-
Ihe Baịbụl Kwuru Banyere Ndụ na ỌnwụỤlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2017 | Nke 4
-
-
BAỊBỤL MERE KA ANYỊ MATA NKE BỤ́ EZIOKWU
Akwụkwọ Jenesis gwara anyị otú Chineke si kee mmadụ. Ọ sịrị: “Jehova bụ́ Chineke wee jiri ájá si n’ala kpụọ mmadụ ma kunye ume ndụ n’oghere imi ya, mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” E si n’okwu Hibru bụ́ ne’phesh,a sụgharịa okwu ahụ bụ “mkpụrụ obi dị ndụ.” Ihe okwu ahụ pụtara bụ “ihe dị ndụ nke na-eku ume.”—Jenesis 2:7.
Ihe a niile na-egosi na Baịbụl mere ka o doo anya na mgbe Chineke kere mmadụ, o kenyeghị ya mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ n’ime. Kama, mmadụ ọ bụla bụ “mkpụrụ obi dị ndụ.” Ọ bụ ya mere na ị chọọ elu, chọọ ala, e nweghị ebe ị ga-ahụ “mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ” na Baịbụl.
-
-
Ihe Baịbụl Kwuru Banyere Ndụ na ỌnwụỤlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2017 | Nke 4
-
-
a Otú Bible Nsọ nke Union Version si sụgharịa ne’phesh bụ, “madụ ahụ we ghọ nkpuru obi di ndu.” Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik sụgharịrị ya “mmadụ ahụ wee ghọọ onye dị ndụ,” ebe Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society sụgharịkwara ya “nke mere ka mmadụ ghọọ mmadụ dị ndụ.”
-