Obodo Mgbaba—Ndokwa Obi Ebere Chineke
“Obodo isii ndị a ga-abụrụ [ha] . . . ebe mgbaba: ka onye ọ bụla nke na-etigbu mmadụ n’ọghọm wee gbalaga n’ebe ahụ.”—ỌNỤ ỌGỤGỤ 35:15.
1. Gịnị bụ ụzọ Chineke si ele ndụ na ikpe ọmụma ọbara anya?
JEHOVA CHINEKE na-ewere ndụ mmadụ dị ka ihe dị nsọ. Ndụ dịkwa n’ọbara. (Levitikọs 17:11, 14) Ya mere, Ken, bụ́ mmadụ mbụ a mụrụ n’ụwa, nwetara ikpe ọmụma ọbara mgbe o gburu nwanne ya bụ́ Ebel. N’ihi ya, Chineke gwara Ken: “Olu ọbara nwanne gị na-etiku m site n’ala.” Ọbara ahụ nke metọrọ ala n’ebe ahụ a nọ gbuo mmadụ na-agba akaebe dị ike n’ekwughị okwu nye ndụ nke e jiworo obi ịta mmiri bie nkenke. Ọbara Ebel tikuru Chineke maka ịbọ ọ́bọ̀.—Jenesis 4:4-11.
2. Olee otú e si mesie ùgwù Jehova na-akwanyere ndụ ike mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị?
2 E mesiri ùgwù Chineke na-akwanyere ndụ mmadụ ike mgbe Noa bụ onye ezi omume na ezinụlọ ya si n’ụgbọ ahụ pụta dị ka ndị nlanarị nke Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ. N’oge ahụ Jehova gbasapụrụ ihe oriri nke ihe a kpọrọ mmadụ ịgụnye anụ ụmụ anụmanụ ma ọ bụghị ọbara. O nyekwara iwu, sị: “Ọbara unu, bụ́ nke dịịrị ndụ unu, ka M ga-ajụtakwa; n’aka anụ nile ọ bụla dị ndụ ka M ga-ajụta ya: ọ bụkwa n’aka mmadụ, n’aka nwanne mmadụ ọ bụla, ka M ga-ajụta ndụ mmadụ. Onye na-awụsị ọbara mmadụ, site n’aka mmadụ ka a ga-awụsị ọbara ya: n’ihi na ọ bụ n’onyinyo Chineke ka O mere mmadụ.” (Jenesis 9:5, 6) Jehova nakweere ikike onye ikwu kasị nso nke onye e gburu nwere igbu ogbu mmadụ ahụ ma o zute ya.—Ọnụ Ọgụgụ 35:19.
3. Olee otú Iwu Mosis si kwusie okwu ike banyere ịdị nsọ nke ndụ?
3 N’Iwu e nyere Israel site n’aka Mosis onye amụma, e mesiri ịdị nsọ nke ọbara ike ugboro ugboro. Dị ka ihe atụ, Chineke nyere iwu, sị: “Gị egbula mmadụ.” (Ọpụpụ 20:13) Nkwanye ùgwù maka ndụ pụtakwara ìhè n’ihe Iwu Mosis ahụ kwuru banyere ihe ọghọm metụtara nwanyị dị ime. Iwu ahụ setịpụrụ na ọ bụrụ na ihe ọghọm emee ya ma ọ bụ nwa ya a na-amụbeghị amụ n’ihi ọgụ n’etiti ndị ikom abụọ, ndị ikpe gaje ịtụle ọnọdụ dịnụ na ọ̀tụ̀tụ̀ nke ịma ụma, ma ntaramahụhụ ya pụrụ ịbụ “ndụ laara ndụ.” (Ọpụpụ 21:22-25) Otú ọ dị, onye Israel gburu mmadụ ọ̀ pụrụ n’ụzọ ọ bụla ịgbanahụ ihe ndị ga-esite n’ime ihe ike ya?
Ọ̀ Bụ Ebe Nchebe Maka Ndị Gburu Mmadụ?
4. E wezụga n’Israel, olee ebe nchebe ndị dịrị n’oge gara aga?
4 Ná mba ndị ọzọ na-abụghị Israel, a na-enye ndị ogbu mmadụ na ndị mpụ ndị ọzọ nchebe. Otú a ka ọ dị n’ebe ndị dị ka ụlọ nsọ chi nwanyị bụ́ Atemis n’Efesọs oge ochie. Banyere ebe ndị dị otú ahụ, a kọrọ: “Ọgba arụsị ụfọdụ bụ ebe ọzụzụ ndị mpụ; ọ na-adịkwa mkpa mgbe mgbe ịkpara ọnụ ọgụgụ ebe nchebe ókè. N’Atens nanị ogige ole na ole ka a nakweere n’iwu dị ka ebe mgbaba (dị ka ihe atụ, ụlọ nsọ Theseus maka ndị ohu); n’oge Taịbiriọs ọgbakọ ndị arụ n’ọgba arụsị dị iche iche adịwo ize ndụ nke ukwuu nke na a kpaara ikike Ebe Nchebe ókè ịbụ nanị n’obodo ole na ole (n’afọ 22).” (The Jewish Encyclopedia, 1909, Mpịakọta nke Abụọ, peji nke 256) E mesịa, chọọchị ndị nke Krisendọm ghọrọ ebe nchebe, ma nke a yiri ka o bufeere ndị ụkọchukwu ike site n’aka ndị ọchịchị ma rụọ ọrụ megide ikpe ikpe ziri ezi n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Iji ha eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi mesịrị duje n’ịkwụsị ndokwa a.
5. Olee ihe àmà e nwere na Iwu ahụ enyeghị ohere maka iji akpacharaghị anya mee ihe nzọrọ maka ebere mgbe e gburu mmadụ?
5 N’etiti ndị Israel, a nabataghị ndị ma ụma gbuo mmadụ n’ebe nchebe. Ọbụna na a ga-akpụpụ onye nchụàjà Livaị na-eje ozi n’ebe ịchụàjà Chineke maka igbu ya n’ihi iji aghụghọ gbuo mmadụ. (Ọpụpụ 21:12-14) Ọzọkwa, Iwu ahụ enyeghị ohere maka iji akpachapụghị anya mere ihe nzọrọ maka ebere mgbe e gburu mmadụ. Dị ka ihe atụ, mmadụ gaje ime ihe mgbochi gburugburu maka elu ụlọ dị larịị nke ụlọ ọhụrụ ya. Ma o meghị ya, ikpe ọmụma ọbara ga-abịakwasị ụlọ ahụ ma ọ bụrụ na mmadụ esi n’elu ụlọ ahụ daa nwụọ. (Deuterọnọmi 22:8) Ọzọkwa, ọ bụrụ na a dọwo onye nwe oké ehi nke nwere àgwà ịdị na-asọgharị mpi aka ná ntị ma o cheghị anụmanụ ahụ nche, o wee gbuo mmadụ, onye nwe oké ehi ahụ nwere ikpe ọmụma ọbara, a pụkwara ime ka ọ nwụọ. (Ọpụpụ 21:28-32) Ihe àmà nke oké ùgwù Chineke na-akwanyere ndụ pụtara ìhè na ikpe ọbara mara onye ọ bụla tigburu onye ohi ma ọ bụrụ na o mere mgbe chi ka dị bụ́ mgbe a pụrụ ịhụ onye ahụ ma mata ya. (Ọpụpụ 22:2, 3) Ya mere, n’ụzọ doro anya, iwu nduzi nile nke Chineke ndị guzoziri eguzozi n’ụzọ zuru okè enyeghị ohere maka ndị ma ụma gbuo mmadụ ịgbanahụ ntaramahụhụ ọnwụ.
6. Olee otú e si emezu iwu nke “ndụ laara ndụ” n’Israel oge ochie?
6 Ọ bụrụ na e gburu mmadụ n’Israel oge ochie, a gaje ịbọ ọ́bọ̀ ọbara onye ahụ. A na-emezu iwu nke “ndụ laara ndụ” mgbe “onye ọ́bọ̀ ọbara” gburu ogbu mmadụ ahụ. (Ọnụ Ọgụgụ 35:19) Onye ọ́bọ̀ ahụ bụ onye ikwu bụ́ nwoke nke kasị onye ahụ e gburu nso. Ma gịnị banyere ndị gburu mmadụ n’ọghọm?
Ndokwa Obi Ebere Jehova
7. Olee ndokwa Chineke mere maka ndị gburu mmadụ n’ọghọm?
7 Maka ndị gburu mmadụ n’akpacharaghị anya ma ọ bụ n’ọghọm, Chineke ji ịhụnanya nye obodo mgbaba. Banyere ndị a, a gwara Mosis: “Gwa ụmụ Israel okwu, sị ha, Mgbe unu onwe unu ga na-agabiga Jọdan baa n’ala Kenean, unu ga-ahọpụtakwara onwe unu obodo ụfọdụ, obodo mgbaba ka ha ga-abụrụ unu; ka ogbu mmadụ onye na-etigbu mmadụ n’ọghọm wee gbalaga n’ebe ahụ. Obodo nile ahụ ga-abụkwara unu ebe mgbaba a ga-esi n’aka onye ọ́bọ̀ gbalaga; ka ogbu mmadụ wee ghara ịnwụ, ruo mgbe ọ ga-eguzo n’ihu nzukọ m ka e kpee ya ikpe. Obodo ndị a nke unu ga-enye, obodo isii nke mgbaba ka ha ga-abụrụ unu. Obodo atọ ka unu ga-enye n’ofe Jọdan nke a, obodo atọ ka unu ga-enyekwa n’ala Kenean; obodo mgbaba ka ha ga-abụ . . . ka onye ọ bụla nke na-etigbu mmadụ n’ọghọm wee gbalaga n’ebe ahụ.”—Ọnụ Ọgụgụ 35:9-15.
8. Olee ebe obodo mgbaba ndị ahụ dị, oleekwa ụzọ e si enyere ndị gburu mmadụ n’ọghọm aka iru ha?
8 Mgbe ndị Israel banyere n’Ala Nkwa ahụ, ha ji nrubeisi guzobe obodo mgbaba isii. Atọ n’ime obodo ndị a—Kedesh, Shekem, na Hebrọn—dị n’akụkụ ọdịda anyanwụ nke Osimiri Jọdan. N’ọwụwa anyanwụ Jọdan ka e nwere obodo mgbaba ndị bụ Golan, Remọt, na Beza. Obodo mgbaba isii ndị ahụ dị n’ebe ndị kwesịrị ekwesị n’okporo ụzọ ndị na-adị n’ọnọdụ ọma. N’ebe ndị kwesịrị ekwesị n’okporo ụzọ ndị a, e nwere ihe mgbaàmà ndị bu okwu bụ́ “ebe mgbaba.” Ihe mgbaàmà ndị a na-atụ aka n’ebe obodo mgbaba dị, onye ahụ gburu mmadụ n’ọghọm na-agbagakwa na nke kasị nso maka ndụ ya. N’ebe ahụ ọ pụrụ inweta nchebe site n’aka onye ọ́bọ̀ ọbara.—Joshua 20:2-9.
9. N’ihi gịnị ka Jehova ji nye obodo mgbaba ndị ahụ, ọ̀ bụkwa maka abamuru ole ndị ka e nyere ha?
9 N’ihi gịnị ka Chineke ji nye obodo mgbaba? E nyere ha ka a ghara iji ọbara na-emeghị ihe ọjọọ merụọ ala ahụ na ka ikpe ọmụma ọbara ghara ịbịakwasị ndị ahụ. (Deuterọnọmi 19:10) Maka abamuru ole ndị ka e nyere obodo mgbaba? Iwu ahụ kwuru, sị: “Obodo isii ndị a ga-abụrụ ụmụ Israel, bụrụkwa ọbịa, bụrụkwa onye bi n’etiti ha, ebe mgbaba: ka onye ọ bụla nke na-etigbu mmadụ n’ọghọm wee gbalaga n’ebe ahụ.” (Ọnụ Ọgụgụ 35:15) Otú a, iji mee ihe kwụ ọtọ na iji mee ihe ezi ikpe ma na-enye ohere maka obi ebere, Jehova gwara ndị Israel ka ha setịpụ obodo mgbaba maka ndị gburu mmadụ n’ọghọm bụ́ (1) ndị Israel site n’ọmụmụ, (2) ndị ọbịa n’Israel, ma ọ bụ (3) ndị si ná mba ndị ọzọ bi ebi n’ala ahụ.
10. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na obodo mgbaba ndị ahụ bụ ndokwa obi ebere Chineke mere?
10 Ọ dị ịrịba ama na ọ bụrụgodị na mmadụ gburu mmadụ n’ọghọm, a gaje ime ka ọ nwụọ n’okpuru iwu Chineke: “Onye na-awụsị ọbara mmadụ, site n’aka mmadụ ka a ga-awụsị ọbara ya.” N’ihi ya, ọ bụ nanị site ná ndokwa obi ebere Jehova Chineke ka onye gburu mmadụ n’ọghọm pụrụ ịgbalaga n’otu n’ime obodo mgbaba ndị a. O yiri ka ndị mmadụ n’ozuzu ha nwere ọmịiko maka onye na-agbalaga n’ihu onye ọ́bọ̀ ọbara, n’ihi na ha nile maara na ha pụrụ ịda iwu yiri nke ahụ n’ọghọm ma nwee mkpa nke ebe mgbaba na obi ebere.
Ịgbalaga n’Ebe Mgbaba
11. N’Israel oge ochie, gịnị ka mmadụ pụrụ ime ma ọ bụrụ na o gbuo onye ọrụ ibe ya n’amaghị ama?
11 Otu ihe atụ pụrụ ime ka ị ghọtakwuo ndokwa obi ebere Chineke maka ebe mgbaba. Were ya na ị bụ nwoke na-egbutu osisi n’Israel oge ochie. Ka e were ya na isi anyụike ahụ gbụpụrụ na mberede n’aka ya ma tigbuo onye ọrụ ibe gị. Gịnị ka ị ga-eme? Iwu ahụ mere ndokwa maka ọnọdụ a kpọmkwem. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-eji ndokwa a Chineke mere mee ihe: “Nke a bụkwa okwu banyere ogbu mmadụ, nke ga-agbalaga n’ebe ahụ, wee dị ndụ: onye na-egbu mmadụ ibe ya n’amaghị ama, ma ya onwe ya akpọghị ya asị na mgbe gara aga; dị ka mgbe ya na ibe ya na-aba n’oké ọhịa ịkpọwa nkụ, aka ya wee fee anyụike igbutu osisi, anyụike, bụ́ ígwè, wee gbụpụ n’osisi ahụ, wee ruo mmadụ ibe ya ahụ, o wee nwụọ; onye ahụ ga-agbalaga n’otu n’ime obodo ndị a, wee dị ndụ.” (Deuterọnọmi 19:4, 5) Ma, ọbụna ma i ruo n’obodo mgbaba, ị gaghị enwere onwe gị pụọ n’ibu ọrụ nile nke ihe merenụ.
12. Usoro dị aṅaa ka a ga-agbaso ma ọ bụrụ na onye gburu mmadụ n’ọghọm erute n’obodo mgbaba?
12 Ọ bụ ezie na a nabatara gị nke ọma, ị gaje ịkọrọ ndị okenye nọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo mgbaba ahụ ihe merenụ. Mgbe ị banyesịrị n’obodo ahụ, a ga-ezighachi gị azụ ịga guzo n’ikpe n’ihu ndị okenye na-anọchite anya ọgbakọ Israel n’ọnụ ụzọ ámá nke obodo na-elekọta ógbè ebe ahụ e gburu mmadụ. N’ebe ahụ ị ga-enwe ohere ịnwapụta na aka gị dị ọcha.
Mgbe A Na-ekpe Ndị Gburu Mmadụ Ikpe
13, 14. Olee ihe ụfọdụ ndị okenye ga-achọ ịchọpụta n’oge ikpe nke ogbu mmadụ?
13 N’oge ikpe ahụ n’ihu ndị okenye n’ọnụ ụzọ ámá nke obodo na-elekọta ebe ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-eji obi ekele rịba ama na e kwusiri okwu ike banyere omume gị n’oge gara aga. Ndị okenye ahụ ga-eji nlezianya tụlee mmekọrịta gị na onye ahụ e gburu egbu. Ị̀ kpọrọ onye ahụ asị, chebiri ya, ma mara ụma tigbuo ya? Ọ bụrụ otú ahụ, ndị okenye ahụ gaje inyefe gị n’aka onye ọ́bọ̀ ọbara, ị ga-anwụkwa. Ndị ikom a nwere ibu ọrụ gaje ịmara ihe Iwu ahụ chọrọ nke bụ na a “ga-ekpochapụ n’Israel [ikpe ọmụma] ọbara nke onye na-emeghị ihe ọjọọ.” (Deuterọnọmi 19:11-13) N’ụzọ yiri nke ahụ, n’okwu ikpe taa, ọ dị ndị okenye ndị Kraịst mkpa ịmara Akwụkwọ Nsọ nke ọma, na-eme ihe n’ụzọ kwekọrọ na ya mgbe ha na-eleba anya n’àgwà na omume oge gara aga nke onye mere ihe ọjọọ.
14 Na-agba ajụjụ n’ụzọ obi ọma, ndị okenye obodo ahụ ga-achọ ịmata ma i dere onye ahụ e gburu egbu ede. (Ọpụpụ 21:12, 13) Ì si n’ebe nzuzo wakwasị ya? (Deuterọnọmi 27:24) Ì jupụtara n’iwe megide onye ahụ nke na i kpebiri iji atụmatụ aghụghọ ụfọdụ gbuo ya? Ọ bụrụ otú ahụ, ị ga-ekwesị ọnwụ. (Ọpụpụ 21:14) Ọ ga-adị ndị okenye ahụ mkpa ịma karịsịa ma e nwebuwo iro, ma ọ bụ mkpọrọmasị, n’etiti gị na onye ahụ. (Deuterọnọmi 19:4, 6, 7; Joshua 20:5) Ka anyị were ya na ndị okenye ahụ hụrụ na aka gị dị ọcha ma kpọghachi gị n’obodo mgbaba ahụ. Lee aha ekele ị ga-enwe maka obi ebere ahụ e gosiri!
Ndụ n’Obodo Mgbaba
15. Olee ihe ndị a chọrọ n’aka onye gburu mmadụ n’ọghọm?
15 Onye gburu mmadụ n’ọghọm aghaghị ịnọgide n’obodo mgbaba ahụ ma ọ bụ na gburugburu 1,000 cubit (ihe dị ka 435 mita) ná mpụga mgbidi ya. (Ọnụ Ọgụgụ 35:2-4) Ọ bụrụ na ọ kpapụ gabiga ebe ahụ, ọ pụrụ izute onye ọ́bọ̀ ọbara ahụ. N’okpuru ọnọdụ ndị ahụ, onye ọ́bọ̀ ahụ pụrụ igbu ogbu mmadụ ahụ n’anataghị ntaramahụhụ ọ bụla. Ma a tụghị ogbu mmadụ ahụ ịga ma ọ bụ mkpọrọ. Dị ka onye bi n’obodo mgbaba, ọ ghaghị ịmụta otu nkà, bụrụ onye ọrụ, ma na-eje ozi dị ka onye bara uru n’etiti ọha mmadụ.
16. (a) Ruo ogologo oge hà aṅaa ka onye gburu mmadụ n’ọghọm gaje ịnọgide n’obodo mgbaba? (b) N’ihi gịnị ka ọnwụ onye isi nchụàjà ji eme ka o kwe onye gburu mmadụ omume ịhapụ obodo mgbaba?
16 Ogologo oge hà aṅaa ka onye ahụ gburu mmadụ n’ọghọm gaje ịnọgide n’obodo mgbaba? Ma eleghị anya ná ndụ ya nile fọrọ afọ. Ka o sina dị, Iwu ahụ sịrị: “N’ime obodo mgbaba ya ka ọ ga-ebi ruo mgbe ọnwụ onye isi nchụàjà: ma mgbe ọnwụ onye isi nchụàjà gasịrị ogbu mmadụ ahụ ga-alaghachi n’ala ihe onwunwe ya.” (Ọnụ Ọgụgụ 35:26-28) N’ihi gịnị ka ọnwụ onye isi nchụàjà ji enye ohere ka ogbu mmadụ ahụ n’ọghọm hapụ obodo mgbaba? Ọ dị mma, onye isi nchụàjà bụ otu n’ime ndị a kasị mara ama ná mba ahụ. Ya mere ọnwụ ya ga-abụ ihe omume dị ịrịba ama nke ukwuu nke na a ga-amata ya n’ebo nile nke Israel. Ndị nile gbara ọsọ ndụ nọ n’obodo mgbaba ndị ahụ pụziri ịlaghachi n’ụlọ ha n’anọghị n’ihe ize ndụ n’aka ndị ọ́bọ̀ ọbara. N’ihi gịnị? N’ihi na Iwu Chineke ekwuwo na ohere onye ọ́bọ̀ ahụ nwere igbu ogbu mmadụ ahụ gwụsịrị n’ọnwụ nke onye isi nchụàjà, onye ọ bụla makwaara nke a. Ọ bụrụ na onye ikwu nke na-esonụ abọọ ọ́bọ̀ ọnwụ ahụ mgbe nke ahụ gasịrị, ọ ga-abụ ogbu mmadụ, ọ ga-enwetakwa ntaramahụhụ n’ikpeazụ maka igbu mmadụ.
Mmetụta Na-adịgide Adịgide
17. Olee mmetụta ndị ihe mgbochi ndị a na-atụkwasị onye gburu mmadụ n’ọghọm pụrụ inwe?
17 Olee mmetụta ndị ihe mgbochi ndị a tụkwasịrị ogbu mmadụ n’ọghọm pụrụ inwe? Ha bụ ihe ncheta na ọ kpatawo ọnwụ mmadụ. Ma eleghị anya, ọ ga na-ele ndụ mmadụ anya dị ka ihe dị nsọ mgbe nile mgbe nke ahụ gasịrị. Ọzọ, ọ ga-esi ike ya ichezọ na e mesowo ya n’ụzọ ebere. N’ịbụ onye e gosiworo ebere, ọ ga-achọ n’ezie ịdị ebere nye ndị ọzọ. Ndokwa nke obodo mgbaba na ihe mgbochi ya nile bakwaara ndị ahụ n’ozuzu ha uru. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ ghaghị ịkụbanyewo n’uche ha na ha ekwesịghị ilelị ndụ mmadụ ma ọ bụ were ya n’ihe nkịtị. N’ihi ya ndị Kraịst kwesịrị ịbụ ndị e chetaara mkpa nke izere elezighị anya nke pụrụ ịrụpụta ọnwụ n’ọghọm. Mgbe ahụkwa, ndokwa obi ebere Chineke maka obodo mgbaba kwesịrị ịkwali anyị igosi ebere mgbe nke ahụ kwesịrị ekwesị.—Jemes 2:13.
18. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ndokwa Chineke maka obodo mgbaba si baa uru?
18 Ndokwa Jehova Chineke maka obodo mgbaba bakwara uru n’ụzọ ndị ọzọ. Ndị mba ahụ ehiweghị òtù ndị nche n’ịchụso ogbu mmadụ ná nkweta nke na ikpe mara ya tupu e kpee ya ikpe. Kama nke ahụ, ha lere ya anya dị ka onye aka ya dị ọcha pụọ n’ịma ụma gbuo mmadụ, ọbụna na-enyere ya aka iru n’ebe nchebe. Ọzọkwa, ndokwa nke obodo mgbaba bụ kpọmkwem ọdịiche nke ndokwa ndị e nwere taa nke idebe ndị ogbu mmadụ n’ụlọ mkpọrọ na n’ogige ịta ahụhụ, ebe ọha mmadụ na-eji ego na-azụ ha, ha na-aghọkwa ndị omekome ka njọ n’ihi iso ndị mmehie ndị ọzọ na-akpachi anya. Ná ndokwa obodo mgbaba, ọ dịghị mkpa iwu, ilekọta, na ichebe ụlọ mkpọrọ ndị na-ewe oké ego bụ́ ndị e wuuru mgbidi, jiri ígwè gachibido gburugburu bụ́ ebe ndị e si n’ime ya na-achọkarị ụzọ isi mịpụ. Ya bụ na ogbu mmadụ ahụ na-achọ “ụlọ mkpọrọ” ahụ ma nọgide n’ime ya ruo oge ahụ a kara aka. Ọ ghaghịkwa ịbụ onye na-arụ ọrụ, si otú ahụ na-eme ihe baara ụmụ mmadụ ibe ya uru.
19. Olee ajụjụ ndị a na-ewelite banyere obodo mgbaba?
19 N’ezie, ndokwa Jehova nke obodo mgbaba ndị Israel maka nchebe nke ndị gburu mmadụ n’ọghọm bụ nke obi ebere. Ndokwa nke a n’ezie kwalitere nkwanye ùgwù maka ndụ. Otú ọ dị, obodo mgbaba oge ochie ndị ahụ hà nwere ihe ha pụtaara ndị na-adị ndụ na narị afọ nke 20? Ànyị pụrụ ịbụ ndị ikpe ọbara mara n’ihu Jehova Chineke ma ghara ịma na obi ebere ya dị anyị mkpa? È nwere ihe ọ bụla obodo mgbaba ndị nke Israel pụtaara anyị taa?
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Olee otú Jehova si ele ndụ mmadụ anya?
◻ Olee ndokwa obi ebere Chineke mere maka ndị gburu mmadụ n’ọghọm?
◻ Olee otú ogbu mmadụ si eru n’obodo mgbaba, ogologo oge hà aṅaa ka ọ ga-anọgidekwa n’ebe ahụ?
◻ Olee mmetụta ndị ihe mgbochi ndị a tụkwasịrị ogbu mmadụ n’ọghọm pụrụ inwe?
[[Map dị na peeji 12]
Obodo mgbaba ndị nke Israel dị n’ebe ndị kwesịrị ekwesị
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
KEDESH Osimiri Jọdan GOLAN
SHEKEM REMỌT
HEBRỌN BEZA