-
‘Ọ Na-ekwu Okwu, Ọ Bụ Ezie na Ọ Nwụrụ Anwụ’Ụlọ Nche—2013 | Jenụwarị 1
-
-
Ọ bụrụ ihe ahụ ka Iv chere, ọ dara ya. Ọ bụrụkwa ihe ahụ ka ya na Adam kụziiri Ken mgbe ọ na-eto, o nweghị aka ha nyeere ya. Kama nke ahụ, ha mere ka isi buwe ya. Iv mechakwara mụta nwa nwoke ọzọ, ma ọ gụghị ya oké aha otú ahụ ọ gụrụ Ken. Ha gụrụ ya Ebel. Ọ ga-abụ na ihe aha a pụtara bụ “Ume E Kupụrụ Ekupụ” ma ọ bụ “Ihe Efu.” (Jenesis 4:2) Ọ̀ ga-abụ na aha a ha gụrụ Ebel gosiri na ha na-eche na Ken ga-aka ya baa uru? Anyị amaghị.
-
-
‘Ọ Na-ekwu Okwu, Ọ Bụ Ezie na Ọ Nwụrụ Anwụ’Ụlọ Nche—2013 | Jenụwarị 1
-
-
Ka Ken na Ebel na-etolite, ọ ga-abụ na Adam kụziiri ha ọrụ ha ga na-arụ ka ezinụlọ ha nweta ihe ha ga-eri. Ken ghọrọ onye ọrụ ubi, Ebel aghọọ onye na-azụ atụrụ.
-
-
‘Ọ Na-ekwu Okwu, Ọ Bụ Ezie na Ọ Nwụrụ Anwụ’Ụlọ Nche—2013 | Jenụwarị 1
-
-
Ọ ga-abụrịrị na Ebel wepụtara oge chebara ụdị onye Jehova bụ echiche. Were ya na ị na-ahụ ya ka ọ na-azụ atụrụ ya. Onye ọzụzụ atụrụ anaghị anọ otu ebe. Ọ na-akpọrọ atụrụ ndị ọ na-azụ rịa ugwu, gafee ndagwurugwu na iyi ma gaa n’ebe ahịhịa ndụ juru eju nakwa n’ebe ha ga-aṅụju mmiri afọ. Ọ na-akpọkwa ha aga n’ebe ndị mara mma ha ga-anọ zuru ike. A bịa n’ụmụ anụmanụ niile Chineke kere, ọ dị ka ọ̀ bụ atụrụ kacha bụrụ nke na-agbasighị ike, dị ka à ga-asị na Chineke kere ha ka mmadụ na-elekọta ma na-echebe ha. Ọ̀ ga-abụ na Ebel ghọtara na yanwa kwesịkwara inwe Onye karịrị mmadụ, nke kakwa mmadụ mara ihe, ga na-eduzi ya, na-echebe ya ma na-elekọta ya? Ọ ga-abụrịrị na o kpere ekpere banyere ihe ndị ahụ, ekpere ahụ mekwara ka okwukwe ya sikwuo ike.
Ihe e kere eke ndị Ebel hụrụ mere ka o nwee okwukwe siri ike na Chineke
-