Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ịchụrụ Jehova Àjà Ndị Ọ Na-anakwere
    Ụlọ Nche—1999 | Febụwarị 1
    • Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ma eleghị anya mgbe ha meworo nnọọ okenye, Ken na Ebel chụụrụ Jehova àjà n’otu n’otu. Ebe ọ bụ na Ebel bụ onye ọzụzụ ewu na atụrụ, ọ bụghị ihe ijuanya na o nyere “ụfọdụ n’ime ụmụ e buru ụzọ mụọ nke ìgwè ewu na atụrụ ya, na ụfọdụ n’ime iberibe ha mara abụba.” N’ụzọ dị iche, Ken nyere “ụfọdụ n’ime mkpụrụ ala.” Jehova nakweere àjà Ebel, ma “Ken na onyinye ịnata ihu ọma ya, O leghị ha anya ọma.” (Jenesis 4:3-5) N’ihi gịnị?

      Ụfọdụ na-arụtụ aka n’eziokwu ahụ bụ́ na àjà Ebel sitere n’ime “ụmụ e buru ụzọ mụọ nke ìgwè ewu na atụrụ ya,” ebe nke Ken bụ nanị “ụfọdụ n’ime mkpụrụ ala.” Ma ihe bụ nsogbu abụghị ọdịdị nke ihe e wetara n’ubi nke Ken chụrụ n’àjà, n’ihi na ihe ndekọ ahụ na-ekwu na Jehova lere “Ebel, leekwa onyinye ịnata ihu ọma ya” anya ọma, o leghịkwa “Ken na onyinye ịnata ihu ọma ya” anya ọma. (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ya mere Jehova lere anya n’ụzọ bụ́ isi n’ọnọdụ obi nke onye na-efe ya. N’ime otú ahụ, gịnị ka ọ hụrụ? Ndị Hibru 11:4 na-ekwu na ọ bụ “okwukwe” ka Ebel ji chụọ àjà ya. Ya mere, ihe àmà na-egosi na Ken egosighị okwukwe ahụ mere ka a nakwere àjà Ebel.

  • Ịchụrụ Jehova Àjà Ndị Ọ Na-anakwere
    Ụlọ Nche—1999 | Febụwarị 1
    • N’ụzọ dị iche, o yiri ka Ken echerughị echiche ala banyere àjà ọ chụrụ. “Onyinye ya bụ nanị ngosipụta nke nkwenye o kwenyere na Chineke bụ onye na-enye ihe,” ka otu onye na-akọwa Bible biri ndụ na narị afọ nke 19 tụrụ n’aro. “O kpughere n’ụzọ doro anya na ọ mataghị na e nwere esemokwu ọ bụla dị n’etiti ya na Onye Okike ya, ọ mataghịkwa mkpa ọ dị ime nkwupụta mmehie ma ọ bụ idabere ná mkpuchi mmehie.”

      Ọzọkwa, dị ka ọkpara, Ken pụrụ ijiworị mpako chee na ọ bụ ya bụ mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa ga-ebibi Agwọ ahụ, bụ́ Setan. Iv pụkwara iburuworị oké ọchịchọ dị otú ahụ n’uche maka ọkpara ya. (Jenesis 4:1) Otú ọ dị, ọ bụrụ na nke a bụ ihe Ken na Iv tụrụ anya ya, ha hiere nnọọ ụzọ.

      Bible ekwughị ụzọ Jehova si gosipụta na ọ nakweere àjà Ebel. Ụfọdụ ndị na-atụ aro na ọkụ sitere n’eluigwe repịara ya. Nke ọ bụla ọ bụ, ozugbo ọ matara na a jụrụ onyinye ya, “Ken wee wee iwe dị ọkụ nke ukwuu, ihu ya wee gbarụọ.” (Jenesis 4:5) Ken chere ihu n’ọdachi.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya