-
Ihe Ndekọ Njem Noa—Ò Nwere Ihe Ọ Pụtara Nye Anyị?Ụlọ Nche—2003 | Mee 15
-
-
Biko gụzie Jenesis 8:5-17. Mgbe a malitere ịhụ ọnụ ọnụ ugwu bụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọnwa abụọ na ọkara (ụbọchị 73) ka e mesịrị, “n’ọnwa nke iri ahụ [June], n’ụbọchị mbụ nke ọnwa.” (Jenesis 8:5)b Ọnwa atọ (ụbọchị 90) ka e mesịrị—n’afọ nke [narị isii na otu nke Noa], n’ọnwa mbụ, n’ụbọchị mbụ nke ọnwa ahụ,” ma ọ bụ n’etiti September, 2369 T.O.A.—Noa wepụrụ ihe mkpuchi nke ụgbọ ahụ. Mgbe ahụ, ọ bịara nwee ike ịhụ na “ihu ala kpọrọ nkụ.” (Jenesis 8:13) Ọ bụ otu ọnwa na ụbọchị 27 (ụbọchị 57) ka e mesịrị, “n’ọnwa nke abụọ, n’ụbọchị nke [iri abụọ] na asaa [n’etiti November, 2369 T.O.A.], ka ala kọsịrị.” Noa na ezinụlọ ya sizi n’ụgbọ ahụ pụta n’ala akọrọ. N’ihi ya, Noa na ndị ọzọ nọrọ otu afọ na ụbọchị iri e ji ọnwa gụọ (ụbọchị 370) n’ime ụgbọ ahụ.—Jenesis 8:14.
-
-
Ihe Ndekọ Njem Noa—Ò Nwere Ihe Ọ Pụtara Nye Anyị?Ụlọ Nche—2003 | Mee 15
-
-
b Akwụkwọ bụ́ Keil-Delitzsch Commentary on the Old Testament, Mpịakọta nke 1, peeji nke 148, na-ekwu, sị: “Ikekwe, ụbọchị 73 site n’oge ụgbọ ahụ tọgbọsịrị, a hụrụ elu ugwu, ya bụ, elu ugwu ndị dị n’Armenia, bụ́ ndị dị gburugburu ebe ụgbọ ahụ tọgbọrọ.”
-