-
Nkebi nke 1Gee Chineke Ntị
-
-
Nkebi nke 1
Chineke si na Baịbụl agwa anyị okwu. 2 Timoti 3:16
Ndị mmadụ na-amụ banyere Chineke n’ebe niile. Matiu 28:19
-
-
Nkebi nke 2Gee Chineke Ntị
-
-
Nkebi nke 2
Jehova kere ihe niile dị n’eluigwe . . . ọ bụkwa Jehova kere ihe niile dị n’ụwa. Abụ Ọma 83:18; Mkpughe 4:11
-
-
Nkebi nke 3Gee Chineke Ntị
-
-
Nkebi nke 3
Jehova nyere Adam na Iv ọtụtụ ihe ọma. Jenesis 1:28
Chineke sịrị ha erila mkpụrụ si n’otu osisi dị n’ogige Iden ahụ. Jenesis 2:16, 17
-
-
Nkebi nke 4Gee Chineke Ntị
-
-
Nkebi nke 4
Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi ma nwụọ. Jenesis 3:6, 23
Ndị nwụrụ anwụ adịghị ndụ, otú ahụ ájá na-adịghị ndụ. Jenesis 3:19
-
-
Nkebi nke 5Gee Chineke Ntị
-
-
Nkebi nke 5
Ọtụtụ mmadụ mere ihe ọjọọ n’oge Noa. Jenesis 6:5
Noa gere Chineke ntị wee rụọ ụgbọ. Jenesis 6:13, 14, 18, 19, 22
-
-
Nkebi nke 6Gee Chineke Ntị
-
-
Nkebi nke 6
Chineke bibiri ndị ajọ mmadụ, ma o chebere Noa na ezinụlọ ya. Jenesis 7:11, 12, 23
N’oge anyị a, Chineke ga-ebibi ndị na-eme ihe ọjọọ, ma ọ ga-echebe ndị na-eme ihe ọma. Matiu 24:37-39
-
-
Nkebi nke 7Gee Chineke Ntị
-
-
Nkebi nke 7
Jehova zitere Jizọs n’ụwa. 1 Jọn 4:9
Jizọs mere ihe ọma, ma ndị mmadụ kpọrọ ya asị. 1 Pita 2:21-24
-
-
Nkebi nke 8Gee Chineke Ntị
-
-
Nkebi nke 8
Jizọs nwụrụ ka anyị wee dị ndụ. Jọn 3:16
Chineke kpọlitere Jizọs n’ọnwụ ma chie ya Eze nke Alaeze Chineke. Daniel 7:13, 14
-
-
Nkebi nke 9Gee Chineke Ntị
-
-
Nkebi nke 9
Ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa na-egosi na Alaeze Chineke adịla nso. Luk 21:10, 11; 2 Timoti 3:1-5
Alaeze Chineke ga-ewepụ ihe ọjọọ niile. 2 Pita 3:13
-
-
Nkebi nke 10Gee Chineke Ntị
-
-
Nkebi nke 10
A ga-akpọlite ọtụtụ ndị nwụrụ anwụ ka ha biri n’ụwa. Ọrụ Ndịozi 24:15
Alaeze Chineke ga-akwụsị ahụhụ niile. Mkpughe 21:3, 4
-
-
Nkebi nke 11Gee Chineke Ntị
-
-
Nkebi nke 11
Chineke na-anụ ekpere anyị. 1 Pita 3:12
E nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ịrịọ Chineke n’ekpere. 1 Jọn 5:14
-
-
Nkebi nke 12Gee Chineke Ntị
-
-
Nkebi nke 12
Ọ bụ ịhụnanya ga-eme ka ezinụlọ nwee obi ụtọ. Ndị Efesọs 5:33
Nwee obiọma. Ahapụkwala di gị ma ọ bụ nwunye gị chụwa nwoke ma ọ bụ nwaanyị ọzọ. Enwela obi ọjọọ, ahapụkwala ezinụlọ gị. Ndị Kọlọsi 3:5, 8-10
-
-
Nkebi nke 13Gee Chineke Ntị
-
-
Nkebi nke 13
Emela ihe ọjọọ. 1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10
Na-eme ihe ọma. Matiu 7:12
-
-
Nkebi nke 14Gee Chineke Ntị
-
-
Nkebi nke 14
Na-akwado Chineke. 1 Pita 5:6-9
Mee mkpebi ga-akacha abara gị uru, ya bụ, gee Chineke ntị. Matiu 7:24, 25
-