Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 12/15 p. 11-16
  • ‘Otú A Ka Ha Mere’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Otú A Ka Ha Mere’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • N’ụbọchị Noa
  • Mosis—Nwoke Kasị Dị Obi Umeala
  • Joshua—Dị Ike, Nweekwa Ume nke Ukwuu
  • Ndị Eze—Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi na Ndị Nupụrụ Isi
  • Iji Okwu Chineke Na-adị Ndụ
  • Ịmata Ụzọ Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ihe Jọshụa Chetara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Olee Ụzọ Jisọs Kraịst Si Bụrụ Onye Amụma Dị Ka Mosis?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Dịrị Njikere!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 12/15 p. 11-16

‘Otú A Ka Ha Mere’

“Nke a bụ ịhụnanya Chineke, ka anyị debe ihe nile O nyere n’iwu.” —1 JỌN 5:3.

1. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ọ̀tụ̀tụ̀ nke ịhụnanya Chineke?

“CHINEKE BỤ ỊHỤNANYA.” Ndị nile bịara mata Chineke ma na-edebe ihe nile o nyere n’iwu na-enwe ekele miri emi maka omimi nke ịhụnanya ahụ. “N’ime nke a ka ịhụnanya dị, ọ bụghị na anyị onwe anyị hụrụ Chineke n’anya, kama ọ bụ na Ya onwe ya hụrụ anyị n’anya, wee zite Ọkpara Ya ka Ọ bụrụ ihe ịjụrụ Ya obi banyere mmehie anyị.” Ka anyị na-egosipụta okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs nke dị oké ọnụ ahịa, anyị ‘na-anọgide n’ime ịhụnanya Chineke.’ (1 Jọn 4:8-10, 16) Otú a anyị pụrụ inweta ụba nke ngọzi ime mmụọ ugbu a na n’usoro ihe nke gaje ịbịa, ndụ ebighị ebi.—Jọn 17:3; 1 Jọn 2:15, 17.

2. Olee otú idebe ihe Chineke nyere n’iwu siworo baara ndị ohu ya uru?

2 Ihe ndekọ Bible jupụtara n’ihe atụ nke ndị debeworo ihe nile Chineke nyere n’iwu, a gọziekwa ha nke ukwuu n’ihi ya. Ndị a gụnyere ndị àmà dịrị ndụ tupu oge ndị Kraịst, ndị Pọl onyeozi dere banyere ụfọdụ n’ime ha, sị: “Ndị a nile nwụrụ n’ụzọ okwukwe, ebe ha anataghị nkwa ahụ, kama ha hụrụ ha rịị, sikwa n’ebe dị anya kelee ha, wee kwupụta na ha bụ ndị ọbịa na ndị nọ dị ka ọbịa n’elu ụwa.” (Ndị Hibru 11:13) E mesịa, ndị Kraịst raara onwe ha nye bụ́ ndị ohu Chineke ritere uru site ‘n’amara na eziokwu sitere n’aka Jisọs Kraịst bịa.’ (Jọn 1:17) N’ime oge ihe dị ka 6,000 afọ nke akụkọ ihe mere eme mmadụ, Jehova enyewo ndị àmà na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị debeworo ihe nile o nyere n’iwu, bụ́ ndị ‘na-adịghị arọ’ n’ezie, ụgwọ ọrụ.—1 Jọn 5:2, 3.

N’ụbọchị Noa

3. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Noa mere “otú a”?

3 Ihe ndekọ Bible na-asị: “Noa, mgbe Chineke dụsịrị ya ọdụ banyere ihe a ka ahụghị anya ruo oge ahụ, ebe ọ tụrụ egwu Chineke, ọ bụ okwukwe ka o ji dozie ụgbọ ịzọpụta ezinụlọ Ya; o sitekwara na nke a maa ụwa ikpe, wee ghọọ onye nketa nke ezi omume ahụ nke dị n’ụzọ okwukwe.” Dị ka “onye na-ekwusa ezi omume,” Noa rubeere Chineke isi site n’obi dum, na-adọ ụwa ime ihe ike ahụ nke dịrị tupu Iju Mmiri aka ná ntị banyere ikpe Chineke ahụ na-eru nso. (Ndị Hibru 11:7; 2 Pita 2:5) N’iwu ụgbọ ahụ, o ji nlezianya gbasoo ụkpụrụ Chineke nyere. O wee webata ụmụ anụ na nri a kpọrọ aha. “Noa wee mee ya; dị ka iwu nile si dị nke Chineke nyere ya, otú a ka o mere.”—Jenesis 6:22.

4, 5. (a) Olee otú mmetụta ọjọọ siworo kpaa ike n’ahụ ihe a kpọrọ mmadụ ruo ụbọchị a? (b) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji mee “otú a” n’irube isi ná ntụziaka Chineke?

4 Noa na ezinụlọ ya aghaghị ịgbaso mmetụta ọjọọ nke ndị mmụọ ozi nupụrụ isi mgba. Ụmụ ndị ikom a nke Chineke nwogharịrị ma soro ụmụ nwanyị bikọọ, na-amụpụta ndị dimkpa gwara ọgwa bụ́ ndị na-etigbu ihe a kpọrọ mmadụ. “E bibiri ụwa n’ihu Chineke, ụwa jupụtakwara n’ihe ike.” Jehova zitere Iju Mmiri ahụ ikpochapụ ọgbọ ọjọọ ahụ. (Jenesis 6:4, 11-17; 7:1) Eri ụbọchị Noa e nyebeghị ndị ajọ mmụọ ozi ohere inwogha n’ụdị mmadụ. Ka o sina dị, ‘ụwa dum nọgidere na-atọgbọ n’aka ajọ onye ahụ,’ bụ́ Setan Ekwensu. (1 Jọn 5:19; Mkpughe 12:9) N’ụzọ amụma, Jisọs ji ọgbọ nnupụisi nke ụbọchị Noa tụnyere ọgbọ nke ihe a kpọrọ mmadụ jụworo ya kemgbe ihe ịrịba ama nke “ọnụnọ” ya malitere ịpụta ìhè na 1914.—Matiu 24:3, 34, 37-39, NW; Luk 17:26, 27.

5 Taa, dị ka n’ụbọchị Noa, Setan na-anwa imebi ihe a kpọrọ mmadụ na mbara ụwa anyị. (Mkpughe 11:15-18) N’ihi ya ọ dị ngwa na anyị rubere isi n’iwu ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ: “Yikwasịnụ ihe agha nile nke Chineke, ka unu wee pụ iguzogide ihe nile ekwensu na-ezupụta.” (Ndị Efesọs 6:11) Na nke a, a na-ewusi anyị ike site n’ịmụ Okwu Chineke na itinye ya n’ọrụ ná ndụ anyị. Ọzọ, anyị nwere nzukọ Jehova na-enye nlekọta, ya na ‘ohu ya kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche’ nke e tere mmanụ na ndị okenye ya na-ahụ n’anya, iji ndidi na-azụ anyị dị ka atụrụ n’ụzọ anyị kwesịrị ịgbaso. Anyị nwere ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ ịrụzu. (Matiu 24:14, 45-47) Dị ka Noa, onye ji nnọọ nlezianya rube isi ná ntụziaka Chineke, ka anyị ‘mee otú ahụ’ mgbe nile.

Mosis—Nwoke Kasị Dị Obi Umeala

6, 7. (a) Olee nhọrọ na-enye ụgwọ ọrụ nke Mosis mere? (b) Ihe nlereanya dị aṅaa nke obi ike ka Mosis hapụụrụ anyị?

6 Tụlee nwoke ọzọ nwere okwukwe—Mosis. Ọ gaara ebiwo ndụ ntụsara ahụ n’etiti ihe okomoko nile nke Ijipt. Ma ọ họọrọ “ka e mejọkọọ ya na ndị nke Chineke, kama inwe ihe ụtọ nke mmehie na nwa oge.” Dị ka ohu Jehova nyere ọrụ, “o wepụrụ anya ya lee nnyeghachi nke ụgwọ ọrụ ahụ [nọgidesiekwa] ike, dị ka ọ na-ahụ Onye ahụ Nke a na-apụghị ịhụ Ya anya.”—Ndị Hibru 11:23-28.

7 N’Ọnụ Ọgụgụ 12:3, anyị na-agụ, sị: “Nwoke ahụ, bụ́ Mosis, dị umeala n’obi nke ukwuu, karịa mmadụ nile ndị nọ n’elu ala.” N’ụzọ dị iche, Fero nke Ijipt kpara àgwà ka onye kasị dị mpako n’etiti mmadụ nile. Mgbe Jehova nyere Mosis na Erọn iwu ikwupụta ikpe ọmụma ya n’isi Fero, olee otú ha si meghachi omume? A na-agwa anyị, sị: “Mosis na Erọn wee mee ya; dị ka Jehova nyere ha iwu, otú a ka ha mere.” (Ọpụpụ 7:4-7) Lee ihe ilereanya obi ike ha bụụrụ anyị bụ́ ndị na-ekwupụta ikpe Chineke taa!

8. Olee otú e si chọọ n’aka ndị Israel ime “otú a,” oleekwa ụzọ a ga-esi nwee n’ọdịnihu dị nso ihe yiri nṅụrị ọṅụ nke si na ya pụta?

8 Ndị Israel hà ji nnọgidesi ike n’ihe kwado Mosis? Mgbe Jehova tisịrị Ijipt ihe otiti itoolu n’ime iri ndị ahụ, o nyere Israel ntụziaka sara mbara banyere ime Ememe Ngabiga. “Ndị Israel wee rube isi, kpọọ isiala. Ụmụ Israel wee jee mee ya; dị ka Jehova nyere Mosis na Erọn iwu, otú a ka ha mere.” (Ọpụpụ 12:27, 28) N’etiti abalị nke oké ụbọchị ahụ, Nisan 14, 1513 T.O.A., mmụọ ozi Chineke wee tigbuo ụmụ mbụ nile nke Ijipt ma gabiga ụlọ ndị Israel. N’ihi gịnị ka e ji hapụ ụmụ mbụ ndị Israel ndụ? N’ihi na ha enwetawo nchebe n’okpuru ọbara nwa atụrụ Ememe Ngabiga ahụ, nke e fekwasịrị n’ibo ụzọ ha. Ha emewo nnọọ otú Jehova nyere Mosis na Erọn n’iwu. Ee, “otú a ka ha mere.” (Ọpụpụ 12:50, 51) N’Osimiri Uhie ahụ, Jehova rụkwuru otu ọrụ ebube n’ịzọpụta ndị ya na-erube isi mgbe ọ na-ebibi Fero na oké ìgwè ndị agha ya. Lee ka ndị Israel si tee egwú ọṅụ! N’otu aka ahụ taa, ọtụtụ ndị debeworo ihe nile Jehova nyere n’iwu ga-aṅụrị ọṅụ n’ịbụ ndị ji anya ha hụ mwepụ n’ụta ya n’Amagedọn.—Ọpụpụ 15:1, 2; Mkpughe 15:3, 4.

9. Ihe ùgwù dịgasị aṅaa nke oge a ka ndị Israel ime “otú a” n’ihe banyere ụlọikwuu ahụ sere onyinyo ha?

9 Mgbe Jehova nyere Israel iwu ịnakọta onyinye ma wuo ụlọikwuu n’ọzara, ndị ahụ ji mmesapụ aka nye nkwado ha zuru ezu. Mgbe ahụ, ọbụna n’akụkụ kasị nta, Mosis na ndị ọrụ ibe ya obi ha dị n’ọrụ gbasoro ụkpụrụ owuwu ihe Jehova nyere. “E wee mee ka ofufe nile nke ebe obibi nke ụlọikwuu nzute gwụsịa: ụmụ Israel wee mee dị ka ihe nile si dị nke Jehova nyere Mosis n’iwu, otú a ka ha mere.” N’otu aka ahụ, ná nhiwe nke usoro ndị nchụàjà, “Mosis wee mee ya: dị ka ihe nile si dị nke Jehova nyere ya n’iwu, otú a ka o mere.” (Ọpụpụ 39:32; 40:16) N’oge ndị a, anyị nwere ohere nke inye ọrụ nkwusa ahụ na usoro ihe omume nile nke mgbasawanye Alaeze nkwado sitere n’obi dum. Ọ bụ ihe ùgwù anyị isi otú a dịrị n’otu n’ime “otú a.”

Joshua—Dị Ike, Nweekwa Ume nke Ukwuu

10, 11. (a) Gịnị kwadebere Joshua maka inwe ihe ịga nke ọma? (b) Olee otú a pụrụ isi wusie anyị ike ịnagide ule ndị nke oge a?

10 Mgbe Mosis nyere Joshua ọrụ iduba Israel n’Ala Nkwa ahụ, o yiri ka Okwu e dere ede nke Jehova nke sitere n’ike mmụọ nsọ ọ̀ dị nanị n’akwụkwọ ise nke Mosis, otu abụ ọma ma ọ bụ abụọ, na akwụkwọ Job. Mosis enyewo Joshua ntụziaka ịkpọkọta ndị ahụ mgbe ha ruru n’Ala Nkwa ahụ ma ‘gụọ iwu a n’ihu Israel nile ná ntị ha.’ (Deuterọnọmi 31:10-12) Ọzọkwa, Jehova n’onwe ya nyere Joshua iwu, sị: “Akwụkwọ iwu a agaghị apụ n’ọnụ gị, kama ị ga-atụgharị uche n’ime ya ehihie na abalị, ka i wee lezie anya ime dị ka ihe nile si dị nke e deworo n’ime ya: n’ihi na mgbe ahụ ị ga-eme ka ije gị gaa nke ọma, mgbe ahụ ị ga-enwekwa uche.”—Joshua 1:8.

11 Ịgụ “akwụkwọ” Jehova kwa ụbọchị kwadebere Joshua ime ihe banyere ule ndị dị n’ihu, dị nnọọ ka ọgụgụ Okwu Jehova, bụ́ Bible kwa ụbọchị, na-ewusi Ndịàmà Ya nke oge a ike ịnagide ule nile nke “mgbe ikpeazụ” a dị oké egwu. (2 Timoti 3:1) N’ịbụ ndị ụwa ime ihe ike gbara gburugburu, ka anyị buru n’obi okwu ịdọ aka ná ntị Chineke nyere Joshua: “Dị ike, nweekwa ume; amala jijiji, atụkwala ụjọ: n’ihi na Jehova, bụ́ Chineke gị, nọnyeere gị n’ebe ọ bụla ị na-eje.” (Joshua 1:9) Mgbe e merisịrị Kenean, e nyere ebo nile nke Israel ụgwọ ọrụ n’ụba mgbe ha na-anọdụ n’ebe nketa ha. “Dị ka Jehova nyere Mosis iwu, otú a ka ụmụ Israel mere.” (Joshua 14:5) Otu ụdị ụgwọ ọrụ ahụ na-echere anyị nile taa, bụ́ ndị na-agụ Okwu Chineke ma na-etinye ya n’ọrụ ná ndụ anyị, jiri nrubeisi ‘na-eme otú a.’

Ndị Eze—Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi na Ndị Nupụrụ Isi

12. (a) Olee iwu e nyere ndị eze n’Israel? (b) Ndị eze ịghara irube isi rụpụtara gịnị?

12 Gịnị banyere ndị eze n’Israel? Jehova achọwo ihe nke a n’aka onyeeze: “Mgbe ọ na-anọkwasị n’ocheeze nke alaeze ya, na ọ ga-edepụtara onwe ya iwu a n’akwụkwọ, site n’akwụkwọ ahụ nke dị n’ihu ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị: ọ ga-adịkwa n’aka ya, ọ ga-agụkwa ihe dị n’ime ya ụbọchị nile nke ndụ ya: ka o wee mụta ịtụ egwu Jehova, bụ́ Chineke ya, idebe okwu nile nke iwu a na ụkpụrụ ndị a, ime ha.” (Deuterọnọmi 17:18, 19) Ndị eze Israel hà rubere isi n’iwu ahụ? N’akụkụ ka ukwuu, ha erubeghị isi ma ọlị, nke na ha nwetara nkọcha ndị e buru ụzọ kwuo na Deuterọnọmi 28:15-68. N’ikpeazụ, e mere ka Israel gbasaa “site n’otu nsọtụ ụwa wee ruo nsọtụ ụwa nke ọzọ.”

13. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru, dị ka Devid, site n’igosi ịhụnanya maka Okwu Jehova?

13 Otú ọ dị, Devid—eze mbụ kwesịrị ntụkwasị obi nke bụ mmadụ n’Israel—gosiri nsọpụrụ pụrụ iche nye Jehova. Ọ ghọrọ ‘ọdụm nke Juda,’ na-ese onyinyo Kraịst Jisọs bụ́ ‘ọdụm ahụ si n’ebo Juda, mkpọrọgwụ Devid’ nke na-enwe mmeri. (Jenesis 49:8, 9; Mkpughe 5:5) Na gịnị ka Devid nwetara ume ya? O nwere ekele miri emi maka Okwu Jehova e dere ede ma jiri ya bie ndụ. N’Abụ Ọma nke 19, “abụ ọma Devid,” anyị na-agụ, sị: “Iwu Jehova zuru okè.” Mgbe o zosịrị aka n’ihe àmà, ụkpụrụ, iwu, na ikpe Jehova, Devid gara n’ihu ikwu, sị: “Ihe a na-achọsi ike ka ha bụ, karịa ọlaedo, ee, karịa ọtụtụ ọlaedo a nụchara anụcha: ha dịkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ, bụ́ nke si n’ụgbụgbọ mmanụ aṅụ na-atasị. Ọzọ, e ji ha dọọ ohu Gị aka ná ntị: n’idebe ha ka ọkpụkpụ ọrụ hiri nne na-apụta.” (Abụ Ọma 19:7-11) Ọ bụrụ na ịgụ Okwu Jehova na ịtụgharị uche na ya kwa ụbọchị na-enye ụgwọ ọrụ 3,000 afọ gara aga, lee ka o si dị otú ahụ ọbụna karị taa!—Abụ Ọma 1:1-3; 13:6; 119:72, 97, 111.

14. N’ụzọ dị aṅaa ka ụzọ Solomọn gbasoro si gosi mkpa nke ihe karịrị ihe ọmụma?

14 Ka o sina dị, o zughị ezu nanị inweta ihe ọmụma. Ọ dịkwa ndị ohu Chineke mkpa iji ihe ọmụma ahụ mee ihe, itinye ya n’ọrụ dị ka uche Chineke si dị—ee, ime “otú a.” A pụrụ ime ihe atụ nke a n’ọnọdụ nwa Devid bụ́ Solomọn, onye Jehova họọrọ “ịnọkwasị n’ocheeze nke alaeze Jehova dị ka onye isi Israel.” Solomọn natara ọrụ nke iwu ụlọ nsọ ahụ, na-eji ihe atụ owuwu ihe nke Devid natara site na “Mmụọ Nsọ.” (1 Ihe Emere 28:5, 11-13) Olee otú Solomọn pụrụ isi rụzuo nnukwute ọrụ a? N’azịza nye otu ekpere, Jehova nyere ya amamihe na ihe ọmụma. Na-eji ihe ndị a eme ihe, na site n’ịrapagide n’ihe atụ ndị ahụ Chineke nyere, Solomọn nwere ike iwu ụlọ ahụ magburu onwe ya, nke ebube Jehova bịara jupụta. (2 Ihe Emere 7:2, 3) Ma, mgbe e mesịrị, Solomọn dara. N’ụzọ dị aṅaa? Iwu Jehova ekwuwo banyere onyeeze n’Israel, sị: “Ọ gaghị emekwa ka ndị inyom baara ya ụba, ka obi ya wee ghara iwezụga onwe ya.” (Deuterọnọmi 17:17) Ma Solomọn bịara “nwee [narị ndị inyom asaa], bụ́ ụmụ ndị isi, na [narị ndị iko nwanyị atọ]: ndị inyom ya . . . wezụgara obi ya ka o soo chi ọzọ.” N’afọ agadi ya, Solomọn si n’ime “otú a” wezụga onwe ya.—1 Ndị Eze 11:3, 4; Nehemaịa 13:26.

15. Olee otú Josaịa si mee “otú a”?

15 E nwere eze ole na ole na-erube isi na Juda, nke nke ikpeazụ n’ime ha bụ Josaịa. N’afọ 648 T.O.A., ọ malitere ikpochapụ ikpere arụsị n’ala ahụ na iwuzighachi ụlọ nsọ Jehova. Ọ bụ n’ebe ahụ ka onye isi nchụàjà chọtara “akwụkwọ iwu Jehova nke e nyere site n’aka Mosis.” Gịnị ka Josaịa mere banyere nke a? “Eze wee rịgoruo ụlọ Jehova, ya na ndị ikom nile nke Juda, na ndị bi na Jerusalem, na ndị nchụàjà, na ndị Livaị, na ndị Juda nile, site n’onye ukwu wee ruo onye nta; o wee gụọ ná ntị ha okwu nile nke akwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ nke a chọtaworo n’ụlọ Jehova. Eze wee guzo n’ọnọdụ ya, gbaa ndụ n’ihu Jehova, ijeso Jehova, na iwere obi ya nile na mkpụrụ obi ya nile debe ihe nile O nyere n’iwu, na ihe àmà Ya nile, na ụkpụrụ Ya nile, ime okwu nile nke ọgbụgba ndụ nke a nke e deworo n’akwụkwọ a.” (2 Ihe Emere 34:14, 30, 31) Ee, Josaịa mere “otú a.” N’ihi ụzọ ikwesị ntụkwasị obi ya, e gburu oge n’imezu ihe Jehova kpere n’ikpe n’isi Juda ruo ụbọchị ụmụ ya na-enupụ isi.

Iji Okwu Chineke Na-adị Ndụ

16, 17. (a) N’akụkụ dịgasị aṅaa ka anyị na-aghaghị ịgbaso nzọụkwụ Jisọs? (b) Olee ndị ohu ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi nke Chineke ndị nyere anyị ihe nlereanya?

16 N’etiti ndị ikom nile dịtụworo ndụ, ihe nlereanya kasị mma nke ịtụgharị uche n’Okwu Chineke na iji ya adị ndụ bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Okwu Chineke dị ka nri nye ya. (Jọn 4:34) Ọ gwara ndị na-ege ya ntị, sị: “Ọkpara apụghị ime ihe ọ bụla n’Onwe ya, ma ọ bụghị ihe Ọ hụrụ na Nna Ya na-eme: n’ihi na ihe ọ bụla Ya onwe ya na-eme, ndị a ka Ọkpara Ya na-emekwa otú ahụ.” (Jọn 5:19, 30; 7:28; 8:28, 42) Jisọs ‘mere otú a,’ na-ekwupụta, sị: “Esiwo m n’eluigwe rịdata, ọ bụghị ka M na-eme ihe Mụ onwe m na-achọ, kama ka M na-eme ihe Onye zitere m na-achọ.” (Jọn 6:38) A na-akpọku anyị bụ́ Ndịàmà Jehova raara onwe anyị nye ime “otú a” site n’ịgbaso nzọụkwụ Jisọs.—Luk 9:23; 14:27; 1 Pita 2:21.

17 Ime ihe Chineke na-achọ kasị mkpa n’uche Jisọs mgbe nile. Ọ maara Okwu Chineke nke ọma, si otú ahụ bụrụ onye a kwadebere inye azịza Akwụkwọ Nsọ. (Matiu 4:1-11; 12:24-31) Site n’itinye uche mgbe nile n’Okwu Chineke, anyị onwe anyị kwa pụrụ ‘izu okè, bụrụ ndị e meworo ka ha zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.’ (2 Timoti 3:16, 17) Ka anyị gbasoo ihe nlereanya nke ndị ohu kwesịrị ntụkwasị obi nke Jehova n’oge ochie na n’oge ndị sochirinụ nakwa nke kasịnụ nke Onyenwe anyị, Jisọs Kraịst, onye sịrị: “Ka ụwa wee mara na ana m ahụ Nna m n’anya, ka ọ marakwa na dị ka Nna m nyere m iwu, otú ahụ ka M na-eme.” (Jọn 14:31) Ka anyị gosikwa ịhụnanya anyị maka Chineke site n’ịnọgide na-eme “otú a.”—Mak 12:29-31.

18. Gịnị kwesịrị ịkpali anyị ịghọ “ndị na-eme okwu ahụ,” gịnịkwa ka a ga-atụlezi?

18 Ka anyị na-atụgharị uche n’ụzọ nrubeisi nke ndị ohu Chineke n’oge Bible, ọ̀ bụ na anyị adịghị enweta agbamume ije ozi ikwesị ntụkwasị obi n’ụbọchị ndị ikpeazụ nke usoro ihe ọjọọ Setan? (Ndị Rom 15:4-6) N’ezie anyị kwesịrị ịbụ ndị a kpaliri ịghọ “ndị na-eme okwu ahụ” ná nghọta ya nile, dị ka isiokwu na-esonụ ga-atụle.—Jemes 1:22.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Gịnị ka “ịhụnanya Chineke” kwesịrị ịpụtara anyị?

◻ Gịnị ka anyị na-amụta site n’ihe nlereanya Noa, Mosis, na Joshua?

◻ Ruo n’ókè hà aṅaa ka ndị eze n’Israel rubeere “okwu” Chineke isi?

◻ Olee otú Jisọs si bụrụ Onye Nlereanya anyị n’ime “otú a”?

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Noa, Mosis, na Joshua ‘mere otú a’

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya