-
Nọgide Na-ekwesị Ntụkwasị ObiỤlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2019 | Febụwarị
-
-
3. (a) Olee otú ndị na-efe Chineke si egosi na ha na-ekwesị ntụkwasị obi? (b) Olee ihe atụ ndị nwere ike inyere anyị aka ịghọta ihe ikwesị ntụkwasị obi pụtara?
3 Olee otú ndị na-efe Chineke si egosi na ha na-ekwesị ntụkwasị obi? Ọ bụ iji obi ha niile hụ Jehova n’anya. Nke a mere ka ha na-eme ihe na-adị ya mma mgbe niile. Tụlee ihe ụfọdụ e kwuru na Baịbụl banyere ikwesị ntụkwasị obi. Na Baịbụl, okwu Hibru a sụgharịrị “iguzosi ike n’ezi ihe” ma ọ bụ ikwesị ntụkwasị obi pụtara ihe zuru ezu ma ọ bụ ihe na-enweghị nkwarụ.b Dị ka ihe atụ, ndị Izrel ji anụmanụ chụọrọ Jehova àjà. Iwu Mozis kwuru na anụmanụ ndị ahụ agaghị enwe nkwarụ.c (Lev. 22:21, 22) Chineke achọghị ka ndị ya jiri anụmanụ dara ngwọrọ, nke ntị chiri, ma ọ bụ nke kpuru ìsì chụọrọ ya àjà. Ọ chọghịkwa ka ha jiri nke na-arịa ọrịa chụọrọ ya àjà. Jehova chọrọ ka e jiri anụmanụ na-enweghị nkwarụ na-achụrụ ya àjà. (Mal. 1:6-9) Ihe ndị a emeela ka anyị ghọta na Jehova ji ihe zuru ezu ma ọ bụ ihe na-enweghị nkwarụ kpọrọ ihe. Anyị chọọ ịzụ ihe, dị ka mkpụrụ osisi, akwụkwọ ma ọ bụ ngwá ọrụ, anyị anaghị achọ ịzụ mkpụrụ osisi na-adịghị mma, akwụkwọ peeji ya na-ezughị ezu ma ọ bụ ngwá ọrụ akụkụ ya ụfọdụ na-ezughị ezu. Anyị chọrọ ịzụ nke dị mma ma ọ bụ nke zuru ezu. Otú ahụ ka ọ dị Jehova ma a bịa n’ihe gbasara ịhụ ya n’anya na irubere ya isi. Ọ chọrọ ka anyị jiri obi anyị niile na-eme otú ahụ.
-
-
Nọgide Na-ekwesị Ntụkwasị ObiỤlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2019 | Febụwarị
-
-
b N’isiokwu a, anyị ga-eji ikwesị ntụkwasị obi dochie anya iguzosi ike n’ezi ihe.
-