-
“Onye Na-anụ Ekpere”Ụlọ Nche—2010 | Ọktoba 1
-
-
JEHOVA CHINEKE ọ̀ na-aza ekpere nke ndị ji obi ha niile na-efe ya? Ihe Baịbụl kọrọ banyere otu nwoke anyị na-amaghị ọtụtụ ihe banyere ya, nke aha ya bụ Jebez, na-egosi na Jehova bụ n’ezie “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) Akụkọ a dị mkpirikpi dị n’ebe nwere ike ịtụ ọtụtụ ndị n’anya—n’ihe ndekọ usoro ọmụmụ nke malitere akwụkwọ Ihe E Mere nke Mbụ. Ka anyị tụlee 1 Ihe E Mere 4:9, 10.
-
-
“Onye Na-anụ Ekpere”Ụlọ Nche—2010 | Ọktoba 1
-
-
Jebez ejighị ekpere egwuri egwu. Ọ malitere ekpere ya site n’ịrịọ Chineke ka ọ gọzie ya. Ọ rịọziri arịrịọ atọ ndị gosiri na o nwere okwukwe siri ike.
Nke mbụ, Jebez rịọrọ Chineke, sị: “Mee ka ókèala m sakwuo mbara.” (Amaokwu 10) Nwoke a a na-asọpụrụ abụghị onye anyaukwu nke na-achọ ịnara ndị mmadụ ala ha. O nwere ike ịbụ na ihe ọ rịọsiri ike bụ mmadụ, ọ bụghị ala. Ọ ga-abụ na ọ na-arịọ ka ókèala ya sakwuo mbara n’udo ka o nwee ike ịba ndị ọzọ na-efe ezi Chineke ofufe.b
Nke abụọ, Jebez rịọrọ ka “aka” Chineke dịnyere ya. Aka ihe atụ Chineke bụ ike o ji na-arụ ọrụ, bụ́ nke o ji enyere ndị na-efe ya aka. (1 Ihe E Mere 29:12) Onye Jebez tụrụ anya isi n’aka ya nweta ihe niile obi ya na-arịọ bụ Chineke nke aka ya na-adịghị mkpụmkpụ imere ndị nwere okwukwe na ya ihe ha rịọrọ.—Aịzaya 59:1.
Nke atọ, Jebez kpere ekpere, sị: “Gị echebekwa m n’ọdachi, ka ọ ghara imerụ m ahụ́.” O nwere ike ịbụ na okwu bụ́ “ka ọ ghara imerụ m ahụ́” na-egosi na Jebez kpere ekpere, ọ bụghị ka ọ gbanahụ ọdachi, kama ka e chebe ya ka ihe ọjọọ ghara ịkpatara ya obi mgbawa ma ọ bụ merie ya.
Ekpere Jebez gosiri na ọ na-echegbu onwe ya banyere ezi ofufe nakwa na o nwere okwukwe n’ebe Onye na-anụ ekpere nọ, tụkwasịkwa ya obi. Olee ihe Jehova mere banyere arịrịọ ya? Akụkọ a dị nkenke ji okwu ndị a mechie: “Chineke wee meere ya ihe ọ rịọrọ.”
Onye ahụ na-anụ ekpere agbanwebeghị. Ekpere nke ndị na-efe ya na-atọ ya ụtọ. Ndị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ ma tụkwasị ya obi nwere ike inwe obi ike a: “Ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.”—1 Jọn 5:14.
-
-
“Onye Na-anụ Ekpere”Ụlọ Nche—2010 | Ọktoba 1
-
-
b Targum, bụ́ Akwụkwọ Nsọ ndị Juu a kọwara akọwa, sụgharịrị okwu Jebez otú a: “Jiri ụmụ gọzie m, jirikwa ndị na-eso ụzọ mee ka ókèala m saa mbara.”
-