AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌPỤPỤ 1-3
“M Ga-abụ Ihe M Chọrọ Ịbụ”
Jehova kpugheere Mozis ihe pụrụ iche banyere onwe ya. Jehova na-abụ ihe ọ bụla ọ chọrọ ịbụ iji mezuo nzube ya. Ma, nke ahụ agaghị eme ka o mee ihe na-ezighị ezi. Jehova dị ka nna na-egboro ụmụ ya mkpa ha. Ọ na-abụ ihe ọ bụla ọ dị mkpa ka ọ bụrụ iji gbooro anyị mkpa anyị.
Olee ihe ndị Jehova bụtụrụla ná ndụ m iji gbooro m mkpa m?