Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w04 9/15 p. 28
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọnọdụ Onye Bụ Nwanyị n’Akwụkwọ Nsọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Olee Otú M Kwesịrị Isi Mesoo Nwa Agbọghọ nke Gosiri Mmasị n’Ebe M Nọ?
    Teta!—2005
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
w04 9/15 p. 28

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’ihi gịnị ka e ji kwe ka ndị ikom Izrel lụọ ndị inyom ala ọzọ a dọtara n’agha ebe Iwu Mozis kwuru na a gaghị eso ndị ala ọzọ ụfọdụ alụrịta di na nwunye?—Deuterọnọmi 7:1-3; 21:10, 11.

Ọ bụ n’ihi ọnọdụ ndị pụrụ iche ka e ji nye ohere maka nke a. Jehova enyewo ụmụ Izrel iwu ibibi obodo nile nke mba asaa dị n’ala Kenan, na-egbu ndị nile bi n’ime ha. (Deuterọnọmi 20:15-18) N’ihe banyere mba ndị ọzọ, nanị ndị toro eto o yiri ka hà ga-alanarị bụ ndị inyom na-amaghị nwoke bụ́ ndị a dọtara n’agha. (Ọnụ Ọgụgụ 31:17, 18; Deuterọnọmi 20:14) Onye Izrel pụrụ ịlụ nwanyị dị otú ahụ nanị ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ ewere nzọụkwụ ụfọdụ.

Banyere nzọụkwụ ndị a chọrọ n’aka nwanyị dị otú ahụ, Bible na-ekwu, sị: “Ọ ga-akọpụkwa isi ya, mezie mbọ aka ya, yipụ uwe ndọta n’agha ya n’ahụ́ ya, nọdụ n’ụlọ gị, kwaara nna ya na nne ya ogologo otu ọnwa: e mesịa, ị ga-abakwuru ya, wee ghọọrọ ya di, o wee ghọọrọ gị nwunye.”—Deuterọnọmi 21:12, 13.

Nwanyị na-amaghị nwoke nke a dọtara n’agha bụ́ onye onye Izrel chọrọ ịlụ aghaghị ịkọpụ isi ya. Ịkpụ isi na-egosi iru újú ma ọ bụ ahụhụ. (Aịsaịa 3:24) Dị ka ihe atụ, mgbe ụmụ na ihe onwunwe nile nke nna ochie bụ́ Job funahụrụ ya, ọ kpụrụ isi ya dị ka ihe àmà nke iru újú. (Job 1:20) Nwanyị ala ọzọ ahụ aghaghịkwa imezi mbọ aka ya, eleghị anya ‘na-ebe mbọ aka ya’ ka ọ ga-abụ a sịgodị na o tee ha ihe, aka ya agaghị na-adọrọ adọrọ. (Deuterọnọmi 21:12, Knox) Gịnị bụ “uwe ndọta n’agha ya” nke nwanyị ahụ a dọtara n’agha na-aghaghị iyipụ? Ndị inyom nke obodo ndị Kenan bụ́ ndị a na-aga ịdọrọ n’agha na-eyirikarị uwe ha ndị kasị mma. Ha na-eme nke a n’olileanya nke na ha ga-enweta ihu ọma nke ndị ga-adọrọ ha n’agha. Nwanyị a dọọrọ n’agha nke na-eru újú aghaghị iyipụ uwe dị otú ahụ.

Nwanyị a dọọrọ n’agha nke ga-abụ nwunye onye Izrel ga-eruru ndị ọ hụrụ n’anya nwụrụ anwụ újú ruo otu ọnwa. A ga-ebibi obodo nile nke ndị Kenan kpamkpam nke na ọ dịghịzi ihe ga-ejikọ nwanyị ahụ na ndị ezinụlọ ya na ndị obodo ya. Ebe ọ bụ na ndị agha Izrel ebibiwo ihe oyiyi nke chi ya, ihe ndị nwanyị ahụ ji efe ofufe adịghịzi. Ọnwa ahụ o ji ruo újú bụkwa oge e ji mee ka ọ dị ọcha, bụ́ oge nwanyị ahụ a dọtara n’agha ga-enwere onwe ya pụọ n’ihe nile gbasara ofufe ochie ya.

Otú ọ dị, nke a dị iche n’ebe ndị inyom ala ọzọ n’ozuzu ha nọ. Banyere nke a, Jehova nyere iwu, sị: “Gị na ha alụrịtakwala nwunye; enyela nwa ya nwoke nwa gị nwanyị, ekurukwala nwa ya nwanyị nye nwa gị nwoke.” (Deuterọnọmi 7:3) Gịnị mere e ji gbochie ha ime nke a? Deuterọnọmi 7:4 na-ekwu, sị: “N’ihi na ọ ga-ewezuga nwa gị nwoke n’iso m n’azụ, ka ha wee fee chi ọzọ.” Ya mere, mmachibido ahụ bụ iji chebe ụmụ Izrel pụọ ná ngwagbu nke ofufe ha. Otú ọ dị, nwanyị ala ọzọ nke nọ n’ọnọdụ ahụ a kọwara na Deuterọnọmi 21:10-13 abụghị ihe iyi egwu. Ndị ikwu ya nile anwụchaala, e bibisiwokwa ihe oyiyi nke chi ya. Ya na ndị na-efe ofufe ụgha enweghịzi mmekọ. Onye Izrel pụrụ ịlụ nwanyị ala ọzọ nọ n’ọnọdụ dị otú ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya