Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • “Ebe Ị Gara Ka M Ga-aga”
    Ṅomie Okwukwe Ha
    • 16-18. (a) Olee otú Rut si gosi na ya hụrụ Neomi n’anya? (b) Olee ihe anyị ga-amụta n’aka Rut banyere ịhụnanya na-adịgide adịgide? (Lee foto ụmụ nwaanyị abụọ ahụ.)

      16 Ka Rut na Neomi nọ na-ele ibe ha anya n’okporo ụzọ ahụ, ihe Rut chọrọ ime doro ya anya. Ọ hụrụ Neomi n’anya, hụkwa Chineke ahụ Neomi na-efe n’anya. N’ihi ya, Rut gwara Neomi, sị: “Arịọla m ka m hapụ gị, ka m kwụsị iso gị; n’ihi na ebe ị gara ka m ga-aga, ebe ị ga-arahụ ka m ga-arahụ. Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m. Ebe ị nwụrụ ka m ga-anwụ, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka a ga-eli m. Ka Jehova mee m otú a, ka ọ tụkwasịkwa ihe na ya ma ọ bụrụ na ọ bụghị naanị ọnwụ ga-ekewa mụ na gị.”—Rut 1:16, 17.

      Ebe Rut na-agwa Neomi, “Ebe ị gara ka m ga-aga”

      “Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m”

      17 Ihe a Rut kwuru magburu onwe ya. A ka na-echeta ya n’agbanyeghị na o ruola ihe dị ka puku afọ atọ o kwuru ya. Ihe a o kwuru gosiri na ịhụnanya ya bụ nke ezigbo ya, ọ bụ ịhụnanya na-adịgide adịgide. Rut hụrụ Neomi n’anya nke ukwuu nke na o kpebiri iso Neomi gaa ebe ọ bụla ọ na-aga. Ọ bụ naanị ọnwụ nwere ike ikewa ha. Ebe ọ bụ na Rut ekpebiela ịhapụ Moab bụ́ obodo ya, hapụkwa chi ndị obodo ya, ndị obodo Neomi ga-abụzi ndị obodo ya. Rut emeghị ka Ọpa, kama o ji obi ya niile kwuo na ya chọrọ ka Jehova, bụ́ Chineke ahụ Neomi na-efe, bụrụ Chineke ya.a

  • “Ebe Ị Gara Ka M Ga-aga”
    Ṅomie Okwukwe Ha
    • a Ị̀ hụrụ na ihe Rut kpọrọ Chineke abụghị naanị “Chineke” otú ọtụtụ ndị na-abụghị ndị Izrel na-eme? Ọ kpọkwara ya aha ya bụ́ Jehova. Akwụkwọ bụ́ The Interpreter’s Bible kwuru, sị: “Onye dere akwụkwọ Rut si otú a gosi na nwaanyị a na-abụghị onye Izrel na-efe ezi Chineke.”

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya