-
“Ezigbo Nwaanyị”Ụlọ Nche—2012 | Ọktoba 1
-
-
Mgbe Rut lọtara, Neomi jụrụ ya, sị: “Ònye ka ị bụ, nwa m?” Ọ ga-abụ otú ahụ chi na-abọchabeghị mere Neomi ji jụọ Rut ajụjụ a, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na Neomi chọrọ ịma ma Rut ò nwetala onye ga-alụ ya ka ọ̀ bụ na o nwetabeghị. Ozugbo ahụ, Rut gwara nne di ya otú ya na Boaz si jee. O bunyekwara ya ọka bali ahụ Boaz gwara ya ka o bunye ya.d—Rut 3:16, 17.
-
-
“Ezigbo Nwaanyị”Ụlọ Nche—2012 | Ọktoba 1
-
-
d Boaz bunyere Rut ọka bali dị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ sia isii. O nwere ike ịbụ na ihe mere o ji dịrị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ isii bụ iji gosi na ebe ọ bụ na a na-arụ ọrụ ụbọchị isii ma zuo ike n’ụbọchị nke asaa, oge Rut dọgburu onwe ya n’ọrụ agwụwala, nakwa na oge ọ ‘ga-ezu ike’ n’ụlọ di ya eruwela. O nwekwara ike ịbụ na ọ bụ naanị ọka dị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ isii, ya bụ, ihe dị ka shọvel isii, ka Rut nwere ike ibuli.
-