Ezi Omume Ebulie Otu Mba Elu
MGBE ọtụtụ ụbọchị nke mmiri ozuzo gasịrị, lee ihe obi ụtọ ọ bụ isi n’ụra bilie wee hụ ka anyanwụ na-acha n’igwe na-acha gbaa! E mewo ka ala dị ọhụrụ, ugbu a kwa ahịhịa pụrụ ito pokopoko. N’otu oge Jehova Chineke jiri onyinyo dị otú ahụ maa atụ ngọzi nile nke ịchịisi ezi omume. Ọ gwara Eze Devid, sị: “[Mgbe] onye na-achị mmadụ bụ onye ezi omume, ọ na-achị n’egwu Chineke. Ọ dịkwa ka ìhè ụtụtụ, mgbe anyanwụ na-awa, bụ ụtụtụ igwe ojii na-adịghị; mgbe ahịhịa ndụ na-epupụta n’ala, site n’ọmụma anyanwụ, site ná mmiri ozuzo.”—2 Samuel 23:3, 4.
Okwu Chineke mezuru n’oge ọchịchị ezi omume nke ọkpara Devid, bụ́ Eze Solomọn. Bible na-akọ, sị: “Juda na Israel wee biri ná ntụkwasị obi, nwoke ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya, site na Dan wee ruo na Biasheba, ụbọchị nile nke Solomọn.”—1 Ndị Eze 4:25.
Israel oge ochie bụ mba Chineke họọrọ. O nyere ha iwu ya ma gwa ha na ọ bụrụ na ha egee ntị n’olu ya na ọ ga-eme ka ha “kachasịa mba nile nke ụwa elu.” (Deuterọnọmi 28:1) Ọ bụghị ezi omume nke Israel buliri ha elu kama ezi omume Jehova. Iwu ndị Chineke nyere ha dị elu nke ukwuu karịa iwu nke mba ndị gbara ha gburugburu. Dị ka otu ndị, ha bụkwa ndị na-ezughị okè dị ka mba ndị ahụ nile. N’ihi ya, ọ bụ Iwu Jehova nke dị elu karị na ha ịrapagidesi ike na ya mere e ji bulie ha elu karịa mba nile. Mgbe ha rubere isi n’iwu Jehova, ha nwere ihu ọma na ngọzi ya. Eze Solomọn hụrụ nke a n’oge ọchịchị ya. Ọ pụrụ ikwu, sị: “Ezi omume na-ebuli mba: ma,” ka ọ dọrọ aka ná ntị, “ihe ihere nke ndị nile dị iche iche ka mmehie ha bụ.”—Ilu 14:34.
N’ụzọ dị mwute, site n’inupụ isi ugboro ugboro, e wedatara mba Israel n’ọnọdụ dị ala. Ha nwetara mmechuihu dị ka otu mba. Nke a mesịrị duje n’ọjụjụ a jụrụ ha kpam kpam n’ịhọrọ mba ime mmụọ ọhụrụ.—Matiu 21:43.
Israel Ime Mmụọ
N’otu nzukọ nke otu na-achị isi nke ndị Kraịst nwere na Jerusalem, Jemes, bụ́ onye Juu n’ọmụmụ, kwuru n’okpuru ike mmụọ nsọ na Chineke ‘eletawo ndị mba ọzọ, isi n’etiti ha wepụtara aha ya otu ndị.’ (Ọrụ 15:14) Pọl onyeozi kpọrọ mba ọhụrụ a nke ndị Kraịst “Israel nke Chineke.” (Ndị Galetia 6:16) Banyere nzube e ji kpọọ ha, Pita dere, sị: “Unu onwe unu bụ ọgbọ ndị a họpụtaworo, òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nwetara, ka unu wee kwusaa ịdị mma nile nke Onye ahụ Onye kpọpụtara unu n’ọchịchịrị ahụ baa n’ìhè Ya dị ebube.” (1 Pita 2:9) Dị ka ndị Chineke họpụtara, ha gaje inwu dị ka ndị na-enye ìhè n’ụwa. Ezi omume Jehova ga-ebuli ha elu.—Ndị Filipaị 2:15.
A pụrụ iji nhọrọ a họọrọ ndị Israel ime mmụọ a tụnyere igwupụta diamond. Mgbe e gwupụtara ájá ndị diamond dị na ha n’elu ala, a pụrụ inweta nanị 1 carat (200 miligram) n’ime 3 tọn ájá ọ bụla. Otu ụzọ nke e ji mee ihe n’otu oge iji wepụta diamond ndị dị ya gụnyere ịgwakọta mmiri na ájá ahụ na ịwụsa ngwakọta ahụ n’elu table e tere griiz. Diamond na mmiri adịghị agwakọta, ha na-araparakwa na griiz ahụ ebe a na-asachapụ ihe ndị a na-achọghị. N’oge a, diamond ahụ na-adị nkịkara. Otú ọ dị, mgbe e bepụtara ma kwọchaa ya, ha na-egbukepụ ìhè n’akụkụ nile.
Dị ka diamond ndị ya na mmiri na-adịghị agwakọta ndị na-abụghị akụkụ nke ihe ndị gbara ha gburugburu, e kewapụwo ndị Jehova iche n’ụwa. (Jọn 17:16) Mgbe mbụ e wepụtara ha n’ìhè, ọ pụrụ ịbụ na ha adịghị egbukepụ egbukepụ. Ma Okwu na mmụọ Jehova na-ekepụta n’ime ha mmadụ ọhụrụ, ha na-enwukwa dị ka ndị na-enye ìhè n’ụwa a. Ọ bụ n’ihi ezi omume Jehova ka e ji welie ha elu, ha na-egbukepụkwa ìhè ahụ dị ebube nke eziokwu Alaeze n’akụkụ nile, ọ bụghị n’ihi ezi omume nke onwe ha.
Ma, malite n’akụkụ ikpeazụ nke narị afọ mbụ O.A., ndapụ n’ezi ofufe gbebatara n’ime ọgbakọ dị iche iche, metụtakwa ọtụtụ ndị. Ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst ghọrọ ndị e jikọtara ha na mba nile nke ụwa, bụrụkwa ndị a na-apụghị ịhụ dị ka ndị dị iche n’ụwa nke dị ha gburugburu.
Taa e weghachiwo ndị na-ekwesị ntụkwasị obi fọdụrụ n’Israel ime mmụọ n’ihu ọma Jehova. Ha ekewapụwo onwe ha iche pụọ n’ụwa, sachapụkwa onwe ha pụọ ná “mmerụ nile nke ahụ na nke mmụọ.” (2 Ndị Kọrint 7:1) N’ịbụ ndị dị ọcha na ndị ziri ezi n’ihu Jehova, ha na-akwado ezi omume ya. Nke a ebuliwo ha gaa n’ọnọdụ ihu ọma dị elu karịa mba nile nke ụwa. Site ná nkwusa ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ, a dọtawo oké ìgwè mmadụ sitere ná mba nile n’ebe Jehova nọ, ha aghọwokwa akụkụ nke ndị ya.—Mkpughe 7:9, 10.
Ụwa Pụrụ Ịhụ Ihe Dị Iche
Mgbe ụfọdụ ndị ọchịchị ụwa na-eto àgwà nke ndị na-ejere Chineke ozi. N’otu oge gara aga, onye isi ọrụ nche nke ogige Pretoria Show Grounds, South Africa, kwuru okwu banyere akparamàgwà nke Ndịàmà Jehova sitere n’agbụrụ nile bụ́ ndị na-eji ihe owuwu ahụ eme ihe maka mgbakọ ha kwa afọ. Gụnyere ihe ndị ọzọ, o dere, sị: “Mmadụ nile kpara ma na-akpa àgwà ọma, ndị mmadụ na-agwa ibe ha okwu n’ụzọ dị mma, àgwà e gosipụtara n’ụbọchị ole na ole gara aga—ha nile na-agba akaebe banyere ụdị ndị so n’òtù unu, nakwa na mmadụ nile na-ebikọ ọnụ dị ka otu ezinụlọ nwere obi ụtọ.”
Ndị Jehova pụrụ ịtụnye ụtụ n’ezi omume nke mba ya ọ bụghị nanị ná mgbakọ ukwu ndị dị otú ahụ kamakwa ná ndụ onwe ha. Dị ka ihe atụ, alaka ụlọ ọrụ South Africa nke Watch Tower Society natara akwụkwọ ozi site n’aka otu nwaada na Johannesburg na-ekwu, sị: “N’izu gara aga, pọọsụ m dị n’elu ụgbọ ala m mgbe m nyaara ụgbọ ala pụọ. Ọ dapụrụ na Jan Smuts Avenue, otu n’ime ndị ọgbakọ unu, Maazi R—, bụ́ onye kpọrọ m òkù na fon ma weghachiri m ya, tụtụtakwara ya na ihe nile dị ya n’ime. . . . Enwere m ekele dị ukwuu n’ịkwụwa aka ọtọ a nke ghọworo àgwà dị ụkọ n’oge a ma na-aja ọgbakọ unu mma maka iguzobe ụkpụrụ ndị òtù unu na-arapara na ha.”
Ee, site n’ịrapara n’ụkpụrụ ezi omume nile nke Jehova, a na-eme ka ndị ya guzopụ iche dị ka ndị dị iche pụọ n’ụwa. N’ihi na ndị a na-egosipụta ezi omume Jehova, a na-adọta ndị nwere obi eziokwu n’ọgbakọ ndị Kraịst. Ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị ịbụ onye a dọtara n’ebe ihe na-erughị unyi, nke dị ọcha dị. Dị ka ihe atụ, otu oge, otu onye ọbịa bịara nzukọ Ndịàmà Jehova na Zurich, Switzerland, wee kwuo na ya chọrọ ịghọ onye òtù ọgbakọ. Ọ kọwara na a chụpụla nwanne ya nwanyị n’ihi omume rụrụ arụ wee kwukwasị na ya chọrọ isonyere nzukọ nke “na-adịghị anabata àgwà ọjọọ.” Ọbụna akwụkwọ New Catholic Encyclopedia kwetara na a maara Ndịàmà Jehova dị ka “otu n’ime ìgwè ndị kasị akpa àgwà ọma n’ụwa.”
Ebe ezi omume na-ebuli elu, mmehie pụrụ imebi aha ọma mmadụ, karịsịa ma ọ bụrụ na a mata banyere mmehie dị oké njọ n’ógbè. Mgbe ụfọdụ ọgbakọ ndị Kraịst aghaghị idi ihere nke e wetaara ya mgbe ndị òtù ya n’otu n’otu mere mmehie dị oké njọ. N’ụzọ kwere nghọta, ndị òtù na-ekwesị ntụkwasị obi nke ọgbakọ pụrụ ịgbachitere aha ọma nke ọgbakọ site n’igosi na a tawo onye mmehie ahụ ahụhụ n’ụzọ ebere, ya bụ, n’ikwekọ n’ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụrụ na mmadụ na-eme mmehie ma jụ ichegharị, a ga-ewepụ ya n’ọgbakọ—chụpụ ya.—1 Ndị Kọrint 5:9-13.
Ihe Mere E Ji Achụpụ Ụfọdụ
Ọ bụ ezie na a na-achụpụ ọtụtụ puku mmadụ site n’ọgbakọ ndị Kraịst kwa afọ, ọ bụ nanị akụkụ dị nta nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde Ndịàmà Jehova ise nọ n’ụwa. N’ihi gịnị ka e kwesịrị iji were nzọụkwụ a siri ike megide onye ọ bụla n’ọgbakọ ndị Kraịst? Ọdịdị mmehie ahụ bụ otu n’ime ihe ndị na-ekpebi ya. Ma ihe ka mkpa bụ ma onye ahụ mehierenụ ò nwere ezi nchegharị banyere mmehie ahụ dị oké njọ o mere. Ọ bụrụ na o wutere ya n’ezie, o chigharịkwurukwa Jehova n’ekpere sitere n’obi, na-arịọ mgbaghara maka mmehie e mere megide Ya, chọọkwa enyemaka nke ndị ikom ọ dị n’aka n’ọgbakọ, a pụrụ inyere ya aka inwetaghachi ihu ọma Chineke ma nọgide na-abụ akụkụ nke ọgbakọ.—Ilu 28:13; Jemes 5:14, 15.
Mgbe nwatakịrị nke ya na nna ya nwere ezi mmekọrịta, nke dị mma, mere ihe wutere nna ya, ha abụọ kwesịrị ime ihe ngwa ngwa imezighachi mmekọrịta ahụ dị oké ọnụ ahịa. N’otu aka ahụ, mgbe anyị raara ndụ anyị nye Jehova, anyị na-esoro ya abanye ná mmekọrịta kasị dị oké ọnụ ahịa. N’ihi ya, mgbe anyị mere ihe wutere ya, anyị kwesịrị ime ihe ngwa ngwa n’ịchọ imezighachi mmekọrịta ahụ nke anyị na Nna anyị nke eluigwe.
N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ụfọdụ ndị nọ n’ọnọdụ ndị a chụpụrụ achụpụ ejiriwo ihe atụ nke nwa mmefu ahụ kpọrọ ihe. N’ebe ahụ e ji Jehova tụnyere Nna na-ahụ n’anya nke dị njikere ịnabataghachi onye mmehie chegharịrị echegharị ma ọ bụrụ na onye ahụ echigharịa ma chọọ mgbaghara Chineke. (Luk 15:11-24) Ezi nchegharị, nke sitere n’obi na nchigharị pụọ n’ihe ọjọọ anọwo na-abụ ụzọ isi laghachi n’ihu ọma Jehova na ọgbakọ ndị Kraịst. A kpaliwo ụfọdụ ndị mmehie chegharịrị echegharị bụ́ ndị nweworo mmetụta nke ịbụ ndị e gwepịara n’okpuru ibu dị arọ nke obi amamikpe ha iwere nzọụkwụ ụfọdụ iji laghachite na gburugburu ebe na-ahụ n’anya nke ọgbakọ ndị Kraịst. Ha esiwo otú a bịa ghọta okwu Jehova ndị dị n’Aịsaịa 57:15.
Iji gbochie ndị mmadụ n’otu n’otu ịlaghachite ná nlekọta ịhụnanya nke Jehova, Setan ga-achọ ime ka o yie ka ọ dịghị mgbaghara ọ bụla dị maka mmehie ndị e meworo. Ma àjà mgbapụta nke Kraịst Jisọs zuru ezu ikpuchi mmehie nile nke onye ọ bụla chegharịrịnụ—ee, ọbụna mmehie e ketara eketa “nke ụwa dum.” (1 Jọn 2:1, 2) Nanị mmehie nke mgbapụta ahụ na-adịghị ekpuchi bụ mmehie megide mmụọ nsọ Chineke, nke ya na ilezi anya nupụ isi megide ịrụ ọrụ nke mmụọ nsọ Chineke bụ otu ihe, dị ka mmehie ndị dị oké njọ nke Judas Iskarịọt na ọtụtụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii.—Matiu 12:24, 31, 32; 23:13, 33; Jọn 17:12.
Ịkwado Ezi Omume Jehova
Kemgbe e weghachiri ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ ahụ n’ihu ọma Jehova na 1919, ha aghọọla ndị e buliri elu karị pụọ n’ụwa gbara ha gburugburu. Nke a abụghị n’ihi ịdị mma ọ bụla n’akụkụ nke ha kama n’ihi nrubeisi ha sitere n’obi n’iwu na ụkpụrụ nile nke Jehova. N’ihi ya, a dọbatawo ọtụtụ nde “atụrụ ọzọ” nke Kraịst n’ịdị n’otu ha na Israel ime mmụọ dị ka ndị ibe na-eguzosi ike n’ihe. (Jọn 10:16) Ndị a na-ewetara Jehova otuto na nsọpụrụ n’ime ụwa nke e kewapụrụ nnọọ n’ebe ụkpụrụ ezi omume nile nke Chineke dị. Ọ dị dị ka otu magazin South Africa bụ́ Personality si kwuo n’otu oge, sị: “Ndịàmà Jehova yiri ka ha na-agbawa n’ihi àgwà ọma, ọ fọkwara nke nta ka ọ bụrụ na ha enweghị àgwà ọjọọ ọ bụla.”
Iji jigide ọnọdụ a e buliri elu n’ime ụwa nke na-adịghị asọpụrụ Chineke, ọ dị onye òtù ọ bụla nke ọgbakọ ndị Kraịst mkpa ibi ndụ dị ọcha, nke ziri ezi n’ihu Jehova. N’ime Bible, e ji ihe ndị dị ọcha see onyinyo nzukọ eluigwe Jehova. A na-ahụ ya dị ka nwanyị mara mma nke e yikwasịrị anyanwụ, na-enwekwa ọnwa n’okpuru ụkwụ ya. (Mkpughe 12:1) A kọwara Jerusalem Ọhụrụ ahụ dị ka obodo dị nsọ, nke mara mma n’ile anya. (Mkpughe 21:2) E nyere ndị òtù na-ekwesị ntụkwasị obi nke nwunye Kraịst “ezi ákwà ọcha na-enwu enwu, nke dịkwa ọcha.” (Mkpughe 19:8) A hụrụ ndị so n’oké ìgwè mmadụ ka ha yi “uwe mwụda dị ọcha.” (Mkpughe 7:9) A na-adọta ndị nwere ọchịchọ ime ezi omume n’ebe nzukọ dị ọcha dị. N’ụzọ dị iche, nzukọ Setan adịghị ọcha. E sere onyinyo usoro okpukpe ya dị ka nwanyị na-akwa iko, a kọwakwara ndị na-anọghị n’ime obodo nsọ ahụ dị ka ndị ruru unyi, ndị na-adịghị ọcha.—Mkpughe 17:1; 22:15.
E kwere ndị ezi omume nkwa ndụ ebighị ebi. Ndị zukọtaranụ nke na-akwado ezi omume Jehova nwere olileanya nke ịlanarị ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a. “Onye na-ege m ntị ga-ebi ná ntụkwasị obi . . . n’atụghị oké egwu ihe ọjọọ,” ka Chineke na-ekwe ná nkwa n’Ilu 1:33.
Lee ihe na-enye ọṅụ ọ ga-abụ mgbe Solomọn Ka Ukwuu, bụ́ Kraịst Jisọs, na-achị ụwa ọhụrụ ahụ n’ezi omume, n’egwu Jehova! (2 Pita 3:13) Ọ ga-adị ka ìhè ụtụtụ mgbe anyanwụ na-acha, ụtụtụ nke na-enweghị igwe ojii. Ndị nile bi n’ụwa ga-ebi ná ntụkwasị obi, onye ọ bụla ọ na-anọdụ ala n’okpuru osisi vine na fig ya, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Òtù ụmụ mmadụ bụ́ ndị ezi omume ga-eme ka ụwa maa mma ma were ọnọdụ ya kwesịrị ekwesị n’elu igwe na ụwa nye otuto ebighị ebi nke Chineke anyị, bụ́ Jehova.—Maịka 4:3, 4; leekwa Aịsaịa 65:17-19, 25.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 26]
Garo Nalbandian