-
“Ebe Ị Gara Ka M Ga-aga”Ụlọ Nche—2012 | Julaị 1
-
-
Mgbe Rut na Neomi biwere na Betlehem, Rut malitere iche ihe ọ ga-arụwa ka o nwee ike ịkpa afọ ya na Neomi. Ọ nụrụ na n’ime iwu Jehova nyere ndị ya bụ́ Izrel, e nwere nke kwuru otú a ga-esi na-enyere ndị ogbenye aka. Iwu ahụ kwuru na ndị ogbenye nwere ike ịga n’ubi mmadụ n’oge a na-ewe ihe ubi soro ndị na-ewe ihe ubi n’azụ na-atụtụkọrọ ihe ha wefọrọ n’ubi nakwa ndị nke dị n’ọnụ ọnụ ubi ha.c—Levitikọs 19:9, 10; Diuterọnọmi 24:19-21.
Oge ahụ bụ oge iwe ọka bali n’ubi. O nwere ike ịbụ n’ọnwa Eprel na kalenda oge anyị a. Rut gaziri ka ọ mara ma ò nwere onye ga-ekwe ya were ọka e wefọrọ n’ubi ya. Ọ dabara na ọ bụ n’ubi Boaz ka Rut banyere. Boaz bụ nwoke bara ọgaranya, nweekwa ala, ọ bụkwa onye ikwu Elimelek bụ́ di Neomi. Ọ bụ eziokwu na iwu ahụ e nyere ndị Izrel kwuru na ndị ogbenye nwere ike ịbanye n’ubi ọ bụla were ọka e wefọrọ ewefọ, Rut abanyeghị n’ubi Boaz n’ajụghị ase. O bu ụzọ rịọ nwa okorobịa na-elekọta ndị na-aghọrọ Boaz ọka ma ọ̀ ga-ekwe ya were ọka e wefọrọ ewefọ. Nwa okorobịa ahụ kwetara, ya amalitezie.—Rut 1:22–2:3, 7.
-
-
“Ebe Ị Gara Ka M Ga-aga”Ụlọ Nche—2012 | Julaị 1
-
-
c Iwu a e nyere ụmụ Izrel magburu onwe ya. E nweghị ụdị ya n’obodo Rut hà. Ná mba ndị gbara Izrel gburugburu n’oge ahụ, a na-emesikarị ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ ike. Otu akwụkwọ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na di nwaanyị anwụọ, ọ bụzi ụmụ ya ga na-elekọta ya; ọ bụrụ na ọ mụtaghị nwa, ihe o nwere ike ime bụ ịgbawara ndị ọzọ ohu, ịgbawa akwụna ma ọ bụkwanụ gaa nwụọrọ onwe ya.”
-