Ihe Ndị A Hụrụ n’Ala Nkwa ahụ
Sameria—Isi Obodo n’Etiti Isi Obodo Ndị nke Ebe Ugwu
BABILỌN, Nineve, na Rom. Ha bụ isi obodo dị iche iche n’oge Bible. Ma, dị ka ihe dị na Bible gosiri, e wezụgakwa Jerusalem n’onwe ya, isi obodo kasị kwesị ịrịba ama yiri ka ọ bụghị nke ọ bụla n’ime ha kama, ọ bụ Sameria. Ruo ihe dị ka 200 afo, ọ bụ isi obodo nke alaeze ebo iri nke Israel, ọtụtụ okwu amụma lekwasịkwara anya na Sameria. Ma gịnị ka ị maara banyere Sameria? Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka o ji bụrụ isi obodo n’etiti isi obodo ndị nke ebe ugwu?
N’ile anya na map ahụ, cheta ụfọdụ n’akụkọ ihe mere eme mgbe ebo iri nke Israel kewapụrụ onwe ha site n’okpuru eze na ụlọ nsọ nke Jehova dị na Jerusalem. Jeroboam, bụ́ onye duziri nguzobe nke alaeze ebe ugwu ahụ, chịrị achị ruo nwa mgbe site na Shekem, bụ́ nke dị n’ụzọ ahụ si ebe ugwu gaa ebe ndịda n’etiti oké ugwu dị iche iche. Jeroboam mesịrị buru isi obodo ya gafee Tiaza, bụ́ nke dị n’isi Wadi Far’ah. Otu okporo ụzọ nke sitere na Ndagwurugwu Jọdan gabigara Tiaza ma jikọta ụzọ ahụ si n’etiti oké ugwu dị iche iche gabiga. Ị̀ maara na Tiaza bụ isi obodo nke alaeze ebo iri ahụ n’oge ochịchị nke Nedab, Beasha, Ila, Zimri, na ọbụna Omri?—Jenesis 12:5-9; 33:17, 18; 1 Ndị Eze 12:20, 25, 27; 14:17; 16:6, 15, 22.
Ma mgbe afọ isii gasịrị, Omri guzobere isi obodo ọhụrụ. N’òle ebe? Ọ zụtara oké ugwu ahụ nke ị na-ahụ n’aka ekpe, bụ́ Sameria. (1 Ndị Eze 16:23-28) Ọ bụ ezie na ugbu a, o nwere ọtụtụ ala ubi dị iche iche, o yiri ka Omri họọrọ ya n’ihi na ugwu ahụ nke elu ya dị larịị nke tipụtara isi site n’ọzara ahụ ga-adị mfe nchebe. Nwa ya bụ Ehab gara n’ihu n’iwu Sameria, ma eleghi anya, na-ewusawanye ihe nchebe ya site n’iwu mgbidi ndị buru ibu. O wukwaara Beal ụlọ nsọ, wuokwara onwe ya na nwunye ya bụ onye Finisia, bụ́ Jezebel, otu obieze. Ihe mgbe ochie ndị e gwupụtara n’ala egosiwo mkpọmkpọ ebe nke obieze Ehab, nke e gosiri na peji nke na-eso. A maara obieze ahụ maka ndụ okomoko na ajọ omume gabigara ókè. (1 Ndị Eze 16:29-33) Jiri anya nke uche gị lee ka onye amụma bụ Elaịja na-arịgo ịbanye n’obodo nke a ma na-aga ije n’ụzọ ahụ dị obosara nke na-eduje n’obieze ahụ, ịnọ ebe ahụ kwutọọ ajọ omume Ehab nke dabeere na Beal.—1 Ndị Eze 17:1.
Na 1990, ndị ọkà n’igwupụta ihe mgbe ochie e liri n’ala chọtara n’ebe ahụ iberibe ụrọ ndị e dekwasịrị ihe n’elu ha, bụ́ ndị nwere ihe ndekọ nke mmanya na mmanụ olive ndị e bujere n’ebe ndị ọzọ ma ọ bụ ego ụtụ isi ndị a kwụrụ. Ma ọtụtụ aha mmadụ ndị dị na ha nwere ihe mgbakwụnye ahụ bụ ba’al. Ọ pụrụ ịmasị gị ịmara na ndị ọkà mmụta ihe mgbe ochie e gwupụtara n’ala ndị ahụ chọtakwara iberibe ọdụ́enyi e ji amachita ihe, dị ka e gosiri n’ebe a. Cheta na n’ogologo oge gara aga, 1 Ndị Eze 22:39 hotara na Ehab wuru “ụlọ ọdụ.” Ma eleghị anya nke a gụnyere ngwá ụlọ ndị e ji ọdụ́enyi machita ime ha, ndị dị ka “ihe ndina ọdụ” ndị ahụ Emọs onye amụma zoro aka na ha mgbe otu narị afo gasịrị. (Emọs 3:12, 15; 6:1, 4) Ụfọdụ n’ihe oyiyi ndị a tụrụ na ha bụ sphinx ndị nwere nkù na ihe oyiyi ndị ọzọ sitere n’akụkọ ifo nke ndị Ijipt.
Ma eleghị anya ịkpọtụ Ehab na Jezebel aha ga-echetara gị otú ha si nwụọ. Ehab nwụrụ n’otu agha nzuzu ya na ndị Siria buru. Mgbe a sachara ụgbọ ịnyịnya ya n’akụkụ “ọdọ mmiri Sameria; nkịta wee rachaa ọbara ya,” dị nnọọ ka okwu Elaịja si dị. (1 Ndị Eze 21:19, 22:34-38) E si n’otu windo nke dị n’obieze ahụ tụpụ Eze Nwanyị bụ Jezebel o wee nwụọ. Ọ̀ bụ site n’obieze nke a dị na Sameria? Ee e. Ehab nwekwara otu obieze n’ebe ugwu na ndagwurugwu Jezreel. O nwere anyaukwu maka ubi vine Nebọt nke dị nso ebe ahụ. Site n’elu obieze ahụ, ndị nche ndị na-ele anya gaa n’ebe ọwụwa anyanwụ hụrụ ka Jihu ji oké ọsọ na-agbagote site na ndagwurugwu ahụ. N’ebe ahụkwa, onye ahụ bụbu eze nwanyị nke Sameria dakasịrị wee nwụọ ajọ onwụ, bụ́ nke kwesịịrị ya.—1 Ndị Eze 21:1-16; 2 Ndị Eze 9:14-37.
Ọ bụ ezie na Sameria nọgidere na-abụ isi obodo, o nweghị nkwado ma ọ bụ ngọzi Chineke. Kama nke ahụ, o gosipụtara omume ịma aka na ịkpọasị n’ebe isi obodo ya nke ebe ndịda, bụ́ Jerusalem, dị. Jehova zipụrụ ọtụtụ ndị amụma ije dọọ ndị ọchịchị ya na ndị ebe ahụ aka ná ntị banyere ikpere arụsị, omume na-adịghị ọcha, na nsọpụrụ ha na-adịghị enye iwu ya nile, ma ọ dịghị nke rụpụtara ihe ọ bụla. (Aịsaịa 9:9; 10:11; Ezikiel 23:4-10, Hosea 7:1; 10:5; Emọs 3:9; 8:14; Maịka 1:1, 6) Ya mere, n’afọ 740 Tupu Oge Anyị, e mere ka Sameria zaa ajụjụ ihe o metara, na-abụ nke ndị Asiria tikpọsịrị. A dọọrọ ọtụtụ ndị bi na ya n’agha, e wee jiri ndị ala ọzọ dochie ọnọdụ ha.—2 Ndị Eze 17:1-6, 22-24.
Mgbe e mesịrị, karịsịa n’oge Herọd Onye Ukwu ahụ, ndị Grik na ndị Rom wetaghachiri ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ịdị ukwuu na Sameria. Ya mere, ọbụna Jisọs na ndị ozi ya maara ihe banyere isi obodo nke a nke dị n’etiti isi obodo ndị nke ebe ugwu.—Luk 17:11; Jọn 4:4.
[Map dị na peeji nke 16]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Jezreel
Tirzah
Sameria
Shechem
Jerusalem
Jordan River
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ọ dabeere na map nke a natara Pictorial Archive (Near Eastern History) Est. and Survey of Israel ikike wee sepụta.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 16]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Ebe E Si Nweta Foto Ndị Dị na peeji nke 17]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
Garo Nalbandian
Nke dị n’ime: Israel Department of Antiquities and Museums; foto nke sitere na Israel Museum, Jerusalem