Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Legara Jehova Anya Maka Nkasi obi
    Ụlọ Nche—1996 | Nọvemba 1
    • 5 N’ụzọ dị otú a, di na nwunye ahụ mehierenụ malitere ịnwụ. Mgbe ọ na-ama ha ikpe ọnwụ ahụ, Chineke gwakwara Adam, sị: “Ihe a na-abụ ọnụ ka ala bụ n’ihi gị; n’ihe mgbu ka ị ga-eri ihe sitere na ya ụbọchị nile nke ndụ gị; ọ bụkwa ogwu na uke ka ọ ga-epuru gị; ị ga-erikwa ihe ọkụkụ nke ubi.” (Jenesis 3:17, 18) Adam na Iv si otú a tụfuo olileanya nke ime ka ụwa ahụ a na-akwadebeghị akwadebe ghọọ paradaịs. N’ịbụ ndị a chụpụrụ n’Iden, ha aghaghị itinye ume ha nile n’inweta nri site n’ala nke a bụworo ọnụ. Ụmụ ha, ebe ha ketaworo ọnọdụ a nke ime mmehie, nke ịnwụ anwụ, bịara nọrọ n’oké mkpa maka nkasi obi.—Ndị Rom 5:12.

  • Legara Jehova Anya Maka Nkasi obi
    Ụlọ Nche—1996 | Nọvemba 1
    • 8 Jehova zubere ibibi ajọ ụwa ahụ site n’iju mmiri zuru ụwa ọnụ, ma tupu nke ahụ o mere ka Noa wuo otu ụgbọ iji chekwaa ndụ. N’ụzọ dị otú a, a zọpụtara agbụrụ mmadụ na ụdị anụmanụ nile. Lee ka Noa na ezinụlọ ya na-aghaghị isiworị nwee ahụ efe mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị ka ha na-apụta n’ụgbọ ahụ baa n’elu ala e mere ka ọ dị ọcha! Lee ka o si na-akasi obi ịhụ na e bupụwo ọnụ ahụ a bụrụ ala, na-eme ka ọrụ ịkọ ugbo dị mfe nke ukwuu karị! N’ezie, amụma Lemek ghọrọ eziokwu, Noa mezukwara ihe aha ya pụtara. (Jenesis 8:21) Dị ka ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi, e ji Noa rụọ ọrụ n’iwetara ihe a kpọrọ mmadụ ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke “nkasi obi.” Otú ọ dị, mmetụta ọjọọ nke Setan na ndị mmụọ ozi ọjọọ ya akwụsịghị n’Iju Mmiri ahụ, ihe a kpọrọ mmadụ gakwara n’ihu na-asụ ude n’okpuru ibu arọ nke mmehie, ọrịa, na ọnwụ.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya