adam na Iv nupụchaara Jehova isi, ha ghọrọ ndị mmehie ma mee ka ụmụ ha keta mmehie na ọnwụ. (Rom 5:12) Ihe a mere ka o yie ka Setan ọ̀ kụghasịrị nzube Jehova nke bụ́ na ụmụ mmadụ zuru okè ma na-erubere ya isi ga-eju n’ụwa. O yiri ka ò mere ka ọ ghara ikwe Jehova omume ịsị “Omega.” Ekwensu nwere ike iche na Jehova agaghị emezuli nzube ya. O nwere ike iche na Jehova ga-egbu Adam na Iv, kee di na nwunye ọzọ zuru okè iji mezuo nzube ya maka ụmụ mmadụ. Ma, ọ bụrụ na Jehova mere otú ahụ, Ekwensu gaara ekwu na Jehova bụ onye ụgha. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe Jehova gwara Adam na Iv na Jenesis 1:28 bụ na ọ bụ ụmụ ha ga-eju ụwa.

16. Gịnị ka ọ ga-abụ ya mere Setan ji chee na Jehova agaghị emezuli nzube ya?

16 Olee ihe ọzọ Setan nwere ike iche na Jehova ga-eme? Ọ ga-abụ na Setan chere na Jehova ga-ahapụ Adam na Iv ka ha mụọ ụmụ na-ezughị okè, ndị na-enweghị mgbe ọ bụla ha ga-ezu okè. (Ekli. 7:20; Rom 3:23) A sị na Jehova mere otú ahụ, Setan gaara ekwu na nzube Jehova kụrụ afọ n’ala. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe a agaghị emezu nzube Jehova, ya bụ, na ọ bụ ụmụ Adam na Iv zuru okè, ndị na-erubekwara Jehova isi, ga-eju ụwa.

17. Mgbe Setan na Adam na Iv nupụụrụ Jehova isi, gịnị ka Jehova mere, oleekwa ihe ga-emecha mee? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

17 Ọ ga-abụrịrị na otú Jehova si dozie okwu ahụ mgbe Setan na Adam na Iv nupụụrụ ya isi riri Setan ọnụ. (Ọma 92:5) Jehova kwere ka Adam na Iv mụọ ụmụ, si otú ahụ mezuo okwu ya. Jehova abụghị onye ụgha. O gosikwara na ọ bụrụ na o kwuo ihe, e nweghị ihe ga-egbochi ya imezu ya. O mere ihe iji jide n’aka na nzube ya ga-emezurịrị. O mere ka e nwee “nwa” ga-anapụta ụmụ Adam na Iv ga-erubere ya isi. (Jen. 3:15; 22:18) Ọ ga-abụrịrị na ndokwa a Jehova mere ka e nwee onye mgbapụta juru Setan anya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe mgbapụta ahụ gosiri na Jehova hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, ọ naghịkwa achọ ihe ga-abara naanị onwe ya uru. (Mat. 20:28; Jọn 3:16) Setan enweghị ịhụnanya. Ọ na-achọ ihe ga-abara naanị onwe ya uru. Gịnịzi ga-eme n’ihi na Jehova nyere ihe mgbapụta? Ná ngwụcha otu puku afọ ahụ Jizọs ga-achị, ụmụ Adam na Iv ndị na-erubere Jehova isi, ndị zukwara okè, ga-enweta ụwa nke ga-abụ paradaịs otú ahụ Jehova kwuru na mbụ. N’oge ahụ, ọ ga-eyi ka Jehova ọ̀ sịrị “Omega.”

IHE ANYỊ GA-EME KA OBI SIKWUO ANYỊ IKE NA JEHOVA GA-EMEZU NKWA O KWERE IWETA PARADAỊS

18. Olee ihe atọ Jehova kwuru na-eme ka obi sie anyị ike? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Ihe Atọ Mere Anyị Ga-eji Tụkwasị Nkwa Jehova Obi.”)

18 N’isiokwu a, anyị elebala anya n’ihe ndị mere ka obi sie anyị ike na ụwa ga-aghọ Paradaịs. Olee ihe anyị nwere ike ịgwa ndị ọzọ iji mee ka obi sie ha ike na ihe a ga-emerịrị? Nke mbụ, ọ bụ Jehova n’onwe ya kwere nkwa ahụ. Akwụkwọ Mkpughe sịrị: “Chineke, onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ, sịkwara: ‘Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.’” Jehova ma otú ọ ga-esi mezuo nkwa ya. O nwere ikike ime ya, chọọkwa ime ya. Nke abụọ, Jehova ma na ihe ọ bụla o kwuru ga-emerịrị. Ọ bụ ya mere o ji sị: “E kwesịrị ịtụkwasị okwu ndị a obi, ha bụkwa eziokwu. . . . Ha emezuola.” Nke atọ, Jehova bido ime ihe, ọ na-eme ya ruo n’isi. Ọ bụ ya mere o ji sị: “Abụ m Alfa na Omega.” Jehova ga-egosi na Setan bụ onye ụgha nakwa na ọ gaghị egbochili ya imezu nzube ya.

Ihe Atọ Mere Anyị Ga-eji Tụkwasị Nkwa Jehova Obi

Ocheeze na-enwu gbaa, nke nọchiri anya Jehova.
  • “Chineke, onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ, sịkwara: ‘Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.’”​—Mkpu. 21:5.

Ebe Jọn onyeozi na-ede ihe n’akpụkpọ anụ e ji ede ihe.
  • “Ọ sịkwara: ‘Dee ha edee, n’ihi na e kwesịrị ịtụkwasị okwu ndị a obi, ha bụkwa eziokwu. . . . Ha emezuola.”​—Mkpu. 21:5, 6.

Mkpụrụ akwụkwọ ndị Grik bụ́ alfa na omega.
  • “Abụ m Alfa na Omega.”​—Mkpu. 21:6.

19. Ọ bụrụ na o siere mmadụ ike ikweta na Jehova ga-eme ka ụwa ghọọ Paradaịs, olee ihe i nwere ike ime?

19 Cheta na mgbe ọ bụla ị nọ n’ozi ọma gwa mmadụ ihe ga-eme ka obi sie ya ike na nkwa Jehova kwere ga-emezu, ọ na-emekwa ka ị tụkwasịkwuo Jehova obi na ọ ga-emezu nzube ya. N’ihi ya, mgbe ọzọ ị ga-agụrụ mmadụ nkwa Chineke kwere ná Mkpughe 21:4 gbasara Paradaịs na-abịanụ, onye ahụ asị: “Ihe a yichara ihe na-agaghị ekwe omume,” gịnị ka i nwere ike ime? Ọ ga-adị mma ka ị gụọrọ ya amaokwu nke 5 na nke 6 ma kọwaa ya. Gosi ya ihe Jehova mere nke yiri ịbịanyere anyị aka n’akwụkwọ iji gosi na ihe o kwuru ga-emerịrị.​—Aịza. 65:16.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Gịnị mere nkwa Jehova ji aka ya kwe na ọ ga-eme ka ụwa ghọọ Paradaịs ji agba anyị ume?

  • Olee ihe Jehova kwuru iji mee ka obi sie anyị ike na nkwa ya ga-emezu?

  • Gịnị ka anyị ga-eme ka obi sikwuo anyị ike na nkwa Jehova ga-emezu?

ABỤ NKE 145 Chineke Kwere Anyị Nkwa Paradaịs

a N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ndị Jehova kwuru iji mee ka obi sie anyị ike na nkwa o kwere ime ka ụwa ghọọ Paradaịs ga-emezu. Mgbe ọ bụla anyị gwara ndị ọzọ ihe ndị a, ọ na-eme ka obi sikwuo anyị ike na nkwa ndị Jehova kwere ga-emezu.

b Gụọ akwụkwọ Mkpughe​—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! peeji nke 303, paragraf nke 8 na nke 9.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya