Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 4/15 p. 5-8
  • Gịnị Ka Ọdịnihu Gị Ga-abụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka Ọdịnihu Gị Ga-abụ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọdịnihu E Bu Ụzọ Detuo
  • Chineke Ọ̀ Na-Ebu Ụzọ Amara Ihe Nile?
  • Ọdịnihu Abụọ nke Mmadụ
  • À Kara Ọdịnihu Gị Aka?
    Teta!—2009
  • À Pụrụ Ime Ka Akara Aka na Ịhụnanya Chineke Kwekọọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Gịnị Mere Ihe Ọjọọ Ji Eme Ndị Ezigbo Mmadụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Jehova Na-egosi “Ikpeazụ Site na Mbụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 4/15 p. 5-8

Gịnị Ka Ọdịnihu Gị Ga-abụ?

ỌBỤRỤ na Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile mazuuru ihe nile, mara ihe nile gara aga, ndị na-eme ugbu a, na ndị ga-eme n’ọdịnihu, ọ̀ bụ na ihe nile agaghị eme kpọmkwem dị ka Chineke si buru ụzọ hụ ha? Ọ bụrụ na Chineke ebuwo ụzọ hụ ma kpebie ụzọ na ọdịnihu ikpeazụ nke mmadụ ọ bụla, à pụrụ ikwu n’eziokwu na anyị nweere onwe anyị ịhọrọ ụzọ ndụ anyị, ọdịnihu anyị?

A rụwo ụka n’ajụjụ ndị a ruo ọtụtụ narị afọ. Arụmụka ahụ ka na-ekewa okpukpe ndị bụ isi. À pụrụ ime ka ikike Chineke ịmara ọdịnihu kwekọọ ná nnwere onwe mmadụ ime nhọrọ? Olee ebe anyị kwesịrị ịchọ azịza?

Ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa ga-ekwere na Chineke esorowo ihe a kpọrọ mmadụ kwurịta okwu site n’Okwu ya e dere ede nke e nyere site n’ọnụ ndị na-ekwuchitere ya, bụ́ ndị amụma. Dị ka ihe atụ, Koran na-ezo aka ná mkpughe dị ka ihe sitere n’aka Chineke: Taurāh (Torah, Iwu, ma ọ bụ akwụkwọ ise nke Mosis), Zabūr (Abụ Ọma), na Injīl (Oziọma, Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ma ọ bụ “Agba Ọhụrụ”), nakwa ihe e kpugheere ndị amụma Israel.

N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, anyị na-agụ, sị: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie.” (2 Timoti 3:16) N’ụzọ doro anya, nduzi ọ bụla ma ọ bụ nkọwa ọ bụla anyị na-anata kwesịrị isite n’aka Chineke n’onwe ya kpọmkwem. Mgbe ahụ, ọ́ gaghị abụ ihe amamihe dị na ya inyocha ihe odide nke ndị amụma Chineke nke oge mbụ? Gịnị ka ha na-ekpughe banyere ọdịnihu anyị?

Ọdịnihu E Bu Ụzọ Detuo

Onye ọ bụla gụworo Akwụkwọ Nsọ maara na o nwere nnọọ n’ezie ọtụtụ narị amụma. E buchara ihe omume ndị mere ihe akụkọ ndị dị ka ọdịda nke Babilọn oge ochie, mwughachi nke Jerusalem (site na narị afọ nke isii ruo na narị afọ nke ise T.O.A.), na mbilite na ọdịda nke ndị eze Medo-Peasia na Gris n’amụma n’ozuzu ha. (Aịsaịa 13:17-19; 44:24–45:1; Daniel 8:1-7, 20-22) Mmezu nke amụma ndị dị otú ahụ bụ otu n’ime ihe nnwapụta ndị kasị sie ike na Akwụkwọ Nsọ bụ n’ezie Okwu Chineke, n’ihi na nanị Chineke nwere ike ma ịhụ ma ikpebi ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. N’echiche a Akwụkwọ Nsọ na-edekọ n’ezie ọdịnihu e bu ụzọ detuo.

Chineke n’onwe ya kwupụtara, sị: “Mụ onwe m bụ Chineke, ọ dịghịkwa Chineke ọzọ dị; abụ m Chineke, ọ dịghịkwa otu efu dị ka Mụ onwe m; na-egosi ikpeazụ site na mbụ, na-egosikwa ihe nke a na-emeghị eme site na mgbe ochie; na-asị, Ndụmọdụ m ga-eguzosi ike, ọ bụkwa ihe nile nke na-atọ m ụtọ ka M ga-eme . . . ekwuwo m, M ga-emekwa ka o mee; ezubewo m, M ga-eme kwa ya.” (Aịsaịa 46:9-11; 55:10, 11) Aha ahụ Chineke ji kọwaa onwe ya nye ndị amụma oge ochie ya bụ Jehova, nke pụtara n’ụzọ nkịtị “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.”a (Jenesis 12:7, 8; Ọpụpụ 3:13-15; Abụ Ọma 83:18) Chineke na-ekpughe onwe ya dị ka Onye na-aghọ Onye Mmezu nke okwu ya, Onye na-emezu nzube ya mgbe nile.

N’ihi ya, Chineke na-eji ike ya nke ibu ụzọ amara ihe eme ihe n’imezu nzube ya. O jiwo ya mgbe mgbe dọọ ndị ajọ omume aka ná ntị banyere ikpe na-abịanụ nakwa inye ndị ohu ya olileanya maka nzọpụta. Ma Chineke ọ̀ na-eji ike a eme ihe n’ụzọ a na-akparaghị ókè? È nwere ihe àmà ọ bụla n’ime Akwụkwọ Nsọ banyere ihe ndị Chineke họrọwooro ịhapụ ibu ụzọ mara?

Chineke Ọ̀ Na-Ebu Ụzọ Amara Ihe Nile?

Arụmụka nile e ji akwado ọdịnihu a kara aka dabeere n’echiche nke na ebe ọ bụ ihe a na-apụghị ịgọpụ agọpụ na Chineke nwere ike nke ịmara ma kpebie ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu, ọ ghaghị ibu ụzọ mara ihe nile, tinyere omume mmadụ nke ọ bụla ga-eme n’ọdịnihu. Otú ọ dị, echiche a ò rijuru afọ? Ihe Chineke na-ekpughe n’Akwụkwọ Nsọ ya na-egosi ihe dị iche.

Dị ka ihe atụ, Akwụkwọ Nsọ na-asị na “Chineke nwara Abraham” site n’inye ya iwu ka ọ chụọ nwa ya nwoke bụ́ Aịsak n’àjà dị ka àjà nsure ọkụ. Mgbe Abraham chọrọ ịchụ Aịsak n’àjà, Chineke gbochiri ya ma, sị: “Ugbu a ka M maara na onye na-atụ egwu Chineke ka ị bụ, n’ihi na i gbochighị nwa gị nwoke, nke i nwere nanị ya, iwere ya nye m.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) (Jenesis 22:1-12) Chineke ọ̀ gaara ekwu okwu ahụ ma ọ bụrụ na o bu ụzọ mara na Abraham ga-erube isi n’iwu ya? Ọ̀ gaara abụ ule e lere n’obi eziokwu?

Ọzọkwa, ndị amụma oge ochie kọrọ na Chineke kwuru ugboro ugboro banyere onwe ya dị ka onye “kwara ụta” n’ihi otu ihe o meworo ma ọ bụ ọ nọ na-eche echiche ime. Dị ka ihe atụ, Chineke sịrị na ya “[kwara ụta, (NW); site n’okwu Hibru bụ́ na·chamʹ] na o mere Sọl ka ọ bụrụ eze Israel.” (1 Samuel 15:11, 35; tụlee Jeremaịa 18:7-10; Jona 3:10.) N’ihi na Chineke zuru okè, amaokwu ndị a apụghị ịpụta na Chineke hiere ụzọ n’ịhọpụta Sọl ịbụ eze mbụ nke Israel. Kama, ha aghaghị igosi na Chineke nwere mwute na Sọl mesịrị bụrụ onye na-enweghị okwukwe na onye na-enupụ isi. Chineke iji okwu dị otú ahụ mee ihe n’ebe ya onwe nọ ga-abụ ihe nzuzu ma ọ bụrụ na o bu ụzọ mara ihe ndị Sọl ga-eme.

Otu okwu ahụ na-apụta n’Akwụkwọ Nsọ ndị kasị ochie, bụ́ ebe n’izo aka n’ụbọchị Noa, o kwuru, sị: “Jehova wee [kwaa ụta, NW] na O mere mmadụ n’ụwa, o wee wute Ya n’obi Ya. Jehova wee sị, M ga-ekpochapụ mmadụ n’elu ala, bụ́ ndị M keworo; . . . n’ihi na [akwawo m ụta, NW] na emere m ha.” (Jenesis 6:6, 7) N’ebe a kwa, nke a na-egosi na Chineke adịghị ebu ụzọ kpebie ihe omume mmadụ ga-abụ. Chineke kwara ụta, ruo újú, ọbụnakwa nwee mwute, ọ bụghị n’ihi na o hiere ụzọ n’omume ya, kama ọ bụ n’ihi na ajọ omume mmadụ bịara baa ụba. Onye Okike kwara ụta na ọ dịwo mkpa ibibi ihe nile a kpọrọ mmadụ ma e wezụga Noa na ezinụlọ ya. Chineke na-emesi anyị obi ike, sị: “Ọnwụ nke onye na-emebi iwu adịghị atọ m ụtọ.”—Ezikiel 33:11; tụlee Deuterọnọmi 32:4, 5.

Ya mere Chineke ò bu ụzọ mara na ọbụna kpebie ndaba Adam dabara ná mmehie, nakwa ọdachi ndị nke a ga-ewetara ezinụlọ ụmụ mmadụ? Ihe anyị tụleworo na-egosi na nke a apụghị ịbụ eziokwu. Ọzọkwa, ọ bụrụ na Chineke ebuwo ụzọ mara ihe a nile, ọ gaara aghọwo onye kpatara mmehie mgbe o kere mmadụ, Chineke gaara amawokwa ụma kpata ajọ omume na ahụhụ nile nke mmadụ. N’ụzọ doro anya, a pụghị ime ka nke a kwekọọ n’ihe Chineke na-ekpughe banyere onwe ya n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụ Chineke nke ịhụnanya na nke ikpe ziri ezi, onye kpọrọ ajọ omume asị.—Abụ Ọma 33:5; Ilu 15:9; 1 Jọn 4:8.

Ọdịnihu Abụọ nke Mmadụ

Akwụkwọ Nsọ adịghị ekpughe na n’ụzọ ụfọdụ Chineke na-ebu ụzọ kpebie ma ọ bụ guzobe akara aka ọdịnihu anyị n’otu n’otu. Kama nke ahụ, ihe ha na-ekpughe bụ na Chineke ebuwo amụma nanị ọdịnihu abụọ mmadụ nwere ike inweta. Chineke na-enye mmadụ ọ bụla nnwere onwe ịhọrọ ọdịnihu nke ga-abụ nke ya. Mosis onye amụma gwara ụmụ Israel n’oge dị anya gara aga, sị: “Ndụ na ọnwụ, . . . ka m tinyeworo n’ihu gị: gị họrọkwa ndụ, ka i wee dị ndụ, gị onwe gị na mkpụrụ gị: ịhụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya, na ige ntị olu Ya, na ịrapara n’ahụ Ya: n’ihi na Ya onwe ya bụ ndụ gị, na ogologo nke ụbọchị gị.” (Deuterọnọmi 30:19, 20, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Onye amụma Chineke bụ́ Jisọs bu ụzọ dọọ aka ná ntị, sị: “Sinụ n’ọnụ ụzọ dị warara baa: n’ihi na obosara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mbara ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba n’ịla n’iyi, ọtụtụ ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-esi na ya na-aba. N’ihi na warara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mkpagide ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba ná ndụ, ole na ole ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-achọta ya.” (Matiu 7:13, 14) Ụzọ abụọ, ọdịnihu abụọ. Ọdịnihu anyị na-adabere n’omume anyị onwe anyị. Irubere Chineke isi na-apụta ndụ, inupụrụ ya isi na-apụta ọnwụ.—Ndị Rom 6:23.

Chineke “na-agwa mmadụ ka ha nile chegharịa n’ebe nile: ebe O debeworo otu ụbọchị, nke Ọ ga-ekpe elu ụwa dum mmadụ bi ikpe n’ezi omume.” (Ọrụ 17:30, 31) Dị nnọọ ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ihe a kpọrọ mmadụ n’oge Noa họọrọ inupụrụ Chineke isi, e wee gbuo ha, otú ahụ, taa, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ adịghị erube isi n’ihe ndị Chineke nyere n’iwu. Ma, Chineke ebubeghị ụzọ kpebie ndị a ga-ebibi na ndị ga-enweta nzọpụta. N’eziokwu, Okwu Chineke na-asị na o “zubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.” (2 Pita 3:9) Ọbụna ndị dị njọ nke ukwuu pụrụ ichegharị, ghọọ ndị na-erube isi, meekwa mgbanwe ndị dị mkpa iji nweta ihu ọma Chineke.—Aịsaịa 1:18-20; 55:6, 7; Ezikiel 33:14-16; Ndị Rom 2:4-8.

Chineke na-ekwe ndị na-erube isi nkwa ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs nke udo, ụwa nke e mere ka ọ dị ọcha pụọ n’ajọ omume, ime ihe ike, na agha nile, ụwa nke agụụ, nhụjuanya, ọrịa, na ọnwụ na-agaghị adịkwa. (Abụ Ọma 37:9-11; 46:9; Aịsaịa 2:4; 11:6-9; 25:6-8; 35:5, 6; Mkpughe 21:4) Ọbụna na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ ma nye ha ohere ijere Chineke ozi.—Daniel 12:2; Jọn 5:28, 29.

“Rịba onye zuru okè ama, leekwa onye ziri ezi,” ka ọbụ abụ ahụ na-asị, “n’ihi na ọdịnihu dịịrị onye udo. Ma ndị njehie, a na-ekpochapụ ha n’otu: a ga-ebipụ ọdịnihu nke ndị na-emebi iwu.” (Abụ Ọma 37:37, 38) Gịnị ka ọdịnihu gị ga-abụ? Ihe nile dị gị n’aka. Ndị na-ebipụta magazin a ga-enwe obi ụtọ inyekwu gị ihe ọmụma iji mee ka i jide n’aka na i nwetara ọdịnihu udo.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Aha ahụ bụ́ Jehova pụtara ihe karịrị ugboro 7,000 n’ime Akwụkwọ Nsọ; lee traktị bụ́ The Greatest Name, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1995.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

Chineke na-eji ike ya nke ibu ụzọ amara ihe na-eme ihe n’imezu nzube ya

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

Chineke ‘ezubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.’ 2 Pita 3:9

[Foto dị na peeji nke 7]

Ọ bụrụ na Chineke bu ụzọ mara na Abraham ga-adị njikere ịchụ nwa ya nwoke n’àjà, ọ̀ gaara abụ ule e lere n’obi eziokwu?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya