Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ihe Atụ nke Iji Onwe Onye Achụ Àjà na Iguzosi Ike n’Ihe
    Ụlọ Nche—1997 | Nọvemba 1
    • NYE onye ọrụ ubi na-eto eto aha ya bụ Elaịsha, ihe malitere dị ka ịkọ ubi ya ọ na-eme kwa ụbọchị ghọrọ ụbọchị kasị mkpa ná ndụ ya. Ka ọ nọ ọrụ n’ubi, Elaịsha nwetara nleta ọ na-atụghị anya ya site n’aka Elaịja, bụ́ onye amụma kasịnụ n’Israel. ‘Gịnị ka ọ pụrụ ịchọ n’aka m?’ ka Elaịsha pụrụ icheworị. Ọ dịghị ya mkpa ichere ogologo oge maka azịza. Elaịja chịsara uwe ọrụ ya n’ahụ Elaịsha, na-egosi na Elaịsha ga-anọchi ya otu ụbọchị. Elaịsha eleghị ọkpụkpọ òkù a anya dị ka ihe dị nta. Ozugbo, ọ hapụrụ ubi ya iji ghọọ onye na-ejere Elaịja ozi.—1 Ndị Eze 19:19-21.

  • Ihe Atụ nke Iji Onwe Onye Achụ Àjà na Iguzosi Ike n’Ihe
    Ụlọ Nche—1997 | Nọvemba 1
    • Mgbe a kpọrọ ya òkù isoro Elaịja jee ozi pụrụ iche, Elaịsha hapụrụ ubi ya ozugbo iji jeere onye amụma kasịnụ n’Israel ozi. Dị ka ihe àmà na-egosi, ọrụ ya ụfọdụ dị ala, n’ihi na a maara ya dị ka “onye wụkwasịrị mmiri n’aka Elaịja.”c (2 Ndị Eze 3:11) Otú o sina dị, Elaịsha weere ọrụ ya dị ka ihe ùgwù, ọ nọgidesikwara ike n’akụkụ Elaịja.

      Ọtụtụ ndị ohu Chineke taa na-egosipụta mmụọ yiri nke a nke iji onwe onye achụ àjà. Ụfọdụ ahapụwo “ubi” ha, ihe ha ji ebi ndụ, iji kwusaa ozi ọma n’ókèala dịgasị anya ma ọ bụ ije ozi dị ka ndị òtù ezinụlọ Betel. Ndị ọzọ emewo njem gaa ala ọzọ iji rụọ ọrụ n’ihe owuwu nke Society. Ọtụtụ anabatawo ihe a pụrụ ịkpọ ọrụ ndị dị ala. Ma, o nweghị onye na-agara Jehova ozi nke na-eje ozi na-adịghị mkpa. Jehova na-enwe obi ekele maka ndị nile na-efe ya n’afọ ofufo, ọ ga-agọzikwa mmụọ nke iji onwe onye achụ àjà.—Mak 10:29, 30.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya