Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w23 Septemba p. 20-25
  • Nọsie Ike n’Ozi Chineke Otú Pita Mere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nọsie Ike n’Ozi Chineke Otú Pita Mere
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE NDỊ HA NA PITA LỤRỤ NA NGỌZI NDỊ O NWETARA
  • OLEE IHE NYEERE PITA AKA ỊNỌSI IKE N’OFUFE JEHOVA?
  • GỊNỊ KA ANYỊ NA-AMỤTA?
  • Jizọs Kụziiri Ya Ihe Bụ́ Ịgbaghara Mmadụ Mmehie
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Ka Anyị Jisie Okwukwe Anyị Dị Oké Ọnụ Ahịa Ike!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ọ Mụtara Mgbaghara n’Aka Nna Ya Ukwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ọ Kwụsiri Ike Mgbe Ọnwụnwa Bịaara Ya
    Ṅomie Okwukwe Ha
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
w23 Septemba p. 20-25

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 40

Nọsie Ike n’Ozi Chineke Otú Pita Mere

“Onyenwe anyị, si ebe m nọ pụọ, n’ihi na abụ m onye mmehie.”​—LUK 5:8.

ABỤ NKE 38 Ọ Ga-eme Ka I Sie Ike

IHE ISIOKWU A NA-EKWUa

1. Gịnị ka Pita mere mgbe Jizọs rụrụ ọrụ ebube mee ka o gbute ọtụtụ azụ̀?

PITA ji abalị niile kụọ azụ̀ n’enweghị azụ̀ ọ bụla o gbutere. N’ihi ya, ọ tụrụ ya n’anya mgbe Jizọs sịrị ya: “Kwọrọ ụgbọ a banye n’ebe miri emi, wụnyekwanụ ụgbụ unu ka unu gbute azụ̀.” (Luk 5:4) Ọ nọ na-eme Pita obi abụọ ma ọ̀ ga-egbute azụ̀ ọ bụla. Ma, o mere ihe Jizọs gwara ya. Ụgbụ ha wụnyere ná mmiri malitere ịdọkasị n’ihi ọtụtụ azụ̀ ha gbutere. Mgbe Pita na ndị ya na ha so chọpụtara na ihe ahụ bụ ọrụ ebube, ‘o juru ha anya.’ Pita tiri mkpu, sị: “Onyenwe anyị, si ebe m nọ pụọ, n’ihi na abụ m onye mmehie.” (Luk 5:6-9) Ọ ga-abụ na Pita chere na ya erughị eru ịnọ n’ihu Jizọs.

2. Olee ihe mere ịmụ akụkọ Pita ga-eji abara anyị uru?

2 Ihe Pita kwuru bụ eziokwu. Ọ bụ “onye mmehie.” Baịbụl kwuru na e nwere mgbe ụfọdụ Pita kwuru ma mee ihe o mechara kwaara mmakwaara. È nwere mgbe ọ na-adị gị otú ahụ ọ dị Pita? È nwere àgwà na-adịghị mma gị na ya na-alụ kemgbe ma ọ bụ ihe ị na-anaghị emeta? Ọ bụrụ otú ahụ, ịmụ gbasara Pita ga-eme ka obi sie gị ike. Olee otú ọ ga-esi eme ya? Chegodị ihe a. Chineke gaara eme ka a ghara ide ihe ndị Pita mejọrọ na Baịbụl. Ma, o ji mmụọ nsọ ya mee ka e dee ha, ka anyị si na ha mụta ihe. (2 Tim. 3:16, 17) Pita nwere ihe ụfọdụ ọ na-emejọ dịkwa ka anyị. Obi na-adịkwa ya otú ọ na-adị anyị. N’ihi ya, ịmụ gbasara ya nwere ike inyere anyị aka ịghọta na Jehova anaghị atụ anya ka anyị zuo okè. Jehova chọrọ ka anyị nọsie ike na-efe ya, ya bụ, ka anyị na-agbasi mbọ ike, n’agbanyeghị ezughị okè anyị.

3. Gịnị mere anyị ji kwesị ịnọsi ike n’ozi Chineke?

3 Gịnị mere o ji dị mkpa ka ike ghara ịgwụ anyị? Ọ bụrụ na anyị ana-eme otu ihe ọtụtụ mgbe, anyị ga na-emekwu ihe ahụ nke ọma. Dị ka ihe atụ, onye na-akpọ ụbọ nwere ike ịmụ ịkpọ ụbọ ruo ọtụtụ afọ. N’oge ndị ahụ, o nwere ike ịkpọjọ ụbọ ahụ ọtụtụ ugboro. Ma, ọ bụrụ na ike agwụghị ya ịkpọ ụbọ ahụ, ọ ga na-amụtakwu ya. Ọ bụrụgodị na ọ ghọọla aka ochie n’ịkpọ ụbọ, ọ ka nwere ike ịkpọjọ ya mgbe ụfọdụ. Mana, ike agaghị agwụ ya. Ọ bụrụ na ọ nọsie ike na-amụ ịkpọ ụbọ, ọ ga na-amụtakwu ya nke ọma. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Ọ bụrụgodị na anyị echee na anyị akwụsịla ihe anyị na-anaghị emetacha, e nwere mgbe ụfọdụ anyị nwere ike ime ya ọzọ. Ma, ike agaghị agwụ anyị ịgba mbọ na-emekwu nke ọma. Anyị niile na-ekwu ma ọ bụ na-eme ihe anyị na-emecha kwaara mmakwaara. Ma, ọ bụrụ na ike agwụghị anyị, Jehova ga-enyere anyị aka ịna-emekwu nke ọma. (1 Pita 5:10) Ka anyị leba anya n’otú Pita si nọsie ike n’ozi Chineke. Otú Jizọs si nweere ya ọmịiko n’agbanyeghị ihe ndị o mejọrọ nwere ike ime ka ike ghara ịgwụ anyị ife Jehova.

IHE NDỊ HA NA PITA LỤRỤ NA NGỌZI NDỊ O NWETARA

Ebe ụjọ jidere Pita, ya anọrọkwa ka onye o riri ọnụ mgbe ụgbụ ya azụ̀ juru malitere ime ka ụgbọ ha mikpuwe ná mmiri. Jizọs na-ege Pita ntị nke ọma ka onye nke ọzọ nọ ebe ahụ na-agbalị ịdọbata ụgbụ ahụ n’ụgbọ.

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ụdị ihe mere Pita emee gị? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4)

4. Dị ka a kọrọ na Luk 5:5-10, olee ihe Pita kwuru gbasara onwe ya, ma olee otú Jizọs si mesie ya obi ike?

4 Baịbụl ekwughị ihe mere Pita ji sị na ya bụ “onye mmehie” ma ọ bụkwanụ mmehie ndị o bu n’obi kwuo ya. (Gụọ Luk 5:5-10.) Ma, ọ ga-abụ na e nwere mgbe o mere ihe ụfọdụ dị ezigbo njọ. Jizọs ghọtara na ụjọ ji Pita. O nwere ike ịbụ maka na Pita chere na ya erughị eru. Jizọs makwa na Pita nwere ike ịnọsi ike n’ofufe Jehova. N’ihi ya, Jizọs weturu obi gwa Pita ka ọ “kwụsị ịtụ egwu.” Otú Jizọs si gosi Pita na ọ tụkwasịrị ya obi gbanwere ndụ Pita. Pita na nwanne ya nwoke bụ́ Andru mechara hapụ ọrụ ịgbu azụ̀ ha na-arụ ma jiri oge ha niile na-eso ụzọ Mezaya. Ihe a ha kpebiri ime mere ka Chineke gọzie ha ngọzi na-enweghị atụ.​—Mak 1:16-18.

5. Olee uru Pita ritere n’ihi na o kweghị ka otú o si ele onwe ya anya mee ka ọ kwụsị ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs?

5 E nwere ọtụtụ ihe magburu onwe ha Pita hụrụ mgbe ọ na-eso ụzọ Jizọs. Ọ hụrụ ka Jizọs gwọrọ ndị ọrịa, chụpụ ndị mmụọ ọjọọ, kpọlitedị ndị nwụrụ anwụ.b (Mat. 8:14-17; Mak 5:37, 41, 42) Pita hụkwara ọhụụ otú Jizọs ga-esi adị ebube n’Alaeze ya n’ọdịnihu. Ihe a Pita hụrụ bụ ihe ọ na-agaghị echefu echefu. (Mak 9:1-8; 2 Pita 1:16-18) N’eziokwu, Pita agaraghị ahụ ihe ndị ahụ ma ọ bụrụ na ọ bụghị onye na-eso ụzọ Jizọs. O doro anya na obi tọgburu ya atọgbu na o kweghị ka otú na-adịghị mma o si ele onwe ya anya mee ka ihe ndị a kwaa ya.

6. Pita ọ̀ kwụsịrị àgwà ndị na-adịghị mma ọ na-akpa ozugbo? Kọwaa.

6 N’agbanyeghị ihe ndị Pita ji anya ya hụ na ihe ndị ọ nụrụ, a ka nwere ihe ndị ọ na-anaghị emetacha. Legodị ihe atụ ụfọdụ. Mgbe Jizọs kọwara ụdị ahụhụ ọ ga-ata na ụdị ọnwụ ọ ga-anwụ iji mezuo amụma Baịbụl, Pita baara ya mba. (Mak 8:31-33) E nwekwara ọtụtụ oge Pita na ndịozi ndị ọzọ rụrụ ụka gbasara onye kachanụ n’ime ha. (Mak 9:33, 34) N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, Pita gbupụrụ otu nwoke ntị. (Jọn 18:10) N’otu abalị ahụkwa, Pita tụrụ ụjọ ma gọnahụ enyi ya Jizọs ugboro atọ. (Mak 14:66-72) Ihe a mere ka Pita bee ezigbo ákwá.​—Mat. 26:75.

7. Olee ohere Jizọs nyere Pita mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ?

7 Jizọs ahapụghị onyeozi ya a obi gbawara. Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, o nyere Pita ohere igosi na ọ hụrụ ya n’anya. Jizọs gwara ya ka o wetuo obi na-azụ atụrụ ya. (Jọn 21:15-17) Pita kwetara. Ọ nọ na Jeruselem n’ụbọchị Pentikọst, sorokwa ná ndị mbụ e ji mmụọ nsọ tee mmanụ.

8. Olee ihe dị ezigbo njọ Pita mere n’Antiọk?

8 Mgbe Pita ghọchadịrị Onye Kraịst e tere mmanụ, a ka nwere ihe ndị ọ na-emejọ. N’afọ 36 Oge Ndị Kraịst, Pita nọ ya mgbe e ji mmụọ nsọ tee Kọnịliọs na-abụghị onye Juu mmanụ. Ihe a gosiri na “Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu” nakwa na ndị na-abụghị ndị Juu nwere ike iso n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (Ọrụ 10:34, 44, 45) Mgbe ihe a mechara, Pita na ndị na-abụghị ndị Juu na-erikọzi nri, nke bụ́ ihe ọ na-agaghị echetụdị n’echiche ime n’oge mbụ. (Gal. 2:12) Ma, ụfọdụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst chere na ha na ndị na-abụghị ndị Juu ekwesịghị ịna-erikọ nri. Mgbe ụfọdụ n’ime ha bịara Antịọk, Pita kwụsịrị iso ndị na-abụghị ndị Juu na-eri nri. Ọ ga-abụ na ụjọ ya bụ ka ọ ghara ịkpasu ụmụnna ya bụ́ ndị Juu iwe. Mgbe Pọl hụrụ omume ihu abụọ a Pita mere, ọ baara ya mba n’ihu ọha. (Gal. 2:13, 14) N’agbanyeghị ihe a merenụ, ike agwụghị Pita. Olee ihe nyeere ya aka?

OLEE IHE NYEERE PITA AKA ỊNỌSI IKE N’OFUFE JEHOVA?

9. Olee otú Jọn 6:68, 69 si gosi na Pita kwesịrị ntụkwasị obi?

9 Pita ji obi ya niile na-efe Jehova. O kweghị ka ihe ọ bụla mee ka ọ kwụsị iso Jizọs. Dị ka ihe atụ, n’otu oge, Jizọs kwuru ihe ndị na-eso ụzọ ya na-aghọtaghị. (Gụọ Jọn 6:68, 69.) Ọtụtụ ndị na-eso ụzọ Jizọs kwụsịrị iso ya n’echereghị ka ọ kọwaa ihe o kwuru ma ọ bụkwanụ jụọ ya ihe ihe o kwuru pụtara. Mana Pita emeghị otú ahụ. Ọ ghọtara na ọ bụ naanị Jizọs nwere ‘okwu na-enye ndụ ebighị ebi.’

Ebe Jizọs na-akasi Pita obi mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ.

Olee ihe mere otú Jizọs si tụkwasị Pita obi ji agba gị ume? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

10 Olee otú Jizọs si gosi na ọ tụkwasịrị Pita obi? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

10 Jizọs ahapụghị Pita. N’abalị ikpeazụ ọ dịrị ndụ n’ụwa, ọ ma na Pita na ndịozi ya ndị ọzọ ga-ahapụ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs kwuru ihe gosiri na obi siri ya ike na Pita ga-echegharị ma jiri obi ya niile na-eso ya. (Luk 22:31, 32) Jizọs ghọtara na “ọ na-agụ mmadụ ime ihe dị mma, ma anụ ahụ́ adịghị ike.” (Mak 14:38) N’ihi ya, n’agbanyeghị na Pita gọnahụrụ Jizọs, Jizọs ahapụghị ya. Mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ọ pụtara n’ihu Pita. O nwere ike ịbụ mgbe Pita nọ naanị ya. (Mak 16:7; Luk 24:34; 1 Kọr. 15:5) N’oge ahụ, obi gbawara Pita. Ma, ọ ga-abụrịrị na ihe a gbara ya ume.

11 Olee otú Jizọs si mee ka obi sie Pita ike na Jehova ga na-egboro ya mkpa ya?

11 Jizọs mere ka obi sie Pita ike na Jehova ga-akwado ya. Mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ọ rụrụ ọrụ ebube ọzọ, mee ka Pita na ndị na-eso ụzọ ibe ya gbute azụ̀. (Jọn 21:4-6) O doro anya na ọrụ ebube a Jizọs rụrụ mere ka obi sie Pita ike na ọ gaghị esiri Jehova ike ịna-egboro ya mkpa ya. Ọ ga-abụ na onyeozi a chetara ihe Jizọs kwuru na Jehova ga-egboro ndị bu “ụzọ na-achọ Alaeze Chineke” mkpa ha. (Mat. 6:33) Ihe a mere ka Pita mee ka ozi ya bụrụ ihe kacha ya mkpa, ọ bụghị ọrụ igbu azụ̀. O ji obi ike gbaa àmà n’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33, nyere ọtụtụ puku mmadụ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Ọrụ 2:14, 37-41) O mechakwara nyere ndị Sameria na ndị na-abụghị ndị Juu aka ịmụta banyere Kraịst ma ghọọ ndị na-eso ụzọ ya. (Ọrụ 8:14-17; 10:44-48) Jehova ji Pita rụọ ezigbo ọrụ, mee ka ụdị mmadụ niile bata n’ọgbakọ ya.

GỊNỊ KA ANYỊ NA-AMỤTA?

12 Olee otú ihe Pita mere ga-esi nyere anyị aka ma e nwee àgwà na-adịghị mma anyị na-agbalị ịkwụsị kemgbe?

12 Jehova nwere ike inyere anyị aka ịnọsi ike n’ofufe ya. O nwere ike isiri anyị ike ịnọsi ike n’ofufe Jehova, karịchaa ma ọ bụrụ na e nwere àgwà na-adịghị mma anyị na-agbalị ịkwụsị kemgbe ọtụtụ afọ. Mgbe ụfọdụ, ụdị àgwà ahụ nwere ike iyi ihe siri ike ịkwụsị karịa nke Pita. Ma Jehova nwere ike inye anyị ike ka anyị ghara ịda mbà. (Ọma 94:17-19) Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna ya na ụmụ nwoke ibe ya nwere mmekọahụ ruo ọtụtụ afọ tupu ya amụta eziokwu. Ọ gbanwere ndụ ya kpamkpam ma na-ebi ndụ otú Baịbụl kwuru. Ma, e nwere mgbe ụfọdụ echiche ọjọọ na-abata ya n’obi. Olee ihe nyeere ya aka ịnọsi ike n’ofufe Jehova? Ọ sịrị: “Jehova na-enye anyị ike.” Ọ sịkwara: “Mmụọ Jehova enyerela m aka . . . ịmụta na m ga-anọsili ike n’eziokwu . . . Jehova ji m na-arụ ọrụ. N’agbanyeghị na mụ ezughị okè, ọ ka na-enye m ike.”

Foto ndị na-egosi: Nwanna Horst Henschel na nne na nna ya mgbe ọ dị obere. 1. Ebe Horst ji ihere na-eweli aka nri ya mgbe ụmụaka ndị ọzọ weliri aka nri ha na-ekwe ekele pụtara “ọ bụ Hitler ga-azọpụta anyị.” 2. Ebe nne na nna ya na-ekpere ya ekpere. 3. Foto Nwanna Horst Henschel sere n’oge a.

Nwanna Horst Henschel malitere ozi oge niile n’abalị mbụ n’ọnwa Jenụwarị afọ 1950. Ì chere na ọ kwara mmakwaara n’ihi na o ji ndụ ya niile fee Jehova? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 na nke 15)d

13 Olee otú anyị nwere ike isi eme ka Pita dị ka e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 4:13, 29, 31? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

13 Dị ka anyị hụrụ, ịtụ egwu mmadụ mere ka Pita mejọọ ihe mgbe ụfọdụ. Ma Pita mechara nwee obi ike n’ihi na o kpere ekpere ka Chineke nyere ya aka ịkata obi. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 4:13, 29, 31.) Anyịnwa nwekwara ike ịkwụsị ịtụ ụjọ. Legodị ihe mere Nwanna Horst. Ọ bụ nwa okorobịa bi na Jamanị n’oge a na-alụ Agha Ụwa Nke Abụọ. N’oge ahụ, ndị ọchịchị tiri iwu ka ndị mmadụ na-ekwere ibe ha ekele pụtara “ọ bụ Hitler ga-azọpụta anyị.” Ọ bụ eziokwu na Nwanna Horst ma na ime ụdị ihe ahụ adịghị mma, mana, o kwere ekele ahụ mgbe ụfọdụ n’ihi na ọ na-atụ ndị nkụzi ya na ụmụ akwụkwọ ibe ya ụjọ. Nne na nna ya abaraghị ya mba. Kama, ha kpeere ya ekpere, rịọ Jehova ka o mee ka ọ kata obi. Aka nne na nna ya nyeere ya na obi ọ tụkwasịrị Jehova mere ka o mechaa kwụrụ chịm. Nwanna Horst mechara sị: “E nweghị mgbe Jehova hapụrụ m.”c

14 Olee otú ndị okenye hụrụ atụrụ Chineke n’anya nwere ike isi mee ka obi sie ndị dara mbà ike?

14 Jehova na Jizọs agaghịkwa ahapụ anyị. Mgbe Pita gọnahụchara Jizọs, e nwere ihe dị ezigbo mkpa ọ ga-ekpebi. Ọ̀ ga-akwụsị iso Jizọs, ka ọ̀ ka ga na-eso ụzọ Jizọs? Jizọs ebula ụzọ rịọ Jehova ka o mee ka okwukwe Pita ghara ịnyụ ka ọkụ. Jizọs gwakwara Pita gbasara ekpere ahụ o kpere ma kwuo na obi siri ya ike na Pita ga-emecha mee ka ụmụnna ya dị ike. (Luk 22:31, 32) Ọ ga-abụrịrị na obi siri Pita ike mgbe ọ bụla o chetara ihe ahụ Jizọs kwuru. E nwee ihe dị mkpa anyị chọrọ ikpebi, Jehova nwere ike iji ndị okenye hụrụ anyị n’anya mee ka obi sie anyị ike ka anyị ghara ịda mbà. (Efe. 4:8, 11) Otu nwanna aha ya bụ Paul bụ okenye kemgbe ọtụtụ afọ. Ọ na-agbalị ime ka obi sie ụmụnna ya ike. Ọ na-agwa ndị na-eche echiche ịkwụsị ife Jehova ka ha cheta otú Jehova si mee ka ha mụta eziokwu ya. Ọ na-emesizi ha obi ike na Jehova agaghị ahapụ ha n’ihi otú o si hụ ha n’anya nke ukwuu. O kwuziri, sị: “Ahụla m ọtụtụ ndị ike ụwa gwụrụ na-akwụsịghị ife Jehova n’ihi na Jehova nyeere ha aka.”

15 Olee otú akụkọ Pita na Nwanna Horst si gosi na ihe e kwuru na Matiu 6:33 bụ eziokwu?

15 Otú ahụ Jehova gbooro Pita na ndịozi ndị ọzọ mkpa ha, ọ ga-egbokwara anyị mkpa anyị ma ọ bụrụ na anyị ebute ozi ya ụzọ ná ndụ anyị. (Mat. 6:33) Mgbe a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ, Nwanna Horst anyị kwuburu okwu ya nọ na-atụle ma ọ̀ ga-asụ ụzọ. Ma, ọ dara ogbenye. Ọ nọ na-eme ya obi abụọ ma ọ̀ ga-enwe ike ịna-elekọta onwe ya ma ka nọrọ n’ozi oge niile. Olee ihe ọ ga-eme? O kpebiri ịnwale Jehova. N’ihi ya, mgbe onye nlekọta sekit bịara ileta ọgbakọ ha, ọ gara ozi ọma n’izu ahụ niile. Ná ngwụcha izu ahụ, o juru ya anya mgbe onye nlekọta sekit ahụ nyere ya envelopu ego dị na ya. Ma, ọ gwaghị ya onye nyere ya ego ahụ. Ego dị n’envelopu ahụ ga-ezuru ya ilekọta onwe ya ma na-asụ ụzọ ruo ọtụtụ ọnwa. O weere onyinye a e nyere ya ka otú Jehova si mee ka obi sie ya ike na ọ ga-elekọta ya. O ji ndụ ya niile bute ihe gbasara Alaeze Chineke ụzọ.​—Mal. 3:10.

16 Gịnị mere anyị kwesịrị iji mụọ gbasara Pita na akwụkwọ ozi ndị o dere?

16 Pita rịọburu Jizọs ka ọ hapụ ya. Ma ọ ga-abụrịrị na obi tọgburu Pita atọgbu na Jizọs ahapụghị ya. Kraịst akwụsịghị ịzụ Pita ka ọ bụrụ onyeozi kwesịrị ntụkwasị obi nakwa onye Ndị Kraịst ndị ọzọ ga-amụta ihe n’aka ya. Anyị niile nwere ihe bara uru anyị ga-amụta n’akụkọ gbasara otú Jizọs si zụọ Pita. Pita dekwara ụfọdụ ihe ndị ahụ anyị ga-amụta n’akwụkwọ ozi abụọ o degaara ọgbakọ ndị dị n’oge ndịozi. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-eleba anya n’ihe ụfọdụ Pita chetaara anyị n’akwụkwọ ozi ndị ahụ nakwa otú anyị ga-esi eme ha.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Olee àgwà ụfọdụ na-adịghị mma Pita kwesịrị ịkwụsị?

  • Gịnị nyeere Pita aka ịnọsi ike n’ozi Chineke?

  • Olee ihe ụfọdụ anyị ga-amụta n’aka Pita?

ABỤ NKE 126 Mụrụ Anya, Ka Okwukwe Gị Sie Ike, Dị Ike

a A kwadebere isiokwu a ka o mee ka obi sie ndị na-agbalị ịkwụsị àgwà na-adịghị mma ha na-akpa ike na ha ga-akwụsịli ya ma nọsie ike na-efe Jehova.

b  Ọtụtụ amaokwu ndị dị n’isiokwu a si n’Ozi Ọma Mak. Ọ ga-abụ na o dere ihe ndị ọ nụrụ n’ọnụ Pita, onye ji anya ya hụ mgbe ihe ndị ahụ mere.

c  Gụọ akụkọ ndụ Nwanna Horst Henschel isiokwu ya bụ “Motivated by My Family’s Loyalty to God.” Ọ gbara na Teta! Bekee February 22, 1998.

d NKỌWA FOTO: E ji foto a na-egosi ebe nne na nna Nwanna Horst Henschel na-ekpere ya ekpere, na-emekwa ka obi sie ya ike na ọ ga-emerili ụjọ ọ na-atụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya