Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g03 11/8 p. 3
  • Mmanụ Ala—Otú O Si Emetụta Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mmanụ Ala—Otú O Si Emetụta Gị
  • Teta!—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmanụ Ala—Olee Otú Anyị Si Enweta Ya?
    Teta!—2003
  • Mmanụ Ala—Ọ̀ Na-eweta Ngọzi na Nkọcha?
    Teta!—2003
  • Nkwụ—Osisi E Ji Eme Ọtụtụ Ihe
    Teta!—1999
  • Mmanụ Ala—Ọ̀ Dị Mgbe Ọ Ga-agwụ?
    Teta!—2003
Teta!—2003
g03 11/8 p. 3

Mmanụ Ala—Otú O Si Emetụta Gị

Ọ̀ DỊTỤLA mgbe i chere echiche banyere ihe ndụ ọtụtụ ndị gaara adị ka ya ma ọ bụrụ na e nweghị mmanụ ala na ihe ndị a na-eji ya emepụta?a A na-esi na mmanụ ala emepụta mmanụ a na-atụ n’ụgbọala, n’ịnyịnya ígwè, n’ihe ndị e ji akwagharị ụmụaka, nakwa n’ígwè ọrụ ndị ọzọ. Mmanụ na-eme ka akụkụ dị iche iche nke ígwè ọrụ ghara ịdị na-echi echi mgbe ha na-emetụ n’ahụ́ ibe ha, si otú ahụ na-eme ka ọ ghara imebi ngwa ngwa. Ma ọ bụghị ebe ahụ ka okwu gwụrụ.

A na-esi na mmanụ ala emepụta mmanụ ụgbọelu, nke ụgbọala, na nke a na-agbanye n’ígwè ndị e ji eme ka ụlọ kporo ọkụ. Imerime ihe ntecha, ágbá, ink, ọgwụ, fatịlaịza, na plastik nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ, nwere ihe ndị e si na mmanụ ala nweta. Ndụ ọtụtụ ndị ga-adị nnọọ iche ma ọ bụrụ na e nweghị mmanụ ala. Ka a sịkwa ihe mere otu akwụkwọ ji kwuo na ‘a na-eji mmanụ ala na ihe ndị e si na ya emepụta eme ọtụtụ ihe karịa ma eleghị anya, ka a na-eji ihe ọ bụla ọzọ dị n’ụwa eme ihe.’ Olee otú anyị si enweta mmanụ ala? Ebee ka e si enweta ya? Ogologo oge ha aṅaa ka ihe a kpọrọ mmadụ jiworo ya mee ihe?

Bible na-agwa anyị na n’ihe karịrị puku afọ abụọ tupu Kraịst abịa n’ụwa, Noa, site n’irube isi ná ntụziaka Chineke nyere ya, wuru otu akatamkpo ụgbọ ma jiri bitumen—ikekwe ihe e si na mmanụ ala nweta—mee ka mmiri ghara ịba n’ime ya. (Jenesis 6:14) Ndị Babilọn ji ihe ndị e si na mmanụ ala nweta mee brik ndị ha na-aṅa n’ọkụ, ndị Ijipt ji ya mee ihe n’ịgbasi ozu, ndị ọzọ biri n’oge ochie jikwa ya mee ihe n’ịgwọ ọrịa.

Ònye gaara echetụwo n’echiche na mmanụ ala ga-abịa dị mkpa otú a n’ụwa taa? Ọ dịghị onye pụrụ ịrụ ụka na mmepeanya a na-enwe n’oge a n’usoro mmepụta ihe na-adabere na mmanụ ala.

Ọ bụ ojiji e ji mmanụ ala mụọ ọkụ mere ka ọ malite iwu ewu. Laa azụ na narị afọ nke 15, e ji mmanụ e nwetara n’egwumighị ala egwumi mụọ oriọna na Baku, nke bụ́zi isi obodo Azerbaijan. N’afọ 1650, e gwutere mmanụ n’egwumighị ala egwumi na Romania, bụ́ ebe e ji mmanụ dị n’ụdị kerosin mụọ ọkụ. Ka ọ na-erule n’etiti narị afọ nke 19, mba ahụ na mba ndị ọzọ dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe enweelarị ụlọ ọrụ na-egwupụta mmanụ bụ́ ndị na-enwe ọganihu.

Na United States, ọ bụ ọchịchọ a chọrọ ihe na-enye ọkụ nke ọma n’afọ ndị 1800 mere n’ụzọ bụ́ isi ka otu ìgwè ndị ikom tinye mgbalị n’igwupụta mmanụ. Ndị ikom a kwubiri n’ụzọ ziri ezi na iji nweta kerosin ga-ezuru ha ire n’ahịa, ha aghaghị igwu ala iji nweta mmanụ. Ya mere, n’afọ 1859, a gbapuru mmanụ na Pennsylvania. Ịchụ mmanụ aghara aghara ebiri ọkụ. Gịnị meziri?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mgbe ụfọdụ, mmanụ ala na-esi n’ebe ala gbawatụrụ agbawa na-erupụta. E wezụga ịdị goro goro, ọ pụkwara ịdị n’ụdị rọrọ arọ dị ka asphalt, pitch, bitumen, ma ọ bụ tar.

[Igbe dị na peeji nke 3]

MMANỤ ALA—GỊNỊ KA Ọ BỤ?

A na-akọwa mmanụ ala dị ka ihe rọrọ arọ, na-enwu ọkụ, ma na-eji oji, nke ihe ndị mejupụtara ya bụ hydrocarbon na-ekupụ ekupụ, nke dị goro goro, na nke kpụkọtara akpụkọta, bụ́ nke na-adị n’ime ala. A pụrụ ịza ya iji nweta ihe dịgasị iche iche gụnyere gas, mmanụ petrol, naphtha, kerosin, mmanụ a na-atụ n’ígwè, paraffin wax, na asphalt, a na-ejikwa ya emepụta ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya