-
Ọ Kpara Àgwà Onye Nwere Ezi UcheỤlọ Nche—2009 | Julaị 1
-
-
Nebal bi na Meyọn, ma o yiri ka ọ̀ na-arụ ọrụ ma nwee ala n’obodo Kamel dị nso n’ebe ahụ.a Obodo ndị ahụ nwere ugwu ndị ahịhịa juru, bụ́ ebe dị mma ịnọ azụ atụrụ, Nebal nwekwaranụ puku atụrụ atọ. Ma, ebe ndị ọzọ gbara obodo ndị ahụ gburugburu bụ ọhịa. I si na ya gawa n’ebe ndịda, ị ga-ahụ nnukwu ala ịkpa Peran. I si na ya gawa n’ebe ọwụwa anyanwụ, tupu i ruo Oké Osimiri Nnu, ị ga-agafe ala na-adịghị eme nri ndị ndagwurugwu na ọgba juru. Ihe adịrịghị Devid na ndị ikom ya mfe n’ebe a, o dokwara anya na ha na-achụ nta iji nweta ihe oriri ma na-edi ọtụtụ ihe isi ike. Ha na-ezutekarị ụmụ okorobịa na-azụrụ ọgaranya bụ́ Nebal atụrụ.
-
-
Ọ Kpara Àgwà Onye Nwere Ezi UcheỤlọ Nche—2009 | Julaị 1
-
-
a Nke a abụghị Ugwu Kamel ahụ a ma ama nke dị ná mgbago mgbago n’ebe ugwu kama ọ bụ obodo dị n’ọnụ ọnụ ala ịkpa dị n’ebe ndịda.
-