Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Gịnị Ka Jehova Chọrọ Anyị n’Aka?
    Ụlọ Nche—2009 | Ọktoba 1
    • Gịnị Ka Jehova Chọrọ Anyị n’Aka?

      Diuterọnọmi 10:12, 13

      Ọ NAGHỊ adịrị mmadụ mfe mgbe niile ikpebi ma ọ̀ ga-erube isi ma ọ bụ na ọ gaghị erube. O nwere ike isiri ndị nọ n’okpuru onyeisi nke dị aka ike, nke ọ na-esikwa ike imeta mma ike isi n’ala ala obi ha rubere ya isi. Ma, ndị na-efe Jehova Chineke na-eji obi ha dum erubere ya isi. N’ihi gịnị? Iji zaa ajụjụ a, ka anyị leba anya n’ihe Mozis kwuru na Diuterọnọmi 10:12, 13.a

      Mgbe Mozis na-achịkọta ihe ndị Chineke chọrọ n’aka ụmụ mmadụ, ọ jụrụ otu ajụjụ dị mkpa, nke bụ́: “Gịnị ka Jehova bụ́ Chineke gị na-achọ n’aka gị?” (Amaokwu 12) O ruuru Chineke ịgwa anyị mee ihe ọ bụla ọ chọrọ ka anyị mee. A sị kwuwe, ọ bụ ya bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị, Onye nyere anyị ndụ na Onye ji anyị ndụ. (Abụ Ọma 36:9; Aịzaya 33:22) N’ihi ya, Jehova ruru nnọọ eru ka anyị rubere ya isi. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ chọghị nrubeisi na-esighị anyị n’obi. Gịnị ka ọ chọrọ anyị n’aka? Ọ chọrọ ka anyị bụrụ “ndị si n’obi ha na-erube isi.”—Ndị Rom 6:17.

      Olee ihe ndị nwere ike ịkpali anyị iji obi anyị dum na-erubere Chineke isi? Mozis kwuru na otu n’ime ha bụ “ịtụ egwu Jehova bụ́ Chineke gị.”b (Amaokwu 12) Nke a abụghị ịtụ egwu na-enweghị isi maka ihe ọjọọ nwere ike ime anyị, kama ọ bụ ịkwanyere nnọọ Chineke na ụzọ ya ùgwù. Ọ bụrụ na anyị na-atụ nnọọ egwu Chineke, anyị ga-achọ izere ime ihe ga-ewute ya.

      Ma, olee isi ihe kwesịrị ịkpali anyị irubere Chineke isi? Mozis kwuru, sị: “Hụ ya [Jehova] n’anya ma jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na-ejere Jehova bụ́ Chineke gị ozi.” (Amaokwu 12) Ịhụ Chineke n’anya abụghị naanị iche banyere ya. Otu akwụkwọ e ji eme nnyocha kwuru, sị: “Okwu Hibru a sụgharịrị iche echiche na-apụtakwa mgbe ụfọdụ àgwà mmadụ kpara n’ihi echiche o chere.” Otu akwụkwọ a kwukwara na ịhụ Chineke n’anya pụtara “imeso ya ihe n’ịhụnanya.” E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke n’anya n’ezie, anyị ga na-eme omume ndị anyị maara ga-eme ya obi ụtọ.—Ilu 27:11.

      Olee otú anyị kwesịrị iruberuru Chineke isi? Mozis kwuru, sị: “Jee ije n’ụzọ ya [Chineke] niile.” (Amaokwu 12) Jehova chọrọ ka anyị mee ihe niile ọ chọrọ anyị n’aka. Irubere ya isi n’ihe niile otú a ò nwere ike imebiri anyị ihe? Mbanụ.

  • Gịnị Ka Jehova Chọrọ Anyị n’Aka?
    Ụlọ Nche—2009 | Ọktoba 1
    • a Ọ bụ ezie na ọ bụ ndị Izrel oge ochie ka Mozis gwara okwu ahụ, ihe o kwuru gbasakwara ndị niile chọrọ ime ihe dị Chineke mma n’oge anyị a.—Ndị Rom 15:4.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya