-
“Ebe Ị Gara Ka M Ga-aga”Ṅomie Okwukwe Ha
-
-
23. Olee ihe Rut malitere iche, oleekwa ihe iwu Jehova nyere ndị Izrel kwuru banyere ndị ogbenye? (Gụọ ihe e dere n’ala ala.)
23 Mgbe Rut na Neomi biwere na Betlehem, Rut malitere iche ihe ọ ga na-arụ ka o nwee ike ịkpa afọ ya na Neomi. Ọ nụrụ na n’iwu Jehova nyere ndị ya bụ́ Izrel, e nwere nke kwuru otú a ga-esi na-enyere ndị ogbenye aka. Iwu ahụ kwuru na ndị ogbenye nwere ike ịga n’ubi mmadụ n’oge a na-ewe ihe ubi soro ndị na-ewe ihe ubi n’azụ na-atụtụkọrọ ihe ha wefọrọ n’ubi nakwa ndị nke dị n’ọnụ ọnụ ubi ha.b—Lev. 19:9, 10; Diut. 24:19-21.
24, 25. Gịnị ka Rut mere mgbe o rutere n’ubi Boaz, oleekwa otú ọrụ iwere ọka e wefọrọ ewefọ na-adị?
24 Oge ahụ bụ oge e ji ewe ọka bali n’ubi. O nwere ike ịbụ n’ọnwa Eprel na kalenda oge anyị a. Rut gaziri ka ọ mara ma ò nwere onye ga-ekwe ya were ọka e wefọrọ n’ubi ya. Ọ dabara na ọ bụ n’ubi Boaz ka Rut banyere. Boaz bụ nwoke bara ọgaranya, nweekwa ala, ọ bụkwa onye ikwu Elimelek, bụ́ di Neomi. Ọ bụ eziokwu na iwu ahụ kwuru na ndị ogbenye nwere ike ịbanye n’ubi ọ bụla were ọka e wefọrọ ewefọ, Rut abanyeghị n’ubi Boaz n’ajụghị ase. O bu ụzọ rịọ nwa okorobịa na-elekọta ndị na-aghọrọ Boaz ọka ma ọ̀ ga-ekwe ya were ọka e wefọrọ ewefọ. Nwa okorobịa ahụ kwetara, Rut amalitezie iwere ọka.—Rut 1:22–2:3, 7.
-
-
“Ebe Ị Gara Ka M Ga-aga”Ṅomie Okwukwe Ha
-
-
b Iwu a e nyere ụmụ Izrel magburu onwe ya. E nweghị ụdị ya n’obodo Rut hà. Ná mba ndị gbara Izrel gburugburu n’oge ahụ, a na-emesikarị ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ ike. Otu akwụkwọ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na di nwaanyị anwụọ, ọ bụzi ụmụ ya ga na-elekọta ya; ọ bụrụ na ọ mụtaghị nwa, ihe o nwere ike ime bụ ịgbawara ndị ọzọ ohu, ịgbawa akwụna ma ọ bụkwanụ ịga nwụfuo.”
-