-
“Ebe Ị Gara Ka M Ga-aga”Ụlọ Nche—2012 | Julaị 1
-
-
Ka Rut na Neomi nọ na-ele ibe ha anya n’okporo ụzọ ahụ, ihe Rut chọrọ ime doro ya anya. Ọ hụrụ Neomi n’anya, hụkwa Chineke ahụ Neomi na-efe n’anya. N’ihi ya, ọ gwara Neomi, sị: “Arịọla m ka m hapụ gị, ka m kwụsị iso gị; n’ihi na ebe ị gara ka m ga-aga, ebe ị ga-arahụ ka m ga-arahụ. Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m. Ebe ị nwụrụ ka m ga-anwụ, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka a ga-eli m. Ka Jehova mee m otú a, ka ọ tụkwasịkwa ihe na ya ma ọ bụrụ na ọ bụghị naanị ọnwụ ga-ekewa mụ na gị.”—Rut 1:16, 17.
Ihe a Rut kwuru magburu onwe ya. A ka na-echeta ya n’agbanyeghị na o ruola ihe dị ka puku afọ atọ o kwuru ya. Ihe a o kwuru gosiri na ịhụnanya ya bụ nke ezigbo ya, ọ bụ ịhụnanya na-adịgide adịgide. Rut hụrụ Neomi n’anya nke ukwuu nke na o kpebiri iso Neomi gaa ebe ọ bụla ọ na-aga. Ọ bụ naanị ọnwụ nwere ike ikewa ha. Ebe ọ bụ na Rut ekpebiela ịhapụ Moab bụ́ obodo ya, hapụkwa chi ndị obodo ya, ndị obodo Neomi ga-abụzi ndị obodo ya. Rut emeghị ka Ọpa, kama o ji obi ya niile kwuo na ya chọrọ ka Jehova, bụ́ Chineke ahụ Neomi na-efe, bụrụ Chineke ya.b
-
-
“Ebe Ị Gara Ka M Ga-aga”Ụlọ Nche—2012 | Julaị 1
-
-
b Ị̀ hụrụ na ihe Rut kpọrọ Chineke abụghị naanị “Chineke” otú ọtụtụ ndị na-abụghị ndị Izrel na-eme? Ọ kpọkwara ya aha ya bụ́ Jehova. Baịbụl bụ́ The Interpreter’s Bible kwuru, sị: “Onye dere akwụkwọ Rut si otú a gosi na nwaanyị a na-abụghị onye Izrel bụ onye na-efe ezi Chineke.”
-