Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
© 2022 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
MACH 6-12
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 IHE E MERE 23-26
“A Haziri Otú E Si Efe Chineke n’Ụlọ Nsọ Nke Ọma”
it-2 241
Ndị Livaị
Mgbe Devid na-achị, ọ haziri ọrụ ndị Livaị na-arụ nke ọma. Ọ họpụtara ndị ga na-elekọta ọrụ, ndị isi, ndị ikpe, ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá, ndị na-elekọta akụ̀, nakwa ọtụtụ ndị ga na-enyere ndị nchụàjà aka n’ọrụ ndị ha na-arụ n’ụlọ nsọ, n’ogige ndị dị na ya, nakwa n’ebe a na-anọ eri ihe. Ọrụ ndị ahụ bụ ịchụ onyinye n’àjà, ịchụ àjà ndị ọzọ, ido ihe ọ bụla dị nsọ ọcha, ịtụ ihe iji mata otú ọ hà, nakwa iche nche. E nwekwara ndị Livaị ọrụ ha bụ ịkpọ egwú na ịbụ abụ. A haziri ha n’ìgwè n’ìgwè ụzọ iri abụọ na anọ, nke yiri otú e si hazie ndị nchụàjà. Ọ na-abụ otu ìgwè rụchaa, ya eruoro ìgwè ọzọ. A na-efe nza iji mata ndị ga-arụ nke ha ga-arụ. Ọ bụkwa otú ahụ ka e si amata ọnụ ụzọ ámá ìgwè nke ọ bụla ga-eche nche.—1 Ihe 23, 25, 26; 2 Ihe 35:3-5, 10.
it-2 686
Onye Nchụàjà
A haziri ndị nchụàjà n’ìgwè n’ìgwè, ha nwekwara ndị isi na-elekọta ọrụ ha na-arụ n’ụlọ nsọ. E fere nza tupu e kenyewe ha ọrụ ụfọdụ ha na-arụ. Ha dị ìgwè iri abụọ na anọ. Ìgwè nke ọ bụla na-arụ ọrụ otu izu otu izu, ugboro abụọ n’afọ. O doro anya na ndị nchụàjà niile na-arụ ọrụ n’oge ememme mgbe a na-achụ ọtụtụ puku anụmanụ ndị mmadụ wetara n’àjà, otú ha mere mgbe a na-enyefe Jehova ụlọ nsọ. (1 Ihe 24:1-18, 31; 2 Ihe 5:11; i nwere ike ịtụle 2 Ihe 29:31-35; 30:23-25; 35:10-19.) Onye nchụàjà nwekwara ike ịrụ ọrụ n’ụlọ nsọ n’oge ọzọ ma ọ bụrụhaala na ọ gaghị aga weghara ọrụ ndị nchụàjà ndị ọzọ e kenyere ọrụ n’oge ahụ. Iwu ndị Rabaị kwuru na n’oge Jizọs nọ ndụ n’ụwa, ndị nchụàjà dịzi ọtụtụ, nke mere e ji keere ezinụlọ dị iche iche nọ n’otu ìgwè ọrụ ha na-arụ n’izu. Ihe a mere ka ezinụlọ nke ọ bụla na-arụ ọrụ otu ụbọchị ma ọ bụ ụbọchị ole na ole n’izu, dabere na mmadụ ole ha dị.
it-2 451-452
Egwú
Mgbe Devid na-akwadebe ọrụ ndị a ga na-arụ n’ụlọ Jehova, o wepụtara puku ndị Livaị anọ (4,000) iche maka ịkpọ egwú na ịgụ abụ. (1 Ihe 23:4, 5) N’ime ndị Livaị a, narị mmadụ abụọ na iri asatọ na asatọ (288) “bụ ndị ọkà n’ịbụrụ Jehova abụ. A zụkwara ha azụ maka ya.” (1 Ihe 25:7) Ọ bụ Esaf, Himan, na Jedutọn (ọ ga-abụkwa ya ka a na-akpọ Itan), mmadụ atọ bụ́ aka ochie n’ịkụ egwú, ka a haziri ka ha na-eduzi ndị niile ahụ e wepụtara maka ịkụ egwú na ịgụ abụ. Ebe ọ bụ na onye nke ọ bụla n’ụmụ nwoke ndị a si n’ezinụlọ ụmụ nwoke atọ Livaị mụrụ, ya bụ, Geshọm, Kohat, na Meraraị, e nwere ike ikwu na ndị na-agụ egwú n’ụlọ nsọ si n’ezinụlọ ndị isi atọ Livaị mụrụ. (1 Ihe 6:16, 31-33, 39-44; 25:1-6) Ụmụ nwoke niile mmadụ atọ a mụrụ dị iri abụọ na anọ. Ha niile so na narị mmadụ abụọ na iri asatọ na asatọ (288) ahụ bụ́ aka ochie n’ịkpọ egwú na ịgụ abụ. E fere nza iji kpebie ìgwè onye nke ọ bụla n’ime ụmụ nwoke iri abụọ na anọ ahụ ga-abụ onyeisi ya. Onye nke ọ bụla n’ime ha nwekwara mmadụ iri na otu ọzọ bụ́ “ndị ọkà” ọ na-elekọta. E si n’ụmụ onye nke ọ bụla n’ime ha nakwa n’ime ndị Livaị ndị ọzọ họpụta mmadụ iri na otu mmadụ iri na otu ahụ. Ọ bụ otú a ka e si kee narị ndị Livaị abụọ na iri asatọ na asatọ ([1 + 11] × 24 = 288) bụ́ aka ochie n’ịkụ egwú na n’ịgụ abụ ụzọ iri abụọ na anọ, otú e kere ndị nchụàjà. Ọ bụrụ na e keekwa puku mmadụ atọ, narị asaa na iri na abụọ (3,712) fọrọnụ, bụ́ ‘ndị ka na-amụ amụ,’ ìgwè nke ọ bụla n’ime ìgwè iri abụọ na anọ ahụ ga-eketakwu ihe dị ka otu narị ụmụ nwoke na iri ise na ise (155). Ihe ọ pụtara bụ na onye nke ọ bụla n’ime ‘ndị bụ́ ọkà’ ketara ihe dị ka ndị Livaị iri na atọ ka na-amụ amụ ọ na-azụ. (1 Ihe 25:1-31) Ebe ọ bụ na ndị na-afụ opi bụkwa ndị nchụàjà, ha sokwa ná ndị Livaị na-akụ egwú ma na-agụ abụ.—2 Ihe 5:12; i nwere ike ịtụle Ọnụ Ọgụ. 10:8.
it-1 898
Onye Nche Ọnụ Ụzọ Ámá
N’Ụlọ Nsọ. Obere oge tupu Eze Devid anwụọ, ọ sara anya ná mmiri hazie otú ndị Livaị na ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ nsọ, ma puku mmadụ anọ (4,000) na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá, ga na-esi arụ ọrụ ha. Ìgwè nke ọ bụla n’ime ha ga-abịa rụọ ọrụ ụbọchị asaa n’oge ọ bụla o ruuru ha. Ọrụ ha bụ ịhụ na e chere ụlọ Jehova nche nakwa imeghe ọnụ ụzọ na imechi ha n’oge kwesịrị ekwesị. (1 Ihe 9:23-27; 23:1-6) E wepụ ọrụ iche nche, ụfọdụ n’ime ha na-ahụ maka ego ndị mmadụ na-enye n’onyinye maka ụlọ nsọ. (2 Eze 12:9; 22:4) Mgbe e mechara, ya bụ, n’oge Jehoyada bụ́ nnukwu onye nchụàjà tere Jehoash mmanụ ka ọ bụrụ eze, a họpụtara ndị nche pụrụ iche ka ha na-eche ọnụ ụzọ ámá ndị dị n’ụlọ nsọ nche ka ajọ eze nwaanyị bụ́ Atalaya ghara ime Jehoash ka bụ́ obere nwa ihe ọ bụla. (2 Eze 11:4-8) Mgbe Eze Josaya mere ka a kwụsị ife arụsị n’Izrel, ndị na-eche ọnụ ụzọ nche nyere aka wepụsịa arịa ndị dị n’ụlọ nsọ, bụ́ ndị e jirila fee Bel ofufe. A kpọziri arịa ndị ahụ ọkụ n’azụ obodo.—2 Eze 23:4.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ife Jehova Otú Ọ Chọrọ Ga-eme Ka Anyị Na-enwekwu Obi Ụtọ
10 Anyị na-efe Jehova ma anyị soro ụmụnna anyị na-abụ abụ. (Ọma 28:7) Ndị Izrel weere ịbụ abụ ka otu ụzọ dị mkpa ha si efe Jehova. Eze Devid họpụtara narị ndị Livaị abụọ na iri asatọ na asatọ ka ha na-abụ abụ n’ụlọ nsọ. (1 Ihe 25:1, 6-8) Taakwa, anyị ga-egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya ma ọ bụrụ na anyị ana-abụ abụ Alaeze. Ọ dịghị mkpa na anyị ga-enwerịrị olu abụ ka anyị nwee ike iso na-abụ abụ Alaeze. Chegodị ihe a: Anyị kwuwe okwu, “anyị niile na-emejọ ihe ọtụtụ ugboro.” Ma, ọ naghị egbochi anyị ikwu okwu ma anyị gaa ọmụmụ ihe ma ọ bụkwanụ gbochie anyị izi ozi ọma. (Jems 3:2) N’ihi ya, anyị ka nwere ike ịbụ abụ iji too Jehova ọ bụrụgodị na anyị chere na anyị enweghị olu abụ.
MACH 13-19
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 IHE E MERE 27-29
“Ndụmọdụ Nna Nyere Nwa Ya Maka na Ọ Hụrụ Ya n’Anya”
Ichekwa Ihe E Ji Mara Anyị Dị Ka Ndị Kraịst
9 Nwapụtara onwe gị eziokwu Bible. Ihe e ji mara anyị dị ka ndị ohu Jehova pụrụ iji nwayọọ nwayọọ na-efunahụ anyị ma ọ bụrụ na anyị ejighị ihe ọmụma sitere n’Akwụkwọ Nsọ na-eme ka ọ pụtawanye ìhè. (Ndị Filipaị 1:9, 10) Ọ dị Onye Kraịst ọ bụla—ma nwata ma okenye—mkpa ịnwapụtara onwe ya n’ụzọ na-eju afọ na ihe o kweere bụ n’ezie eziokwu sitere na Bible. Pọl gbara ndị kwere ekwe ibe ya ume, sị: “Na-anwapụtanụ ihe nile; na-ejisikwanụ aka ike n’ihe dị mma.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:21) Ndị Kraịst na-eto eto bụ́ ndị nọ n’ezinụlọ na-atụ egwu Chineke aghaghị ịghọta na ha apụghị ịdabere n’okwukwe nke ndị mụrụ ha. Nna Solomọn, bụ́ Devid, gbara ya ume ka ọ ‘mara Chineke nke nna ya, were obi zuru okè, fee Ya ofufe.’ (1 Ihe E Mere 28:9) Ọ gaghị ezu nnọọ ezu Solomọn na-eto eto ikiri otú nna ya si na-ewulite okwukwe n’ebe Jehova nọ. Ọ ghaghị ịmara Jehova n’onwe ya, o mekwara nke ahụ. Ọ rịọrọ Chineke, sị: “Ugbu a nye m amamihe na ihe ọmụma, ka m wee na-apụ apụ na-abatakwa abata n’ihu ndị nke a.”—2 Ihe E Mere 1:10.
Jiri Obi Gị Dum Na-ejere Jehova Ozi
13 Ihe anyị kwesịrị ịmụta n’ihe atụ a doro anya. Ọ dị mma ka anyị na-agachi ọmụmụ ihe na ozi ọma anya, bụ́ ọrụ ọma ndị na-eme anyị obi ụtọ. Ma ọ bụghị ebe ahụ ka okwu biri ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iji obi anyị dum na-ejere Jehova ozi. (2 Ihe 25:1, 2, 27) Ọ bụrụ na Onye Kraịst hụrụ ‘ihe ndị dị n’azụ’ n’anya n’ime ime obi ya, ya bụ, ihe ụfọdụ ndị ụwa na-eme, o nwere ike ime ka ya na Chineke ghara ịdịzi ná mma. (Luk 17:32) Naanị ihe ga-eme ka anyị bụrụ ndị “kwesịrị nnọọ ekwesị maka alaeze Chineke” bụ ‘ịkpọ ihe ọjọọ asị ma jidesie ezi ihe ike.’ (Rom 12:9; Luk 9:62) N’ihi ya, n’agbanyeghị otú ihe ndị dị n’ụwa Setan si yie ihe bara uru ma ọ bụ ihe dị mma, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka ihe ọ bụla ghara igbochi anyị iji obi anyị dum na-arụ ọrụ ndị metụtara Alaeze Chineke.—2 Kọr. 11:14; gụọ Ndị Filipaị 3:13, 14.
“Nwee Obi Ike . . . Meekwa Ihe”
20 Eze Devid chetaara Solomọn na Jehova ga-anọnyere ya ruo mgbe a rụchara ụlọ nsọ ahụ. (1 Ihe 28:20) O doro anya na Solomọn chebaara ihe ndị ahụ echiche. O kweghị ka obere nwa ọ bụ, nakwa isi na-akabeghị ya mee ka ọ ghara ịrụ ọrụ ahụ. O gosiri na o nwere obi ike ma rụọkwa ọrụ. Jehova nyekwaara ya aka iji afọ asaa na ọnwa isii rụchaa ụlọ nsọ ahụ dị ebube.
21 Otú ahụ Jehova si nyere Solomọn aka ka ọ ga-esikwa nyere anyị aka inwe obi ike anyị ga-eji rụọ ọrụ anyị n’ezinụlọ nakwa n’ọgbakọ. (Aịza. 41:10, 13) Ọ bụrụ na anyị enwee obi ike n’ozi anyị na-ejere Jehova, obi ga-esi anyị ike na ọ ga-agọzi anyị ugbu a, nakwa n’ọdịnihu. N’ihi ya, “nwee obi ike . . . meekwa ihe.”
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ihe Ị Ga-eme Ka Gị na Enyi Gị Ghara Itisa
Devid nwere ndị enyi ọzọ, bụ́ ndị ji obi ha niile na-enyere ya aka mgbe ihe siiri ya ike. Otu n’ime ha bụ Hushaị, onye Baịbụl kpọrọ “enyi Devid.” (2 Sam. 16:16; 1 Ihe 27:33) Ọ ga-abụ na ọ na-eje ozi n’obí eze, bụrụkwa onye ya na Devid na-anọ mgbe niile, onye na-agakwara eze ozi mgbe ụfọdụ.
Mgbe Absalọm bụ́ nwa Devid chụturu nna ya n’ocheeze, ọtụtụ ndị Izrel dụnyeere Absalọm úkwù. Ma, Hushaị emeghị otú ahụ. O so Devid mgbe ọ gbapụrụ. Obi gbawara Devid n’ihi na nwa ya na ụfọdụ ndị ọ tụkwasịrị obi gbara ya mgba okpuru. Ma, Hushaị ahapụghị Devid. Ọ dị njikere ịkụghasị nkata ọjọọ ahụ a kpara n’agbanyeghị na ime otú ahụ nwere ike ịta isi ya. Ihe mere o ji mee ya abụghị naanị maka na ọ na-ejere eze ozi. Ihe o mere gosiri na ọ bụ ezigbo enyi Devid.—2 Sam. 15:13-17, 32-37; 16:15–17:16.
MACH 20-26
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 IHE E MERE 1-4
“Eze Solomọn Kpebiri Ime Ihe Na-adịghị Mma”
it-1 174 ¶5
Ndị Agha
Mgbe Solomọn malitere ịchị, ọtụtụ ihe gbanwere n’ihe gbasara ndị agha Izrel. Udo dị n’oge ọ na-achị ma e jiri ya tụnyere oge ndị ọzọ chịrị. N’agbanyeghị ya, o mere ka e nwee ọtụtụ ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya. (Gụọ ebe e dere gbasara ỤGBỌ ỊNYỊNYA.) O si n’Ijipt zụta ma tụbata ọtụtụ ịnyịnya ndị a. A rụrụ obodo dị iche iche n’ebe niile Solomọn na-achị maka ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya ndị ahụ. (1 Eze 4:26; 9:19; 10:26, 29; 2 Ihe 1:14-17) Ma, Jehova agọzighị ihe a Solomọn mere. Ozugbo ọ nwụrụ, e kewaakwa alaeze ya, ndị agha Izrel esighịzi ike otú ha siburu. Aịzaya mechara dee, sị: “Ndị na-agakwuru ndị Ijipt ka ha nyere ha aka ga-ata ahụhụ. Ha na-atụ anya na ịnyịnya ga-enyere ha aka. Obi siri ha ike na ụgbọ ịnyịnya agha dị ọtụtụ ga-enyere ha aka. Obi sikwara ha ike na ịnyịnya agha ga-enyere ha aka maka na ha siri ike. Ma, ha anaghị atụ anya ka Onye Nsọ Izrel nyere ha aka. Ha achọghịkwa Jehova.”—Aịza. 31:1.
it-1 427
Ụgbọ Ịnyịnya
Mba Izrel enweghị ọtụtụ ndị agha na-agba ụgbọ ịnyịnya tupu oge Solomọn. Ihe kacha kpata ya bụ aka ná ntị Chineke dọrọ ndị ga-abụ ndị eze ka ha ghara inweta ọtụtụ ịnyịnya, ka à ga-asị na ọ bụ ịnyịnya ndị ahụ ga na-echebe ha. Iwu a Chineke nyere mere ka ha ghara inwe ọtụtụ ụgbọ ịnyịnya ebe ọ bụ ịnyịnya na-adọkpụ ụgbọ ndị ahụ. (Diut. 17:16) Mgbe Samuel na-adọ ndị Chineke aka ná ntị banyere ahụhụ ndị eze bụ́ mmadụ ga-akpatara ha, ọ gwara ha, sị: “Ọ ga-akpọrọ ụmụ unu ndị nwoke, ha abụrụ ndị agha ga na-agba ụgbọ ịnyịnya ya.” (1 Sam. 8:11) Mgbe Absalọm na Adọnaịja na-agbalị ịnara nna ha ọchịchị, onye nke ọ bụla n’ime ha nwetaara onwe ya otu ụgbọ ịnyịnya, họpụtakwa ụmụ nwoke iri ise ga na-agba ọsọ n’ihu ya. (2 Sam. 15:1; 1 Eze 1:5) Mgbe Devid meriri eze Zoba, ọ hapụrụ otu narị (100) ịnyịnya ndị na-adọkpụ ụgbọala ndụ.—2 Sam. 8:3, 4; 10:18.
Mgbe Eze Solomọn chọrọ ime ka ndị agha Izrel sikwuo ike, o mere ka ụgbọ ịnyịnya mba Izrel ruo otu puku na narị anọ (1,400). (1 Eze 10:26, 29; 2 Ihe 1:14, 17) E wezụga Jeruselem, e nwere obodo ndị ọzọ a kpọrọ obodo ndị a na-adọsa ụgbọ ịnyịnya. N’obodo ndị ahụ, e nwere ebe dị iche iche a na-elekọta ụgbọ ịnyịnya ndị ahụ e ji alụ agha.—1 Eze 9:19, 22; 2 Ihe 8:6, 9; 9:25.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ihe E Mere nke Abụọ
1:11, 12. Arịrịọ Solomọn gosiri Jehova na amamihe na ihe ọmụma na-agụ eze ahụ agụụ. Ekpere anyị na-ekpegara Chineke na-egosi ihe na-agụ anyị agụụ. Ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya anyị inyocha ihe anyị na-ekpe n’ekpere.
MACH 27–EPREL 2
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 IHE E MERE 5-7
“Obi M Ga-adịkwa na Ya Mgbe Niile”
Unu Ahapụla Ịdị Na-ezukọ Ọnụ
E mesịa, mgbe Devid bụ eze na Jeruselem, o gosipụtara ọchịchọ siri ike o nwere iwu ụlọ na-adịgide adịgide iji nye Jehova otuto. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na Devid bụ onye agha, Jehova gwara ya, sị: “Ị gaghị ewuru aha m ụlọ.” Kama nke ahụ, Ọ họọrọ nwa Devid bụ́ Solomọn iwu ụlọ nsọ ahụ. (1 Ihe E Mere 22:6-10) Solomọn raara ụlọ nsọ ahụ nye na 1026 T.O.A., mgbe e jisịrị afọ asaa na ọkara wuchaa ya. Jehova nakweere ụlọ a, na-asị: “Edowo m ụlọ a, nke i wuworo, nsọ, itinye aha m n’ebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi; anya m abụọ na obi m ga-adịkwa n’ebe ahụ ụbọchị nile.” (1 Ndị Eze 9:3) Ọ bụrụhaala na ụmụ Izrel anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi, Jehova ga-egosi ihu ọma ya n’ebe ụlọ ahụ dị. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ha esi n’ime ihe dị mma wezụga onwe ha, Jehova ga-eme ka ihu ọma ya ghara ịdị n’ebe ahụ, ‘ụlọ ahụ n’onwe ya ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe.’—1 Ndị Eze 9:4-9, NW; 2 Ihe E Mere 7:16, 19, 20.
it-2 1077-1078
Ụlọ Nsọ
Akụkọ Gbasara Ya. Ụlọ nsọ a dị ruo afọ 607 T.O.N.K., mgbe ndị agha Babịlọn bibiri ya n’oge Eze Nebukadneza na-achị Babịlọn. (2 Eze 25:9; 2 Ihe 36:19; Jere. 52:13) Ebe ọ bụ na ndị Izrel hapụrụ Chineke fewe arụsị, o kwere ka mba dị iche iche lụsowa Juda na Jeruselem agha. N’oge ụfọdụ, mba ndị ahụ bukọọrọ akụ̀ ndị dị n’ụlọ nsọ. E nwekwara oge ndị e leghaara ụlọ nsọ ahụ anya. Eze Ijipt aha ya bụ Shaịshak bukọọrọ akụ̀ ndị dị n’ụlọ nsọ ahụ (993 T.O.N.K.) n’oge Rehoboam nwa Solomọn na-achị, naanị ihe dị ka afọ iri atọ na atọ e nyefechara Jehova ụlọ nsọ ahụ. (1 Eze 14:25, 26; 2 Ihe 12:9) Eze Esa (977-937 T.O.N.K.) ji ụlọ Jehova kpọrọ ihe. Ma, o zuzuru nzuzu mgbe ọ na-achọ ichebe Jeruselem. O si n’akụ̀ dị n’ụlọ nsọ bugara Ben-hedad nke Mbụ, bụ́ eze Siria, ọlaọcha na ọlaedo, ka o mebie ọgbụgba ndụ ya na Beasha eze Izrel gbara.—1 Eze 15:18, 19; 2 Ihe 15:17, 18; 16:2, 3.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ọ “Maara Obi Ụmụ Mmadụ”
Ekpere Sọlọmọn nwere ike ịkasi anyị obi. O nwere ike ụmụ mmadụ ibe anyị agaghị aghọtacha otú obi dị anyị—‘ihe na-egbu anyị mgbu’ na ‘ihe na-afụ anyị ụfụ.’ (Ilu 14:10) Ma, Jehova maara obi anyị, ọ na-echekwa nnọọ banyere anyị. Ịgwa ya otú obi dị anyị n’ekpere nwere ike ime ka ibu anyị kara anyị mfe. Baịbụl kwuru, sị: “Na-atụkwasịnụ ya nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.”—1 Pita 5:7.
EPREL 10-16
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 IHE E MERE 8-9
“O Ji Amamihe Kpọrọ Ihe”
Mgbe Mmesapụ Aka Bara Uba
N’ezie, eze nwanyị Sheba chụkwara ọtụtụ ihe n’àjà n’ihe banyere oge na mgbalị iji leta Solomọn. O yiri ka Sheba ọ dị n’ógbè Republic of Yemen nke oge a; ya mere eze nwanyị ahụ na usuu kamel ya mere njem karịrị nnọọ kilomita 1,600 gaa Jerusalem. Dị ka Jisọs si kwuo, “o siri n’ebe ụwa sọtụrụ bịa.” N’ihi gịnị ka eze nwanyị Sheba ji mee mgbalị siri ike otú ahụ? Isi ihe mere o ji bịa bụ “ịnụ amamihe Solomọn.”—Luk 11:31.
Nleta E Nyeghachiri Ụgwọ Ọrụ n’Ụba
Otú ọ bụla o si dị, eze nwanyị ahụ rutere Jerusalem “ya na usuu dị ọtụtụ nke ukwuu, kamel na-ebu ụda dị iche iche, na ọlaedo bara ụba nke ukwuu, na nkume dị oké ọnụ ahịa.” (1 Ndị Eze 10:2a) Ụfọdụ na-asị na “usuu dị ọtụtụ nke ukwuu” ahụ gụnyere ndị ndú ji ngwá ọgụ. Nke a ga-ekwe nghọta, ebe ọ bụ na eze nwanyị ahụ bụ onye ukwu dị ike nke bukwa ihe ndị bara uru ruru ọtụtụ iri nde dollar, na-eme njem.
Otú ọ dị, rịba ama na eze nwanyị ahụ nụrụ banyere iwu ewu Solomọn “banyere aha Jehova.” Ya mere nke a abụghị njem achụmnta ego nkịtị. Dị ka ihe àmà na-egosi, ihe bụ́ isi mere eze nwanyị ahụ ji bịa bụ iji nụrụ amamihe Solomọn—ma eleghị anya ọbụna ịmụta ihe banyere Chineke ya, bụ́ Jehova. Ebe o yiri ka o sitere n’usoro ọmụmụ Shem ma ọ bụ Ham, bụ́ ndị fere Jehova, ọ pụrụ ịchọsiwo ike ịmata banyere okpukpe nke ndị nna nna ya ha.
Nleta E Nyeghachiri Ụgwọ Ọrụ n’Ụba
Amamihe Solomọn na ọganihu nke alaeze ya masịrị nnọọ eze nwanyị Sheba nke na “mmụọ adịghịkwa n’ime ya ọzọ.” (1 Ndị Eze 10:4, 5) Ụfọdụ na-ewere amaokwu a ịpụta na eze nwanyị ahụ “ekughịzi ume.” Ọbụna otu ọkà mmụta nyere echiche na ọ tụbọrọ! Otú ọ bụla o si dị, ihe eze nwanyị ahụ hụrụ ma nụ juru ya anya. Ọ sịrị na ndị ohu Solomọn bụ ndị ihe na-agara nke ọma n’ihi inwe ike ịnụ amamihe nke eze a, ọ gọzikwara Jehova maka idokwasị Solomọn n’ocheeze. O nyeziri eze ahụ onyinye ndị dị oké ọnụ, ọlaedo nanị ruru ihe dị ka $40,000,000 n’ọnụ ego nke oge a. Solomọn nyekwara eze nwanyị ahụ onyinye, na-enye ya “ihe nile na-atọ ya ụtọ, ihe ọ bụla ọ rịọrọ.”—1 Ndị Eze 10:6-13.
it-2 990-991
Solomọn
Mgbe Eze Nwaanyị Shiba hụchara otú ụlọ nsọ Jehova na ụlọ Solomọn si maa ezigbo mma, hụkwa otú ndị na-ebutere ya nri si ebute ya, otú ndị na-ebutere ya mmanya si ebute ya na otú ha si eji ejiji, nakwa àjà a na-esu ọkụ ọ na-achụ mgbe niile n’ụlọ Jehova, “o riri ya ọnụ.” Ọ gwaziri eze, sị: “A gwarughịdị m ọkara ihe m hụrụ. Otú ị maruru ihe na otú i nweruru akụ̀ karịrị ihe m nụrụ.” O kwuziri na ndị na-ejere eze a ozi ga na-enwe obi ụtọ. Ihe a niile ọ hụrụ mere ka o too Jehova, gọziekwa Jehova Chineke onye hụrụ ndị Izrel n’anya wee họpụtara ha Solomọn ka ọ bụrụ eze ga na-ekpe ha ikpe ziri ezi, na-emekwa ezi omume.—1 Eze 10:4-9; 2 Ihe 9:3-8.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 1097
Ocheeze
Ọ bụ naanị ocheeze Solomọn rụrụ bụ ocheeze eze Izrel a kọwara otú ọ dị nke ọma na Baịbụl. (1 Eze 10:18-20; 2 Ihe 9:17-19) Ọ ga-abụ na ocheeze a dị ‘n’Ụlọ Ocheeze,’ ya bụ, otu n’ime ụlọ ndị a rụrụ n’Ugwu Moraya, n’obodo Jeruselem. (1 Eze 7:7) E ji ọdụ́ rụọ ‘nnukwu ocheeze ahụ ma were ọlaedo a nụchara anụcha machie ya. E nwere ihe dị gburugburu kpuchiri azụ ocheeze ahụ, a rụnyekwara ebe a na-atụkwasị aka n’akụkụ ya abụọ.’ Ọ bụ eziokwu na ọ ga-abụ na ọdụ́ bụ ihe bụ́ isi e ji rụọ ocheeze a, ma o yiri ka otú e si rụọ ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị n’ụlọ nsọ Jehova ọ̀ na-egosi na ọ bụ osisi ka e ji rụọ ocheeze a, e jirizie ọlaedo a nụchara anụcha na ọdụ́ machie ya. Mmadụ lewe ocheeze ahụ anya, ọ ga-adị ya ka ọ̀ bụ naanị ọdụ́ na ọlaedo ka e ji mee ya. Mgbe Baịbụl kwuchara na e nwere steepụ e si arịgo n’ocheeze ahụ, o kwuziri, sị: “A kpụnyekwara otu ọdụm n’akụkụ ebe nke ọ bụla a na-atụkwasị aka. A kpụnyere ọdụm iri na abụọ n’elu ebe isii ahụ a na-azọkwasị ụkwụ ma a rịgowe steepụ ahụ. Ọdụm abụọ dị na nke ọ bụla n’ime ha, otu n’aka nri, otu n’aka ekpe.” (2 Ihe 9:17-19) Ọdụm nọchiri anya ikike ọchịchị. Ihe a ọ nọchiri anya ya kwesịrị ekwesị. (Jen. 49:9, 10; Mkpu. 5:5) O nwere ike ịbụ na ihe mere ọdụm ndị ahụ ji dịrị iri na abụọ bụ maka na ebo ndị e nwere n’Izrel dị iri na abụọ. Ọ ga-abụ na ọ na-egosi na ebo niile a na-akwado ma na-erubere onye nọ n’ocheeze a isi. E nwekwara ihe mgbakwasị ụkwụ e ji ọlaedo rụọ e jikọtara ya na ocheeze ahụ. Otú e si kọwaa ocheeze a e ji ọdụ́ na ọlaedo rụọ, nke a rụrụ ka ọ dị ezigbo elu ma nwee ọdụm n’ihu ya, gosiri na ọ karịrị ocheeze ọ bụla e nwere n’oge ahụ, ma ndị nke ndị ọkachamara n’ihe ndị mgbe ochie chọpụtarala ma ndị nke a na-ahụ n’ihe ndị a kpụrụ n’oge ochie ma ndị nke a kọwara otú ha dị n’ihe e dere ede. Ihe Baịbụl kwuru gbasara ocheeze a bụ eziokwu. Ọ sịrị: “O nweghị alaeze ọzọ rụrụ ụdị ihe a.”—2 Ihe 9:19.
EPREL 17-23
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 IHE E MERE 10-12
“Kwe Ka Ezigbo Ndụmọdụ Baara Gị Uru”
Ọ Gaara Enweta Ngọzi Chineke
O nwere ike ịbụ na Rehoboam amaghị ihe ọ ga-eme eme. Ọ bụrụ na o meere ndị Izrel ihe ndị ha kwuru, yanwa, ndị ezinụlọ ya, na ndị nọ n’obí ya agaghịzi na-ekpori ndụ otú ha sibu ekpori. Ọ jụkwanụ imere ndị Izrel ihe ha kwuru, ha agaghịzi na-erubere ya isi. Gịnịzi ka ọ ga-eme? Ihe mbụ Rehoboam mere bụ ịga kọọrọ ya ndị okenye, bụ́ ndị ndụmọdụ Sọlọmọn. Ma, o mechakwara gaa kọọrọ ya ndị ọgbọ ya ka ha gwa ya ihe ọ ga-eme. N’ihi ihe ndị ọgbọ ya gwara ya, o kpebiri na ya ga-emekpọ ndị Izrel ọnụ. Ọ gwara ha, sị: “M ga-eme ka yok unu dịkwuo arọ, mụ onwe m ga-atụkwasị ihe na ya. Nna m pịara unu ụtarị nkịtị, ma mụ onwe m ga-apịa unu ụtarị akpụkpọ anụ.”—2 Ihe 10:6-14.
Otú Ị Pụrụ Isi Mee Mkpebi Ndị Dị Mma
Jehova na-enyekwa ndị tozuru okè n’ọgbakọ bụ́ ndị anyị pụrụ iso kwurịta mkpebi anyị. (Ndị Efesọs 4:11, 12) Otú ọ dị, n’ịgakwuru ndị ọzọ, anyị ekwesịghị ịgbaso ụzọ nke ndị na-eme ha gakwuru onye a ha agakwuru onye ọzọ ruo mgbe ha mesịrị chọta onye ga-ekwu ihe ha chọrọ ịnụ. Mgbe ahụ, ha agbasoo ndụmọdụ ya. Anyị kwesịkwara icheta mgbe nile ihe atụ ịdọ aka ná ntị nke Rehoboam. Mgbe o nwere mkpebi siri ike ime, o nwetara ndụmọdụ magburu onwe ya site n’aka ndị okenye bụ́ ndị soworo nna ya jee ozi. Otú ọ dị, kama ịgbaso ndụmọdụ ha, ọ gakwuuru ụmụ okorobịa ya na ha tokọrọ. N’ịgbaso ndụmọdụ ha, o mere mkpebi dị nnọọ njọ, n’ihi ya kwa, akụkụ ka ukwuu nke alaeze ya funahụrụ ya.—1 Ndị Eze 12:1-17.
Mgbe ị na-achọ ndụmọdụ, chọọ ya n’aka ndị nwere ahụmahụ ná ndụ, nwee ezi ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ, ma nwee nkwanye ùgwù miri emi maka ụkpụrụ ndị ziri ezi. (Ilu 1:5; 11:14; 13:20) Mgbe o kwere mee, wepụta oge iji tụgharịa uche n’ụkpụrụ ndị o metụtara nakwa n’ihe ọmụma nile i nwetaworo. Ka ị na-ahụkwu ihe n’ụzọ kwekọrọ n’Okwu Jehova, o yiri ka mkpebi ziri ezi ọ ga-apụtakwu ìhè.—Ndị Filipaị 4:6, 7.
it-2 768 ¶1
Rehoboam
Otú Rehoboam, bụ́ nwoke dị mpako, si jiri aka ike na-achị ndị Izrel mere ka ọtụtụ n’ime ha ghara inwe mmasị n’ọchịchị ya. Ọ bụ naanị ebo Juda na Benjamin nọgidere na-akwado ezinụlọ Devid. Ndị nchụàjà na ndị Livaị nọ n’alaeze abụọ ahụ nakwa mmadụ ole na ole si n’ebo iri nke Izrel nọkwa na-akwadọ ezinụlọ Devid.—1 Eze 12:16, 17; 2 Ihe 10:16, 17; 11:13, 14, 16.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 966-967
Mmụọ Ọjọọ Yiri Ewu
Ihe Joshụa kwuru na Joshụa 24:14 gosiri na n’oge ndị Izrel bi n’Ijipt, ha si n’aka ndị Ijipt mụtatụ ikpere arụsị. Ihe Ezikiel kwuru gosikwara na ha ka nọ na-ekpere arụsị ọtụtụ afọ ha sirila n’Ijipt pụta. (Ezik. 23:8, 21) N’ihi ya, ụfọdụ ndị ọkachamara chere na iwu Chineke nyere ndị Izrel n’ala ịkpa ka ha ghara “ịna-achụrụ ndị mmụọ ọjọọ yiri ewu àjà” (Lev. 17:1-7) nakwa nhọpụta Jeroboam họpụtara ndị nchụàjà “ka ha nọrọ n’ebe ndị dị elu na-efe ndị mmụọ ọjọọ yiri ewu na ụmụ ehi ndị ọ kpụrụ” (2 Ihe 11:15) na-egosi na e nwere otú ndị Izrel si na-efe ewu, bụ́kwanụ ihe na-ewu ewu n’Ijipt, karịchaa, n’Ebe Ugwu Ijipt. Hirọdọtọs (Nke Abụọ, afọ 46) kwuru na ọ bụ n’ụdị ofufe a ndị Ijipt na-efe ka ndị Grik si malite ikwere na chi ndị e ji omume rụrụ arụ mara a na-akpọ Pan nakwa sata. E mechara na-ese chi ndị a na-ahụ maka ọhịa ka chi nwere mpi, nwee ọdụdụ ewu, nweekwa ụkwụ ewu. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ bụ otú ahụ e si ese chi ndị ahụ ndị ọgọ mmụọ na-efe ka ha yie ọkara anụmanụ ka ndị mmadụ si mụta ịna-ese Setan ka chi nwere ọdụdụ, mpi, nakwa nke ọbụ ụkwụ ya kebiri abụọ ka nke anụmanụ. Ọ bụ otú a ka ọtụtụ ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst n’Oge Ụwa Nọ n’Ìsì si ese Setan.
Ma, e kwughị ihe ihe ndị ahụ a kpọrọ “ndị bụ́ ajị ajị” (seʽi·rimʹ) bụ. Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị chere na ha bụ ewu nkịtị ma ọ bụ arụsị ndị ọdịdị ha yiri ewu, ma o yighị ka ọ̀ bụ eziokwu. E nweghịkwanụ amaokwu Baịbụl ndị ọzọ kwadoro ihe a ha chere. O nwere ike ịbụ na naanị ihe okwu ahụ na-egosi bụ na n’obi ndị na-efe arụsị ndị ahụ, arụsị ndị ahụ yiri ewu ma ọ bụ na ahụ́ ha bụ ajị ajị. O nwekwara ike ịbụ na “ewu” ahụ a kpọrọ ha bụ naanị otú e si egosi asị a kpọrọ ihe niile e ji efe arụsị. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dịkwa okwu Hibru a sụgharịrị arụsị n’ọtụtụ amaokwu. N’asụsụ Hibru, okwu ahụ pụtara “ikpo nsị.” Ma, ọ pụtaghị na e ji nsị nkịtị mee arụsị ndị ahụ.—Lev. 26:30; Diut. 29:17.
EPREL 24-30
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 IHE E MERE 13-16
“Olee Mgbe Anyị Kwesịrị Ịtụkwasị Jehova Obi?”
Ụmụ Okorobịa, Olee Otú Unu Ga-esi Mee Ka Ndị Ọzọ Tụkwasị Unu Obi?
12 Mgbe Eze Esa ka na-eto eto, ọ dị umeala n’obi, nweekwa obi ike. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ nọchiri nna ya, bụ́ Eze Abaịja, ọ malitere iwepụsị arụsị ndị dị n’obodo ha. “Ọ gwakwara Juda ka ha chọọ Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha nakwa ka ha debe iwu ya na ntụziaka ya.” (2 Ihe 14:1-7) Mgbe Zira, bụ́ onye Itiopia, chị ndị agha ya dị otu nde wakpoo Juda, Esa gakwuuru Jehova ka o nyere ya aka. Ọ sịrị: “Jehova, a bịa n’inye aka, ma ndị mmadụ hà dị ọtụtụ ma ọ bụ na ha adịghị ike, o nweghị ihe o mere n’ebe ị nọ. Jehova bụ́ Chineke anyị, biko, nyere anyị aka n’ihi na anyị dabeere n’ebe ị nọ.” Ihe ndị a magburu onwe ya Esa kwuru gosiri na obi sịrị ya ike na Jehova ga-anapụta ya na ndị ya. Esa tụkwasịrị Nna ya nke eluigwe obi. ‘Jehova merikwara ndị Itiopia.’—2 Ihe 14:8-12.
Ụmụ Okorobịa, Olee Otú Unu Ga-esi Mee Ka Ndị Ọzọ Tụkwasị Unu Obi?
13 Ị manụ na ịlụso ndị agha dị otu nde ọgụ abụghị obere ihe. Ma, Esa meriri ha n’ihi na ọ tụkwasịrị Jehova obi. Ma, ọ dị mwute na mgbe nsogbu ọzọ na-erughị nke mbụ bịaara ya, ọ tụkwasịghị Jehova obi. Mgbe eze ọjọọ na-achị Izrel aha ya bụ Beasha yiri ya egwu, ọ gbakwuuru eze Siria ka o nyere ya aka. Ihe ahụ o mere kpataara ya ezigbo nsogbu. Jehova si n’ọnụ onye amụma aha ya bụ Hanenaị gwa ya, sị: “Ebe ọ bụ na ị dabeere n’ebe eze Siria nọ, ị dabereghị n’ebe Jehova bụ́ Chineke gị nọ, n’ihi ya, ndị agha eze Siria agbapụwo n’aka gị.” Malite mgbe ahụ gawa, Esa nọ n’agha. (2 Ihe 16:7, 9; 1 Eze 15:32) Gịnị ka akụkọ a na-akụziri anyị?
Ụmụ Okorobịa, Olee Otú Unu Ga-esi Mee Ka Ndị Ọzọ Tụkwasị Unu Obi?
14 Dịrị umeala n’obi, nọgidekwa na-atụkwasị Jehova obi. Mgbe i mere baptizim, i gosiri na i nwere ezigbo okwukwe, tụkwasịkwa Jehova obi. Obi dịkwa Jehova ezigbo ụtọ ịnabata gị n’ezinụlọ ya. Ihe i kwesịrị ime ugbu a bụ ịnọgide na-atụkwasị Jehova obi. O nwere ike ịdịrị gị mfe ịtụkwasị Jehova obi ma ị na-eme mkpebi ndị dị ezigbo mkpa ná ndụ gị. Ma, ọ bụrụkwanụ na i mewe mkpebi ndị ọzọ? Ọ dịkwa ezigbo mkpa ka ị tụkwasị Jehova obi ma ị na-ekpebi ihe ị ga-eme gbasara ụdị ihe ị ga-eji atụrụ ndụ, ụdị ọrụ ị ga-arụ, nakwa ụdị ihe ị ga-eme ná ndụ gị. Atụkwasịla onwe gị obi. Kama ime otú ahụ, chọta amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere gị aka ikpebi ihe ị ga-eme. Meekwa ihe ebe ahụ kwuru. (Ilu 3:5, 6) I mee otú ahụ, ị ga-eme Jehova obi ụtọ, ndị nọ n’ọgbakọ unu ana-akwanyekwara gị ùgwù.—Gụọ 1 Timoti 4:12.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Jiri Obi Gị Niile Na-efe Jehova
7 Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike inyocha obi ya ka ọ mata ma ò ji obi ya niile na-efe Chineke. Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ kpebisiri ike ime ihe dị Jehova mma, ịgbachitere ofufe ya, na ime ka ọgbakọ dị ọcha?’ Chegodị ụdị obi ike Esa nwere, nke mere o ji chụtuo Meaka, bụ́ “nnukwu nwaanyị” na Juda. O nwere ike ị gaghị ama onye metụrụla ụdị ihe ahụ Meaka mere, ma o nwere mgbe i kwesịrị ịkata obi ka Esa. Dị ka ihe atụ, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na onye ezinụlọ gị ma ọ bụ ezigbo enyi gị emehie ma jụ ichegharị, a chụọ ya n’ọgbakọ? Ị̀ ga-akwụsị gị na ya ịna-akpa? Gịnị ka obi gị ga-agwa gị mee?