Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • re isi 20 p. 119-129
  • Oké Ìgwè Mmadụ Bara Ụba

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Oké Ìgwè Mmadụ Bara Ụba
  • Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịkwado Ihe E Ji Mara Oké Ìgwè Mmadụ Ahụ
  • N’Eluigwe ka ọ̀ bụ n’Elu Ala?
  • Iti Mkpu Otuto n’Eluigwe na n’Elu Ala
  • Oké Ìgwè Mmadụ ahụ Apụta
  • Ngọzi Nile nke Oké Ìgwè Mmadụ Ahụ
  • Ime Ka Ọkpụkpọ Òkù ahụ Bụrụ nke E Ji n’Aka
  • ‘Lee Oké Ìgwè Mmadụ’
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Oké Ìgwè Mmadụ Ndị Nọ n’Ihu Ocheeze Jehova
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
  • Oké Ìgwè Mmadụ Na-eje Ozi Dị Nsọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • “Lee Oké Ìgwè Mmadụ Ahụ!”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
re isi 20 p. 119-129

Isi nke 20

Oké Ìgwè Mmadụ Bara Ụba

1. Òtù ọzọ dị aṅaa ka Jọn hụrụ mgbe ọ kọwasịrị ịka akara nke 144,000 ahụ?

MGBE ọ kọwasịrị otú e si kaa 144,000 ahụ akara, Jọn gara n’ihu ịkọ otu n’ime mkpughe ndị kasị akpali akpali n’Akwụkwọ Nsọ nile. Ọṅụ aghaghị ijupụtaworị ya obi mgbe ọ na-akọ banyere ya, sị: “Mgbe ihe ndị a gasịrị m wee hụ, ma lee, oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta, na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu Nwa Atụrụ ahụ, e gbokwasịworo ha uwe mwụda dị ọcha, igu nkwụ dịkwa n’aka ha.” (Mkpughe 7:9) Ee, njide e jidere ifufe anọ ahụ nyere ohere maka nzọpụta nke òtù ndị ọzọ na-abụghị 144,000 ahụ nke Israel ime mmụọ: oké ìgwè mmadụ nke ndị sitere n’asụsụ nile na ná mba nile.a—Mkpughe 7:1.

2. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị ụwa siworo kọwaa oké ìgwè mmadụ ahụ, oleekwa otú ọbụna Ndị Mmụta Bible si lee òtù nke a anya n’oge gara aga?

2 Ndị ụwa na-akọwa ihe akọwawo oké ìgwè mmadụ a dị ka ndị na-abụghị ndị Juu n’anụ ahụ a tọghatara gaa n’Iso Ụzọ Kraịst ma ọ bụ ịbụ ndị Kraịst ga-eje eluigwe e gburu maka okwukwe ha. N’oge gara aga, ọbụna Ndị Mmụta Bible lere ha anya dị ka òtù eluigwe nke abụọ, dị ka a rịbara ama na 1886 ná Mpịakọta nke Mbụ nke usoro akwụkwọ Studies in the Scriptures, bụ́ The Divine Plan of the Ages: “Ha enwetaghị ihe mgbata n’ọsọ bụ ocheeze na ọdịdị nke ndị bụ chi, kama ha ga-emesịa nweta ọmụmụ dị ka ụmụ mmụọ ndị nọ n’ọkwa dị ala karịa ndị bụ chi. Ọ bụ ezie na ndị a bụ ndị e doro nsọ, mmụọ nke ụwa meriri ha ruo n’ókè na ha enyeghị ndụ ha dị ka ihe ịchụàjà.” N’oge na-adịchabeghịkwa anya dị ka 1930, e kwupụtara echiche ahụ n’akwụkwọ bụ Light, Akwụkwọ nke Mbụ, sị: “Ndị mejupụtara oké ìgwè mmadụ nke a azaghị òkù ahụ a kpọrọ ha ịghọ ndị nkwusa na-anụ ọkụ n’obi nke Onyenwe anyị.” A kọwara ha dị ka ìgwè mmadụ ndị bụ ndị ezi omume n’anya onwe ha, ndị nwere ihe ọmụma nke eziokwu ahụ ma ghara ime ihe dị ukwuu banyere ikwusa ya. Ha nwere olileanya ije eluigwe dị ka òtù nke abụọ, ndị na-agaghị ekere òkè n’iso Kraịst chịa achịa.

3. (a) Olileanya dị aṅaa ka e setịpụụrụ ndị ọzọ ndị mesịrị malite ịnụ ọkụ n’obi n’ọrụ nkwusa ahụ? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka magazin Ụlọ Nche (Bekee) si kọwaa ilu ahụ nke atụrụ na ụmụ ewu na 1923?

3 Otú ọ dị, e nwere ndị ọzọ na-esonyere ndị Kraịst e tere mmanụ ndị mesịrị malite ịnụ ọkụ n’obi dị ukwuu n’ọrụ nkwusa ahụ. Ha enweghị ọchịchọ ọ bụla ije eluigwe. N’ezie, olileanya ha kwekọrọ n’isiokwu nke okwu ihu ọha ahụ ndị Jehova kwuru malite na 1918 ruo 1922. Na mbụ, isiokwu ya bụ “Ụwa Agwụwo—Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Ma Ọlị.”b N’oge na-adịghị anya ka nke a gasịrị, magazin Ụlọ Nche (Bekee) nke October 15, 1923, kọwara ilu Jisọs banyere atụrụ na ụmụ ewu (Matiu 25:31-46), na-asị: “Atụrụ nọchiri anya ndị nke mba nile, ndị a na-ejighị mmụọ nsọ mụta, kama ha nwere ọchịchọ ezi omume, ndị nakweere Jisọs Kraịst n’uche ha dị ka Onyenwe ha, ndị na-achọ, na-enwekwa olileanya maka oge ka mma n’okpuru ọchịchị ya.”

4. N’ụzọ dị aṅaa ka ìhè nke metụtara òtù elu ala ahụ si nwusawanye na 1931? na 1932? na 1934?

4 Mgbe afọ ole na ole gasịrị, na 1931, akwụkwọ bụ Vindication, Akwụkwọ nke Mbụ, kọwara Ezikiel isi nke 9, na-eme ka a mara ndị ahụ a kara akara n’egedege ihu ha maka nchebe gabiga ọgwụgwụ ụwa nke a dị ka atụrụ ahụ nke dị n’ilu ahụ a kọrọ n’elu. Akwụkwọ bụ Vindication, Akwụkwọ nke Atọ, nke e wepụtara na 1932 kọwara àgwà obi eziokwu nke nwoke ahụ na-abụghị onye Israel, bụ́ Jehonadab, onye sonyeere Eze Israel e tere mmanụ bụ Jihu n’ụgbọ agha ya wee soro jee hụ ịnụ ọkụ n’obi Jihu n’ibibi ndị okpukpe ụgha. (2 Ndị Eze 10:15-17) Akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “Jehonadab nọchiri anya ma ọ bụ sere onyinyo òtù ụmụ mmadụ ndị ahụ nọ n’elu ala ugbu a mgbe ọrụ Jihu [nke ịkpọsa ihe Jehova kpere n’ikpe] na-aga n’ihu, ndị nwere amara, ndị na-ekwekọghị ná nzukọ Setan, ndị na-ewere ọnọdụ ha n’akụkụ ezi omume, ọ bụkwa ha ka Onyenwe ha ga-echebe ná ndụ n’oge Amagedọn, duru ha gabiga nsogbu ahụ, nyekwa ha ndụ ebighị ebi n’elu ala. Ndị a mejupụtara òtù ‘atụrụ’ ahụ.” Na 1934, Ụlọ Nche [Bekee] mere ka o doo anya na ndị Kraịst ndị a nwere olileanya elu ala kwesịrị ịrara onwe ha nye Jehova, bụrụkwa ndị e mere baptism. Ìhè a na-ahụ banyere òtù elu ala nke a na-enwusawanye.—Ilu 4:18.

5. (a) Olee ụzọ e si kọwapụta ndị oké ìgwè mmadụ ahụ bụ na 1935? (b) Mgbe J. F. Rutherford gwara ndị bịara mgbakọ na 1935, bụ́ ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala ka ha guzo ọtọ, gịnị mere?

5 N’oge na-adịghị anya, nghọta zuru ezu nke Mkpughe 7:9-17 gaje itiwapụ ná mgbukepụ ya dị ebube! (Abụ Ọma 97:11) Magazin Ụlọ Nche (Bekee) anọgidewo na-ekwupụta olileanya ahụ bụ na mgbakọ e dokwara inwe na May 30 ruo June 3, 1935, na Washington, D.C., U.S.A., ga-abụ “ezi ihe nkasi obi na abamuru” nye ndị ahụ Jehonadab sere onyinyo ha. Otú ahụ ka ọ dịkwara! N’otu okwu na-akpali akpali n’isiokwu bụ́ “Oké Ìgwè Mmadụ Ahụ,” nke a gwara ihe dị ka 20,000 ndị bịara mgbakọ ahụ, J. F. Rutherford, bụ́ onye na-eduzi ọrụ nkwusa ahụ n’ụwa nile, nyere nkwado sitere n’Akwụkwọ Nsọ na atụrụ ọzọ nke oge a bụ otu ihe ahụ ha na oké ìgwè mmadụ nke Mkpughe 7:9. Ná mmechi okwu ya, ọkà okwu ahụ jụrụ ajụjụ, sị: “Biko ndị nile nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala hà pụrụ ibilite ọtọ?” Ka akụkụ dị ukwuu nke ndị ahụ na-ege ntị biliri ọtọ, ọkà okwu ahụ kwuru, sị: “Lee! Oké ìgwè mmadụ ahụ!” Ebe dum dara jụụ, mgbe ahụ oké ịkụ aka malitere. Lee ka òtù Jọn ahụ si nwee obi ụtọ—ha na òtù Jehonadab ahụ! N’ụbọchị so ya, e mere 840 Ndịàmà ọhụrụ baptism, ihe ka ọtụtụ n’ime ndị a na-ekwupụtakwa na ha so n’òtù oké ìgwè mmadụ ahụ.

Ịkwado Ihe E Ji Mara Oké Ìgwè Mmadụ Ahụ

6. (a) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji ghọta n’ụzọ doro anya na oké ìgwè mmadụ ahụ bụ òtù ndị Kraịst raara onwe ha nye n’oge a, ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala? (b) Gịnị ka uwe mwụda dị ọcha nke oké ìgwè mmadụ ahụ sere onyinyo ya?

6 Ànyị pụrụ isi aṅaa kwusie nnọọ ike na oké ìgwè mmadụ ahụ bụ òtù dị ugbu a nke ndị Kraịst raara onwe ha nye, ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala nke Chineke? Jọn ebuworị ụzọ hụ n’ọhụụ, ìgwè ndị ahụ ga-eje eluigwe, bụ́ ndị ‘a gbatara nye Chineke site n’ebo nile ọ bụla, na asụsụ nile ọ bụla, na ndị nile ọ bụla, na mba nile ọ bụla.’ (Mkpughe 5:9, 10) Oké ìgwè mmadụ ahụ sitekwara n’otu ebe ndị ahụ, ma ebe ha na-eje dị iche. N’adịghị ka Israel nke Chineke, a kaghị ọnụ ọgụgụ ha aka. Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ibu ụzọ kwuo mmadụ ole ha ga-adị. Ha sara uwe mwụda ha wee mee ka ọ dị ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ, na-egosi na ha nwere ọnọdụ ezi omume n’ihu Jehova n’ihi okwukwe ha nwere n’àjà Jisọs. (Mkpughe 7:14) Ha na-efegharịkwa igu nkwụ, na-eto Mesaịa ahụ dị ka Eze ha.

7, 8. (a) Ihe omume dị aṅaa ka ifegharị igu nkwụ na-aghaghị ichetawororịị Jọn onyeozi? (b) Gịnị ka eziokwu ahụ bụ na oké ìgwè mmadụ ahụ na-efegharị igu nkwụ na-egosi?

7 Ka ọ nọgidere na-ahụ n’ọhụụ nke a, ọ ghaghị ịbụ na Jọn ji uche ya na-ahụ ihe karịrị 60 afọ tupu mgbe ahụ, gaa n’izu ikpeazụ Jisọs nọrọ n’elu ala. Na Nisan 9, 33 O.A., mgbe ìgwè mmadụ zukọtara ịnabata Jisọs na Jerusalem, ha “chịịrị igu nkwụ, pụọ izute ya, wee na-eti mkpu, sị, Hosana: onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa n’aha [Jehova, NW], bụ eze nke Israel.” (Jọn 12:12, 13) N’ụzọ yiri nke ahụ, oké ìgwè mmadụ ahụ ifegharị igu nkwụ, na-etikwa mkpu gosiri oké ọṅụ ha nwere n’ịnakwere Jisọs dị ka Eze Jehova họpụtaworo.

8 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na igu nkwụ na mkpu ọṅụ chetakwaara Jọn Ememe Ụlọ Ntu ndị Israel oge ochie na-eme. Jehova nyere iwu banyere ememe nke a, sị: “Unu ga-achịrịkwa n’onwe unu n’ụbọchị mbụ mkpụrụ nke osisi ọma, na igu nkwụ, na alaka osisi gbara ọhịa, na osisi willow nke mmiri iyi; unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihu Jehova, bụ́ Chineke unu, ụbọchị asaa.” E ji igu nkwụ mee ihe dị ka ihe na-egosipụta ịṅụrị ọṅụ. Ụlọ ntu ndị ahụ na-adịghị adịgide adịgide bụ ihe na-echetara ha na Jehova zọpụtara ha site n’Ijipt, ibi n’ụlọ ntu n’ime ọzara. “Ọbịa, na nwa mgbei, na nwanyị di ya nwụrụ” na-ekere òkè n’ememe nke a. Ndị Israel nile “ga-abụkwa [ndị] na-aṅụrị nanị ọṅụ.”—Levitikọs 23:40; Deuterọnọmi 16:13-15.

9. N’iti mkpu ọṅụ dị aṅaa ka oké ìgwè mmadụ ahụ tinyekọrọ olu ha?

9 N’ihi ya, o kwesịrị ekwesị na oké ìgwè mmadụ ahụ, ọ bụ ezie na ha esoghị n’Israel ime mmụọ, kwesịrị ifegharị igu nkwụ, ebe ha ji ọṅụ na obi ekele na-egosipụta na mmeri na nzọpụta sitere n’aka Chineke na Nwa Atụrụ ahụ, dị ka Jọn hụrụ n’ebe a: “Ha wee were oké olu tie mkpu, sị, Nzọpụta dịịrị Chineke anyị, onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, dịkwara Nwa Atụrụ ahụ.” (Mkpughe 7:10) Ọ bụ ezie na e kewapụwo ha n’òtù nile nke elu ala, oké ìgwè mmadụ ahụ ji nanị otu “oké olu” ahụ na-eti mkpu. Olee ụzọ ha pụrụ isi mee nke a, n’agbanyeghị ndịrịta iche nke mba na asụsụ ha?

10. N’ụzọ dị aṅaa ka oké ìgwè mmadụ ahụ pụrụ isi jiri “oké olu” tikọọ mkpu n’agbanyeghị ndịrịta iche nke mba na asụsụ ha?

10 Oké ìgwè mmadụ nke a bụ akụkụ nke otu nzukọ ahụ jikọtara mba nile nke ọ bụ nanị ya bụ nke dị n’otu n’elu ala taa. Ha enweghị ụkpụrụ dị iche iche maka mba dị iche iche kama ha na-etinye ụkpụrụ nile ziri ezi nke Bible n’ọrụ n’agbanyeghị ebe ha bi. Ha adịghị etinye aka n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mgbanwe ọchịchị dị iche iche, kama ha ‘akpụgharịwo mma agha ha ka ha bụrụ mma oge’ n’ezie. (Aịsaịa 2:4) E kewasịghị ha gaa n’ịrọ òtù ma ọ bụ nzukọ dị iche iche, ka ha wee na-etipụta mkpu ozi a gwagburu agwagbu ma ọ bụ ndị na-emegiderịta onwe ha dị ka okpukpe nile nke Krisendọm; ha anaghị ahapụkwara ya nanị òtù ndị bụ ndị ọkà n’ịrụ ọrụ ụkọchukwu inyechitere ha otuto. Ha anaghị ekwu na nzọpụta ha sitere n’aka mmụọ nsọ, n’ihi na ha abụghị ndị na-efe chi atọ n’ime otu ofufe. N’ihe karịrị 200 mba dị iche iche gburugburu ụwa, ha dị n’otu n’ịkpọku aha Jehova ka ha na-asụ otu asụsụ ahụ dị ọcha nke eziokwu. (Zefanaịa 3:9) N’ụzọ ziri ezi, ha na-ekwupụta n’ihu ọha na nzọpụta ha sitere n’aka Jehova, bụ́ Chineke nke nzọpụta, site n’aka Jisọs Kraịst, Onye Bụ Isi O Doworo maka nzọpụta.—Abụ Ọma 3:8; Ndị Hibru 2:10.

11. N’ụzọ dị aṅaa ka nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ siworo nyere oké ìgwè mmadụ ahụ aka ime ka oké olu ha daa ụda ọbụna karị?

11 Nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ enyewo aka ime ka oké olu nke oké ìgwè mmadụ ahụ dị n’otu dapụtakwuo ụda. Ọ dịghị òtù okpukpe ọ bụla ọzọ nọ n’ụwa nke ọ dị mkpa ibipụta ihe ndị na-enye aka ịmụ Bible n’ihe karịrị 400 asụsụ, n’ihi na ọ dịghị òtù ọzọ nwere mmasị n’iwejere ndị nile nọ n’elu ala otu ozi nke dị n’otu. Dị ka ihe ga-enyekwu aka na nke a, n’okpuru nlekọta nke Òtù Na-achị Isi e tere mmanụ nke Ndịàmà Jehova, e mepụtawo usoro Multilanguage Electronic Phototypesetting System (MEPS) [usoro ígwè ọrụ eletrik na-ahazi mkpụrụ okwu n’ọtụtụ asụsụ]. N’oge e bipụtara akwụkwọ a, e ji ụdị ígwè MEPS dị iche iche na-eme ihe n’ihe karịrị ebe 125 gburugburu ụwa, nke a enyewokwa aka n’ime ka o kwe omume ibipụtakọ magazin ha nke na-apụta ugbo abụọ n’ọnwa, bụ́ Ụlọ Nche, n’ihe karịrị 130 asụsụ n’otu mgbe. Ndị Jehova na-ebipụtakọkwa akwụkwọ ukwu dị iche iche, dị ka nke a, n’ọtụtụ asụsụ dị iche iche. Otú a, Ndịàmà Jehova, nke oké ìgwè mmadụ ahụ mejupụtara akụkụ ka ukwuu na ha, nwere ike ikesa ọtụtụ narị nde akwụkwọ kwa afọ n’asụsụ nile ndị a maara nke ọma karị, na-enyere ìgwè ndị mmadụ ka ukwuu aka, bụ́ ndị sitere n’ebo nile na asụsụ nile ịmụ Okwu Chineke wee jikọta olu ha n’oké olu nke oké ìgwè mmadụ ahụ.—Aịsaịa 42:10, 12.

N’Eluigwe ka ọ̀ bụ n’Elu Ala?

12, 13. N’ụzọ dị aṅaa ka oké ìgwè mmadụ ahụ si “na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu Nwa Atụrụ ahụ”?

12 Ànyị si aṅaa mara na ‘iguzo n’ihu ocheeze ahụ’ apụtaghị na oké ìgwè mmadụ ahụ nọ n’eluigwe? E nwere ọtụtụ ihe àmà doro anya banyere nke a. Dị ka ihe atụ, okwu Grik ahụ a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “n’ihu” (e·noʹpi·on) pụtara n’ụzọ nkịtị “ịnọ ebe [a] ga-ahụ,” e jikwa ya mee ihe ọtụtụ ugbo banyere ụmụ mmadụ ndị nọ n’elu ala, bụ́ ndị nọ “n’ihu” ma ọ bụ ‘n’ebe [Jehova] ga-ahụ’ ha. (1 Timoti 5:21; 2 Timoti 2:14; Ndị Rom 14:22; Ndị Galetia 1:20) N’otu oge, mgbe ndị Israel nọ n’ime ọzara, Mosis gwara Erọn, sị: “Sị nzukọ nile nke ụmụ Israel, Bịaruonụ nso n’ihu Jehova: n’ihi na ọ nụwo ntamu nile unu.” (Ọpụpụ 16:9) Ọ dịghị mkpa na a ga-eburu ndị Israel jee n’eluigwe ka ha wee guzo n’ihu Jehova n’oge ahụ. (Tụlee Levitikọs 24:8.) Kama nke ahụ, kpọmkwem n’ime ọzara ebe ahụ ha guzoro n’ebe Jehova na-ahụ ha, o lekwasịkwara ha anya.

13 Ọzọkwa, anyị na-agụ, sị: “Ma mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya, . . . n’ihu ya ka a ga-eme ka mba nile zukọọ.”c Agbụrụ mmadụ dum agaghị anọ n’eluigwe mgbe amụma nke a ga-emezu. N’ezie, ndị ahụ “ga-apụ jee baa [ná mbipụ, NW] ebighị ebi” agaghị anọ n’eluigwe. (Matiu 25:31-33, 41, 46) Kama nke ahụ, ihe a kpọrọ mmadụ ga-eguzo n’elu ala ebe Jisọs ga-ahụ ha, ọ na-elekwasịkwa ha anya ikpe ha ikpe. N’ụzọ yiri nke ahụ, oké ìgwè mmadụ ahụ nọ “n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu Nwa Atụrụ ahụ” n’echiche nke bụ na ha na-eguzo n’ebe Jehova na Eze ya, bụ́ Kraịst Jisọs, ga-ahụ ha, bụ́ ndị ha ga-anata ikpe ziri ezi n’aka ha.

14. (a) Olee ndị ka a kọwara dị ka ndị nọ “ocheeze ahụ gburugburu” na “n’Ugwu Zaịọn [nke dị n’eluigwe]”? (b) Ọ bụ ezie na oké ìgwè mmadụ ahụ na-efe Chineke ofufe “n’ụlọ nsọ ya,” n’ihi gịnị ka nke a na-emeghị ka ha bụrụ òtù ndị nchụàjà?

14 Iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ na ìgwè ndị ahụ e tere mmanụ nke 144,000 ka a kọwara dị ka ndị nọ ‘gburugburu ocheeze’ Jehova nakwa “n’Ugwu Zaịọn [nke eluigwe].” (Mkpughe 4:4; 14:1) Oké ìgwè mmadụ ahụ abụghị òtù ndị nchụàjà, ha agaghị enwetakwa ọnọdụ ahụ e buliri elu. Ọ bụ ezie na e mesịrị kọwaa ha ná Mkpughe 7:15 dị ka ndị na-ejere Chineke ozi “n’ụlọ nsọ ya.” Ma, ụlọ nsọ nke a adịghị ezo aka n’ebe nsọ ahụ dị n’ime ime, nke bụ Ebe Kasị Nsọ. Kama nke ahụ, ọ bụ ogige elu ala nke ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke. Okwu Grik ahụ bụ na·osʹ, nke a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “ụlọ nsọ,” na-enyekarị echiche sara mbara nke ihe owuwu nile e wuru maka ofufe Jehova. Taa, nke a bụ ihe owuwu nke ime mmụọ nke jikọtara ma eluigwe ma elu ala.—Tụlee Matiu 26:61; 27:5, 39, 40; Mak 15:29, 30; Jọn 2:19-21, New World Translation Reference Bible, nkọwa ala ala peji.

Iti Mkpu Otuto n’Eluigwe na n’Elu Ala

15, 16. (a) Mmeghachi omume dị aṅaa ka e nwere n’eluigwe mgbe oké ìgwè mmadụ ahụ pụtara? (b) Olee otú ndị mmụọ Jehova kere eke si emeghachi omume mgbe ọ bụla e nwere mkpughe ọhụrụ nke nzube ya? (ch) Olee otú anyị ndị nọ n’elu ala pụrụ isi sonye n’abụ otuto ahụ?

15 Oké ìgwè mmadụ ahụ na-eto Jehova, ma ndị ọzọ na-abụkwa abụ otuto ya. Jọn kọrọ, sị: “Ndị mmụọ ozi nile na-eguzokwa ocheeze ahụ na ndị okenye ahụ na ihe anọ ahụ nke dị ndụ gburugburu; ha wee daa kpuchie ihu ha n’ala n’ihu ocheeze ahụ, wee kpọọ isiala nye Chineke, sị, Amen: Ngọzi nile, na otuto nile, na amamihe nile, na ekele nile, na nsọpụrụ nile, na ike nile, na ume nile, dịịrị Chineke anyị ruo mgbe nile ebighị ebi. Amen.”—Mkpughe 7:11, 12.

16 Mgbe Jehova kere ala, ndị mmụọ ozi ya nile dị nsọ “na-etikọ mkpu ọṅụ, ụmụ Chineke nile wee tisie mkpu ọṅụ ike.” (Job 38:7) Mkpughe ọhụrụ ọ bụla nke nzube Jehova aghaghịkwa ịkpaliworị iti mkpu otuto dị otú a n’ọnụ ndị mmụọ ozi. Mgbe 24 ndị okenye ndị ahụ—144,000 ahụ ndị nọ n’ebube eluigwe ha—tisiri mkpu ike n’ịmata Nwa Atụrụ ahụ, ndị ọzọ nile Chineke kere n’eluigwe sonyere n’inye Jisọs na Jehova bụ Chineke otuto. (Mkpughe 5:9-14) Ka ọ dị ugbu a, ihe ndị a e kere eke enweworị ọṅụ dị ukwuu n’ịhụ mmezu nke nzube Jehova n’ịkpọlite ndị mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ gaa n’ọnọdụ dị ebube n’ebe ndị bụ mmụọ. Ugbu a, ihe nile kwesịrị ntụkwasị obi Jehova kere eke dị n’eluigwe na-etiwapụkwa mkpu n’abụ otuto ọzọ mgbe oké ìgwè mmadụ ahụ na-apụta. N’eziokwu, ụbọchị Onyenwe anyị ahụ bụ oge na-akpali akpali nye ndị ohu Jehova nile ịdị ndụ n’ime ya. (Mkpughe 1:10) N’elu ala ebe a, lee ka o si bụụrụ anyị ihe ùgwù ikere òkè n’abụ otuto ahụ site n’ịgbara Alaeze Jehova àmà!

Oké Ìgwè Mmadụ ahụ Apụta

17. (a) Ajụjụ dị aṅaa ka otu n’ime 24 ndị okenye ahụ welitere, gịnịkwa ka eziokwu ahụ bụ na onye okenye ahụ pụrụ ịchọta azịza ya na-egosi? (b) Olee mgbe a zara ajụjụ onye okenye ahụ?

17 Malite n’oge Jọn onyeozi gamie n’ime ụbọchị Onyenwe anyị ahụ, ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’ihe mgbagwoju anya banyere ndị oké ìgwè mmadụ ahụ bụ. N’ihi nke a, ọ bụ ihe kwesịrị na otu n’ime 24 ndị okenye ndị ahụ ndị na-anọchi anya ndị e tere mmanụ ndị nọ anọ n’eluigwe, ga-akpali echiche Jọn site n’ịjụ otu ajụjụ dị mkpa. “Otu n’etiti ndị okenye ahụ wee zaa, sị m, Ndị a ndị e gbokwasịworo uwe mwụda ahụ dị ọcha, hà bụ olee ndị, olee ebe ha si bịakwa? M wee sị ya, Onyenwe m, gị onwe gị matara.” (Mkpughe 7:13, 14a) Ee, onye okenye ahụ pụrụ ịchọta azịza ya wee nye Jọn. Nke a na-egosi na ndị biliteworo n’ọnwụ n’ime òtù 24 ndị okenye ahụ pụrụ iso na-ezite ozi metụtara eziokwu nke Chineke taa. N’akụkụ nke ha, ndị so n’òtù Jọn ahụ nọ n’elu ala matara ndị oké ìgwè mmadụ ahụ bụ site n’iji nlezianya na-ekiri ihe Jehova na-eme n’etiti ha. Ha mere ngwa n’ịghọta oké mgbukepụ nke ìhè Chineke nke nwukwasịrị nzukọ ọchịchị Chineke na 1935, n’oge a kara aka nke Jehova.

18, 19. (a) Olileanya dị aṅaa ka òtù Jọn ahụ mesiri ike n’afọ ndị 1920 na 1930, ma olee ndị nakweere ozi ahụ n’ọnụ ọgụgụ na-aba ụba? (b) Gịnị ka mmata a matara oké ìgwè mmadụ ahụ na 1935 gosiri banyere 144,000 ahụ? (ch) Gịnị ka ihe ndekọ ọnụ ọgụgụ ndị bịara Ememe Ncheta na-egosi?

18 N’ime afọ ndị 1920 na mmalite afọ ndị 1930, òtù Jọn ahụ mesiri olileanya nke eluigwe ike, ma n’akwụkwọ ndị ha na-ebipụta ma n’ọrụ nkwusa ahụ. O doro anya na ọnụ ọgụgụ ahụ bụ 144,000 ezubeghị n’oge ahụ. Ma ọnụ ọgụgụ na-aba ụba nke ndị ṅara ntị n’ozi ahụ, ndị gosipụtakwara ịnụ ọkụ n’obi n’ọrụ ịgba àmà ahụ kwupụtara olileanya ha ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs elu ala. Ha enweghị ọchịchọ ije eluigwe. Ọ bụghị ebe ahụ ka a kpọrọ ha ije. Ha abụghị akụkụ nke ìgwè atụrụ nta ahụ kama ha bụ akụkụ nke atụrụ ọzọ ahụ. (Luk 12:32; Jọn 10:16) Mmata a matara ha na 1935 dị ka oké ìgwè mmadụ ahụ nke atụrụ ọzọ bụ ihe àmà na-egosi na nhọpụta nke 144,000 ahụ yiri ka o zuwo n’oge ahụ.

19 Ngụkọ ndị e nwere hà na-akwado nkwubi okwu nke a? Ee, ha na-akwado ya. Na 1938, gburugburu ụwa, 59,047 Ndịàmà Jehova keere òkè n’ije ozi. N’ime ndị a, 36,732 keere òkè n’ihe nnọchianya ndị ahụ dị n’Ememe Ncheta ọnwụ Jisọs a na-eme kwa afọ, wee si otú a na-egosi na ha natara ọkpụkpọ eluigwe. N’afọ ndị dịworo kemgbe ahụ, ọnụ ọgụgụ ndị na-ekere òkè n’ihe nnọchianya ahụ anọgidewo na-agbada, n’ụzọ bụ isi, n’ihi na Ndịàmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi ejezuwo ozi elu ala ha mgbe ha nwụrụ. Na 2005, ọ bụ nanị 8,524 keere òkè n’ihe nnọchianya Ememe Ncheta ndị ahụ—nanị 0.05 pasentị nke 16,390,116 ndị bịara ememe ahụ e mere n’ụwa dum.

20. (a) N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, okwu dị aṅaa ka J. F. Rutherford kwuru n’onwe ya banyere oké ìgwè mmadụ ahụ? (b) Eziokwu dịgasị aṅaa na-egosi ugbu a na oké ìgwè mmadụ ahụ hiri nne n’ezie?

20 Mgbe agha ụwa nke abụọ tiwapụrụ, Setan tinyere ajọ mgbalị iji kwụsị iwe oké ìgwè mmadụ ahụ dị ka ihe ubi. E gbochiri ọrụ Jehova n’ọtụtụ mba. N’oge ọchịchịrị ndị ahụ, n’oge na-adịghịkwa anya tupu ọnwụ ya na January 1942, a nụrụ ka J. F. Rutherford kwuru, sị: “Ee . . . o yiri nnọọ ka oké ìgwè mmadụ agaghị ehichakwa nne otú anyị chere.” Ma ngọzi Chineke rụpụtara ihe dị iche na nke ahụ! Ka ọ na-erule 1946, ọnụ ọgụgụ Ndịàmà na-eje ozi gburugburu ụwa arịwo elu nke ukwuu ruo 176,456—ihe ka ọtụtụ n’ime ndị a bụ ndị oké ìgwè mmadụ ahụ. Na 2005, e nwere 6,390,022 Ndịàmà ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi na 235 ala dị iche iche—n’ezie OKÉ ÌGWÈ MMADỤ! Ọnụ ọgụgụ ndị ahụ nọgidekwara na-arị elu.

21. (a) Olee ụzọ nchịkọbata nke ndị Chineke n’ime ụbọchị Onyenwe anyị siworo kwekọzuo n’ọhụụ Jọn? (b) Olee otú amụma ụfọdụ ndị dị mkpa si malite imezu?

21 Owuwe ihe ubi nke ndị Chineke n’ime ụbọchị Onyenwe anyị ahụ esiwo otú a kwekọzuo n’ọhụụ Jọn: malite n’ịchịkọta ihe fọdụrụ na 144,000 ahụ; e mesịa ịchịkọta oké ìgwè mmadụ ahụ. Dị ka Aịsaịa buru n’amụma, ugbu a “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a,” ndị sitere ná mba nile na-erubata ikere òkè n’ofufe dị ọcha nke Jehova. N’ezie, anyị ji oké ọṅụ na-ahụ okike Jehova na-eke “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.” (Aịsaịa 2:2-4; 65:17, 18) Chineke na-achịkọta “ihe nile n’ime Kraịst anyị dị ka isi, bụ́ ihe nile dị n’eluigwe, na ihe nile dị n’elu ụwa.” (Ndị Efesọs 1:10) Ndị nketa e tere mmanụ nke Alaeze eluigwe—ndị a họpụtaworo n’ime ọtụtụ narị afọ ndị dịworo kemgbe oge Jisọs—bụ “ihe nile dị n’eluigwe.” Ugbu a kwa, oké ìgwè mmadụ ahụ nke atụrụ ọzọ pụtara dị ka ndị mbụ nke “ihe nile dị n’elu ụwa.” Ọ pụrụ iwetara gị obi ụtọ ebighị ebi ma ọ bụrụ na i jee ozi n’ụzọ kwekọrọ ná ndokwa ahụ.

Ngọzi Nile nke Oké Ìgwè Mmadụ Ahụ

22. Ihe ọmụma ọzọ dị aṅaa ka Jọn natara banyere oké ìgwè mmadụ ahụ?

22 Site n’ụzọ mgbasa ozi ahụ nke Chineke, Jọn natara ihe ọmụma ọzọ banyere oké ìgwè mmadụ nke a: “O [onye okenye ahụ] wee sị m, Ndị a bụ ndị na-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta, ha sakwara uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ. N’ihi nke a ka ha nọ n’ihu ocheeze Chineke; ha na-efekwa ya ofufe ehihie na abalị n’ụlọ nsọ ya: onye ahụ nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ ga-agbasakwa ụlọ ikwuu ya n’isi ha.”—Mkpughe 7:14b, 15.

23. Gịnị bụ oké mkpagbu ahụ nke oké ìgwè mmadụ ahụ si na ya “pụta”?

23 N’otu oge tupu mgbe ahụ, Jisọs ekwuworị na ọnụnọ ya n’ebube Alaeze ga-ejedebe mgbe “mkpagbu ukwu ga-adị, nke ihe dị ka ya akadịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.” (Matiu 24:21, 22) Ná mmezu nke amụma ahụ, ndị mmụọ ozi ahụ ga-atọhapụ ifufe anọ nke ụwa ibibi usoro ihe Setan dị n’ụwa. Ihe mbụ a ga-ebibi bụ Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Mgbe ahụ, mgbe mkpagbu ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ, Jisọs ga-anapụta ndị ahụ fọdụrụ n’ime 144,000 ahụ ndị ka nọ n’elu ala, ha na oké ìgwè mmadụ ahụ hiri nne.—Mkpughe 7:1; 18:2.

24. Olee otú ndị mmadụ n’otu n’otu n’oké ìgwè mmadụ ahụ si eru eru maka nlanarị?

24 Olee ụzọ ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ n’otu n’otu si eru eru maka nlanarị? Onye okenye ahụ gwara Jọn na ha “sakwara uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ha enwewo okwukwe n’ebe Jisọs nọ dị ka Onye Mgbapụta ha, ha ararawo onwe ha nye Jehova, gosipụta nrara ha raara onwe ha nye site na baptism ime mmiri, ‘na-enwekwa ezi akọ na uche’ site n’ezi àgwà ha. (1 Pita 3:16, 21; Matiu 20:28) Otú a, ha bụ ndị dị ọcha, bụrụkwa ndị ezi omume n’anya Jehova. Ha na-edebekwa onwe ha “n’enweghị ntụpọ site n’ụwa.”—Jemes 1:27.

25. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka oké ìgwè mmadụ ahụ si na-ejere Jehova ‘ozi dị nsọ ehihie na abalị n’ụlọ nsọ ya’? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si ‘na-agbasa ụlọ ikwuu ya n’isi’ oké ìgwè mmadụ ahụ?

25 Ọzọkwa, ha aghọwo Ndịàmà na-anụ ọkụ n’obi nke Jehova—“na-efekwa ya ofufe ehihie na abalị n’ụlọ nsọ ya.” Ị̀ bụ otu n’ime oké ìgwè mmadụ nke a raara onwe ha nye? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụ ihe ùgwù dịịrị gị ijere Jehova ozi n’akwụsịghị akwụsị n’ogige elu ala nke oké ụlọ nsọ ime mmụọ ya. Taa, n’okpuru nduzi nke ndị ahụ e tere mmanụ, oké ìgwè mmadụ ahụ na-arụzu akụkụ ka nnọọ ukwuu n’ọrụ ịgba àmà ahụ. N’agbanyeghị ibu ọrụ ndị ọzọ ha nwere, ọtụtụ narị puku n’ime ha ewepụtawo ohere maka ozi oge nile dị ka ndị ọsụ ụzọ. Ma, ma i so n’òtù nke a ma ọ bụ na i soghị, dị ka onye raara onwe ya nye nke so n’oké ìgwè mmadụ ahụ, ị pụrụ ịṅụrị ọṅụ na n’ihi okwukwe i nwere na ọrụ gị nile, a na-agụ gị n’onye ezi omume dị ka enyi nke Chineke, a na-anabatakwa gị dị ka onye ọbịa n’ụlọ ikwuu ya. (Abụ Ọma 15:1-5; Jemes 2:21-26) Jehova si otú a ‘na-agbasa ụlọ ikwuu ya’ n’elu ndị ahụ hụrụ ya n’anya, dịkwa ka onye na-ele ndị ọbịa anya nke ọma, ọ na-echebe ha.—Ilu 18:10.

26. Ngọzi ọzọ dịgasị aṅaa ka oké ìgwè mmadụ ahụ ga-enweta?

26 Onye okenye ahụ gara n’ihu, sị: “Agụụ agaghị agụ ha ọzọ, akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ ọzọ; anyanwụ agaghị achakwa ha ọzọ, ma ọ bụ okpomọkụ ọ bụla: n’ihi na Nwa Atụrụ ahụ nke nọ n’etiti ocheeze ahụ ga-azụ ha dị ka atụrụ, ọ ga-edurukwa ha gaa n’isi iyi nke mmiri nke ndụ: Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha.” (Mkpughe 7:16, 17) Ee, n’ezie Jehova na-ele ndị ọbịa anya nke ọma! Ma ruo ókè hà aṅaa ka okwu ndị a nwere ihe ha pụtara?

27. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Aịsaịa si buo amụma ihe yiri okwu nke onye okenye ahụ kwuru? (b) Gịnị na-egosi na amụma Aịsaịa malitere imezu n’ahụ ọgbakọ ndị Kraịst n’oge Pọl?

27 Ka anyị tụlee otu amụma ọzọ nwere okwu ndị yiri nke ahụ: “Otú a ka Jehova sịrị, Na mgbe ihe mmadụ na-atọ m ụtọ ka m zaworo gị, ọ bụkwa n’ụbọchị nzọpụta ka m nyewooro gị aka . . . Agụụ agaghị agụ ha, akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ; mirage na anyanwụ agaghị amagbukwa ha: n’ihi na Onye nwere obi ebere n’ahụ ha ga-edu ha, ọ bụkwa n’akụkụ isi iyi nile jupụtara na mmiri ka ọ ga-edu ha nwayọọ.” (Aịsaịa 49:8, 10; leekwa Abụ Ọma 121:5, 6.) Pọl onyeozi hotara akụkụ ụfọdụ nke amụma nke a wee jiri ya mee ihe banyere “ụbọchị nzọpụta” nke malitere na Pentikọst 33 O.A. O dere, sị: “N’ihi na ọ [Jehova] na-asị, N’oge a na-anara mmadụ nke ọma ka m nụrụ olu gị, ọ bụkwa n’ụbọchị nzọpụta ka m nyeere gị aka: lee, ugbu a bụ oge a na-anara mmadụ nke ọma; lee, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta.”—2 Ndị Kọrint 6:2.

28, 29. (a) Okwu Aịsaịa si aṅaa mezuo n’ime narị afọ mbụ? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka okwu dị ná Mkpughe 7:16 si mezuo n’ihe banyere oké ìgwè mmadụ ahụ? (ch) Gịnị ka a ga-arụpụta site n’odudu a na-eduru oké ìgwè mmadụ ahụ gaa “n’isi iyi nke mmiri nke ndụ”? (d) N’ihi gịnị ka oké ìgwè mmadụ ga-eji bụrụ ndị pụrụ iche n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ?

28 Nkọwa dị aṅaa ka nkwa ahụ banyere ịbụ ndị agụụ na-agaghị agụ ma ọ bụ ndị akpịrị na-agaghị akpọ nkụ ma ọ bụ ịbụ ndị oké okpomọkụ na-agaghị amagbu nwere n’oge ahụ? O doro anya na agụụ nkịtị na akpịrị ịkpọ nkụ nkịtị metụtara ndị Kraịst mgbe ụfọdụ n’ime narị afọ mbụ. (2 Ndị Kọrint 11:23-27) Otú ọ dị, n’ụzọ ime mmụọ, ha nwebigara ihe ókè. E nyere ha ihe n’ụba, nke mere na ọ dịghị mgbe ha nọ n’agụụ ma ọ bụ akpịrị ịkpọ nkụ maka ihe ime mmụọ. Karịsịa, Jehova emeghị ka okpomọkụ nke iwe ya bịakwasị ha mgbe o bibiri usoro ihe ndị Juu n’afọ 70 O.A. Okwu dị ná Mkpughe 7:16 nwere mmezu ime mmụọ yiri nke ahụ nye oké ìgwè mmadụ ahụ taa. Ha na ndị Kraịst e tere mmanụ so na-erite uru onyinye ime mmụọ bara ụba.—Aịsaịa 65:13; Nehum 1:6, 7.

29 Ọ bụrụ na ị bụ otu n’ime oké ìgwè mmadụ ahụ, ọnọdụ ọma nke obi gị ga-eme ka i ‘tie mkpu ọṅụ,’ n’agbanyeghị ụdị ụkọ ihe na nrụgide ndị ị na-aghaghị iche ihu n’oge ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a nke Setan. (Aịsaịa 65:14) Ọbụna ugbu a, Jehova pụrụ ‘ihichapụ anya mmiri nile ọ bụla n’anya gị’ n’echiche dị otú ahụ. “Anyanwụ” na-ekpo ajọ ọkụ nke ikpe ọmụma Chineke adịghị eyikwa gị egwu ọzọ, mgbe a tọhapụkwara ifufe anọ nke mbibi ndị ahụ, a pụkwara ichebe gị pụọ ‘n’okpomọkụ’ nke iwe Jehova. Mgbe mbibi ahụ gasịrị, Nwa Atụrụ ahụ ga-eduru gị gaa n’irite uru zuru ezu site “n’isi iyi nke mmiri nke ndụ” ahụ na-enye ume ọhụrụ, bụ́ mmiri ndị sere onyinyo ihe nile Jehova na-eme maka inweta ndụ ebighị ebi. A ga-eme ka i nweta uru nke okwukwe i nwere n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ n’ihi na a ga-eji nwayọọ nwayọọ bulie gị bịa n’izu okè mmadụ. Unu ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ ga-abụ ndị pụrụ iche n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ dị ka “ọtụtụ nde” ndị ahụ ọ na-adịghị mkpa ọbụna ịnwụ anwụ ma ọlị! N’echiche kasị zuo ezuo, a ga-ehichapụ anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha.—Mkpughe 21:4.

Ime Ka Ọkpụkpọ Òkù ahụ Bụrụ nke E Ji n’Aka

30. Ihe nkiri dị aṅaa nke dị ebube ka a na-ekpughere anyị n’ọhụụ Jọn, ònyekwa ga-enwe ike ‘iguzo’?

30 Lee nnọọ oké ihe nkiri dị ebube okwu ndị a na-emeghere anyị! Jehova n’onwe ya na-anọkwasị n’ocheeze ya, ndị ohu ya nile, ma ndị nọ n’eluigwe ma ndị nọ n’elu ala, jikọtara ọnụ n’inye ya otuto. Ndị ohu ya nọ n’elu ala ghọtara oké ihe ùgwù ọ bụ ikere òkè n’abụ otuto nke a na-arị elu. N’oge na-adịghị anya, Jehova na Kraịst Jisọs ga-emezu ihe ha kpere n’ikpe, a ga-anụkwa mkpu ahụ bụ: “Oké ụbọchị nke iwe ha abịawo; ònye pụkwara iguzo?” (Mkpughe 6:17) Gịnị bụ azịza ya? Ọ bụ nanị ọnụ ọgụgụ dị nta nke ihe a kpọrọ mmadụ, gụnyere onye ọ bụla so na 144,000 ahụ a kara akara ndị ka pụrụ ịnọ n’anụ ahụ na oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ndị ha na ha ga-eso ‘guzo,’ ya bụ, lanarị.—Jeremaịa 35:19; 1 Ndị Kọrint 16:13.

31. Olee ụzọ mmezu nke ọhụụ Jọn kwesịrị isi metụta ndị Kraịst, ma hà so ná ndị e tere mmanụ ma ọ bụ n’oké ìgwè mmadụ ahụ?

31 N’iburu nke a n’uche, ndị Kraịst e tere mmanụ ndị nọ n’òtù Jọn ahụ na-agbalịsi ike ‘ịgbaru ebe mgbaru ọsọ ahụ ka ha wee nata ihe mgbata n’ọsọ nke ọkpụkpọ dị elu nke Chineke n’ime Kraịst Jisọs.’ (Ndị Filipaị 3:14) Ha matara nke ọma na ihe ndị na-eme n’oge a chọrọ ntachi obi pụrụ iche n’aka ha. (Mkpughe 13:10) Mgbe ha jesịwooro Jehova ozi ruo ọtụtụ afọ, ha na-ejigidesi okwukwe ahụ ike, na-aṅụrị ọṅụ n’ihi na ‘e dewo aha ha n’akwụkwọ n’eluigwe.’ (Luk 10:20; Mkpughe 3:5) Ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ matakwara na ọ bụ nanị “onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.” (Matiu 24:13) Ọ bụ ezie na a kara oké ìgwè mmadụ ahụ akara dị ka otu òtù ịbụ ndị ga-agabiga mkpagbu ukwu ahụ, ndị nọ n’ime ya n’otu n’otu aghaghị ịgbalịsi ike ịnọgide na-adị ọcha, na-arụsikwa ọrụ ike.

32. Ọnọdụ dị ngwa dị aṅaa ka e mere ka ọ pụta ìhè site n’eziokwu ahụ bụ na nanị òtù abụọ ‘ga-eguzo’ n’ụbọchị iwe Jehova?

32 E nweghị ihe àmà ọ bụla gosiri na onye ọ bụla na-esoghị n’òtù abụọ ndị a ‘ga-eguzo’ n’ụbọchị iwe Jehova. Gịnị ka nke a pụtaara ọtụtụ nde ndị ahụ na-eme ihe kwa afọ igosi nsọpụrụ n’ókè ụfọdụ maka àjà Jisọs chụrụ site n’ịbịa Ememe Ncheta ọnwụ ya, ma bụrụ ndị na-etinyebeghị okwukwe ha n’àjà Jisọs ruo n’ókè ịghọ ndị ohu Jehova raara onwe ha nye, ndị e mekwara baptism, ndị na-arụsi ọrụ ike n’ozi ya? Ọzọkwa, gịnị banyere ndị ahụ na-arụsibu ọrụ ike, ma bụrụ ndị kweworo ka e were ‘nchegbu nke ndụ a bogbuo obi ha’? Ka ndị nile dị otú ahụ teta n’ụra, mụrụkwa anya, ka ha wee nwee ike “ịgbanarị ihe ndị a nile nke gaje ime, na iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ”—Jisọs Kraịst. Oge fọdụrụnụ dị mkpirikpi!—Luk 21:34-36.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee New World Translation Reference Bible, nkọwa ala ala peji.

b Ụlọ Nche (Bekee), April 1, 1918, peji nke 98.

c N’ụzọ nkịtị, “n’ihu ya,” The Kingdom Interlinear Translation of the Greek Scriptures.

Igbe dị na peeji nke 119]

Chineke Nwe Akụkọ Isi Nrọ Nile

Ruo ọtụtụ iri afọ òtù Jọn ajụwo ajụjụ banyere ihe e ji amata ndị bụ oké ìgwè mmadụ ahụ n’enwetaghị nkọwa ọ bụla na-eju afọ. N’ihi gịnị? Anyị na-achọta azịza ya n’okwu nke Josef onye kwesịrị ntụkwasị obi, mgbe ọ sịrị: “Ọ́ bụghị Chineke nwe akụkọ isi nrọ nile?” (Jenesis 40:8) Olee mgbe, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka Chineke na-esi akọwa mmezu amụma ya nile? Ọ na-abụkarị mgbe oge mmezu ha dị nso, ma ọ bụ mgbe ha na-emezu, ka ndị ohu ya, bụ́ ndị na-eme nnyocha, nwee ike ịghọta ihe ọ na-egosi. A na-enye nghọta ndị a iji “[zie] anyị ihe, ka anyị wee were ntachi obi na nkasi obi nke ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ nwee olileanya.”—Ndị Rom 15:4.

Igbe dị na peeji nke 124]

Ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ

▪ sitere ná mba nile na ebo nile na ndị nile na asụsụ nile

▪ na-eguzo n’ihu ocheeze Jehova

▪ emewo ka uwe mwụda ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ

▪ na-ekwu na nzọpụta ha sitere n’aka Jehova na Jisọs

▪ si ná mkpagbu ukwu ahụ pụta

▪ na-ejere Jehova ozi n’ụlọ nsọ ya ehihie na abalị

▪ na-enweta nchebe ịhụnanya na nlekọta nke Jehova

▪ bụ ndị Jisọs na-eduru jee n’isi iyi nke mmiri nke ndụ

[Foto dị na peeji nke 121]

[Foto dị na peeji nke 127]

Nzọpụta nke oké ìgwè mmadụ ahụ sitere n’aka Chineke na Nwa Atụrụ ahụ

[Foto dị na peeji nke 128]

Nwa Atụrụ ahụ ga-eduru oké ìgwè mmadụ ahụ gaa n’isi iyi nke mmiri nke ndụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya