‘Meenụ Ndị Enyi Site n’Akụ̀ nke Ajọ Omume’
“Meenụ ndị enyi nye onwe unu site n’akụ̀ nke ajọ omume . . . Onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi n’ihe dịkarịsịrị nta kwesịkwara ka a tụkwasị ya obi n’oké ihe.”—LUK 16:9, 10.
1. Olee otú Mosis na ụmụ Israel si nye Jehova otuto mgbe ha si n’Ijipt gbapụta?
NZỌPỤTA site n’ọrụ ebube—lee ahụmahụ na-ewusi okwukwe ike ọ bụ! Ọpụpụ Israel pụrụ n’Ijipt abụghị n’ike onye ọzọ e wezụga Jehova, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Ka a sịkwa ihe mere Mosis na ndị Israel ji bụọ abụ, sị: “Ike m na abụ ọma m ka Ja bụ, O wee ghọọrọ m nzọpụta: Onye a bụ Chineke m, m ga-emekwa Ya ka Ọ dị elu; Chineke nke nna m, m ga-ewelikwa Ya elu.”—Ọpụpụ 15:1, 2; Deuterọnọmi 29:2.
2. Gịnị ka ndị Jehova weere ka ha hapụrụ Ijipt?
2 Lee ka nnwere onwe ọhụrụ Israel chọtara si dị iche n’ọnọdụ ha n’Ijipt! Ugbu a ha pụrụ ife Jehova ofufe n’enweghị ihe mgbochi. Ha agbaghịkwa aka pụọ n’Ijipt. Mosis na-akọ, sị: “Ụmụ Israel . . . wee rịọ n’aka ndị Ijipt ihe ọlaọcha, na ihe ọlaedo, na uwe mgbokwasị: Jehova wee nye ndị Israel amara n’ihu ndị Ijipt, ha wee mee ka ha rịọta ihe. Ha wee napụ ndị Ijipt ihe ha.” (Ọpụpụ 12:35, 36) Ma olee otú ha si jiri akụ̀ ndị a nke Ijipt mee ihe? Ọ̀ rụpụtara ‘iweli Jehova elu’? Gịnị ka anyị na-amụta site n’ihe nlereanya ha?—Tụlee 1 Ndị Kọrint 10:11.
“Àjà Mbuli nke Jehova”
3. Ojiji Israel ji ọlaedo mee ihe n’ofufe ụgha kpaliri mmeghachi omume dị aṅaa n’ebe Jehova nọ?
3 N’oge njem were 40 ụbọchị Mosis jere n’Ugwu Saịnaị ije nata ntụziaka Chineke nye Israel, ndị ahụ na-echere ná ndịda ghọrọ ndị ahụ na-erughị ala. N’ịdọkapụ ọla ntị ọlaedo ha, ha nyere Erọn iwu ka o meere ha otu onyinyo ha ga-efe ofufe. Erọn wukwaara ha ebe ịchụàjà, n’isi ụtụtụ n’ụbọchị na-esonụ, ha chụkwara àjà n’ebe ahụ. Ihe a ha jiri ọlaedo ha mee ọ̀ dọtara ha nsọ n’ebe Onye Mgbapụta ha nọ? Ọ dịghị ma ọlị! “Ugbu a kwe ka M nọdụrụ Onwe m,” ka Jehova gwara Mosis, “ka iwe m wee dị ọkụ megide ha, ka M wee meekwa ka ha gwụsịa.” Ọ bụ nanị n’ihi arịrịọ Mosis ka Jehova ji meere mba ahụ ebere, ọ bụ ezie na e ji ihe otiti sitere n’aka Chineke tigbuo ndị nọ n’isi nnupụisi ahụ.—Ọpụpụ 32:1-6, 10-14, 30-35.
4. Gịnị bụ “àjà mbuli nke Jehova,” ònyekwa chụrụ ya?
4 Mgbe e mesịrị, Israel nwere ohere iji akụ̀ ndị ha nwere mee ihe n’ụzọ mere Jehova obi ụtọ. Ha chịkọtara “onyinye maka Jehova.”a (NW) Ọlaedo, ọlaọcha, ọla, ogho anụnụ, ákwà e sijiri ụcha dị iche iche, akpụkpọ ebulu, akpụkpọ seal, na osisi acacia so n’ihe onyinye ndị e nwetara maka owuwu na nkwaju nke ụlọ ikwuu ahụ. Ihe ndekọ ahụ na-adọrọ uche anyị gaa n’àgwà onye nyere onyinye ahụ. “Onye ọ bụla nke obi ya nwere afọ ofufo, ya weta ya, bụ́ àjà mbuli nke Jehova.” (Ọpụpụ 35:5-9) Israel zara òkù ahụ n’ụzọ dị ịtụnanya. N’ihi ya, ụlọ ikwuu ahụ bụ ihe owuwu nke “mara mma ma dị oké egwu,” dị ka otu onye ọkà mmụta si kwuo ya.
Onyinye Maka Ụlọ Nsọ Ahụ
5, 6. N’ihe banyere ụlọ nsọ ahụ, olee otú Devid si jiri akụ̀ ya mee ihe, oleekwa otú ndị ọzọ si zaghachi?
5 Ọ bụ ezie na Eze Solomọn nke Israel duziri owuwu nke ụlọ na-adịgide adịgide maka ofufe Jehova, Devid, bụ́ nna ya, emewo nkwadebe buru ibu maka ya. Devid chịkọtara ụbara buru ibu nke ọlaedo, ọlaọcha, ọla, ígwè, osisi, na nkume ndị dị oké ọnụ ahịa. “N’ihi na ihe ụlọ Chineke m na-atọ m ụtọ,” ka Devid gwara ndị ya, “ebe m nwere ihe nke aka m, bụ́ ọlaedo na ọlaọcha, ewerewo m ya nye ụlọ Chineke m, tụkwasị ihe nile m doziworo nye ụlọ nsọ ahụ [puku talent ọlaedo atọ] . . . na [puku talent ọlaọcha asaa], bụ́ nke a nụchara n’ọkụ, iji machita mgbidi nile nke ụlọ nile.” Devid gbara ndị ọzọ ume imesapụkwa aka. Nzaghachi ha bịara n’ụba: ọtụtụ ọlaedo, ọlaọcha, ọla, ígwè, na nkume ndị dị oké ọnụ ahịa. “N’obi zuru okè,” ndị ahụ “weere afọ ofufo nye Jehova.”—1 Ihe Emere 22:5; 29:1-9.
6 Site n’onyinye afọ ofufo ndị a, ndị Israel gosipụtara ekele miri emi maka ofufe Jehova. Devid ji umeala n’obi kpee ekpere, sị: “Ònye ka mụ onwe m bụ, olee ndị ka ndị m bụkwa, na anyị nwere ike iwere afọ ofufo nye Gị onwe anyị otú a?” N’ihi gịnị? “N’ihi na n’ebe Ị nọ ka ihe nile si bịa, ọ bụkwa ihe si n’aka Gị bịa ka anyị nyere Gị. . . . Mụ onwe m, n’izi ezi obi m ka m weere afọ ofufo nye Gị ihe nile ndị a.”—1 Ihe Emere 29:14, 17.
7. Ihe mmụta ịdọ aka ná ndị dị aṅaa ka anyị na-amụta site n’ụbọchị Emọs?
7 Ma, ebo nile nke Israel dara n’idebe ofufe Jehova n’ọnọdụ mbụ n’uche na n’obi ha. Ka ọ na-erule narị afọ nke itoolu T.O.A., Israel kewara ekewa aghọwo ndị ikpe nke nleghara anya nke ihe ime mmụọ mara. Banyere alaeze ebo iri nke ebe ugwu Israel, Jehova kwupụtara site n’ọnụ Emọs, sị: “Ahụhụ dịrị ndị nọ jụụ na Zaịọn, na ndị nwere ntụkwasị obi n’ugwu Sameria.” Ọ kọwara ha dị ka ndị “na-edina n’elu ihe ndina ọdụ́, na-esetịkwa onwe ha n’elu ebe ndina ha, na-erikwa ụmụ atụrụ ọma sitere n’ìgwè ewu na atụrụ, na ụmụ ehi site n’etiti ụlọ ebe a na-eme ka anụ maa abụba; . . . na-aṅụ mmanya vine n’ọkwá mwụsa.” Ma ụba ihe onwunwe ha abụghị ihe nchebe. Chineke dọrọ aka ná ntị, sị: “A ga-eme ka ha jee biri n’ala ọzọ bụrụ ndị obu ụzọ nke ndị a na-eme ka ha jee biri n’ala ọzọ, oriri ọkwụkwa ozu nke ndị na-esetị onwe ha ga-ewezụgakwa onwe ya.” Na 740 T.O.A., Israel tara ahụhụ n’aka ndị Asiria. (Emọs 6:1, 4, 6, 7) Mgbe oge na-agakwa alaeze ebe ndịda nke Juda ghọkwara ndị mara n’ọnyà nke ịhụ ihe onwunwe n’anya.—Jeremaịa 5:26-29.
Iji Ihe Ndị E Nwere Mee Ihe nke Ọma n’Oge Ndị Kraịst
8. Ezi ihe nlereanya dị aṅaa ka Josef na Meri na-enye anyị n’ihe banyere iji ihe ndị anyị nwere na-eme ihe?
8 N’ụzọ dị iche, ọnọdụ dịtụ njọ nke ndị ohu Chineke n’oge ikpeazụ egbochighị ha igosipụta ịnụ ọkụ n’obi maka ezi ofufe. Tụlee Meri na Josef. Ná nrubeisi nye iwu ike nke Siza Augustus, ha mere njem gaa ala nke ezinụlọ ha, bụ́ Betlehem. (Luk 2:4, 5) N’ebe ahụ ka a mụrụ Jisọs. Mgbe 40 ụbọchị gasịrị, Josef na Meri gara n’ụlọ nsọ nke dị nso na Jerusalem ịchụ àjà ime ka a dị ọcha. Dị ka ihe na-egosi ọnọdụ ogbenye ha, Meri chụrụ àjà nke ụmụ obere nnụnụ abụọ. Ma ya ma Josef adịghị nke ji ịda ogbenye gbara isi onwe ya. Kama nke ahụ, ha ji nrubeisi jiri ihe ole na ole ha nwere mee ihe.—Levitikọs 12:8; Luk 2:22-24.
9-11. (a) Okwu Jisọs kwuru na Matiu 22:21 na-enye ihe nduzi dị aṅaa banyere ụzọ anyị si eji ego eme ihe? (b) N’ihi gịnị ka obere onyinye nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ na-ejighị bụrụ nke e nyere n’efu?
9 Mgbe e mesịrị, ndị Farisii na ndị so n’òtù Herọd nwara itigharị Jisọs anya, na-asị: “Ya mere, gwa anyị, Gịnị bụ uche Gị? Ò ziri ezi n’iwu ịtụ ụtụ nye Siza, ma ọ bụ na o zighị ezi?” Nzaghachi Jisọs kpughere nghọta ya. N’izo aka ná mkpụrụ ego ahụ ha nyere ya, Jisọs jụrụ, sị: “Ònye nwe onyinyo a na ihe a e dekwasịrị ya?” Ha zaghachiri: “Siza nwe.” N’ụzọ amamihe o kwubiri, sị: “Ya mere, nyeghachinụ Siza ihe nke Siza, nyeghachikwanụ Chineke ihe nke Chineke.” (Matiu 22:17-21) Jisọs maara na ịchịisi nke mepụtara mkpụrụ ego ahụ tụrụ anya ka a na-akwụ taks. Ma ọ nọ n’ebe ahụ nyere ndị na-eso ụzọ ya nakwa ndị iro ya aka ịghọta na ezi onye Kraịst na-achọkwa inyeghachi “Chineke ihe nke Chineke.” Nke a gụnyere mmadụ iji ihe ndị o nwere na-eme ihe nke ọma.
10 Otu ihe nke Jisọs ji anya ya hụ nke mere n’ụlọ nsọ na-eme ihe atụ nke a. Ọ ka katọsịrị ndị odeakwụkwọ anyaukwu ahụ bụ́ ndị “na-eripịa ụlọ ndị inyom di ha nwụrụ.” “O wee lee anya n’elu, hụ ndị ọgaranya ka ha na-atụba onyinye ha n’ebe a na-edebe ụtụ a na-atụ,” ka Luk na-akọ. “[Jisọs] wee hụ otu nwanyị, bụ́ ogbenye, nke di ya nwụrụ, ka ọ na-atụba n’ebe ahụ ego nta abụọ. O wee sị, N’ezie asị m unu, Nwanyị a, bụ́ ogbenye, nke di ya nwụrụ, ọ tụbara karị ha nile: n’ihi na ndị a nile sitere n’inwebiga akụ̀ ókè ha tụba n’onyinye: ma nwanyị ahụ sitere n’ụkọ ya tụba ihe nile o nwere nke o ji biri.” (Luk 20:46, 47; 21:1-4) Ụfọdụ n’ime ndị ahụ kwuru na e ji nkume ndị dị oké ọnụ ahịa chọọ ụlọ nsọ ahụ mma. Jisọs zaghachiri: “Ihe ndị a nke unu na-ekiri, ụbọchị ga-abịa, nke a na-agaghị ahapụ otu nkume n’ebe a n’elu nkume ibe ya, nke a na-agaghị akwatu n’ala.” (Luk 21:5, 6) Obere onyinye nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ ọ̀ bụwo n’efu? N’ezie ọ bụghị. Ọ kwadoro ndokwa nke Jehova nwere n’oge ahụ.
11 Jisọs gwara ezi ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla nke na-eje ozi nke pụrụ ịbụ ohu nke nna abụọ: n’ihi na ọ ga-akpọ otu onye n’ime ha asị, hụ ibe ya n’anya; ma ọ bụghị otú a ọ ga-ejide otu, lelịa ibe ya anya. Unu apụghị ịbụ ohu Chineke na akụ̀.” (Luk 16:13) Otú a, olee ụzọ anyị pụrụ isi gosipụta nguzo ziri ezi n’iji ego anyị nwere na-eme ihe?
Oje Ozi Kwesịrị Ntụkwasị Obi
12-14. (a) Ndị Kraịst bụ ndị oje ozi nke ihe onwunwe ndị dị aṅaa? (b) N’ụzọ ndị dị aṅaa pụrụ iche ka ndị Jehova taa na-esi eji ikwesị ntụkwasị obi arụ ọrụ oje ozi ha? (ch) Olee ebe ego e ji akwado ọrụ Chineke taa na-esi abịa?
12 Mgbe anyị raara ndụ anyị nye Jehova, anyị n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, sịrị na ihe ọ bụla anyị nwere, ihe onwunwe anyị nile, dị ya n’aka. Mgbe ahụ, olee ụzọ anyị kwesịrị isi jiri ihe anyị nwere na-eme ihe? N’ịtụle ozi ndị Kraịst na-eje n’ọgbakọ, Nwanna C. T. Russell, onyeisi oche mbụ nke Watch Tower Society, dere, sị: “Onye ọ bụla kwesịrị iwere onwe ya dị ka onye Onyenwe anyị họpụtara ịbụ oje ozi nke oge, mmetụta, ego, na ihe ndị ọzọ o nwere, onye ọ bụla kwesịkwara ịchọ iji talent ndị a mee ihe ruo n’ókè ike ya kwere, iji nye Onyenwe anyị otuto.”—The New Creation, peji nke 345.
13 “Ihe a na-achọkwa n’aka ndị na-achị ezinụlọ bụ, ka a hụ onye ọ bụla na o kwesịrị ntụkwasị obi,” ka 1 Ndị Kọrint 4:2 na-ekwu. Dị ka nzukọ zuru ụwa ọnụ, Ndịàmà Jehova na-agba mbọ ime ihe kwekọrọ ná nkọwa ahụ, na-eji ihe ka ukwuu n’oge ha dị ka ha nwere ike na-eme ihe n’ozi ndị Kraịst, na-eji nlezianya na-azụlite ikike izi ihe ha. Ọzọkwa, ìgwè ndị ọrụ afọ ofufo n’okpuru nduzi nke Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè na-eji afọ ofufo nye oge, ume, na ọgụgụ isi ha iji wuo ụlọ nzukọ ndị mara mma maka ofufe. Site n’ihe ndị a nile, Jehova na-enwe obi ụtọ.
14 Olee ebe ego e ji akwado ọrụ izi ihe na ọrụ ihe owuwu nke a buru ibu si abịa? Ọ bụ site n’aka ndị obi ha nwere afọ ofufo, ọbụna dị ka o mere n’ụbọchị owuwu nke ụlọ ikwuu. N’otu n’otu, ànyị na-ekere òkè? Ụzọ anyị si eji ego anyị eme ihe ọ̀ na-egosipụta na ozi Jehova bụ ihe dị oké mkpa nye anyị? N’okwu ego, ka anyị bụrụ ndị oje ozi kwesịrị ntụkwasị obi.
Ihe Nlereanya nke Mmesapụ Aka
15, 16. (a) Olee otú ndị Kraịst n’ụbọchị Pọl si gosipụta mmesapụ aka? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi lee ntụle anyị na-eme ugbu a anya?
15 Pọl onyeozi dere banyere mmụọ mmesapụ aka nke ndị Kraịst nọ na Masedọnia na Akaịa. (Ndị Rom 15:26) Ọ bụ ezie na ha onwe ha nọ n’ihe isi ike, ha dị ngwa n’inye onyinye iji nyere ụmụnna ha aka. Pọl gbara ndị Kọrint bụ́ ndị Kraịst ume n’otu aka ahụ imesapụ aka n’inye ihe, na-enye ihe ha nwebigara ókè iji nyere ndị ọzọ na-enweghị ihe aka. Ọ dịghị onye pụrụ ibo Pọl ebubo mere eme nke nrigbu. O dere, sị: “Onye weere aka ntagide na-agha mkpụrụ ga-ewerekwa aka ntagide na-ewe ihe ubi; onye werekwa ngọzi na-agha mkpụrụ ga-ewerekwa ngọzi na-ewe ihe ubi. Ka onye ọ bụla n’etiti unu nye dị ka o buru ụzọ họpụta n’obi ya; ọ bụghị site ná mwute, ma ọ bụ site ná mkpa: n’ihi na Chineke hụrụ onye weere obi ụtọ na-enye n’anya.”—2 Ndị Kọrint 8:1-3, 14; 9:5-7, 13.
16 Onyinye mmesapụ aka nke ụmụnna anyị na ndị nwere mmasị na-enye maka ọrụ Alaeze nke zuru ụwa ọnụ taa na-enye ihe àmà nke ụzọ dị elu ha si were ihe ùgwù nke a. Ma, dị ka Pọl chetaara ndị Kọrint, ọ ga-adị mma anyị ịtụle isiokwu nke a dị ka ihe ncheta.
17. Olee usoro inye ihe nke Pọl gbara ume, a pụkwara itinye nke a n’ọrụ?
17 Pọl gbara ụmụnna ya ume ịgbaso otu usoro n’inye ihe ha. “Kwa ụbọchị mbụ n’izu ụbọchị asaa,” ka ọ sịrị, “ka unu nile n’otu n’otu debe ihe n’ụlọ na-akpado ya, otú ihe na-agara onye ọ bụla nke ọma.” (1 Ndị Kọrint 16:1, 2) Nke a pụrụ ije ozi dị ka ihe atụ nye anyị nakwa nye ụmụ anyị n’inye onyinye anyị, ma ànyị na-eme ya site n’ọgbakọ ma ọ bụ kpọmkwem gaa n’alaka ụlọ ọrụ kasị dịrị nso nke Watch Tower Society. Otu di na nwanyị na-eje ozi ala ọzọ e kenyere ọrụ ime nkwusa n’otu obodo Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa kpọrọ ndị nwere mmasị isonyere ha maka ọmụmụ Bible. Ná ngwụsị nke nzukọ mbụ a, ndị ozi ala ọzọ ahụ ji ezi uche tụnye mkpụrụ ego ụfọdụ n’otu igbe e dere “Onyinye maka ọrụ Alaeze.” Ndị ọzọ bịaranụ mekwara otu ihe ahụ. Mgbe e mesịrị, mgbe a haziworo ndị ọhụrụ a ịghọ ọgbakọ ndị Kraịst, onye nlekọta sekit letara ma kwuo okwu banyere onyinye ha na-enye mgbe nile.—Abụ Ọma 50:10, 14, 23.
18. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ụmụnna anyị nọ n’ihe isi ike aka?
18 Anyị nwekwara ihe ùgwù nke iji ihe ndị anyị nwere nyere ndị ọdachi ndị na-emere onwe ha dakwasịrị na ndị bi n’ebe agha tisasịworo aka. Lee ka anyị si nwee obi ụtọ ịgụ banyere ihe inyeaka ndị e zigara n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe ka ọgba aghara akụ̀ na ụba na ndọrọ ndọrọ ọchịchị tiwapụworo n’akụkụ ụwa ebe ahụ! Onyinye nke ma ngwongwo ma ego gosipụtara mmesapụ aka na ịdị n’otu nke ụmụnna anyị nwere n’ebe ndị Kraịst ụwa na-atụ n’ọnụ nọ.b—2 Ndị Kọrint 8:13, 14.
19. Olee ihe ndị dị irè anyị pụrụ ime iji nyere ndị nọ n’ozi oge nile aka?
19 Anyị ji ọrụ ụmụnna ndị na-ekere òkè n’ozi oge nile dị ka ndị ọsụ ụzọ, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị ozi ala ọzọ, na ndị ọrụ Betel nyere onwe ha n’afọ ofufo akpọrọ ihe, ọ́ bụghị otú ahụ? Ka ọnọdụ anyị nyere ohere ya, anyị pụrụ inwe ike inyere ha aka n’ụzọ ihe onwunwe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, mgbe onye nlekọta sekit letara ọgbakọ unu, ị pụrụ inwe ike inye ya ebe obibi, ihe oriri, ma ọ bụ enyemaka maka ego ọ ga-agbafu. Ọ dịghị mmesapụ aka dị otú ahụ nke Nna anyị nke eluigwe na-adịghị ahụ, bụ́ onye chọrọ ka a na-elekọta ndị ohu ya. (Abụ Ọma 37:25) N’afọ ụfọdụ gara aga, otu nwanna nke pụrụ inye nanị ihe oriri na-ebughị ibu kpọrọ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na nwunye ya òkù n’ụlọ ya. Mgbe di na nwunye ahụ pụwara maka ozi ubi uhuruchi, nwanna ahụ nyere ndị ọbịa ya otu envelopu. N’ime ya e nwere otu akwụkwọ ego bank (nke ya na otu dollar United States hà) tinyere otu akwụkwọ e ji aka dee, nke na-asị: “Maka iji ṅụọ otu iko tii ma ọ bụ otu galọn petrol.” Lee aha ekele ọma nke e gosipụtara n’ụzọ obi umeala!
20. Ihe ùgwù na ibu ọrụ dị aṅaa ka anyị na-achọghị ileghara anya?
20 N’ụzọ ime mmụọ, ndị Jehova bụ ndị a gọziri agọzi! Anyị na-eri oriri ime mmụọ ná mgbakọ nta na mgbakọ ukwu anyị, ebe anyị na-anata akwụkwọ ndị ọhụrụ, ozizi dị mma, na ndụmọdụ ndị dị irè. Site n’obi ndị jupụtara n’ekele maka ngọzi ime mmụọ anyị, anyị adịghị echefu ihe ùgwù na ibu ọrụ anyị nwere inye onyinye ego a ga-eji mee ihe maka ọganihu nke ọdịmma nile nke Alaeze Chineke n’ụwa nile.
‘Meenụ Ndị Enyi Site n’Akụ̀ nke Ajọ Omume’
21, 22. Gịnị ga-eme “akụ̀ nke ajọ omume” n’oge na-adịghị anya, na-achọ anyị n’aka ime gịnị ugbu a?
21 N’ezie, e nwere ọtụtụ ụzọ anyị pụrụ isi gosi na ofufe Jehova na-ebute ụzọ ná ndụ anyị, otu ụzọ n’ime ha nke ga-adị mkpa gụnyere anyị ịṅa ntị na ndụmọdụ Jisọs bụ: “Meenụ ndị enyi nye onwe unu site n’akụ̀ nke ajọ omume; ka, mgbe ọ bụla ọ ga-agwụ ka ha wee kpọbata unu n’ụlọ ikwuu ebighị ebi.”—Luk 16:9.
22 Rịba ama na Jisọs kwuru okwu banyere ọdịda nke akụ̀ ajọ omume. Ee, ụbọchị na-abịa mgbe ego nke usoro ihe a ga-aghọ ihe na-abaghị uru. “Ọlaọcha ha ka ha ga-atụfu n’èzí nile, ọlaedo ha ga-aghọkwa ihe ịsọ nsọ,” ka Ezikiel bụrụ n’amụma. “Ọlaọcha na ọlaedo ha agaghị enwe ike ịnapụta ha n’ụbọchị nrubiga ókè nke iwe Jehova.” (Ezikiel 7:19) Ruo mgbe nke a mere, anyị aghaghị iji amamihe na nghọta na-eme ihe n’ụzọ anyị si eji ihe onwunwe anyị na-eme ihe. Ya mere anyị agaghị eleghachi anya ná mwute n’ihi aṅaghị ntị n’ịdọ aka ná ntị Jisọs: “Ọ bụrụkwa na unu abụghị ndị kwesịrị ka a tụkwasị unu obi n’ihe onye ọzọ nwere, ònye ga-enye unu ihe nke aka unu? . . . Unu apụghị ịbụ ohu Chineke na akụ̀.”—Luk 16:11-13.
23. Ihe dị aṅaa ka anyị kwesịrị iji mee ihe n’ụzọ amamihe, gịnị ga-abụkwa ụgwọ ọrụ anyị?
23 Mgbe ahụ, ka anyị nile jiri ikwesị ntụkwasị obi na-aṅa ntị n’ihe ncheta ndị a nke idebe ofufe Jehova n’ọnọdụ mbụ ná ndụ anyị ma jiri ihe onwunwe anyị nile na-eme ihe n’ụzọ amamihe. Otú a anyị ga-ejigide ọbụbụ enyi anyị na Jehova na Jisọs, bụ́ ndị kwere nkwa na mgbe ego dara ha ga-akpọbata anyị “n’ụlọ ikwuu ebighị ebi,” na-enwe olileanya nke ndụ ebighị ebi ma ọ bụ n’Alaeze eluigwe ma ọ bụ n’elu ala bụ paradaịs.—Luk 16:9.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Okwu Hibru a sụgharịrị “onyinye” sitere ná ngwaa nke pụtara n’ụzọ nkịtị “ịdị elu; ibuli elu; iweli elu.”
b Lee akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, peji nke 307-315, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1993.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Olee otú Israel si zaghachi n’ọkpụkpọ òkù Jehova inye onyinye maka owuwu nke ụlọ ikwuu ahụ?
◻ N’ihi gịnị ka onyinye nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ na-ejighị bụrụ n’efu?
◻ Ibu ọrụ dị aṅaa ka ndị Kraịst nwere maka ụzọ ha si eji ihe ndị ha nwere eme ihe?
◻ Olee ụzọ anyị pụrụ isi zere inwe mwute banyere ihe anyị ji ego eme?
[Foto dị na peeji nke 15]
Onyinye nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ, ọ bụ ezie na ọ dị ntakịrị, abụghị n’efu
[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]
Onyinye anyị na-akwado ọrụ Alaeze ahụ zuru ụwa ọnụ