Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Gebriel Gara Hụ Meri
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe mmụọ ozi Gebriel bịakwutere Meri

      ISI NKE 69

      Gebriel Gara Hụ Meri

      Ebe otu mmụọ ozi bịakwutere Josef ná nrọ

      Elizabet nwere onye ikwu bi na Nazaret nke dị na Galili. Aha ya bụ Meri. Josef onye ọkwá nkà kwere nkwa na ọ ga-alụ Meri. Mgbe Elizabet dị ime ọnwa isii, mmụọ ozi Gebriel pụtara n’ihu Meri. Ọ gwara ya, sị: ‘Meri, ndeewo. Jehova emeerela gị amara dị ukwuu.’ Ma, ọ ghọtaghị ihe ihe a Gebriel kwuru pụtara. Ọ gwaziri ya, sị: ‘Ị ga-adị ime, mụọ nwa nwoke. Ị ga-agụkwa ya Jizọs. Ọ ga-abụ Eze. Alaeze ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.’

      Meri gwara ya, sị: ‘Ma, amaghị m nwoke. Olee otú m ga-esi mụọ nwa?’ Gebriel sịrị ya: ‘E nweghị ihe Jehova na-agaghị emeli. Mmụọ nsọ ga-arụ ọrụ n’ime gị, ị ga-amụkwa nwa nwoke. Elizabet, onye ikwu gị dịkwa ime.’ Meri gwaziri ya, sị: “Abụ m ohu Jehova. Ka ihe i kwuru meere m.”

      Ebe Josef kpọ Meri nwunye ya na-ala ụlọ ya. Meri dị ime mgbe ahụ

      Meri gawaziri n’otu obodo dị n’ugwu ka ọ hụ Elizabet. Mgbe o ruru, o kelere Elizabet, nwa Elizabet bu n’afọ amalie elu. Elizabet jupụtara na mmụọ nsọ ma kwuo, sị: ‘Meri, Jehova agọziela gị. Ihe ọma meere m na nne Onyenwe m bịara n’ụlọ m.’ Meri gwara ya, sị: ‘Eji m obi m niile na-eto Jehova.’ Meri na Elizabet nọrọ ọnwa atọ tupu ya alaghachi Nazaret.

      Mgbe Josef matara na Meri dị ime, ọ chọrọ ịgwa ya na ọ gaghịzi alụ ya. Ma, otu mmụọ ozi bịakwutere ya ná nrọ, gwa ya, sị: ‘Atụla egwu ịlụ Meri. O nweghị ihe ọjọọ o mere.’ Ọ bụ ya mere Josef ji lụọ Meri ma kpọrọ ya laa n’ụlọ ya.

      “Jehova na-eme ihe ọ bụla dị ya mma, ma n’eluigwe ma n’ụwa.”​—Abụ Ọma 135:6

      Ajụjụ: Gịnị ka Gebriel gwara Meri banyere nwa ọ ga-amụ? Olee otú obi dị Elizabet na Meri maka ihe meere ha?

      Matiu 1:18-25; Luk 1:26-56; Aịzaya 7:14; 9:7; Daniel 2:44; Ndị Galeshia 4:4

  • Ndị Mmụọ Ozi Mere Ka A Mata na A Mụọla Jizọs
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe ndị mmụọ ozi na-agwa ndị ọzụzụ atụrụ na a mụọla Jizọs

      ISI NKE 70

      Ndị Mmụọ Ozi Mere Ka A Mata na A Mụọla Jizọs

      Mgbe Meri dị ime Jizọs, ya na Josef gara Betlehem bụ́ obodo Josef. Ihe mere ha ji gaa bụ na Siza Ọgọstọs, onye na-achị Alaeze Rom, nyere iwu ka ndị Juu niile laa n’obodo ha gaa deba aha ha n’akwụkwọ. N’oge ahụ, ọ fọrọ obere ka Meri mụọ nwa.

      Mgbe ha ruru Betlehem, ha gara nọrọ n’ụlọ anụ n’ihi na e nweghị ebe ọzọ ha hụrụ ha ga-anọ. Ọ bụ ebe ahụ ka Meri nọ mụọ Jizọs. Ọ fụrụ ya ákwà ma jiri nwayọọ nyiwe ya n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri.

      E nwere ndị ọzụzụ atụrụ bi n’ọhịa n’ebe dị nso na Betlehem. Ha nọ na-eche ìgwè atụrụ ha nche n’abalị. Na mberede, otu mmụọ ozi bịara guzo n’ihu ha, ebube Jehova nwukwara dị ka ìhè gburugburu ha. Ụjọ jidere ndị ọzụzụ atụrụ ahụ, ma mmụọ ozi ahụ gwara ha, sị: ‘Unu atụla ụjọ. M chọrọ izi unu ozi na-eme obi ụtọ. Taa, a mụrụ Mezaya na Betlehem.’ Ozugbo ahụ, ọtụtụ ndị mmụọ ozi pụtara n’eluigwe, na-ekwu, sị: ‘Ka otuto dịrị Chineke n’eluigwe, ka udo dịkwa n’ụwa.’ Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ kwuchara ihe a, ha pụrụ. Gịnịzi ka ndị ọzụzụ atụrụ ahụ mere?

      Ha gwara ibe ha, sị: ‘Ka anyị gawanụ Betlehem ozugbo.’ Ha gawara ngwa ngwa ma hụ Meri na Josef na nwa ọhụrụ ha n’ụlọ anụ.

      Ihe ahụ mmụọ ozi ahụ gwara ndị ọzụzụ atụrụ ahụ tụrụ onye ọ bụla nụrụ ya n’anya. Meri chebaara ihe ahụ mmụọ ozi ahụ gwara ya echiche, o chefughịkwa ya. Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ laghachiri ebe ha na-azụ atụrụ ha. Ha nọ na-ekele Jehova maka ihe niile o mere ka ha nụ ma hụ.

      “Esi m n’ebe Chineke nọ bịa, anọkwa m ebe a. Ọ bụghị m zitere onwe m, kama ọ bụ ya zitere m.”​—Jọn 8:42

      Ajụjụ: Olee otú ndị mmụọ ozi si mee ka a mata na a mụọla Jizọs? Ònye na onye ka ndị ọzụzụ atụrụ hụrụ mgbe ha ruru Betlehem?

      Luk 2:1-20; Aịzaya 9:6

  • Jehova Chebere Jizọs
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe Meri na Jizọs nọ n’elu jakị, Josef ejiri ụkwụ na-aga

      ISI NKE 71

      Jehova Chebere Jizọs

      E nwere ndị bi n’ebe ọwụwa anyanwụ Izrel. Ha kweere na kpakpando nwere ike iduzi ha. N’otu abalị, ụfọdụ n’ime ndị ahụ bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ hụrụ ihe yiri kpakpando na-egbuke egbuke n’eluigwe ka ọ nọ na-aga, ha esoro ya na-aga. Ihe ahụ yiri kpakpando duuru ha gaa Jeruselem. Mgbe ha ruru, ha jụwara ndị mmadụ, sị: ‘Olee ebe nwa ahụ ga-abụ eze ndị Juu nọ? Anyị bịara ịkpọrọ ya isiala.’

      Mgbe Herọd, eze na-achị Jeruselem nụrụ banyere eze ọhụrụ a, obi kooro ya n’elu. Ọ jụrụ ndị isi nchụàjà, sị: ‘Ebee ka a sị na a ga-amụ eze a?’ Ha gwara ya, sị: ‘Ndị amụma kwuru na a ga-amụ ya na Betlehem.’ N’ihi ya, Herọd kpọrọ ndị ahụ si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ ma gwa ha, sị: ‘Gaanụ Betlehem chọọ nwa a. Unu chọta ya, bịanụ gwa m ebe ọ nọ. M chọkwara ịga kpọọrọ ya isiala.’ Ma, ihe a o kwuru bụ ụgha.

      Ihe ahụ yiri kpakpando gawakwara ọzọ. Ndị ahụ si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ sooro ya gawa Betlehem. Ọ kwụsịrị n’elu otu ụlọ, ụmụ nwoke ahụ abanye n’ime ụlọ ahụ. Ha hụrụ Jizọs na Meri nne ya ebe ahụ. Mgbe ha hụrụ Jizọs, ha kpọọrọ ya isiala, nyekwa ya onyinye. Ha nyere ya ọlaedo, frankinsens, na mea. Ọ̀ bụ Jehova zigara ndị ahụ ka ha gaa chọta Jizọs? Mba.

      N’abalị ahụ, Jehova gwara Josef ná nrọ, sị: ‘Herọd chọrọ igbu Jizọs. Kpọrọ nwunye gị na nwa gị gbaga Ijipt. Nọrọnụ ebe ahụ ruo mgbe ala jụchara oyi ka unu laghachi.’ Josef kpọọrọ nwunye ya na nwa ya gbaga Ijipt ozugbo.

      Jehova gwakwara ndị ahụ si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ ka ha ghara ịgaghachikwuru Herọd. Mgbe Herọd hụrụ na ha alọghachighị, ezigbo iwe were ya. Ebe ọ bụ na ọ mataghị ebe Jizọs nọ, o nyere iwu ka e gbuo ụmụntakịrị nwoke niile nọ na Betlehem ha na Jizọs bụ ọgbọ. Ma, e nweghị ihe mere Jizọs n’ihi na ọ nọzi n’Ijipt bụ́ ebe dị anya.

      Ka oge na-aga, Herọd nwụrụ. Jehova gwara Josef, sị: ‘O nweghị ihe ga-eme unu, unu nweziri ike ịlaghachi.’ Josef kpọọrọ Meri na Jizọs laghachi Izrel, ha ebirizie na Nazaret.

      “Otú ahụ ka okwu si m n’ọnụ pụta ga-adị. . . . Ihe m kwuru ga-emezurịrị otú ahụ m si kwuo ya.”​—Aịzaya 55:11

      Ajụjụ: Gịnị mere e ji chọọ igbu Jizọs? Olee otú Jehova si chebe Jizọs?

      Matiu 2:1-23; Maịka 5:2

  • Mgbe Jizọs Dị Afọ Iri na Abụọ
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe Jizọs nọ ọdụ n’etiti ndị na-akụzi ihe n’ụlọ nsọ n’oge ọ dị afọ iri na abụọ

      ISI NKE 72

      Mgbe Jizọs Dị Afọ Iri na Abụọ

      Josef na Meri na nwa ha Jizọs nakwa ụmụ ha ndị nwoke ndị ọzọ na ụmụ ha ndị nwaanyị bi na Nazaret. Josef bụ ọkwá nkà. Ọ bụ ọrụ o ji akpa afọ ezinụlọ ya. Ọ na-akụzikwara ha gbasara Jehova na Iwu ya. Ha na-aga n’ụlọ nzukọ ndị Juu mgbe niile efe Chineke, na-agakwa Jeruselem otu ugboro n’afọ maka Ememme Ngabiga.

      Mgbe Jizọs dị afọ iri na abụọ, ndị ezinụlọ ha gbara okporo gaa Jeruselem otú ha si eme kwa afọ. Ndị mmadụ si ebe dị iche iche bịa Jeruselem maka Ememme Ngabiga, ya emee ka ndị mmadụ ju ebe niile n’obodo a. Mgbe e mechara ememme a, Josef na Meri na ọtụtụ ndị ikwu ha so na-ala, ha echee na Jizọs sokwa ha. Ka ha na-ala, ha chọrọ ya n’etiti ndị ikwu ha, ma ha ahụghị ya.

      Josef na Meri laghachiri Jeruselem na-achọgharị Jizọs. Ha chọrọ ya abalị atọ, mechaa hụ ya n’ụlọ nsọ. Ha hụrụ ya ebe ọ nọ ọdụ n’etiti ndị na-akụzi ihe n’ụlọ nsọ, na-ege ha ntị nke ọma ma na-ajụ ha ezigbo ajụjụ. Otú o si gee ha ntị na ajụjụ ndị ọ nọ na-ajụ ha masịrị ha nke na ha malitere ịjụ ya ajụjụ. Ihe Jizọs zara ha jukwara ha anya. Ha chọpụtara na ọ ma Iwu Jehova nke ọma.

      Obi erughị Josef na Meri ala oge niile ahụ ha nọ na-achọ Jizọs. Ọ bụ ya mere Meri ji gwa Jizọs, sị: ‘Nwa m, mụ na papa gị nọ na-achọgharị gị kemgbe. Olee ebe ị nọ kemgbe?’ Jizọs sịrị ha: “Ọ̀ bụ na unu amaghị na m ga-anọ n’ụlọ Nna m?”

      Jizọs sooro ndị mụrụ ya laghachi Nazaret. Josef kụziiri Jizọs ọrụ ịkwa nkà ọ na-arụ. Olee ụdị onye i chere Jizọs bụ mgbe ọ na-eto eto? Ka ọ na-eto, ọ nọ na-enwekwu amamihe, ihe ya nọkwa na-amasị ma Chineke ma ndị mmadụ.

      Ebe Josef na Meri na Jizọs nakwa ụmụnne Jizọs nọ ọdụ n’oche

      “Chineke m, ime uche gị na-atọ m ụtọ, iwu gị dịkwa n’ime ime obi m.”​—Abụ Ọma 40:8

      Ajụjụ: Olee ebe Josef na Meri chọtara Jizọs? Gịnị mere o ji nọrọ ebe ahụ?

      Matiu 13:55, 56; Mak 6:3; Luk 2:40-52; 4:16; Diuterọnọmi 16:15, 16

  • Jọn Kwadebeere Jizọs Ụzọ
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe Jọn Onye Na-eme Baptizim na-akụziri ndị mmadụ ihe n’akụkụ Osimiri Jọdan

      ISI NKE 73

      Jọn Kwadebeere Jizọs Ụzọ

      Jọn nwa Zekaraya na Elizabet ghọrọ onye amụma mgbe o toro. Jehova ji Jọn na-akụziri ndị mmadụ na Mezaya na-abịa. Jọn anọghị n’ụlọ nzukọ ma ọ bụ n’obodo na-akụziri ndị mmadụ ihe, kama ọ nọ n’ala ịkpa. Ndị mmadụ si na Jeruselem na Judia niile na-abịa ka Jọn kụziere ha ihe. Ọ gwara ha na ọ bụrụ na ha chọrọ ka obi dị Chineke mma, ha kwesịrị ịkwụsị ihe ọjọọ ha na-eme. Mgbe ọtụtụ ndị gechara Jọn ntị, ha chegharịrị, ya emeekwa ha baptizim n’Osimiri Jọdan.

      Jọn adịghị okomoko. Ọ na-eyi uwe e ji ajị kamel mee. Ihe ọ na-eri bụ igurube na mmanụ aṅụ. Ndị mmadụ nọ na-achọ ịma onye Jọn bụ. Ndị Farisii na ndị Sadusii, bụ́ ndị mpako, gakwudịịrị ya. Jọn gwara ha, sị: ‘Unu kwesịrị ịkwụsị ihe ọjọọ unu na-eme ma chegharịa. Unu echela na unu pụrụ iche naanị maka na unu na-asị na unu bụ ụmụ Ebreham. Ọ bụghị ya ga-eme ka unu bụrụ ụmụ Chineke.’

      Ọtụtụ ndị Juu gakwuuru Jọn ma jụọ ya, sị: ‘Olee ihe anyị ga-eme ka obi dị Chineke mma?’ Jọn gwara ha, sị: ‘Ọ bụrụ na unu nwere uwe ime abụọ, chịnyenụ onye na-enweghị otu.’ Ị̀ ma ihe mere o ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ maka na ọ chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya mara na ọ bụrụ na ha chọrọ ime ihe dị Chineke mma, ha ga-ahụrịrị ndị mmadụ n’anya.

      Jọn gwara ndị ọnaụtụ, sị: ‘Na-ekwunụ eziokwu, unu aghọgbukwala onye ọ bụla.’ Ọ gwakwara ndị amị, sị: ‘Unu anala aka azụ, unu aghakwala ụgha.’

      Ndị nchụàjà na ndị Livaị gakwukwaara Jọn ma jụọ ya, sị: ‘Ị̀ bụ onye? Mmadụ niile chọrọ ịma onye ị bụ.’ Jọn gwara ha, sị: ‘Abụ m onye na-eti mkpu n’ala ịkpa. Ana m eduru ndị mmadụ ka ha bịakwute Jehova, otú Aịzaya buru n’amụma.’

      Ihe Jọn na-akụzi masịrị ndị mmadụ. Ọtụtụ ndị nọ na-eche ma Jọn ọ̀ bụ Mezaya ahụ. Ma, ọ gwara ha, sị: ‘Onye ka m na-abịa. Erughịdị m eru ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ ya. Eji m mmiri na-eme baptizim, ma ọ ga-eji mmụọ nsọ na-eme baptizim.’

      “Nwoke a bịara ka ọ bụrụ onye àmà, ka o wee gbaa àmà banyere ìhè ahụ, ka ụdị mmadụ niile si n’aka ya kwere.”​—Jọn 1:7

      Ajụjụ: Olee ihe mere Jehova ji ziga Jọn ka ọ kụziere ndị mmadụ ihe? Gịnị ka ha mere mgbe ha nụrụ ihe Jọn na-akụzi?

      Matiu 3:1-11; Mak 1:1-8; Luk 3:1-18; Jọn 1:19-28; Aịzaya 40:3

  • Jizọs Ghọrọ Mezaya
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe mmụọ nsọ dakwasịrị Jizọs mgbe Jọn mechara ya baptizim. O fedatara ka nduru

      ISI NKE 74

      Jizọs Ghọrọ Mezaya

      Jọn nọ na-agwa ndị Juu, sị: ‘Onye ka m na-abịa.’ Mgbe Jizọs dị ihe dị ka afọ iri atọ, o si na Galili gaa n’Osimiri Jọdan ebe Jọn nọ na-eme ndị mmadụ baptizim. Jizọs chọrọ ka Jọn mee ya baptizim, ma Jọn ekweghị. Jọn gwara ya, sị: ‘Ekwesịghị m ime gị baptizim. Ọ bụ gị kwesịrị ime m baptizim.’ Jizọs gwara ya, sị: ‘Jehova chọrọ ka i mee m baptizim.’ N’ihi ya, Jọn na Jizọs banyere n’Osimiri Jọdan, ya emikpuo Jizọs n’ime mmiri.

      Mgbe Jizọs si na mmiri ahụ pụta, o kpere ekpere. Mgbe ọ nọ na-ekpe ekpere, eluigwe meghere, mmụọ Chineke dakwasịrị ya, o fedatara ka nduru. Jehova sizi n’eluigwe kwuo, sị: “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe gị masịrị m.”

      Mgbe mmụọ nsọ dakwasịrị Jizọs, ọ ghọrọ Kraịst ma ọ bụ Mezaya. Ugbu a ka ọ ga-amalite ọrụ Jehova ji maka ya zite ya n’ụwa.

      Ozugbo e mechara Jizọs baptizim, ọ gara nọrọ n’ala ịkpa ruo ụbọchị iri anọ. Mgbe ọ lọtara, ọ gawara ịhụ Jọn. Mgbe o rutewere ebe Jọn nọ, Jọn sịrị: ‘Onye a bụ Nwa Atụrụ Chineke onye ga-ewepụ mmehie nke ụwa.’ Jọn ji ihe a o kwuru mee ka ndị mmadụ mata na ọ bụ Jizọs bụ Mezaya ahụ. Ị̀ ma ihe mere Jizọs mgbe ọ nọ n’ala ịkpa? Anyị ga-amata n’isiokwu ọzọ.

      “Otu olu sikwa n’eluigwe kwuo, sị: ‘Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe gị masịrị m.’”​—Mak 1:11

      Ajụjụ: Gịnị mere Jọn ji mee Jizọs baptizim? Gịnị mere Jọn ji kwuo na Jizọs bụ Nwa Atụrụ Chineke?

      Matiu 3:13-17; Mak 1:9-11; Luk 3:21-23; Jọn 1:29-34; Aịzaya 42:1; Ndị Hibru 10:7-9

  • Ekwensu Nwara Jizọs Ọnwụnwa
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe Jizọs jụrụ isi n’ebe kacha elu n’ụlọ nsọ wụda

      ISI NKE 75

      Ekwensu Nwara Jizọs Ọnwụnwa

      Ebe Jizọs jụrụ ime ka nkume ghọọ achịcha

      Mgbe e mechara Jizọs baptizim, mmụọ nsọ duuru ya gaa n’ala ịkpa. O righị nri ruo ụbọchị iri anọ, ezigbo agụụ malitekwara ịgụ ya. Ekwensu bịaziri na-anwa ya ọnwụnwa. Ọ sịrị ya: ‘Ọ bụrụ n’eziokwu na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume ndị a ka ha ghọọ achịcha.’ Ma Jizọs gwara ya ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ sịrị ya: ‘E dere na ọ bụghị naanị nri ga-eme ka mmadụ dị ndụ. Ọ bụ ime ihe niile Jehova kwuru.’

      Ekwensu nwara Jizọs ọnwụnwa ọzọ. Ọ sịrị ya: ‘Ọ bụrụ n’eziokwu na ị bụ Ọkpara Chineke, si n’ebe kacha elu n’ụlọ nsọ wụda. E dere na Chineke ga-ezite ndị mmụọ ozi ya ka ha ghọrọ gị.’ Ma, Jizọs kwukwara ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ sịrị ya: ‘E dere na i kwesịghị ịnwa Jehova ọnwụnwa.’

      Ebe Jizọs jụrụ isi n’ebe kacha elu n’ụlọ nsọ wụda

      Setan gosiziri Jizọs alaeze niile nke ụwa, akụnụba ha na ebube ha, ma gwa ya, sị: ‘M ga-enye gị alaeze ndị a niile na ebube ha ma i fee m ofufe naanị otu ugboro.’ Ma, Jizọs gwara ya, sị: ‘Si ebe a pụọ, Setan! E dere na ọ bụ naanị Jehova ka i kwesịrị ife ofufe.’

      Ekwensu hapụziri Jizọs, ndị mmụọ ozi bịara ma nye ya nri ka o rie. Malite mgbe ahụ gawa, Jizọs malitere izi ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ bụ ọrụ Chineke zitere ya n’ụwa ka ọ rụọ. Ihe Jizọs na-akụziri ndị mmadụ na-atọ ha ụtọ, ọ bụ ya mere ha ji na-eso ya aga ebe ọ bụla ọ na-aga.

      “Mgbe [Ekwensu] na-agha ụgha, ọ na-ekwu ihe bụ́ uche ya, n’ihi na ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna ụgha.”​—Jọn 8:44

      Ajụjụ: Olee ọnwụnwa atọ Ekwensu nwara Jizọs? Gịnị ka Jizọs gwara ya na nke ọ bụla n’ime ha?

      Matiu 4:1-11; Mak 1:12, 13; Luk 4:1-15; Diuterọnọmi 6:13, 16; 8:3; Jems 4:7

  • Jizọs Mere Ka Ụlọ Nsọ Dị Ọcha
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe Jizọs ji ụtarị na-achụpụ anụmanụ n’ụlọ nsọ, kpuokwa tebụl ndị na-agbanwe ego ihu n’ala

      ISI NKE 76

      Jizọs Mere Ka Ụlọ Nsọ Dị Ọcha

      N’ihe dị ka ọnwa Eprel n’afọ 30, Jizọs gara Jeruselem. Ọtụtụ ndị gakwara Jeruselem maka Ememme Ngabiga. Ha ji anụmanụ chụọ àjà n’ụlọ nsọ n’ihi na o so n’ihe a na-eme n’ememme a. Ụfọdụ ndị ji anụmanụ nke ha gaa, ma ndị ọzọ zụrụ nke ha na Jeruselem.

      Mgbe Jizọs banyere n’ụlọ nsọ, ọ hụrụ ndị na-ere anụmanụ n’ebe ahụ. Ha nọ n’ụlọ a na-anọ efe Jehova na-akpa ego. Olee ihe Jizọs mere mgbe ọ hụrụ ha? O ji ụdọ mere ụtarị ma were ya chụpụ atụrụ na ehi n’ụlọ nsọ. Ọ wụfukwara mkpụrụ ego nke ndị na-agbanwe ego ma kpuo tebụl ha ihu n’ala. Ọ gwara ndị na-ere nduru, sị: ‘Wepụsịanụ ihe ndị a ebe a! Unu emezila ka ụlọ Nna m bụrụ ụlọ ahịa.’

      Ihe Jizọs mere juru ndị nọ n’ụlọ nsọ ahụ anya. Ndị na-eso ụzọ ya chetara amụma e buru gbasara Mezaya. Amụma ahụ sịrị: ‘Ihe gbasara ụlọ Jehova ga na-anụ m ọkụ n’obi.’

      Mgbe e mechara n’afọ 33, Jizọs mekwara ka ụlọ nsọ ahụ dị ọcha nke ugboro abụọ. Ọ chọghị ka onye ọ bụla jiri ụlọ Nna ya na-eme ihe na-ekwesịghị ekwesị.

      “Unu agaghị abụli ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.”​—Luk 16:13

      Ajụjụ: Gịnị ka Jizọs mere mgbe ọ hụrụ ndị na-ere anụmanụ n’ụlọ nsọ? Gịnị mere o ji mee ya?

      Matiu 21:12, 13; Mak 11:15-17; Luk 19:45, 46; Jọn 2:13-17; Abụ Ọma 69:9

  • Otu Nwaanyị Nke Bịara n’Olulu Mmiri
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe Jizọs na-agwa nwaanyị Sameria okwu n’olulu mmiri Jekọb

      ISI NKE 77

      Otu Nwaanyị Nke Bịara n’Olulu Mmiri

      Mgbe e mechara Ememme Ngabiga, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya laghachiwara Galili. Ha si Sameria mgbe ha na-alaghachi. Mgbe ha rutewere obodo aha ya bụ Saịka, Jizọs kwụsịrị n’ebe a na-akpọ olulu mmiri Jekọb. Mgbe Jizọs nọ na-ezu ike n’ebe ahụ, ndị na-eso ụzọ ya gawara n’ime obodo ịzụta nri.

      Otu nwaanyị bịara n’olulu mmiri ahụ isere mmiri. Jizọs sịrị ya: “Nye m mmiri ka m ṅụọ.” Nwaanyị ahụ sịrị Jizọs: ‘Gịnị mere i ji na-agwa m okwu? Abụ m nwaanyị Sameria. Ndị Juu na ndị Sameria anaghị ekwurịta okwu.’ Jizọs sịrị ya: ‘A si na ị ma onye m bụ, ị gaara arịọ m mmiri, m gakwaara enye gị mmiri na-enye ndụ.’ Nwaanyị ahụ jụrụ Jizọs, sị: ‘Gịnị ka ị na-ekwu? I nwedịghị ihe e ji esere mmiri.’ Jizọs sịrị ya: ‘Onye ọ bụla ṅụrụ mmiri m ga-enye ya, mmiri agakwaghị agụ ya ọzọ.’ Nwaanyị ahụ sịrị: “Nna anyị ukwu, nye m mmiri a.”

      Jizọs gwaziri nwaanyị ahụ, sị: ‘Gaa kpọrọ di gị bịa n’olulu mmiri a.’ Ya asị Jizọs: “Enweghị m di.” Jizọs sịrị ya: ‘I kwuru eziokwu. Ị lụọla di ise, ma nwoke gị na ya bi ugbu a abụghị di gị.’ Nwaanyị ahụ sịrị ya: ‘Ọ ga-abụrịrị na ị bụ onye amụma. Ndị obodo anyị kweere na anyị nwere ike ịnọ n’ugwu a fee Chineke, ma ndị Juu sịrị na ọ bụ naanị na Jeruselem ka mmadụ ga-anọ fee Chineke. Ekwetara m na mgbe Mezaya ga-abịa, ọ ga-akụziri anyị otú e si efe Chineke.’ Jizọs gwaziri ya ihe ọ na-agwabeghị mmadụ ọ bụla. Ọ sịrị ya: ‘Abụ m Mezaya ahụ.’

      Ebe Jizọs na-agwa ndị Sameria okwu

      Nwaanyị ahụ gbaara ọsọ banye n’obodo ma gwa ndị mmadụ, sị: ‘Eche m na ahụla m Mezaya. Ọ ma ihe niile banyere m. Bịanụ hụ ya.’ Ha sooro ya gaghachi n’olulu mmiri ahụ ma gee Jizọs ntị ka ọ na-akụziri ha ihe.

      Ndị Sameria gwara Jizọs ka ọ bịa nọrọ n’obodo ha. Jizọs nọrọ ebe ahụ abalị abụọ kụziere ha ihe, ọtụtụ ndị nwekwara okwukwe na ya. Ha gwara nwaanyị ahụ, sị: ‘Ugbu a anyị gere nwoke a ntị, anyị amatala n’eziokwu na ọ bụ onye ga-azọpụta ụwa.’

      “‘Bịa!’ Onye ọ bụla akpịrị na-akpọ nkụ, ya bịa. Onye ọ bụla nke chọrọ, ya bịa ṅụọ mmiri nke ndụ n’efu.”​—Mkpughe 22:17

      Ajụjụ: Gịnị mere o ji ju nwaanyị Sameria anya na Jizọs gwara ya okwu? Gịnị ka Jizọs gwara ya?

      Jọn 4:1-42

  • Jizọs Kwusara Ozi Ọma Alaeze Chineke
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe Jizọs na otu onye na-eso ụzọ ya na-ezi ozi ọma

      ISI NKE 78

      Jizọs Kwusara Ozi Ọma Alaeze Chineke

      Obere oge e mechara Jizọs baptizim, ọ malitere izi ndị mmadụ ozi ọma, sị: ‘Alaeze Chineke dị nso.’ Ndị na-eso ụzọ ya sooro ya gaa Galili na Judia niile kwusaa ozi ọma. Mgbe Jizọs lọtara n’obodo ya bụ́ Nazaret, ọ gara n’ụlọ nzukọ ndị Juu, meghee akwụkwọ mpịakọta Aịzaya ma gụpụtara ya ndị nọ ebe ahụ, sị: ‘Jehova enyela m mmụọ nsọ ka m nwee ike izi ozi ọma.’ Gịnị ka ihe a ọ gụpụtara pụtara? Ihe ọ pụtara bụ na isi ihe mere Chineke ji nye Jizọs mmụọ nsọ bụ ka o jiri ya na-ekwusa ozi ọma, ọ bụghị iji ya na-arụ ọrụ ebube otú ndị mmadụ chọrọ. Ọ gwaziri ndị na-ege ya ntị, sị: ‘Taa ka amụma a mezuru.’

      Jizọs gaziri n’Osimiri Galili. N’ebe ahụ, ọ hụrụ mmadụ anọ na-akụ azụ̀, ndị mechara bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Ọ gwara ha, sị: “Soronụ m. M ga-eme ka unu bụrụ ndị na-akụta mmadụ.” Ha bụ Pita, Andru, Jems, na Jọn. Ha hapụrụ ọrụ ịkụ azụ̀ ozugbo soro ya. Ha so ya gaa Galili niile na-ekwusa ozi ọma Alaeze Jehova. Ha ziri ozi ọma n’ụlọ nzukọ, n’ahịa, nakwa n’okporo ámá. Ìgwè mmadụ na-eso ha ebe ọ bụla ha na-aga. Akụkọ Jizọs ruru ebe niile, ma na Siria.

      Ka oge na-aga, Jizọs nyere ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya ikike ịgwọ ọrịa na ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ. Ndị ọzọ sokwa ya ka ọ na-ezisa ozi ọma n’obodo ukwu nakwa n’obodo nta dị iche iche. E nwekwara ọtụtụ ụmụ nwaanyị na-efe Chineke ndị nọ na-elekọta Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya. Ụfọdụ n’ime ha bụ Meri Magdalin, Joana, na Suzana.

      Mgbe Jizọs kụzichaara ndị na-eso ụzọ ya otú e si ezi ozi ọma, o zipụrụ ha ka ha gaa zie ozi ọma. Ka ha na-ezisa ozi ọma na Galili niile, ọtụtụ ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, e meekwa ha baptizim. E nwere ọtụtụ ndị chọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ọ bụ ya mere Jizọs ji were ha tụnyere ubi ihe a kụrụ na ya chara acha. Ọ sịrị: ‘Na-arịọnụ Jehova ka o zitekwuo ndị ọrụ ga-ewe ihe ubi ahụ.’ Jizọs mechara họrọ ndị na-eso ụzọ ya iri asaa, kee ha abụọ abụọ ma zipụ ha ka ha gaa zie ozi ọma na Judia niile. Ha ziri ụdị mmadụ niile ozi ọma Alaeze Chineke. Mgbe ha lọtara, ha ji obi ụtọ kọọrọ Jizọs ihe merenụ. O nweghị ihe Ekwensu ga-emeli ka ọrụ ikwusa ozi ọma kwụsị.

      Jizọs gbara mbọ hụ na ndị na-eso ụzọ ya akwụsịghị ọrụ a dị mkpa mgbe ọ laghachiri eluigwe. Ọ gwara ha, sị: ‘Kwusaanụ ozi ọma n’ụwa niile. Kụzierenụ ndị mmadụ Okwu Chineke, meekwanụ ha baptizim.’

      “M ga-ekwusarịrị ozi ọma Alaeze Chineke n’obodo ndị ọzọ, n’ihi na ọ bụ ya mere e ji zite m.”​—Luk 4:43

      Ajụjụ: Olee ọrụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-arụ? Olee otú obi dị ha banyere ọrụ a?

      Matiu 4:17-25; 9:35-38; 28:19, 20; Mak 1:14-20; Luk 4:14-21; 8:1-3; 10:1-22

  • Jizọs Rụrụ Ọtụtụ Ọrụ Ebube
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe ndị ọrịa bịakwutere Jizọs ka ọ gwọọ ha

      ISI NKE 79

      Jizọs Rụrụ Ọtụtụ Ọrụ Ebube

      Jizọs bịara n’ụwa ka o kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke. Jehova nyere ya mmụọ nsọ ka ọ rụọ ọrụ ebube iji gosi ihe ndị ọ ga-eme mgbe ọ ga-abụ Eze. Ọ gwọrọ ụdị ọrịa ọ bụla. Ebe ọ bụla ọ gara, ndị ahụ́ na-adịghị na-abịakwute ya, ya agwọọ ha niile. O mere ka ndị ìsì hụwa ụzọ, ka ndị ntị chiri nụwa ihe, mee ka ndị ngwọrọ gawa ije, meekwa ka ndị mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu nwere onwe ha. Ọ bụrụgodị na ha ebitụ naanị ọnụ ọnụ uwe ya aka, ha na-agbake. Ndị mmadụ na-eso Jizọs ebe ọ bụla ọ na-aga. Ọ bụrụgodị na ọ chọrọ ịnọrọ naanị ya, ọ naghị achụpụ onye ọ bụla bịakwutere ya.

      Otu ụbọchị, ndị mmadụ butere otu nwoke ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ n’ụlọ ebe Jizọs nọ. Ma, ndị mmadụ juru n’ụlọ ahụ nke na o nweghị otú ha ga-esi buru ya banye. N’ihi ya, ha meghere otu ebe n’elu ụlọ ahụ ma si ebe ahụ budatara ya Jizọs. Jizọs gwaziri nwoke ahụ, sị: ‘Bilie, gawa ije.’ Mgbe o biliri gawa ije, o juru ndị niile nọ ebe ahụ anya.

      N’oge ọzọ Jizọs na-abanye n’otu obodo, ụmụ nwoke iri, bụ́ ndị ekpenta, nọ n’ebe dị anya na-eti mkpu, sị: ‘Jizọs nyere anyị aka!’ N’oge ahụ, a naghị ekwe ka ndị ekpenta bịa ndị ọzọ nso. Jizọs gwara ha ka ha gaa n’ụlọ nsọ otú Iwu Jehova kwuru ndị ekpenta kwesịrị ime ma a gwọọ ha. Mgbe ha na-aga n’ụzọ, ha gbakere. Mgbe otu n’ime ha chọpụtara na a gwọọla ya, ọ laghachiri ka o kelee Jizọs ma too Chineke. N’ime ndị ekpenta iri ahụ, ọ bụ naanị ya gara kelee Jizọs.

      E nwere otu nwaanyị nọ na-arịa ọrịa kemgbe afọ iri na abụọ. Ọ chọsiri ike ka a gwọọ ya. Ọ bịara ebe Jizọs na ìgwè mmadụ nọ, si n’azụ Jizọs bitụ ọnụ ọnụ uwe ya aka. Ọ gbakere ozugbo. Mgbe ihe a mere, Jizọs jụrụ, sị: “Ònye bitụrụ m aka?” Ụjọ jidere nwaanyị ahụ, ma ọ pụtara gwa Jizọs eziokwu. Jizọs kasiri ya obi, sị ya: ‘Nwa m nwaanyị, lawa n’udo.’

      Otu onyeisi oche ụlọ nzukọ aha ya bụ Jaịrọs bịara rịọ Jizọs, sị: ‘Biko, bịa n’ụlọ m. Ọrịa ji obere nwa m nwaanyị aka ọjọọ.’ Ma, tupu Jizọs eruo n’ụlọ ya, nwa ya nwaanyị nwụrụ. Mgbe Jizọs ruru, ọ hụrụ na ọtụtụ mmadụ nọ ebe ahụ soro ezinụlọ ahụ na-ebe ákwá. Jizọs gwara ha, sị: ‘Kwụsịnụ ibe ákwá, ọ na-ehi ụra.’ O seere nwa ahụ n’aka ma kwuo, sị: “Nwatakịrị, bilie!” O biliri ozugbo. Jizọs agwazie mama ya na papa ya ka ha nye ya nri ka o rie. Chegodị otú obi dị mama ya na papa ya mgbe ahụ.

      Ebe Jizọs na-akpọlite ada Jaịrọs n’ọnwụ

      “Chineke ji mmụọ nsọ tee ya mmanụ ma nye ya ike. Ebe Chineke nọnyeere ya, ọ gazuru ala ahụ na-eme ihe ọma ma na-agwọ ndị niile Ekwensu na-emekpọ ọnụ.”​—Ọrụ Ndịozi 10:38

      Ajụjụ: Gịnị mere Jizọs ji nwee ike ịgwọ ụdị ọrịa niile? Olee ihe mere ada Jaịrọs?

      Matiu 9:18-26; 14:36; Mak 2:1-12; 5:21-43; 6:55, 56; Luk 6:19; 8:41-56; 17:11-19

  • Jizọs Họọrọ Ndịozi Iri na Abụọ
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Jizọs na ndịozi ya iri na abụọ

      ISI NKE 80

      Jizọs Họọrọ Ndịozi Iri na Abụọ

      Mgbe Jizọs kwusarala ozi ọma ihe dị ka otu afọ na ọnwa isii, e nwere ihe dị mkpa ọ ga-ekpebi. Ònye na onye ka ọ ga-ahọrọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya ka ha na ya na-anọ mgbe niile? Olee ndị ọ ga-azụ ka ha na-elekọta ọgbakọ Ndị Kraịst? Jizọs chọrọ ka Jehova duzie ya ka o nwee ike ime mkpebi ndị a. Ọ bụ ya mere o ji gaa n’ugwu ebe ọ ga-anọ naanị ya kpee ekpere abalị niile. N’ụtụtụ echi ya, ọ kpọkọtara ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya, si na ha họrọ ndịozi ya iri na abụọ. Ị̀ ma aha ha? Aha ha bụ Pita, Andru, Jems, Jọn, Filip, Batọlọmiu, Tọmọs, Matiu, Jems nwa Alfiọs, Tadiọs, Saịmọn, na Judas Iskarịọt.

      Andru, Pita, Filip, Jems

      Andru, Pita, Filip, Jems

      Mmadụ iri na abụọ a ga na-eso ya aga ebe ọ bụla ọ na-aga. Ọ kụziiri ha otú e si ezi ozi ọma ma zipụ ha ka ha kwusawa ozi ọma. Jehova nyere ha ike ka ha na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ ma na-agwọ ndị ọrịa.

      Jọn, Matiu, Batọlọmiu, Tọmọs

      Jọn, Matiu, Batọlọmiu, Tọmọs

      Jizọs kpọrọ ndịozi iri na abụọ ahụ ndị enyi ya, ọ tụkwasịkwara ha obi. Ndị Farisii weere ndịozi Jizọs ka ndị nkịtị na-agụghị akwụkwọ. Ma, Jizọs kụziiri ha otú ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma. Ha na ya ga-anọ n’oge ndị kacha mkpa ná ndụ ya. Dị ka ihe atụ, ha na ya ga-anọ tupu e gbuo ya nakwa mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ. Ọtụtụ n’ime ndịozi iri na abụọ ahụ bụ ndị Galili, otú Jizọs bụkwa. Ụfọdụ n’ime ha lụrụ nwaanyị.

      Jems nwa Alfiọs, Judas Iskarịọt, Tadiọs, Saịmọn

      Jems nwa Alfiọs, Judas Iskarịọt, Tadiọs, Saịmọn

      Ndịozi Jizọs bụ ndị na-ezughị okè, ndị na-emehie ihe mgbe ụfọdụ. Mgbe ụfọdụ, ha na-ekwu okwu n’echeghị echiche, e nwere oge ndị ha mere mkpebi na-adịghị mma. Mgbe ụfọdụ, ha mere ihe ndị gosiri na ha enweghị ndidi. E nwekwara mgbe ha sere okwu maka na ha na-azọ onye kacha n’ime ha. Ma, ha abụghị ndị ọjọọ. Ha hụrụ Jehova n’anya. Ọ bụ ha ga na-elekọta ọgbakọ Ndị Kraịst ma Jizọs laghachi n’eluigwe.

      “Ana m akpọ unu ndị enyi m n’ihi na m mere ka unu mara ihe niile m nụrụ n’ọnụ Nna m.”​—Jọn 15:15

      Ajụjụ: Olee ndị Jizọs họọrọ ka ha bụrụ ndịozi ya iri na abụọ? Gịnị ka Jizọs zigara ndịozi ya ka ha mee?

      Matiu 10:1-10; Mak 3:13-19; 10:35-40; Luk 6:12-16; Jọn 15:15; 20:24, 25; Ọrụ Ndịozi 2:7; 4:13; 1 Ndị Kọrịnt 9:5; Ndị Efesọs 2:20-22

  • Ihe Jizọs Nọ n’Elu Ugwu Kụzie
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe Jizọs nọ n’elu ugwu na-akụziri ìgwè mmadụ ihe

      ISI NKE 81

      Ihe Jizọs Nọ n’Elu Ugwu Kụzie

      Mgbe Jizọs họrọchaara ndịozi ya iri na abụọ, o si n’elu ugwu gbadata ma gaa n’ebe ìgwè mmadụ gbakọrọ. Ụfọdụ n’ime ha si Galili, Judia, Taya, Saịdọn, Siria, nakwa n’ofe Osimiri Jọdan bịa. Ha kpọ ndị na-arịa ọrịa dị iche iche na ụfọdụ ndị mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu bịa. Jizọs gwọrọ ha niile. Mgbe ọ gwọchara ha, ọ nọdụrụ ala n’akụkụ ugwu ahụ ma malite ịkụziri ha ihe. O kwuru ihe anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ ndị enyi Chineke. Anyị kwesịrị ịmata Jehova ma hụ ya n’anya. Ma, anyị enweghị ike ịhụ Chineke n’anya ma ọ bụrụ na anyị ahụghị ndị ọzọ n’anya. Anyị kwesịrị ịdị obiọma ma ghara imegbu onye ọ bụla, ma ndị iro anyị.

      Jizọs kwuru, sị: ‘Ọ bụghị naanị ndị enyi unu ka unu kwesịrị ịhụ n’anya. Unu kwesịkwara ịhụ ndị iro unu n’anya ma jiri obi unu na-agbaghara ndị ọzọ. Ọ bụrụ na i mee ihe were mmadụ iwe, gaa ozugbo rịọ ya ka ọ gbaghara gị. Na-emeso ndị ọzọ ihe otú ị chọrọ ka ha si na-emeso gị.’

      Ebe Jizọs nọ n’elu ugwu na-akụziri ìgwè mmadụ ihe

      Jizọs nyekwara ha ezigbo ndụmọdụ gbasara otú ha kwesịrị isi na-ele akụnụba anya. O kwuru, sị: ‘Ọ ka mma ịbụ enyi Jehova karịa inwe ego buru ibu. Onye ohi nwere ike izu ego unu, ma o nweghị onye ga-emeli ka unu na Jehova kwụsị ịbụ enyi. Kwụsịnụ ichegbu onwe unu maka ihe unu ga-eri, ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụ uwe unu ga-eyi. Legodịnụ ụmụ nnụnụ. Chineke na-enye ha nri ga-ezuru ha mgbe niile. Ichegbu onwe unu agaghị eme ka ndụ unu dịkwuo ogologo. Chetanụ na Jehova ma ihe ndị dị unu mkpa.’

      Ìgwè mmadụ ahụ ahụtụbeghị onye na-akụzi ihe ka Jizọs. Ndị isi okpukpe ha akụzirighị ha ihe ndị a. Gịnị mere Jizọs ji bụrụ ezigbo onye nkụzi? Ọ bụ n’ihi na ihe niile ọ kụziiri ndị mmadụ si n’aka Jehova.

      “Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi, unu ga-enwetakwa ume.”​—Matiu 11:29

      Ajụjụ: Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị na Jehova bụrụ enyi? Olee otú Jehova chọrọ ka i si na-emeso ndị ọzọ ihe?

      Matiu 4:24–5:48; 6:19-34; 7:28, 29; Luk 6:17-31

  • Jizọs Kụziiri Ndị Na-eso Ụzọ Ya Otú E Si Ekpe Ekpere
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe onye Farisii na-ekpe ekpere n’ebe ọhaneze na-anọ, ndị mmadụ akwụsị na-ele ya

      ISI NKE 82

      Jizọs Kụziiri Ndị Na-eso Ụzọ Ya Otú E Si Ekpe Ekpere

      Ndị Farisii na-eme ihe niile ha na-eme ka ndị mmadụ na-aja ha mma. Ọ bụrụ na ha meere mmadụ ihe ọma, ọ bụ ka ndị ọzọ hụ ha. Ha chọọ ikpe ekpere, ha na-aga n’ebe ọhaneze na-anọ ka mmadụ niile hụ ha. Ndị Farisii na-ebu ogologo ekpere n’isi ma nọrọ n’ụlọ nzukọ nakwa n’ebe ụzọ gbara mkpị na-ekwughachi ya ka ndị mmadụ nụ ihe ha na-ekwu. N’ihi ya, o juru ndị mmadụ anya mgbe Jizọs gwara ha, sị: ‘Unu ekpela ekpere ka ndị Farisii. Ha chere na Chineke ga-anụ olu ha n’ihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu. Ma, ọ naghị anụ olu ha. Ekpere bụ okwu ị na-agwa naanị Jehova. Ekwughachila otu ihe ugboro ugboro. Jehova chọrọ ka ị gwa ya otú obi dị gị.

      Ebe otu nwatakịrị nwoke gburu ikpere n’ala na-ekpe ekpere

      ‘Otú a ka unu kwesịrị isi na-ekpe ekpere: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka Alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.”’ Jizọs gwakwara ha ka ha na-arịọ Chineke ka o nye ha nri ha ga-eri n’ụbọchị, ka ọ gbaghara ha mmehie ha, nakwa ka o meere ha ihe ndị ọzọ dị ha mkpa.

      Jizọs kwuru, sị: ‘Na-ekpenụ ekpere mgbe niile. Na-arịọnụ Nna unu bụ́ Jehova ka o meere unu ihe ọma. Nne ma ọ bụ nna ọ bụla na-achọ imere nwa ya ihe ọma. Ọ bụrụ na nwa gị arịọ gị achịcha, ị̀ ga-enye ya okwute? Ọ bụrụkwa na ọ rịọ gị azụ̀, ị̀ ga-enye ya agwọ?’

      Jizọs kwuziri ihe ọ chọrọ ka ha mụta. Ọ sịrị: ‘Ọ bụrụ na unu ma otú e si enye ụmụ unu ezigbo onyinye, ọ̀ bụ na Nna unu bụ́ Jehova agaghị enye unu mmụọ nsọ? N’ihi ya, na-arịọnụ ya ihe ọ bụla unu chọrọ ịrịọ ya.’ Ị̀ na-eme ihe a Jizọs kwuru? Olee ihe ndị ị na-ekpe n’ekpere?

      “Na-arịọnụ, a ga-enye unu. Na-achọnụ, unu ga-achọta. Na-akụnụ aka n’ụzọ, a ga-emeghere unu ya.”​—Matiu 7:7

      Ajụjụ: Mgbe Jizọs na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekpe ekpere, olee ihe ndị ọ gwara ha? Ị̀ na-arịọ Chineke ka o meere gị ihe ndị dị gị mkpa?

      Matiu 6:2-18; 7:7-11; Luk 11:13

  • Jizọs Nyere Ọtụtụ Puku Mmadụ Nri
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe ndịozi Jizọs na-ekesara ìgwè mmadụ nri

      ISI NKE 83

      Jizọs Nyere Ọtụtụ Puku Mmadụ Nri

      Obere oge tupu e mee Ememme Ngabiga nke afọ 32, ndịozi Jizọs si ebe ha gara ikwusa ozi ọma lọta. Ike gwụchara ha, Jizọs agwa ha ka ha banye n’ụgbọ mmiri gaa Betseida zurutụ ike. Ma, mgbe ụgbọ ha ruwere n’akụkụ osimiri, Jizọs hụrụ na ọtụtụ puku mmadụ esorola ha rute ebe ahụ. Ọ bụ eziokwu na ọ chọrọ ka naanị ya na ndịozi ya nọrọ, ọ nabatara ndị ahụ nke ọma. Ọ gwọrọ ndị ọrịa ha kpọ bịa, malitekwa ịkụziri ha ihe. Ọ kụziiri ha banyere Alaeze Chineke ruo ná mgbede. Ma, mgbe o ruru mgbede, ndịozi ya gakwuuru ya, sị ya: ‘Agụụ abịala ndị a. Gwa ha ka ha lawa, ka ha nwee ike chọta ihe ha ga-eri.’

      Ebe otu nwatakịrị nwoke na-ebunye Jizọs nkata azụ̀ na bred juru

      Jizọs gwara ndịozi ya, sị: “Ha ekwesịghị ịla. Nyenụ ha nri ka ha rie” ebe a. Ndịozi ya jụrụ ya, sị: ‘Ị̀ chọrọ ka anyị gaa zụtara ha nri?’ Filip, otu n’ime ndịozi ya, sịrị: ‘Ọ bụrụgodị na anyị nwejuru ego enweju, ọ gaghị ezu ịzụta nri ga-ezu ìgwè mmadụ a.’

      Jizọs jụrụ ha, sị: ‘Ogbe achịcha ole ka unu nwere?’ Andru zara ya, sị: ‘Anyị nwere ogbe achịcha ise na obere azụ̀ abụọ. Ọ gatụdịghị ezu.’ Jizọs sịrị ha: ‘Wetaranụ m ogbe achịcha ndị ahụ na azụ̀ ndị ahụ.’ Ọ gwara ìgwè mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala n’elu ahịhịa n’ìgwè n’ìgwè. Ụfọdụ dị mmadụ iri ise, ụfọdụ adịrị otu narị. Jizọs weere achịcha na azụ̀ ndị ahụ lelie anya n’eluigwe ma kpee ekpere. Mgbe o kpechara ekpere, o nyere ha ndịozi ya, ha ekesaara ha ìgwè mmadụ ahụ. Puku ụmụ nwoke ise (5,000) na ụmụ nwaanyị na ụmụaka riri ihe oriri ahụ rijuo afọ. Mgbe ha richara, ndịozi Jizọs tụtụkọtara ihe ha rifọrọ ka ihe ọ bụla ghara ịla n’iyi. Ihe ha tụtụkọtara juru nkata iri na abụọ. Ihe a bụ ezigbo ọrụ ebube, ọ́ bụghị ya?

      Ihe a Jizọs mere dị ndị mmadụ mma nke na ha chọwara ime ya eze ha. Ma, Jizọs ma na oge Jehova ga-eme ya eze erubeghị. Ọ gwaziri ìgwè mmadụ ahụ ka ha lawa ma gwa ndịozi ya ka ha gafee Osimiri Galili. Ndịozi Jizọs banyere n’ụgbọ gawa, ya agawa n’ugwu naanị ya. Gịnị mere o ji gawa naanị ya? Ọ bụ maka na ọ chọrọ ịnọ naanị ya kpee ekpere. N’agbanyeghị na Jizọs nwere ọtụtụ ọrụ ọ na-arụ, ọ na-ewepụta oge mgbe niile ekpe ekpere.

      “Unu arụla ọrụ maka nri nke na-ala n’iyi, kama rụọnụ ọrụ maka nri nke ga-adịru ebighị ebi, nke Nwa nke mmadụ ga-enye unu.”​—Jọn 6:27

      Ajụjụ: Olee otú Jizọs si gosi na ihe banyere ndị mmadụ na-emetụ ya n’obi? Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị banyere Jehova?

      Matiu 14:14-22; Luk 9:10-17; Jọn 6:1-15

  • Jizọs Gara Ije n’Elu Mmiri
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe Jizọs na-aga ije n’elu mmiri ma gwa Pita ka ọ bịakwute ya

      ISI NKE 84

      Jizọs Gara Ije n’Elu Mmiri

      Jizọs gwọrọ ndị ọrịa ma kpọlite ndị nwụrụ anwụ. O mekwara ka oké ifufe na ebili mmiri kwụsị. Mgbe Jizọs kpechara ekpere n’elu ugwu, ọ nọ ebe ahụ hụ ka oké ifufe na-efe n’Oké Osimiri Galili. Ndịozi ya nọ n’ụgbọ ha, ọ na-esikwara ha ike ịkwọrọ ya na-aga n’ihi ifufe ahụ na-efesi ike. Jizọs si n’elu ugwu ahụ gbadata ma jiri ụkwụ gawa n’elu mmiri ka ọ garuo n’ebe ụgbọ ha dị. Mgbe ndịozi Jizọs hụrụ onye na-aga ije n’elu mmiri, ụjọ tụwara ha. Ma, Jizọs gwara ha, sị: “Ọ bụ m. Unu atụla egwu.”

      Ebe Jizọs na-aga ije n’elu mmiri ma gwa Pita ka ọ bịakwute ya

      Pita gwara Jizọs, sị: ‘Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ bụ gị n’eziokwu, gwa m ka m bịakwute gị.’ Jizọs gwara ya, sị: ‘Bịawa.’ N’ihi ya, Pita si n’ụgbọ ahụ pụta gawa ije n’elu mmiri na-agakwuru Jizọs n’agbanyeghị oké ifufe na-efe. Ma mgbe Pita ruwere n’ebe Jizọs nọ, o lewere oké ifufe ahụ anya, ụjọ atụwa ya. Ọ maliteziri imikpu, ya etiwe mkpu, sị: “Onyenwe anyị, zọpụta m!” Jizọs matịrị aka jide ya ma sị ya: ‘Gịnị mere i ji nwewe obi abụọ? Olee ebe okwukwe gị dị?’

      Mgbe Jizọs na Pita banyere n’ụgbọ ahụ, oké ifufe kwụsịrị ozugbo. Olee otú i chere obi dị ndịozi Jizọs? Ha sịrị: “Ị bụ Ọkpara Chineke n’eziokwu.”

      Ọ bụghị naanị otu ugboro a ka Jizọs mere ka oké ifufe na ebili mmiri kwụsị. O nwekwara oge ọzọ Jizọs na ndịozi ya ji ụgbọ mmiri na-aga n’ofe ọzọ n’osimiri, Jizọs agaa n’azụ ụgbọ na-ehi ụra. Ka ọ na-ehi ụra, oké ifufe malitere ife n’osimiri ahụ. Ebili mmiri nọkwa na-awụba mmiri n’ụgbọ ahụ, mmiri eju na ya. Ndịozi Jizọs kpọtere ya, na-eti mkpu, sị: ‘Onye ozizi, anyị na-agadị ịnwụ. Nyere anyị aka.’ Jizọs biliri ma gwa osimiri ahụ, sị: “Daa jụụ!” Ozugbo ahụ, ifufe ahụ na osimiri ahụ dajụrụ. Jizọs jụrụ ndịozi ya, sị: ‘Olee ebe okwukwe unu dị?’ Ha gwawara ibe ha, sị: “Ifufe na oké osimiri na-erubedịrị ya isi.” Ndịozi Jizọs mụtara na ha ekwesịghị ịtụ ụjọ ihe ọ bụla ma ọ bụrụ na ha ji obi ha niile tụkwasị Jizọs obi.

      “Ebee ka m gaara anọ ma a sị na enweghị m okwukwe na m ga-anọ ndụ hụ otú Jehova si dị mma?”​—Abụ Ọma 27:13

      Ajụjụ: Gịnị mere Pita ji malite imikpu na mmiri? Gịnị ka ndịozi Jizọs mụtara n’aka ya?

      Matiu 8:23-27; 14:23-34; Mak 4:35-41; 6:45-52; Luk 8:22-25; Jọn 6:16-21

  • Jizọs Gwọrọ Mmadụ n’Ụbọchị Izu Ike
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe ndị Farisii na-ajụ nwoke kpuburu ìsì ajụjụ

      ISI NKE 85

      Jizọs Gwọrọ Mmadụ n’Ụbọchị Izu Ike

      Ndị Farisii kpọrọ Jizọs asị ma na-achọ ihe ha ga-asị na o mere ka ha jide ya. Ha kwuru na o kwesịghị ịgwọ ndị mmadụ n’Ụbọchị Izu Ike. N’otu Ụbọchị Izu Ike, Jizọs hụrụ otu nwoke kpuru ìsì ka ọ na-arịọ arịrịọ n’okporo ụzọ. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘Unu ga-ahụ otú m ga-esi eji ike Chineke enyere nwoke a aka.’ Jizọs gwakọtara ọnụ mmiri na ájá ma were ya tee nwoke ahụ n’anya. Jizọs sịziri ya: “Gaa saa anya gị n’ọdọ mmiri Siloam.” Nwoke ahụ mere otú ahụ, ya amalite ịhụ ụzọ. Ihe a bụ nke mbụ ọ na-ahụ ụzọ kemgbe a mụrụ ya.

      Ihe a juru ndị mmadụ anya. Ha sịrị: ‘Onye a ọ́ bụghị nwoke ahụ na-anọ otu ebe arịọ arịrịọ, ka ọ̀ bụ onye yiri ya?’ Nwoke ahụ gwara ha, sị: ‘Ọ bụ m bụ nwoke ahụ kpuru ìsì kemgbe a mụrụ ya.’ Ha jụrụ ya, sị: ‘Gịnịzi mere i ji ahụ ụzọ?’ Mgbe ọ gwara ha ihe merenụ, ha kpọọrọ ya gakwuru ndị Farisii.

      Nwoke ahụ gwara ndị Farisii, sị: ‘Jizọs ji ụrọ tee m n’anya, sị m gaa saa anya m na mmiri. M mere ihe ọ gwara m, hụwazie ụzọ.’ Ndị Farisii kwuru, sị: ‘Ọ bụrụ na Jizọs na-agwọ mmadụ n’Ụbọchị Izu Ike, ọ bụghị Chineke nyere ya ike.’ Ma ndị ọzọ sịrị: ‘Ọ bụrụ na ọ bụghị Chineke nyere ya ike, ọ gaghị agwọli mmadụ.’

      Ndị Farisii kpọrọ nne na nna nwoke ahụ ma jụọ ha, sị: ‘Olee otú nwa unu si hụwa ụzọ?’ Ụjọ tụrụ ndị mụrụ ya n’ihi na ndị Farisii kwuru na a ga-achụpụ onye ọ bụla nwere okwukwe na Jizọs n’ụlọ nzukọ. N’ihi ya, ha gwara ndị Farisii, sị: ‘Anyị amaghị. Jụọnụ ya.’ Ndị Farisii jụkwuru nwoke ahụ ajụjụ, ya asị ha: ‘Agwala m unu ihe niile m ma. Gịnị mere unu ji ka na-ajụ m ajụjụ?’ Ihe a o kwuru were ndị Farisii iwe, ha akwapụ ya.

      Jizọs gara chọọ nwoke ahụ ma jụọ ya, sị: ‘Ì nwere okwukwe na Mezaya?’ Nwoke ahụ zara ya, sị: ‘M ga-enwe ma m mata onye ọ bụ.’ Jizọs gwara ya, sị: ‘Ọ bụ m bụ Mezaya ahụ.’ Ihe a ó gosighị na Jizọs dị obiọma? Ọ bụghị naanị na o mere ka nwoke ahụ hụwa ụzọ, kama o mekwara ka o nwee okwukwe.

      “Unu furu ụzọ, n’ihi na unu amaghị Akwụkwọ Nsọ, unu amaghịkwa otú ike Chineke si arụ ọrụ.”​—Matiu 22:29

      Ajụjụ: Olee otú Jizọs si nyere nwoke kpuru ìsì aka? Gịnị mere ndị Farisii ji kpọọ Jizọs asị?

      Jọn 9:1-41

  • Jizọs Kpọlitere Lazarọs n’Ọnwụ
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe Lazarọs na ụmụnne ya nwaanyị aha ha bụ Meri na Mata nọ mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ

      ISI NKE 86

      Jizọs Kpọlitere Lazarọs n’Ọnwụ

      Jizọs nwere ezigbo ndị enyi atọ bi na Betani. Aha ha bụ Lazarọs, Meri, na Mata. Ha atọ bụ ụmụnne. Otu ụbọchị, mgbe Jizọs nọ n’ofe Osimiri Jọdan, Meri na Mata zigaara ya ozi dị ọkụ ọkụ, sị: ‘Ọrịa ji Lazarọs aka ọjọọ. Biko, bịa ngwa ngwa.’ Ma, Jizọs agaghị ozugbo. O cheere abalị abụọ ọzọ tupu ya agwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘Ka anyị gaa Betani. Lazarọs na-arahụ ụra, ma m na-eje ebe ahụ ịkpọte ya.” Ndịozi ya sịrị: ‘Ọ bụrụ na ọ na-arahụ ụra, ọ ga-enyere ya aka ịgbake.’ Jizọs gwaziri ha hoo haa, sị: ‘Lazarọs anwụọla.’

      Mgbe Jizọs garuru Betani, e liela Lazarọs kemgbe ụbọchị anọ. Ìgwè mmadụ bịara ebe ahụ ka ha kasie Mata na Meri obi. Mgbe Mata nụrụ na Jizọs abịala, ọ gbaara gawa ịhụ ya. Ọ gwara Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, a sị na ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.” Jizọs gwara ya, sị: ‘Mata, nwanne gị nwoke ga-adị ndụ ọzọ. Ì kwetara?’ Ọ gwara Jizọs, sị: ‘Ekwere m na ọ ga-ebili n’oge a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ.’ Jizọs sịrị ya: “Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ.”

      Mata hapụziri Jizọs gaa gwa Meri, sị: ‘Jizọs abịala.’ Meri gbaara ọsọ gakwuru Jizọs, ìgwè mmadụ esorokwa ya. Mgbe ọ hụrụ Jizọs, ọ dara n’ụkwụ ya, na-ebe ákwá. Ọ sịrị: ‘Onyenwe anyị, a sị na ị nọ n’ebe a, nwanne anyị nwoke agaraghị anwụ.’ Jizọs hụrụ otú o si na-ebe ákwá, ya esoro ya bewe ákwá. Mgbe ìgwè mmadụ ahụ hụrụ anya mmiri na-agba Jizọs, ha sịrị: ‘Ọ hụrụ Lazarọs n’anya nke ukwuu.’ Ma, ụfọdụ ndị nọ na-eche, sị: ‘Gịnị mere na o meghị ka enyi ya ghara ịnwụ?’ Oleezi ihe Jizọs ga-eme?

      Jizọs gara ebe e liri Lazarọs. E ji nnukwu nkume dọchie ọnụ ya. Ọ gwara ndị nọ ebe ahụ, sị: ‘Kwapụnụ nkume ahụ.’ Mata gwara ya, sị: ‘Ma ihe a bụ ụbọchị anọ ọ nwụrụ. O siwela ísì ugbu a.’ N’agbanyeghị ya, ha kwapụrụ nkume ahụ. Jizọs kpere ekpere, sị: ‘Nna, ana m ekele gị na ị nụla olu m. Ama m na ị na-anụ olu m mgbe niile. Ma, ana m ekwu ihe a ka ìgwè mmadụ a mata na ọ bụ gị zitere m.’ O kwuziri n’oké olu, sị: “Lazarọs, pụta!” Ihe dị egwu meziri. Lazarọs si n’ili ahụ pụta. O bu ákwà e kere ya pụta. Jizọs sịrị: “Tọpụnụ ya ákwà ka ọ lawa.”

      Ọtụtụ ndị hụrụ ihe a nwere okwukwe na Jizọs. Ma, ụfọdụ ndị gara gwa ndị Farisii ihe merenụ. Si mgbe ahụ gawa, ndị Farisii chọwara otú ha ga-esi egbu ma Jizọs ma Lazarọs. Otu n’ime ndịozi iri na abụọ Jizọs aha ya bụ Judas Iskarịọt gakwuuru ndị Farisii na nzuzo ma jụọ ha, sị: ‘Ego ole ka unu ga-akwụ m ma m nyere unu aka ka unu jide ya?’ Ha kwekọrịtara inye ya mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ. Si mgbe ahụ gawa, Judas nọ na-achọ oge ọ ga-eji mee ka ndị Farisii jide Jizọs.

      “Ezi Chineke bụụrụ anyị Chineke na-azọpụta anyị. Ọkaakaa Onyenwe anyị bụ́ Jehova na-anapụta anyị n’aka ọnwụ.”​—Abụ Ọma 68:20

      Ajụjụ: Kọọ otú e si kpọlite Lazarọs n’ọnwụ. Gịnị ka ndị Farisii chọrọ ime mgbe ha nụrụ na Jizọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ?

      Matiu 26:14-16; Jọn 11:1-53; 12:10

  • Nri Anyasị Ikpeazụ Jizọs Riri
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe Jizọs na ezigbo ndịozi ya iri na otu na-eri Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị nke mbụ ya

      ISI NKE 87

      Nri Anyasị Ikpeazụ Jizọs Riri

      Ndị Juu na-eme Ememme Ngabiga kwa afọ n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan. Ememme a na-echetara ha otú Jehova si kpọpụta ha n’Ijipt ebe ha nọ na-agba ohu ma kpọga ha n’ala o kwere ha ná nkwa. N’afọ 33, Jizọs na ndịozi ya nọ n’ọnụ ụlọ dị n’otu ụlọ elu dị na Jeruselem mee Ememme Ngabiga. Mgbe ha richara nri, Jizọs sịrị ha: ‘Otu onye n’ime unu ga-enyefe m n’aka ndị Juu.’ Ihe a wutere ndịozi ya, ha ajụọ ya, sị: “Ọ̀ bụ onye?” Jizọs sịrị ha: ‘Ọ bụ onye m ga-enye achịcha a m ji.’ O nyeziri Judas Iskarịọt ibé achịcha o ji. Ozugbo ahụ, Judas biliri si n’ụlọ ahụ pụọ.

      Mgbe ọ pụrụ, Jizọs kpere ekpere, nyawaa achịcha ma nye ya ndịozi ya ndị ọzọ. Ọ gwara ha, sị: ‘Taanụ achịcha a. Ọ nọchiri anya ahụ́ m nke m ga-enye n’ihi unu.’ O bukwaara mmanya, kpee ekpere ma nye ya ndịozi ya. Ọ sịrị ha: ‘Ṅụọnụ mmanya a. Ọ nọchiri anya ọbara m nke m ga-awụpụ ka e nwee ike ịgbaghara ndị mmadụ mmehie ha. M na-ekwe unu nkwa na mụ na unu ga-abụ eze n’eluigwe. Na-emenụ ihe a kwa afọ iji na-echeta m.’ N’afọ ọ bụla, ndị na-eso ụzọ Jizọs ka na-ezukọ ná mgbede ụbọchị ahụ na-eme ihe a Jizọs kwuru. Ihe a na-akpọzi ya bụ Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị.

      Mgbe ndịozi Jizọs richara nri anyasị ahụ, ha sewere okwu ebe ha na-azọ onye kacha ukwuu n’ime ha. Ma, Jizọs sịrị ha: ‘Onye kacha ukwuu n’ime unu bụ onye weere onwe ya ka onye kacha nta ma ọ bụ onye weere onwe ya ka onye na-enweghị ihe ọ bụ.

      ‘Unu bụ ndị enyi m. M na-agwa unu ihe niile Nna m chọrọ ka m gwa unu. N’oge na-adịghị anya, m ga-alakwuru Nna m n’eluigwe. Unu agaghị eso m ugbu a. Ndị mmadụ ga-amata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m n’ihi otú unu si hụ ibe unu n’anya. Unu ga-ahụ ibe unu n’anya otú m si hụ unu n’anya.’

      Jizọs kpeziri ekpere rịọ Jehova ka o chebe ndị niile na-eso ụzọ ya. Ọ rịọrọ Jehova ka o nyere ha aka ka ha dịrị n’udo ma na-arụkọ ọrụ ọnụ. O kpekwara ekpere ka e doo aha Jehova nsọ. Mgbe o kpechara, ya na ndịozi ya bụrụ abụ ha ji too Jehova. Mgbe ha bụchara ya, ha pụwara. Oge a ga-ejide Jizọs dịzi nso.

      “Ìgwè atụrụ nta, unu atụla egwu, n’ihi na ọ dị Nna unu mma inye unu Alaeze.”​—Luk 12:32

      Ajụjụ: Olee nkwa Jizọs kwere ndịozi ya? Olee ihe ndị dị mkpa Jizọs kụziiri ndịozi ya mgbe ha na-eri nri anyasị ikpeazụ ya?

      Matiu 26:20-30; Luk 22:14-26; Jọn 13:1, 2, 26, 30, 34, 35; 15:12-19; 17:3-26

  • E Jidere Jizọs
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe Judas na-arara Jizọs nye n’ogige Getsemeni

      ISI NKE 88

      E Jidere Jizọs

      Jizọs na ndịozi ya ji ụkwụ si na Ndagwurugwu Kidrọn gaa n’Ugwu Oliv. Mgbe ahụ bụ n’ime ime abalị, ọnwa na-etikwa gbaa ebe niile. Mgbe ha ruru n’ogige Getsemeni, Jizọs gwara ndịozi ya, sị: “Nọrọnụ n’ebe a, na-echenụ nche.” Jizọs hapụziri ha gatụ n’ihu n’ogige ahụ ma gbuo ikpere n’ala. Ọ nọ na-echegbu onwe ya, ya ekpee ekpere ma rịọ Jehova, sị: “Ka uche gị mee.” Jehova zigaziri mmụọ ozi ya ka ọ gbaa Jizọs ume. Mgbe Jizọs gaghachiri n’ebe ụfọdụ ndịozi ya nọ, ọ hụrụ ha atọ ka ha na-ehi ụra. Ọ gwara ha, sị: ‘Bilienụ. Ugbu a abụghị oge unu kwesịrị iji na-ehi ụra. Oge eruola ka e nyefee m n’aka ndị iro m.’

      Ebe a na-enye Judas akpa ego

      Obere oge, Judas kpọọrọ ìgwè mmadụ ndị ji mma agha na osisi bịa n’ogige ahụ. Ọ ma ebe ọ ga-achọta Jizọs n’ihi na ha na-agakarị n’ogige a. Judas gwaburu ndị agha so ìgwè mmadụ ahụ na ya ga-eme ihe ha ga-eji mata onye bụ́ Jizọs. Ọ gakwuuru Jizọs ozugbo, sị ya: ‘Onye Ozizi, ndeewo,’ ma susuo ya ọnụ. Jizọs sịrị ya: ‘Ì ji isusu m ọnụ enyefe m n’aka ha?’

      Jizọs gakwuuru ìgwè mmadụ ahụ ma jụọ ha, sị: “Ònye ka unu na-achọ?” Ha asị ya: “Ọ bụ Jizọs onye Nazaret.” Jizọs gwaziri ha, sị: “Ọ bụ m.” Mgbe o kwuru ihe a, ha lara azụ daa n’ala. Jizọs jụkwara ha ọzọ, sị: “Ònye ka unu na-achọ?” Ha sịkwara: “Jizọs onye Nazaret.” Jizọs gwara ha, sị: ‘Agwara m unu na ọ bụ m. Hapụnụ ha ka ha laa.’

      Mgbe Pita ghọtara ihe na-emenụ, ọ mịịrị mma agha bepụ Malkọs ntị. Malkọs bụ ohu nnukwu onye nchụàjà. Ma, Jizọs bitụrụ ntị nwoke ahụ aka ma gwọọ ya. Ọ gwaziri Pita, sị: ‘Mịghachi mma gị n’ọbọ. I jiri mma agha na-alụ agha, ị ga-esi ná mma agha nwụọ.’ Ndị agha ahụ jidere Jizọs kee ya agbụ n’aka, ndịozi ya agbaa ọsọ. Ìgwè mmadụ ahụ kpọọrọ Jizọs gakwuru Anas, bụ́ onyeisi nchụàjà. Anas jụrụ Jizọs ọtụtụ ajụjụ ma ziga ya n’ụlọ Nnukwu Onye Nchụàjà aha ya bụ Keyafas. Ma, gịnị meziri ndịozi Jizọs?

      “N’ụwa, a ga-akpagbu unu, ma nweenụ obi ike. Emeriela m ụwa.”​—Jọn 16:33

      Ajụjụ: Gịnị mere mgbe Jizọs na ndịozi ya nọ na Getsemeni? Olee ihe ị mụtara n’ihe Jizọs mere n’abalị ahụ?

      Matiu 26:36-57; Mak 14:32-50; Luk 22:39-54; Jọn 18:1-14, 19-24

  • Pita Gọnahụrụ Jizọs
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe Pita nọ n’ogige ụlọ Keyafas na-agọnahụ Jizọs

      ISI NKE 89

      Pita Gọnahụrụ Jizọs

      Mgbe Jizọs na ndịozi ya nọ n’ọnụ ụlọ dị n’elu, ọ gwara ha, sị: ‘Unu niile ga-ahapụ m n’abalị a gbaa ọsọ.’ Pita sịrị ya: ‘Agaghị m ahapụ gị. Ọ bụrụgodị na ndị ọzọ niile ahapụ gị, agaghị m ahapụ gị.’ Ma Jizọs gwara ya, sị: ‘Tupu oké ọkpa akwaa, ị ga-ekwu ugboro atọ na ị maghị onye m bụ.’

      Mgbe ndị agha kpọọrọ Jizọs gawa n’ụlọ Keyafas, ọtụtụ n’ime ndịozi ya gbara ọsọ. Ma, mmadụ abụọ n’ime ha sooro ìgwè mmadụ ahụ. Otu n’ime ha bụ Pita. Ọ banyere n’ogige ụlọ Keyafas ma soro ndị nọ ebe ahụ na-anya ọkụ. Otu nwa agbọghọ na-eje ozi ji ìhè ọkụ ahụ hụ ihu Pita ma sị ya: ‘Ama m gị. Gị na Jizọs na-eso.’

      Pita gwara ya, sị: ‘Mba, ọ bụghị m. Amaghị m ihe ị na-ekwu.’ Pita si ebe ahụ gawa n’ebe ọnụ ụzọ ogige ahụ. Obere oge, nwa agbọghọ ọzọ na-eje ozi hụrụ ya ma gwa ndị nọ ebe ahụ, sị: ‘Nwoke a na Jizọs na-eso.’ Pita gwara ha, sị: ‘Amaghịdị m onye Jizọs bụ.’ Otu nwoke sịrị Pita: ‘Ị bụ otu n’ime ha. Otú i si ekwu okwu na-egosi na ị bụ onye Galili ka Jizọs.’ Ma Pita ṅụrụ iyi, sị: ‘Amaghị m onye ọ bụ.’

      Ozugbo ahụ, oké ọkpa kwara. Pita hụrụ ka Jizọs tụgharịrị lee ya anya, ya echeta ihe Jizọs gwara ya. Ọ pụrụ n’èzí bee ezigbo ákwá.

      Ma, ndị Sanhedrin zukọtara n’ụlọ Keyafas ka ha kpee Jizọs ikpe. Ha eburula ụzọ kpebie na ha ga-egbu ya. Ha na-achọzi ihe ha ga-asị na o mere. Ma, ha achọtaghị ihe ọ bụla. Keyafas mechara jụọ Jizọs, sị: ‘Ị̀ bụ Ọkpara Chineke?’ Jizọs sịrị ya: ‘Abụ m.’ Keyafas kwuru, sị: ‘O nweghịzi ihe anyị ji ndị akaebe ọzọ eme. O kwuluola Chineke!’ Ha niile mara ya ikpe ma kwuo, sị: “O kwesịrị ịnwụ.” Ha mara ya ụra, gbụọ ya asọ mmiri, kpuchie ya ihu, ma kụọ ya ihe. Ha sịrị ya: ‘Ọ bụrụ na ị bụ onye amụma, gwa anyị onye kụrụ gị ihe.’

      Mgbe chi bọrọ, ha kpọọrọ Jizọs gaa n’ụlọ nzukọ Sanhedrin. Ha jụrụ ya ọzọ, sị: ‘Ị̀ bụ Ọkpara Chineke?’ Jizọs zara ha, sị: “Ọ bụ unu kwuru na m bụ.” Ha sịziri na Jizọs kwuluru Chineke ma maa ya ikpe. Ha kpọọrọ ya gaa n’ụlọ Pọntiọs Paịlet, onye Rom bụ́ gọvanọ. Gịnị meziri? Ka anyị chọpụta.

      “Oge na-abịa . . . mgbe a ga-achụsasị unu, onye ọ bụla alaa n’ụlọ ya, unu ahapụkwa naanị m. Ma anọghị m naanị m n’ihi na Nna m nọnyeere m.”​—Jọn 16:32

      Ajụjụ: Olee ihe mere n’ogige ụlọ Keyafas? Gịnị mere ndị Sanhedrin ji ma Jizọs ikpe ọnwụ?

      Matiu 26:31-35, 57–27:2; Mak 14:27-31, 53–15:1; Luk 22:55-71; Jọn 13:36-38; 18:15-18, 25-28

  • Jizọs Nwụrụ na Gọlgọta
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe a kpọgidere Jizọs n’elu osisi. Onyeisi ndị agha, ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, nakwa Meri na Jọn guzo nso n’ebe ahụ

      ISI NKE 90

      Jizọs Nwụrụ na Gọlgọta

      Ndị isi nchụàjà kpụụrụ Jizọs gaa n’ụlọ Paịlet bụ́ gọvanọ. Paịlet jụrụ ha, sị: “Olee ihe ọjọọ unu sị na nwoke a mere?” Ha sịrị ya: ‘Ọ sịrị na ya bụ eze.’ Paịlet jụrụ Jizọs, sị: “Ị̀ bụ Eze ndị Juu?” Jizọs agwa ya, sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.”

      Paịlet zigaara ya Herọd, onye na-achị Galili, ka ọ mara ma ọ̀ ga-achọpụta ihe Jizọs mere. E nweghị ihe ọjọọ Herọd chọpụtara Jizọs mere, ya ezighachiri ya Paịlet. Paịlet gwaziri ìgwè mmadụ nọ ebe ahụ, sị: ‘O nweghị ihe ọjọọ ọ bụla mụ na Herọd hụrụ nwoke a mere. M ga-ahapụ ya.’ Ìgwè mmadụ ahụ tiri mkpu, sị: ‘Gbuo ya! Gbuo ya!’ Ndị agha pịara ya ụtarị, gbụọ ya asọ mmiri, ma kụọ ya ihe. Ha kpuwere ya okpu e ji ogwu kpaa, jiri ya na-eme ihe ọchị, sị: ‘Eze ndị Juu, ndeewo.’ Paịlet gwara ìgwè mmadụ ahụ ọzọ, sị: ‘O nweghị ihe ọjọọ m hụrụ nwoke a mere.’ Ma, ha tiri mkpu, sị: “Kwụwa ya n’osisi!” N’ihi ya, Paịlet kpọnyere ha Jizọs ka ha gbuo.

      Ha kpọọrọ Jizọs gaa n’ebe a na-akpọ Gọlgọta, kpọgide ya n’osisi ma bulie osisi ahụ elu. Jizọs kpere ekpere, sị: “Nna, gbaghara ha, n’ihi na ha amaghị ihe ha na-eme.” Ndị mmadụ ji ya na-eme ihe ọchị, na-asị ya: ‘Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, si n’osisi ịta ahụhụ a rịdata. Zọpụta onwe gị.’

      Otu n’ime ndị omekome a kpọgidere ha na Jizọs n’osisi gwara ya, sị: “Cheta m ma ị banye n’Alaeze gị.” Jizọs gwara ya, sị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” N’ehihie ụbọchị ahụ, ọchịchịrị gbara n’ala ahụ niile ruo awa atọ. Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs guzo nso n’ebe ahụ a kpọgidere Jizọs n’osisi, ma Meri nne ya. Jizọs gwara Jọn ka o lekọtawa Meri ka nne ya.

      N’ikpeazụ, Jizọs sịrị: “E mechaala ya.” O hulatara isi ma kubie ume. Ozugbo ahụ, e nwere oké ala ọma jijiji. N’ụlọ nsọ, ákwà mgbochi nke kewara Ebe Nsọ na Ebe Kacha Nsọ dọwara ụzọ abụọ. Mgbe ihe ndị a mere, onyeisi ndị agha kwuru, sị: ‘N’eziokwu, onye a bụ Ọkpara Chineke.’

      “N’aka ya ka nkwa niile Chineke kwere si mezuo.”​—2 Ndị Kọrịnt 1:20

      Ajụjụ: Gịnị mere Paịlet ji kwe ka e gbuo Jizọs? Olee otú Jizọs si gosi na ọ na-eche banyere ndị ọzọ karịa onwe ya.

      Matiu 27:11-14, 22-31, 38-56; Mak 15:2-5, 12-18, 25, 29-33, 37-39; Luk 23:1-25, 32-49; Jọn 18:28–19:30

  • A Kpọlitere Jizọs n’Ọnwụ
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe ụmụ nwaanyị abụọ na-ele ili Jizọs, ya eju ha anya na ọ nọghịzi n’ili ahụ

      ISI NKE 91

      A Kpọlitere Jizọs n’Ọnwụ

      Mgbe Jizọs nwụrụ, otu nwoke bara ọgaranya aha ya bụ Josef gara rịọ Paịlet ka o kwe ka ya buru ozu Jizọs gaa lie, ya ekweta. Josef buuru ozu ya, jiri ákwà linin mara mma e tinyere ihe ndị na-esi ísì ọma fụchie ya ma lie ya n’ili ọhụrụ. Ọ kwaara nnukwu nkume kwachie ọnụ ya. Ndị isi nchụàjà gara gwa Paịlet, sị: ‘Ọ dị anyị ka ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya hà ga-abịa buru ozu ya ma kwuo na a kpọlitela ya n’ọnwụ.’ N’ihi ya, Paịlet gwara ha, sị: ‘Mechisienụ ili ahụ ike, dowekwanụ ndị nche na ya.’

      Mgbe ụbọchị atọ gachara, n’isi ụtụtụ ya, ụfọdụ ụmụ nwaanyị gara n’ili ahụ ma chọpụta na a kwapụla nkume ahụ e ji kwachie ọnụ ya. Ha hụrụ otu mmụọ ozi n’ime ili ahụ, ya agwa ha, sị: ‘Unu atụla egwu. A kpọlitela Jizọs n’ọnwụ. Gaanụ gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa na Galili hụ ya.’

      Meri Magdalin gbaara ọsọ gawa ịchọ Pita na Jọn. Mgbe ọ hụrụ ha, ọ sịrị ha: ‘E bupụla ozu Jizọs.’ Pita na Jọn gbaara ọsọ gaa n’ili ahụ. Mgbe ha ruru, ha hụrụ na ozu Jizọs adịghịzi ebe ahụ, ha alaghachi n’ụlọ ha.

      Mgbe Meri gaghachiri n’ili ahụ, ọ hụrụ ndị mmụọ ozi abụọ n’ime ya, ya agwa ha, sị: ‘Amaghị m ebe ha dọsara Onyenwe m.’ Ọ hụziri otu nwoke nọ ebe ahụ, ya echee na ọ bụ onye na-elekọta ubi ahụ. Ọ sịrị ya, ‘Nna m ukwu, gwa m ebe ị dọsara ya.’ Ma, mgbe nwoke ahụ kpọrọ ya “Meri,” ọ matara na ọ bụ Jizọs. Meri tiri mkpu, sị, “Onye Ozizi!” ma makụọ ya. Jizọs sịrị ya: ‘Gaa gwa ụmụnna m na ị hụrụ m.’ Ozugbo ahụ, Meri gbaara ọsọ gaa hụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ma gwa ha na ya hụrụ Jizọs.

      Ná mgbede ụbọchị ahụ, mmadụ abụọ na-eso ụzọ Jizọs si Jeruselem na-aga Emeọs ma na-akparịta ụka ka ha na-aga. Otu nwoke bịakwutere ha ma soro ha. Ọ jụrụ ha ihe ha na-akpa. Ha asị ya: ‘Ọ̀ bụ na ị nụbeghị ihe na-emenụ? Abalị atọ gara aga, ndị isi nchụàjà gburu Jizọs. Ugbu a, ụfọdụ ụmụ nwaanyị na-ekwu na ọ dị ndụ.’ Nwoke ahụ jụrụ ha, sị: ‘Ọ̀ bụ na unu ekweghị ihe ndị amụma kwuru? Ha kwuru na Kraịst ga-anwụ nakwa na a ga-akpọlite ya n’ọnwụ.’ Ọ nọgidere na-akọwara ha ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ. Mgbe ha ruru Emeọs, ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs gwara nwoke ahụ ka o soro ha, ya ekweta. Mgbe ha chọrọ iri nri anyasị, nwoke ahụ weere achịcha, kpee ekpere, ha amata na ọ bụ Jizọs. Ozugbo ahụ, ọ pụrụ n’anya ha.

      Mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ Jizọs laghachiri Jeruselem ozugbo. Ha gara n’ụlọ ebe ndịozi Jizọs zukọrọ ma gwa ha ihe merenụ. Mgbe ha nọ n’ime ụlọ ahụ, Jizọs pụtara n’ihu ha niile. Ná mmalite, ndịozi Jizọs ekwetaghị na ọ bụ ya. Ọ gwaziri ha, sị: ‘Leenụ aka m, metụnụ m aka. E dere n’Akwụkwọ Nsọ na Kraịst ga-esi n’ọnwụ bilie.’

      “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ. E nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụrụ na o sighị na m.”​—Jọn 14:6

      Ajụjụ: Olee ihe mere mgbe ụfọdụ ụmụ nwaanyị gara n’ebe e liri Jizọs? Gịnị mere mgbe mmadụ abụọ na-eso ụzọ Jizọs na-aga Emeọs?

      Matiu 27:57–28:10; Mak 15:42–16:8; Luk 23:50–24:43; Jọn 19:38–20:23

  • Jizọs Pụtara n’Ihu Ndị Gara Igbu Azụ̀
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe Jizọs na-agwa ndị na-eso ụzọ ya okwu mgbe ha hụnyere azụ̀ n’ọkụ

      ISI NKE 92

      Jizọs Pụtara n’Ihu Ndị Gara Igbu Azụ̀

      Obere oge Jizọs pụtachara n’ihu ndịozi ya, Pita gawara igbu azụ̀ n’Oké Osimiri Galili. Tọmọs, Jems, Jọn, na ụfọdụ ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs so ya gaa. Ha ji abalị niile gbalịa ka ha gbute azụ̀, ma o nweghị nke ha gbutere.

      N’isi ụtụtụ echi ya, ha hụrụ otu nwoke guzo n’akụkụ osimiri ahụ. Nwoke ahụ kpọrọ ha òkù ma jụọ ha, sị: ‘Ò nwere azụ̀ unu gbutere?’ Ha zara ya, sị: “Mba.” Ọ gwara ha, sị: “Wụnyenụ ụgbụ n’akụkụ aka nri nke ụgbọ mmiri unu.” Mgbe ha wụnyere ya, azụ̀ juru n’ụgbụ ha nke na ha enweghị ike ịdọbata ya n’ụgbọ ha. Jọn matara ozugbo na ọ bụ Jizọs ma kwuo, sị: “Ọ bụ Onyenwe anyị.” Ozugbo ahụ, Pita mabara n’ime mmiri ma gwuru mmiri gawa n’ebe Jizọs nọ. Ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ ji ụgbọ mmiri gawa ebe ahụ.

      Mgbe ha ruru n’akụkụ mmiri ahụ, ha hụrụ achịcha na azụ̀ a hụnyere n’ọkụ a kwanyere n’ebe ahụ. Jizọs gwara ha ka ha tinye ụfọdụ azụ̀ ndị ha gbutere n’ọkụ ahụ. Ọ gwaziri ha, sị: ‘Bịanụ rie nri ụtụtụ.’

      Ebe Pita na-agakwuru Jizọs n’akụkụ mmiri, ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ ejiri ụgbọ mmiri na-eso ya

      Mgbe ha richara nri ụtụtụ, Jizọs jụrụ Pita, sị: ‘Ị̀ hụrụ m n’anya karịa igbu azụ̀?’ Pita zara ya, sị: ‘Ee, Onyenwe anyị, ị ma na m hụrụ gị n’anya.’ Jizọs gwara ya, sị: “Na-enye ụmụ atụrụ m nri.” Ọ jụrụ Pita ọzọ, sị: ‘Pita, ị̀ hụrụ m n’anya?’ Ọ sịrị: “Ee, Onyenwe anyị, ị ma na m hụrụ gị n’anya.” Jizọs gwara ya, sị: “Na-azụ ụmụ atụrụ m.” Ọ jụkwara ya nke ugboro atọ. Ihe a wutere Pita. Ọ gwaziri Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, ị ma ihe niile. Ị ma na m hụrụ gị n’anya.” Jizọs sịrị ya: “Na-enye ụmụ atụrụ m nri.” Ọ gwaziri Pita, sị: “Na-eso m.”

      “[Jizọs] wee sị ha: ‘Soronụ m. M ga-eme ka unu bụrụ ndị na-akụta mmadụ.’ Ha hapụrụ ụgbụ ha ozugbo soro ya.”​—Matiu 4:19, 20

      Ajụjụ: Olee ọrụ ebube Jizọs rụụrụ ndị gara igbu azụ̀? Gịnị ka i chere mere Jizọs ji jụọ Pita ugboro atọ, sị: “Ị̀ hụrụ m n’anya?”

      Jọn 21:1-19, 25; Ọrụ Ndịozi 1:1-3

  • Jizọs Laghachiri Eluigwe
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe Jizọs na-alaghachi n’eluigwe, ndịozi ya ana-ele ihe na-emenụ

      ISI NKE 93

      Jizọs Laghachiri Eluigwe

      Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya zukọrọ na Galili. N’oge ahụ, Jizọs nyere ha otu iwu dị ezigbo mkpa. Ọ sịrị ha: ‘Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-akụziri ha ihe niile m kụziiri unu, na-emekwa ha baptizim.’ O kweziri ha nkwa, sị: ‘Chetanụ na m nọnyeere unu mgbe niile.’

      N’ime abalị iri anọ Jizọs nọrọ n’ụwa mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ, ọ pụtara n’ihu ọtụtụ narị ndị na-eso ụzọ ya nọ na Galili nakwa na Jeruselem. Ọ kụziiri ha ọtụtụ ihe dị mkpa, rụọkwa ọtụtụ ọrụ ebube. Jizọs na ndịozi ya nweziri nnọkọ ikpeazụ ya na ha nwere n’Ugwu Oliv. Ka ha nọ ebe ahụ, ọ gwara ha, sị: “Unu apụla na Jeruselem. Cherenụ ebe ahụ ka Nna m mezuo ihe o kwere ná nkwa.”

      Ndịozi ya aghọtaghị ihe o kwuru. Ha ajụọ ya, sị: ‘Ọ̀ bụ ugbu a ka ị ga-abụ Eze Izrel?’ Jizọs zara ha, sị: ‘Oge Jehova chọrọ ka m bụrụ Eze erubeghị. N’oge na-adịghị anya, unu ga-enweta ike mgbe a ga-enye unu mmụọ nsọ. Unu ga-abụkwa ndị àmà m. Gaanụ kwusaa ozi ọma na Jeruselem, Judia, na Sameria, ruokwa n’ebe ndị kacha anya n’ụwa.’

      Mgbe ahụ, e buliri Jizọs elu, ígwé ojii kpuchikwara ya. Ndị na-eso ụzọ ya nọ na-ele anya n’elu, ma ha ahụghịzi ya n’ihi na ọ laala.

      Ndị na-eso ụzọ Jizọs si n’Ugwu Oliv laghachi Jeruselem. Ha na-ezukọ mgbe niile n’otu ọnụ ụlọ dị n’elu ụlọ ma na-ekpe ekpere. Ha na-eche ka Jizọs gwakwuo ha ihe ha ga-eme.

      “A ga-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa ka ọ bụụrụ mba niile àmà, mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”​—Matiu 24:14

      Ajụjụ: Olee iwu Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya? Gịnị mere n’Ugwu Oliv?

      Matiu 28:16-20; Luk 24:49-53; Jọn 20:30, 31 Ọrụ Ndịozi 1:2-14; 1 Ndị Kọrịnt 15:3-6

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya