-
Devid na GolayatIhe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
-
-
ISI NKE 40
Devid na Golayat
Jehova gwara Samuel, sị: ‘Gaa n’ụlọ Jesi. Otu n’ime ụmụ ya ndị nwoke ga-abụ eze ọzọ ga-achị ndị Izrel.’ N’ihi ya, Samuel gara n’ụlọ Jesi. Mgbe ọ hụrụ ọkpara ya, o kwuru n’obi ya, sị: ‘Ọ ga-abụrịrị nwa okorobịa a.’ Ma, Jehova gwara Samuel na ọ bụghị ya. Ọ sịrị Samuel: ‘M na-ahụ ihe dị n’obi mmadụ, ọ bụghị naanị otú ọ dị n’elu ahụ́.’
Jesi kpọpụtara ụmụ ya ndị nwoke isii ọzọ. Ma, Samuel sịrị ya: ‘Jehova ahọrọghị onye ọ bụla n’ime ha. Ì nwere ụmụ nwoke ndị ọzọ?’ Jesi sịrị ya: ‘Enwere m otu nwoke ọzọ. Ọ bụ ya bụ nke ikpeazụ. Aha ya bụ Devid. Ọ na-elekọtara m atụrụ n’ọhịa.’ Mgbe a kpọtara Devid, Jehova gwara Samuel, sị: ‘Ọ bụ onye a.’ Samuel wụrụ ya mmanụ n’isi, si otú a họpụta ya ka ọ bụrụ eze ga-achị ndị Izrel.
Mgbe oge ụfọdụ gachara, ndị Izrel na ndị Filistia chọrọ ịlụ agha. Ndị Filistia nwere otu dike gbara ezigbo dimkpa na-alụrụ ha agha. Aha ya bụ Golayat. Ọ nọ na-akwa ndị Izrel emo kwa ụbọchị. O ji olu ike kwuo, sị: ‘Kpọpụtanụ otu nwoke ga-alụso m ọgụ. Ọ bụrụ na o merie m, anyị ga-abụ ndị ohu unu. Ma, ọ bụrụ na mụ emerie ya, unu ga-abụ ndị ohu anyị.’
Devid buteere ụmụnne ya, bụ́ ndị agha, nri n’ebe ndị agha Izrel mara ụlọikwuu. Ọ nụrụ ihe Golayat kwuru ma kwuo, sị: ‘M ga-alụso ya ọgụ.’ Eze Sọl sịrị ya: ‘Ị ka bụ nwata.’ Devid asị ya: ‘Jehova ga-enyere m aka.’
Sọl nyere Devid ekike agha ya, ma Devid sịrị ya: ‘Agaghị m ejili ha lụọ agha.’ Devid weere èbè ya gaa n’iyi, họrọ nkume ise na-akwọ mụrụmụrụ ma chịnye ha n’akpa ya. Ọ gbaara ọsọ gawa ebe Golayat nọ. Golayat agwa ya, sị: ‘Obere nwa a, bịa ebe a. M ga-ekesara ụmụ nnụnụ na anụ ọhịa anụ gị.’ Ụjọ atụghị Devid. Ọ gwara Golayat, sị: ‘I ji mma agha na ube bịa, ma eji m aha Jehova bịa. Ọ bụghị anyị ka ị na-alụso agha, kama ọ bụ Chineke. Mmadụ niile nọ ebe a ga-amara na Jehova ka mma agha na ube ike. Ọ ga-enyefe unu niile n’aka anyị.’
Devid tinyeziri otu nkume n’èbè ya, were ike ya niile fegharịa ya ma gbapụ ya. Jehova mere ka nkume ahụ gbata Golayat n’egedege ihu, ya abamie n’egedege ihu ya, Golayat adaa nwụọ. Mgbe ndị Filistịa hụrụ na Golayat anwụọla, ha agbaa ọsọ. Ị̀ tụkwasịrị Jehova obi ka Devid?
“N’anya ụmụ mmadụ, ihe a agaghị ekwe omume. Ma, e nweghị ihe nyịrị Chineke n’ihi na ihe niile kwere Chineke omume.”—Mak 10:27
-
-
Devid na SọlIhe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
-
-
ISI NKE 41
Devid na Sọl
Mgbe Devid gbuchara Golayat, Eze Sọl mere ya otu n’ime ndị ọchịagha ya. Devid lụrụ ọtụtụ agha, meriekwa na ha. Ihe a mere ka ọ bụrụ onye a ma ama. Mgbe ọ bụla Devid si agha lọta, ụmụ nwaanyị na-apụta na-akụ egwú ma na-agba egwú. Ha na-asị: “Sọl egbuola puku kwuru puku, Devid egbuokwala iri puku kwuru iri puku.” Sọl bidoro inwere ya anyaụfụ, chọwakwa igbu ya.
Devid ma otú e si akpọ ụbọ nke ọma. Otu ụbọchị, mgbe Devid na-akpọrọ Sọl ụbọ, Sọl tụrụ ya ube. Devid zere ube ahụ, ya atụọ n’ahụ́ ájá. Mgbe ihe a mechara, Sọl gbalịkwara ọtụtụ ugboro ka o gbuo Devid. Devid mechara gbapụ gaa zoo n’ọzara.
Sọl kpọọrọ ndị agha dị puku atọ (3,000) na-achọgharị Devid. Ọ batara n’ọgba ebe Devid na ndị agha ya zoro. Ndị agha Devid gwara ya, sị: ‘Ihe a bụ ohere i nwere igbu Sọl.’ Devid ji nwayọọ gaa n’ebe Sọl nọ ma bekara uwe elu ya. Ma Sọl amaghị. Obi Devid mechara mawa ya ikpe na ọ kwanyereghị eze Jehova tere mmanụ ùgwù. O kweghịkwa ka ndị agha ya gbuo Sọl. Mgbe Sọl si n’ọgba ahụ pụta, Devid kpọdịrị ya òkù ma gwa ya na ya gaara egbu ya ma a sị na ya chọrọ. Sọl ọ̀ ga-akwụsịnụ ịchụgharị Devid ka o gbuo ya?
Mba. Sọl nọgidere na-achọ ụzọ ọ ga-esi gbuo Devid. Otu abalị, Devid na nwa nwanne ya bụ́ Abishaị banyere n’ebe Sọl na ndị agha ya nọ. Abna, onye na-eche Sọl nche, nọdị na-ehi ụra. Abishaị sịrị Devid: ‘Ihe a bụ ohere anyị nwere. Ka m gbuo ya.’ Devid sịrị ya: ‘Jehova ga-eme Sọl ihe. Ka anyị were naanị ube ya na ihe mmiri ya pụwa.’
Devid rigooro n’ugwu dị nso dị ebe Sọl na ndị agha ya nọ. Devid nọ n’elu ebe ahụ kpọọ Abna, sị: ‘Abna, gịnị mere na i chebeghị eze gị? Olee ebe ihe mmiri Sọl na ube ya dị?’ Sọl matara olu Devid ma sị: ‘Ị gaara egbu m, ma i gbughị m. Ama m na ọ bụ gị bụ eze ọzọ ga-achị ndị Izrel.’ Sọl laghachiri n’obí ya. Ma, ọ bụghị mmadụ niile nọ n’ezinụlọ Sọl kpọrọ Devid asị.
“Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụkwa unu ka ọ dị n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo. Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọbọ, kama nyenụ ọnụma ohere.”—Ndị Rom 12:18, 19
-
-
Jonatan Bụ Dike na Ezigbo Enyi DevidIhe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
-
-
ISI NKE 42
Jonatan Bụ Dike na Ezigbo Enyi Devid
Ọkpara Eze Sọl aha ya bụ Jonatan bụ dike n’agha. Devid kwuru na Jonatan na-efe ọsọ karịa ugo, dịkwa ike karịa ọdụm. Otu ụbọchị, Jonatan hụrụ ndị agha Filistia n’ugwu. Ha dị mmadụ iri abụọ. Ọ gwara onye na-eburu ya ngwá agha, sị: ‘Anyị ga-alụso ha agha ma ọ bụrụ na Jehova egosi anyị ihe àmà. Ọ bụrụ na ha asị anyị bịawa, anyị ga-amata na anyị kwesịrị ịlụso ha agha.’ Ndị agha Filistia tiri mkpu, sị: “Bịanụ lụso anyị agha.” N’ihi ya, Jonatan na onye na-eburu ya ngwá agha gbagooro n’ugwu lụso ha agha ma merie ha.
Jonatan gaara abụ eze ma nna ya nwụọ ebe ọ bụ ya bụ ọkpara. Ma, Jonatan ma na Jehova ahọrọla Devid ka ọ bụrụ eze ọzọ ga-achị ndị Izrel. N’agbanyeghị ya, o nwereghị ya anyaụfụ. Devid na Jonatan ghọrọ ezigbo enyi. Ha kwere ibe ha nkwa na ha ga na-enyere ibe ha aka ma na-agbachitere ibe ha. Jonatan nyere Devid uwe elu ya, mma agha ya, ụta ya, na ájị̀ ya iji gosi na ha abụrụla enyi.
Mgbe Devid na-agba ọsọ ka Sọl ghara igbu ya, Jonatan gakwuuru ya ma sị ya: ‘Dị ike ma nwee obi ike. Jehova ahọrọla gị ịbụ eze. Nna m makwa gbasara ya.’ Ị̀ ga-achọ inwe ezigbo enyi na-akpa àgwà ka Jonatan?
E nwere ihe karịrị otu ugboro Jonatan gaara anwụ maka na ọ chọrọ inyere Devid aka. Ọ ma na Eze Sọl nna ya chọrọ igbu Devid, n’ihi ya, ọ sịrị ya: ‘Ọ bụrụ na i gbuo Devid, i meela ihe ọjọọ n’ihi na o nweghị ihe o mere gị.’ Ihe a Jonatan kwuru were Sọl ezigbo iwe. Mgbe afọ ole na ole gachara, Sọl na Jonatan nwụrụ n’agha.
Mgbe Jonatan nwụrụ, Devid chọwara nwa Jonatan aha ya bụ Mefiboshet. Mgbe ọ chọtara ya, ọ gwara ya, sị: ‘M ga-elekọta gị ná ndụ gị niile n’ihi na nna gị bụ ezigbo enyi m mgbe ọ dị ndụ. Ị ga-ebi n’obí m, na-erikwa nri na tebụl m.’ Devid echefughị enyi ya Jonatan.
“Hụ ibe unu n’anya otú m hụrụ unu n’anya. E nweghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a, na mmadụ ga-enye ndụ ya maka ndị enyi ya.” —Jọn 15:12, 13
-
-
Mmehie Eze Devid MereIhe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
-
-
ISI NKE 43
Mmehie Eze Devid Mere
Mgbe Sọl nwụrụ, Devid ghọrọ eze. Devid dị afọ iri atọ mgbe ahụ. Afọ ole na ole ọ chịwara, ọ nọ n’ụlọ elu ya n’abalị hụ otu nwaanyị mara mma. Devid chọpụtara na aha ya bụ Bat-shiba, nakwa na ọ bụ nwunye onye agha aha ya bụ Yuraya. Devid ziri ozi ka Bat-shiba bịa n’obí ya. Mgbe ọ bịara, ha kwara iko, Bat-shiba atụrụ ime. Devid gbalịrị izo ihe a o mere. Ọ gwara onyeisi ndị agha ya ka o ziga Yuraya n’ihu agha, ebe agha kpụ ọkụ n’ọnụ ma hapụ ya ebe ahụ laa azụ. E gburu Yuraya, Devid alụwazie Bat-shiba.
Ma Jehova hụrụ ihe ọjọọ a niile merenụ. Gịnị ka ọ ga-eme? Jehova ziri otu onye amụma aha ya bụ Netan ka ọ gaa hụ Devid. Netan gwara Devid, sị: ‘E nwere otu ọgaranya nwere ọtụtụ atụrụ, nweekwa otu ogbenye nwere naanị obere atụrụ ọ hụrụ n’anya nke ukwuu. Ọgaranya ahụ weere otu obere atụrụ ahụ ogbenye ahụ nwere.’ Mgbe Netan gwachara ya ihe a, Devid were iwe ma sị: ‘Ọgaranya ahụ kwesịrị ịnwụ.’ Netan gwaziri Devid, sị: ‘Ọ bụ gị bụ ọgaranya ahụ.’ Ihe a wutere Devid, ya agwa Netan, sị: “Emehiela m Jehova.” Mmehie a Devid mere wetaara ya na ezinụlọ ya ọtụtụ nsogbu. Jehova tara Devid ahụhụ, ma o gbughị ya n’ihi na o kwuru eziokwu ma dịrị umeala n’obi.
Devid chọrọ ịrụrụ Jehova ụlọ nsọ, ma Jehova họọrọ nwa ya nwoke aha ya bụ Solomọn ka ọ rụọ ya. Devid malitere ịkwadebere Solomọn ihe ndị ọ ga-eji arụ ya. Ọ sịrị: ‘Ụlọ nsọ Jehova ga-ama ezigbo mma. Solomọn ka bụ nwata, ma m ga-enyere ya aka ịkwadebe ihe ndị ọ ga-eji arụ ya.’ Devid nyere nnukwu ego maka ịrụ ụlọ nsọ ahụ. Ọ kpọtara ndị nwere nkà. O wetara ọlaọcha na ọlaedo, meekwa ka e si n’obodo Taya na Saịdọn bute osisi sida. Mgbe oge ọnwụ ya ruwere, o nyere Solomọn akwụkwọ kwuru otú a ga-esi rụọ ụlọ nsọ ahụ. Devid kwuru, sị: ‘Jehova gwara m ihe ndị a m deere gị. Jehova ga-enyere gị aka. Atụla egwu. Nwee obi ike, bidokwa ọrụ.’
“Ihe agaghị agaziri onye na-ezochi mmehie ya, ma a ga-emere onye ọ bụla kwupụtara mmehie ya ma hapụ ya ebere.”—Ilu 28:13
-