-
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụỤlọ Nche—2006 | Jenụwarị 15
-
-
Ntakịrị oge ka a napụtasịrị ndị Izrel n’Ijipt, ha malitere ime mkpesa banyere nri. N’ihi ya, Jehova nyere ha mana. (Ọpụpụ 12:17, 18; 16:1-5) N’oge ahụ, Mozis nyere Erọn ntụziaka, sị: “Were otu ite, tinye nju omer nke mana n’ime ya, dọba ya n’ihu Jehova ka ọ bụrụ ihe ndebe a na-edebere ọgbọ nile unu.” Ihe ndekọ ahụ kwuru, sị: “Dị ka Jehova nyere Mozis iwu, otú a ka Erọn dọbara ya n’ihu Ihe Àmà, [ebe a na-echekwa ihe odide ndị dị mkpa] ka ọ bụrụ ihe ndebe.” (Ọpụpụ 16:33, 34) Ọ bu ezie na Erọn tinyere mana a n’ime ite ahụ, ma e debeghị ya n’ihu Ihe Àmà ahụ ruo mgbe Mozis rụchara Igbe ahụ ma tinye mbadamba nkume abụọ ahụ n’ime ya.
-
-
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụỤlọ Nche—2006 | Jenụwarị 15
-
-
Mana bụ ihe Chineke nyere ụmụ Izrel n’ime afọ 40 ahụ ha nọrọ n’ọzara. A kwụsịrị inye ha mana mgbe ‘ha malitere iri ụfọdụ n’ime ihe mịrị n’ala ahụ’ e kwere ha ná nkwa. (Joshua 5:11, 12) O nwere ihe mere e ji tinye mkpanaka Erọn n’ime igbe ọgbụgba ndụ ahụ—ka ọ bụrụ ihe ịrịba ama nye ma ọ bụ ihe àmà megide ọgbọ ahụ na-enupụ isi. Nke a na-egosi na ọ pụrụ ịbụ na mkpanaka ahụ nọgidere ebe ahụ ya dịkarịa ala n’oge nile ha nọrọ n’ọzara. Ya mere, ọ ga-abụ ihe ezi uche dị na ya ikwubi na n’agbata oge ndị Izrel banyere n’Ala Nkwa ahụ na tupu a rara ụlọ nsọ ahụ Solomọn wuru nye, e wepụrụ mkpanaka Erọn na ite ọlaedo ahụ nke mana dị n’ime ya site n’igbe ọgbụgba ndụ ahụ.
-