Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yb14 p. 78-81
  • Siera Lion na Gini

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Siera Lion na Gini
  • Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2014
Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2014
yb14 p. 78-81

Siera Lion na Gini

IHE dị ka narị afọ ise gara aga, e nwere otu obere osisi apụ (nke a na-akpọkwa osisi akpụ) pulitere n’akụkụ Osimiri Siera Lion. Osisi a mechara too ma ghọọ nnukwu osisi. E si n’okpuru ya kpụrụ ndị ohu n’ahịrị na-agafe ruo narị afọ atọ. Ndị na-agba ahịa ohu bugara ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị ma ụmụaka ruru ihe dị ka otu narị puku na puku iri ise n’ebe a na-ere ndị ohu ná mba ọzọ. Obi tara ndị ahụ na-agba ahịa ohu mmiri.

Osisi Apụ ahụ dị na Fritaụn

N’abalị iri na otu n’ọnwa Mach n’afọ 1792, ọtụtụ ndị ohu e si n’Amerịka bughachi Afrịka nọ n’okpuru Osisi Apụ ahụ mee ememme ha ji na-echeta otú ha si nwere onwe ha. N’ụbọchị ahụ, ha malitere ibi ebe a kpọrọ Fritaụn. Aha obodo a pụtara ndị nweere onwe ha. Ọ dabakwara adaba n’ihi na ndị ohu ahụ nọ na-atụ anya mgbe ha ga-enwere onwe ha. Ugbu a kwa, ha enwerela onwe ha. A nọkwa na-akpọta ndị bụ́bu ndị ohu n’obodo a ruo mgbe a bịara nwee ihe karịrị otu narị agbụrụ ndị Afrịka n’ebe ahụ. Ndị a bụ́bu ndị ohu kwekọrịtara na ha ewerela Osisi Apụ ahụ ka ihe gosiri na ha enwerela onwe ha, nakwa na ha enweela olileanya.

Kemgbe ihe dị ka otu narị afọ ugbu a, Ndịàmà Jehova nọ na Siera Lion na-akasi ndị mmadụ obi ma na-akọrọ ha gbasara “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.” Nnwere onwe a karịrị nke ahụ ndị bụ́bu ndị ohu nwere. (Rom 8: 21) Ọ bụ n’Alaeze Chineke ka ndị mmadụ ga-enwere onwe ha n’eziokwu. Alaeze ahụ chịwa ụwa, ụwa niile ga-aghọ Paradaịs, udo ga-adị ebe niile, mmehie na ọnwụ agaghịkwa adị.—Aịza. 9:6, 7; 11:6-9.

Kemgbe ihe karịrị iri afọ ise ugbu a, alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Siera Lion na-elekọta ozi ọma Ndịàmà Jehova nọ na Gini na-ekwusa. E nweela ọtụtụ nsogbu kpara ma ọchịchị obodo Gini ma akụnụba ya ma ndị mmadụ aka ọjọọ. Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị obodo ahụ ji na-anabata ozi ọma Ndịàmà Jehova si na Baịbụl na-ekwusara ha. Ozi ọma a na-akasikwa ha obi.

E nwere ọtụtụ nsogbu n’obodo Siera Lion na Gini. E nwere ọtụtụ ndị ogbenye ọnụ ntụ, nwee ndị na-amaghị otú e si agụ na otú e si ede, nweekwa ndị bu omenala n’isi. E nwekwara ndị na-emekpọ ibe ha ọnụ. Ndị mmadụ ahụghịkwa ibe ha n’anya n’ihi na ha esighị n’otu agbụrụ. N’agbanyeghị nsogbu a niile, Ndịàmà Jehova nọ n’obodo abụọ a ka na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma. Akụkọ ndị anyị na-aga ịkọ banyere Ndịàmà Jehova nọ na Siera Lion na Gini gosiri na okwukwe ha ka bụ a kwaa akwụrụ, gosikwa na ha ka na-erubere Jehova isi n’agbanyeghị nsogbu ndị ahụ. Obi siri anyị ike na akụkọ a ga-eru gị n’obi ma mee ka okwukwe i nwere na Chineke sikwuo ike, n’ihi na Baibụl kwuru na Chineke bụ “onye na-enye olileanya.”—Rom 15:13.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya