-
Olee Ebe I Lekwasịrị Anya?Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2018 | Julaị
-
-
9. Gịnị ka Jehova gwara Mozis ka o mee, gịnịkwa ka Mozis mere? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)
9 Gịnị ka Mozis mere mgbe ndị Izrel malitekwara ịtamu ntamu? O lekwasịkwara Jehova anya ka ọ gwa ya ihe ọ ga-eme. Ma na nke ugbu a, Jehova agwaghị ya ka ọ kụọ mkpara ya na nkume. Ọ gwara ya ka o were mkpara ya, kpọkọta ndị Izrel n’ihu nkume ahụ ma gwa nkume ahụ okwu. (Ọnụ Ọgụ. 20:6-8) Ma, Mozis agwaghị nkume ahụ okwu. Kama, o ji iwe gwa ndị nọ ebe ahụ, sị: “Nụrụnụ, unu ndị nnupụisi! Ọ̀ bụ na nkume a dị elu ka anyị ga-esi mee ka mmiri gbapụtara unu?” O jizi mkpara ya kụọ nkume ahụ ugboro abụọ.—Ọnụ Ọgụ. 20:10, 11.
-
-
Olee Ebe I Lekwasịrị Anya?Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2018 | Julaị
-
-
OTÚ MOZIS SI NUPỤ ISI
12. Olee ihe ọzọ nwere ike ịbụ ya mere Jehova ji wesa Mozis na Erọn iwe?
12 E nwekwara ike inwe ihe ọzọ mere Jehova ji wesa Mozis na Erọn iwe. Mozis gwara ndị Izrel, sị: “Ọ̀ bụ na nkume a dị elu ka anyị ga-esi mee ka mmiri gbapụtara unu?” Mgbe Mozis kwuru “anyị,” o nwere ike ịbụ na ọ na-ekwu gbasara ya na Erọn. Ihe Mozis kwuru gosiri na ọ kwanyereghị Jehova ùgwù ọ bụla, bụ́ Onye mere ka mmiri ahụ gbapụta. Ọ ga-abụ ya mere Abụ Ọma 106:32, 33 ji kwuo, sị: “Ha kpasukwara ya iwe na mmiri Meriba, nke mere Mozis ji baa ná nsogbu n’ihi ha. N’ihi na ha mere ihe wutere ya na mmụọ, o wee jiri egbugbere ọnụ ya kwuo okwu n’echeghị echiche.”c (Ọnụ Ọgụ. 27:14) Mozis akwanyereghị Jehova ùgwù ruuru ya. Jehova gwara ya na Erọn, sị: “Unu nupụrụ isi n’iwu m.” (Ọnụ Ọgụ. 20:24) Ihe a ha mere jọgburu onwe ya.
13. Gịnị mere ihe ahụ Jehova mere Mozis ji kwesị ekwesị?
13 Jehova chọrọ ọtụtụ ihe n’aka Mozis na Erọn n’ihi na ọ bụ ha na-edu ndị Izrel. (Luk 12:48) N’oge gara aga, Jehova ekweghị ka ndị Izrel tamuru ntamu malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe banye n’Ala Nkwa ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 14:26-30, 34) N’ihi ya, o kwesịrị ekwesị ka Jehova meekwa Mozis otu ihe ahụ o mere ndị Izrel n’ihi na o nupụụrụ ya isi. O kweghị ya banye n’Ala Nkwa ahụ otú ahụ ọ na-ekweghị ndị Izrel.
-