Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche—2004 | Mach 15
    • Mozis na nwunye ya bụ́ Zipora na ụmụ ya ndị ikom bụ́ Geshọm na Elieza nọ na-aga Ijipt mgbe ihe a na-esonụ mere: “O ruo n’ụzọ n’ebe ịnọ ọnọdụ abalị, na Jehova zutere ya, chọọ ime ka ọ nwụọ. Zipora wee were ọ́mụ́ bipụ apị nwa ya, mee ka o metụ [ụkwụ ya, NW]; Zipora wee sị, N’ezie di nke ọbara ka ị bụ n’ebe m nọ. O wee hapụ ya ndụ. Mgbe ahụ Zipora sịrị, Di nke ọbara ka ị bụ, banyere obibi úgwù.” (Ọpụpụ 4:20, 24-26) Ọ bụ ezie na akụkụ Akwụkwọ Nsọ a edochaghị anya, a pụghịkwa ịmata kpọmkwem ihe ọ pụtara, Akwụkwọ Nsọ na-eme ka a ghọtatụ amaokwu ndị a.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche—2004 | Mach 15
    • Okwu Zipora bụ́ “di nke ọbara ka ị bụ n’ebe m nọ” bụ okwu a na-adịghị anụkebe. Gịnị ka ọ na-egosi banyere ya? Site na ya ikweta mezuo ihe ọgbụgba ndụ ibi úgwù ahụ chọrọ, Zipora kwetara na ya na Jehova nwere mmekọrịta ọgbụgba ndụ. Ọgbụgba ndụ Iwu Jehova na ndị Izrel mechara nwee gosiri na a bịa ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ, a pụrụ iwere Jehova dị ka di na onye nke ọzọ dị ka nwunye. (Jeremaịa 31:32) N’ihi ya, n’ịkpọ Jehova (site ná mmụọ ozi na-anọchite anya ya) “di nke ọbara,” o yiri ka Zipora ọ̀ na-ekweta na ya ga-erube isi n’ihe ndị ọgbụgba ndụ ahụ chọrọ. Ọ dị ka à ga-asị na ọ nabatawo ọnọdụ onye bụ́ nwunye n’ọgbụgba ndụ ibi úgwù ahụ, ebe Jehova Chineke nọ dị ka di. Otú o sina dị, n’ihi iji obi ike mee ihe iji rube isi n’ihe Chineke chọrọ, ndụ nwa ya anọghịzi n’ihe ize ndụ.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya