E Mezuo Ihe E Kpere n’Ikpe na Ndagwurugwu Mkpebi Ikpe
“Ka mba nile . . . rịgota na ndagwurugwu Jehoshafat: n’ihi na n’ebe ahụ ka M ga-anọdụ ikpe mba nile . . . ikpe.”—JOEL 3:12.
1. N’ihi gịnị ka Joel ji hụ ọtụtụ ìgwè mmadụ gbakọrọ n’ime “ndagwurugwu mkpebi ikpe”?
“ỌTỤTỤ ìgwè mmadụ, ọtụtụ ìgwè mmadụ n’ime ndagwurugwu mkpebi ikpe!” Anyị na-agụ okwu ndị ahụ na-akpali akpali na Joel 3:14. N’ihi gịnị ka ọtụtụ ìgwè mmadụ a ji gbakọọ? Joel na-aza, sị: “Ụbọchị Jehova dị nso.” Ọ bụ oké ụbọchị nke iwepụ Jehova n’ụta—ụbọchị maka imezu ihe e kpere n’ikpe n’isi ìgwè mmadụ jụworo Alaeze Chineke e guzobeworo n’okpuru Kraịst Jisọs. N’ikpeazụ, “ndị mmụọ ozi anọ” nke Mkpughe isi nke 7 ga-ahapụ “ifufe anọ nke ụwa,” na-akpata “mkpagbu ukwu . . . nke ihe dị ka ya aka-adịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.”—Mkpughe 7:1; Matiu 24:21.
2. (a) N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ịkpọ ebe a ga-anọ mezuo ihe Jehova kpere n’ikpe “ndagwurugwu Jehoshafat”? (b) Olee otú Jehoshafat si meghachi omume otú kwesịrị ekwesị mgbe a na-awakwasị ya?
2 Na Joel 3:12, a na-akpọ ebe mmezu ihe e kpere n’ikpe a “ndagwurugwu Jehoshafat.” N’ụzọ kwesịrị ekwesị, n’oge oké ihe isi ike n’akụkọ ihe mere eme nke Juda, Jehova mezuru ihe e kpere n’ikpe n’ihi ọdịmma nke ezi Eze Jehoshafat, onye aha ya pụtara “Jehova Bụ Onyeikpe.” Ntụle nke ihe weere ọnọdụ n’oge ahụ ga-enyere anyị aka ịghọta nke ọma karị ihe na-achọ iwere ọnọdụ n’oge anyị. A na-achọta ihe ndekọ ahụ na 2 Ihe E Mere isi nke 20. N’amaokwu 1 nke isiakwụkwọ ahụ, anyị na-agụ na “ụmụ Moab, na ụmụ Amọn, ha na ụfọdụ site ná ndị ọzọ, bịara imegide Jehoshafat n’agha.” Olee otú Jehoshafat si meghachi omume? O mere ihe ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi na-eme mgbe nile n’oge ọgba aghara. O chigharịkwuuru Jehova maka nduzi, na-ekpe ekpere site n’obi, sị: “Chineke anyị, Ị́ gaghị ekpe ha ikpe? n’ihi na ike adịghị n’ime anyị n’ihu ìgwè mmadụ a bara ụba nke na-abịa imegide anyị; anyị onwe anyị amaghịkwa ihe anyị ga-eme: kama ọ bụ Gị ka anya anyị na-adịkwasị.”—2 Ihe E Mere 20:12.
Jehova Azaa Ekpere
3. Olee ntụziaka Jehova nyere Juda mgbe ha chere mwakpo mba ndị gbara ha gburugburu ihu?
3 Ka “Juda nile na-eguzokwa n’ihu Jehova, ha na ụmụntakịrị ha, na ndị inyom ha, na ụmụ ha,” Jehova nyere azịza ya. (2 Ihe E Mere 20:13) Dị nnọọ ka ọ na-eji “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” eme ihe taa, otú ahụ ka Onye ukwu ahụ na-anụ ekpere nyere onye amụma bụ́ onye Livaị bụ́ Jahaziel ike inye ndị gbakọrọnụ azịza Ya. (Matiu 24:45) Anyị na-agụ, sị: “Otú a ka Jehova sịrị unu, Unu onwe unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ n’ihu ìgwè mmadụ a bara ụba; n’ihi na ọ bụghị unu nwe agha nke a, kama ọ bụ Chineke nwe. . . . Ọ bụghị unu ga-enwe ibu agha n’agha nke a: guzonụ onwe unu, guzo, hụ nzọpụta Jehova n’etiti unu. . . . Unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ: echi pụkwurunụ ha; Jehova nọnyekwaara unu.”—2 Ihe E Mere 20:15-17.
4. N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si chọọ ka ndị ya nọrọ n’ọrụ, ọ bụghị ịfanye aka n’ụkwụ, mgbe ha na-eche ịma aka ndị iro ihu?
4 Jehova chọrọ n’aka Eze Jehoshafat na ndị ya ihe karịrị nanị ịfanye aka n’ụkwụ na-echere mgbapụta ọrụ ebube. Ha gaje ime ihe iji nagide ịma aka nke ndị iro ahụ. Eze ahụ na ‘ndị Juda nile, ha na ụmụntakịrị ha, na ndị inyom ha, na ụmụ ha,’ gosipụtara okwukwe siri ike ka ha ji nrubeisi bilie n’isi ụtụtụ ma zọrọ ije gawa izute usuu ndị mwakpo ahụ. N’ụzọ, eze ahụ nọgidere na-enye ntụziaka na agbamume ọchịchị Chineke, na-agba ha ume, sị: “Kwerenụ na Jehova, bụ́ Chineke unu, unu ga-ekwesịkwa ntụkwasị obi; kwerenụ ná ndị amụma Ya, ihe ga-agakwara unu nke ọma.” (2 Ihe E Mere 20:20) Okwukwe n’ebe Jehova nọ! Okwukwe n’ebe ndị amụma ya nọ! N’ebe ahụ ka isi ihe na-eweta ihe ịga nke ọma dị. N’otu aka ahụ taa, ka anyị nọgidere na-ejere Jehova ozi, ka anyị ghara inwe obi abụọ mgbe ọ bụla na ọ ga-eme ka okwukwe anyị merie!
5. Olee otú Ndịàmà Jehova taa si eji ọrụ n’aka ka ha na-eto Jehova?
5 Dị ka ndị Juda nke ụbọchị Jehoshafat, anyị aghaghị ‘ikele Jehova; n’ihi na ruo mgbe ebighị ebi ka ebere Ya dị.’ Olee ụzọ anyị si enye ekele a? Site ná nkwusa Alaeze anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-eme! Otú ahụ ndị Juda ahụ “malitere iti mkpu na ito otuto,” otú ahụ ka anyị si na-atụkwasị ọrụ n’okwukwe anyị. (2 Ihe E Mere 20:21, 22) Ee, ka anyị gosipụta otu ụdị ọmarịcha okwukwe ahụ ka Jehova na-akwadebe ime ihe megide ndị iro ya! Ọ bụ ezie na ụzọ ahụ pụrụ iyi ka ọ dị ogologo, ka anyị kpebisie ike ịtachi obi, dị ndụ n’okwukwe, ọbụna dị ka ndị ya na-enwe mmeri na-eme n’ebe ndị jupụtara ná nsogbu n’ụwa taa. N’ala ụfọdụ mkpagbu, ime ihe ike, ụnwụ nri, na ajọ ọnọdụ akụ̀ na ụba na-akpa aka ọjọọ, ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi na-arụpụta ihe ndị dị ịrịba ama, dị ka 1998 Yearbook of Jehovah’s Witnesses na-akọ.
Jehova Azọpụta Ndị Ya
6. Olee otú okwukwe siri ike si enye aka ime ka anyị na-eguzosi ike n’ihe taa?
6 Mba ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke gbara Juda gburugburu nwara irikpu ndị Chineke, ma site n’okwukwe kwesịrị nṅomi ndị Jehova ji ịbụ abụ otuto ya zaghachi. Anyị pụrụ igosipụta otu ụdị okwukwe ahụ taa. Site n’iji ọrụ nke otuto Jehova mejupụta ndụ anyị, anyị na-eme ka ihe agha ime mmụọ anyị sie ike, n’enyeghị ohere ọ bụla maka ụzọ aghụghọ Setan. (Ndị Efesọs 6:11) Okwukwe siri ike ga-abịanyụ ọnwụnwa nke ịbụ ndị ntụrụndụ rere ure, ịhụ ihe onwunwe n’anya, na omume ọ̀ gbasara m e ji mara ụwa na-anwụ anwụ gbara anyị gburugburu, dọpụrụ uche ha. Okwukwe a a na-adịghị emeri emeri ga-eme ka anyị nọgide jiri iguzosi ike n’ihe soro “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-eje ozi ka a nọgidere na-enye anyị nri ime mmụọ na-abịa “n’oge ya.”—Matiu 24:45.
7. Olee otú Ndịàmà Jehova siworo zaghachi ná mwakpo dị iche iche a wakporo ha?
7 Okwukwe anyị dabeere na Bible ga-ewusi anyị ike iguzogide mkpọsa mkpọrọmasị nke ndị na-egosipụta mmụọ nke “ohu ọjọọ” ahụ nke Matiu 24:48-51 na-akpalite. N’imezu amụma a n’ụzọ dị ịrịba ama, ndị dapụrụ n’ezi ofufe ji ọrụ n’aka n’ịkụ okwu ụgha na echiche efu n’ọtụtụ ala taa, ọbụna na-eso ụfọdụ ndị nọ n’ọkwá ọchịchị n’etiti mba dị iche iche na-akpa nkata. N’ebe o kwesịrị ekwesị, Ndịàmà Jehova azaghachiwo, dị ka a kọwara ná Ndị Filipaị 1:7, site ‘n’ịgọpụrụ na ime ka ozi ọma ahụ guzosie ike.’ Dị ka ihe atụ, na September 26, 1996, n’otu okwu ikpe si Gris, ndị ọkàikpe itoolu nke Ụlọikpe Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Europe, dị na Strasbourg, ji otu olu kwusie ike na “Ndịàmà Jehova dabara ná nkọwa nke ‘okpukpe a ma ama,’” ndị ruru eru inwe nnwere onwe iche echiche, akọ na uche, na nkwenkwe, na iru eru ime ka a mara okwukwe ha. Banyere ndị dapụrụ n’ezi ofufe, ikpe Chineke na-asị: “Okwu nke ilu ahụ adakwasịwo ha, Ọ bụ nkịta nke chigharịrị ọzọ n’ihe ọ gbọrọ, bụrụkwa nne ezì nke chigharịrị ọzọ n’ịtụrụ n’apịtị mgbe ọ sachasịrị onwe ya.”—2 Pita 2:22.
8. N’ụbọchị Jehoshafat, olee otú Jehova si mezuo ihe e kpere n’ikpe megide ndị iro nke ndị Ya?
8 Laghachi azụ n’ụbọchị Jehoshafat, Jehova mezuru ihe e kpere n’ikpe megide ndị chọrọ imerụ ndị Ya ahụ. Anyị na-agụ, sị: “Jehova tinyere ndị na-eru mbi imegide ụmụ Amọn na Moab na ugwu Sia, bụ́ ndị na-abakwuru Juda; e wee tigbuo ha. Ụmụ Amọn na Moab wee guzo imegide ndị bi n’ugwu Sia, iwezụga ha ka e bibie ha na ikpochapụ ha: mgbe ha mere ka ndị bi na Sia gwụsịa, ha wee nyere onwe ha aka, nwoke na ibe ya, ibibi onwe ha.” (2 Ihe E Mere 20:22, 23) Ndị Juda kpọrọ ebe ahụ Ndagwurugwu Beraka, Beraka pụtakwara “Ngọzi.” N’oge a kwa, Jehova imezu ihe e kpere n’ikpe n’isi ndị iro ya ga-arụpụta ngọzi ndị dị ukwuu maka ndị nke ya.
9, 10. Olee ndị gosiworo na ha kwesịrị ekwesị inweta ọmụma ikpe Jehova?
9 Anyị pụrụ ịjụ, Olee ndị n’oge ndị a gaje ịnata ọmụma ikpe site n’aka Jehova? Iji nweta azịza nye ajụjụ ahụ, anyị ga-ejeghachi n’amụma Joel. Joel 3:3 na-ekwu banyere ndị iro nke ndị ya bụ́ ndị ‘ga-enye nwa okoro iji gbanwere nwanyị na-akwa iko, nwa mgbọ ka ha rekwara n’ihi mmanya vine.’ Ee, ha na-ele ndị ohu Chineke anya dị ka ndị na-erughị ihe ọ bụla n’ebe ha nọ, ụmụ ha enweghịkwa uru karịa ọnụ ego nke nwanyị na-akwa iko ma ọ bụ ọnụ ahịa nke otu udu mmanya. Ha gaje ịza ajụjụ maka nke ahụ.
10 Ndị na-agba akwụna ime mmụọ kwesịkwara ịma ikpe. (Mkpughe 17:3-6) Ndị kasịkwa kwesị ịta ụta bụ ndị na-enunye ndị ji ike ọchịchị ka ha kpagbuo Ndịàmà Jehova na igbochi ọrụ ha, dị ka ụfọdụ ndị ndú okpukpe na-akpasu ọgba aghara nọworo na-eme n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe n’oge ndị na-adịbeghị anya. Jehova na-ekwupụta mkpebisi ike ya ime ihe megide ndị na-arụ ajọ ihe dị otú ahụ.—Joel 3:4-8.
“Doonụ Agha Nsọ”
11. Olee otú Jehova si ama ndị iro ya aka ịbịa agha?
11 Ọzọ, Jehova na-akpọku ndị ya ịkpọsa otu ịma aka n’etiti mba nile: “Doonụ agha nsọ: kpọteenụ ndị dike; ka ndị agha nile bịaruo nso, rịgota.” (Joel 3:9) Nke a bụ mkpọsa nke obubu agha pụrụ iche—agha ezi omume. Ndịàmà Jehova na-eguzosi ike n’ihe na-adabere n’ihe agha ime mmụọ ka ha na-azaghachi ná mkpọsa ụgha, na-eji eziokwu na-ekwugide okwu ụgha. (2 Ndị Kọrint 10:4; Ndị Efesọs 6:17) N’isi nso, Chineke ga-edo “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile” nsọ. Ọ ga-ekpochapụ n’ụwa ndị nile na-eguzogide ọbụbụeze Chineke. Ndị ya n’elu ụwa agaghị ekere òkè ọ bụla na ya n’ụzọ nkịtị. N’ụzọ nkịtị na n’ụzọ ihe atụ, ha ‘akpụgharịwo mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi.’ (Aịsaịa 2:4) N’ụzọ dị iche, Jehova na-ama mba ndị na-emegide ya aka ime ihe dị iche: “Kpụgharịanụ mma ogè unu ka ha bụrụ mma agha, na mma ịkwa osisi unu ka ha bụrụ ube.” (Joel 3:10) Ọ na-akpọ ha òkù ịchịpụta ihe agha na ngwá ọgụ ọgbara ọhụrụ ha dum n’agha ahụ. Ma ọ gaghị agaziri ha, n’ihi na ọgụ ahụ na mmeri ya dịịrị Jehova!
12, 13. (a) N’agbanyeghị obibi nke Agha Nzuzo ahụ, olee otú ọtụtụ mba siworo gosi na agha ka na-agụ ha? (b) Olee ihe mba dị iche iche na-adịghị njikere maka ya?
12 Ná mmalite afọ ndị 1990, mba nile kpọsara na Agha Nzuzo ahụ ebiwo. N’ihi nke ahụ, è nwetawo ihe mgbaru ọsọ bụ isi nke Mba Ndị Dị n’Otu nke bụ udo na ntụkwasị obi? Ọ dịghị ma ọlị! Gịnị ka ihe ndị na-eme na Burundi, Democratic Republic of Congo, Iraq, Liberia, Rwanda, Somalia, na ebe bụbu Yugoslavia na-agwa anyị? N’okwu nke Jeremaịa 6:14, ha na-asị: “Udo, Udo; mgbe udo na-adịghị.”
13 Ọ bụ ezie na ezigbo ọgụ ebiwo n’ebe ụfọdụ, mba ndị so na UN ka na-amarịta aka n’ịkpụpụta ihe agha ndị bụ ọkpọka. Ụfọdụ nọgidere na-enwe nkwakọba ngwá agha nuklia. Ndị ọzọ na-emepụta ihe agha ọgwụrụ mba nke mmiri ọgwụ ma ọ bụ ndị nke nje. Ka mba ndị ahụ na-agbakọta n’ebe ihe atụ ahụ a kpọrọ Amagedọn, ọ na-ama ha aka, sị: “Ka onye umengwụ sị, Dike ka m bụ. Meenụ ngwa, bịa, unu mba nile ndị bi gburugburu, chịkọtanụ onwe unu.” Mgbe ahụ Joel gbakwụnyere arịrịọ nke ya: “Jehova, mee ka ndị dike Gị rịdaa n’ebe ahụ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.)—Joel 3:10, 11.
Jehova Echebe Ndị nke Ya
14. Olee ndị bụ ndị dike Jehova?
14 Olee ndị bụ ndị dike Jehova? Ihe dị ka ugboro 280 n’ime Bible, a kpọrọ ezi Chineke ahụ “Jehova nke usuu nile nke ndị agha.” (2 Ndị Eze 3:14) Usuu ndị agha a bụ ìgwè ndị mmụọ ozi nke eluigwe ndị dị njikere ime ihe Jehova gwara ha. Mgbe ndị Siria mere mgbalị ịnwụde Elaịsha, Jehova mesịrị meghee anya oje ozi Elaịsha ka o nwee ike ịhụ ihe kpatara na ọ gaghị agara ha nke ọma: “Ugwu ahụ jupụtara n’ịnyịnya na ụgbọala ọkụ gburugburu Elaịsha.” (2 Ndị Eze 6:17) Jisọs sịrị na ya pụrụ ịrịọwo Nna ya maka “legion iri na abụọ n’ime ndị mmụọ ozi.” (Matiu 26:53) N’ịkọwa Jisọs ịgbara gaa n’imezu ihe e kpere n’ikpe n’Amagedọn, Mkpughe na-asị: “Usuu nile nke ndị agha ndị dị n’eluigwe wee soo Ya n’elu ịnyịnya ọcha, na-eyi ezi ákwà ọcha, nke dị ọcha na-enwukwa enwu. Mma agha dị nkọ na-esikwa n’ọnụ Ya pụta, ka O wee were ya tigbuo mba nile: Ya onwe ya ga-ewerekwa mkpanaka nke ígwè zụọ ha dị ka atụrụ: Ya onwe ya na-azọkwa ebe nzọcha mkpụrụ vine nke mmanya nke ọnụma nke iwe Chineke Onye pụrụ ime ihe nile.” (Mkpughe 19:14, 15) E ji okwu ndị doro anya kọwaa ebe nzọcha mmanya vine ihe atụ ahụ dị ka “ebe nzọcha mkpụrụ vine ahụ, nke dị ukwuu, bụ́ nke ọnụma Chineke.”—Mkpughe 14:17-20.
15. Olee otú Joel si akọwa obubu agha Jehova megide mba dị iche iche?
15 Mgbe ahụ, olee otú Jehova si aza arịrịọ Joel ịkpọdata ndị dike nke Chineke? Ọ bụ n’okwu ndị a doro anya: “Ka mba nile teta, rịgota na ndagwurugwu Jehoshafat: n’ihi na n’ebe ahụ ka M ga-anọdụ ikpe mba nile bi gburugburu ikpe. Tinye mma iwe ihe ubi, n’ihi na ihe a ga-ewe n’ubi achawo: bịanụ, zọchaa; n’ihi na ebe nzọcha mkpụrụ vine ejuwo, ebe ịnara mmanya vine nile erubigawo; n’ihi na ihe ọjọọ ha bara ụba. Ọtụtụ ìgwè mmadụ, ọtụtụ ìgwè mmadụ n’ime ndagwurugwu mkpebi ikpe! n’ihi na ụbọchị Jehova dị nso n’ime ndagwurugwu mkpebi ikpe. Anyanwụ na ọnwa ejiwo nji, kpakpando achịkọpụwokwa onwunwu ha. Jehova ga-esikwa na Zaịọn bigbọọ, mee ka olu Ya si na Jerusalem daa; eluigwe na ụwa ga-emekwa mkpatụ.”—Joel 3:12-16.
16. Ole ndị ka a ga-agụnye n’etiti ndị Jehova ga-emezu ihe e kpere n’ikpe n’isi ha?
16 N’eziekwa dị ka aha ahụ bụ́ Jehoshafat pụtara “Jehova Bụ Onyeikpe,” otú ahụ kpọmkwem ka Chineke, bụ́ Jehova, ga-ewepụ ọbụbụeze ya n’ụta kpam kpam mgbe ọ ga-emezu ihe e kpere n’ikpe. Amụma ahụ na-akọwa ndị a mara ikpe dị ka “ọtụtụ ìgwè mmadụ, ọtụtụ ìgwè mmadụ n’ime ndagwurugwu mkpebi ikpe.” Ndị ọ bụla fọdụrụnụ na-akwado okpukpe ụgha ga-eso n’ọtụtụ ìgwè mmadụ ahụ. Ọ ga-agụnyekwa ndị a kọwara n’Abụ Ọma nke abụọ—mba nile, ndị nile, ndị eze nke ụwa, na ndị isi—bụ́ ndị họrọwooro usoro ihe rụrụ arụ nke ụwa a kama ‘iwere egwu fee Jehova ofufe.’ Ndị a jụrụ ‘isutụ onye a họpụtara ọnụ.’ (Abụ Ọma 2:1, 2, 11, 12) Ha anabataghị Jisọs dị ka onye so Jehova bụrụ Eze. Ọzọ, ọtụtụ ìgwè mmadụ ahụ a kara akara maka mbibi ga-agụnye ndị nile Eze ahụ dị ebube ga-ekpebi na ha bụ “ụmụ ewu.” (Matiu 25:33, 41) Mgbe o ruru oge Jehova kara aka ibigbọ site na Jerusalem eluigwe, Eze kachasị ndị eze nile ọ họpụtara ga-agbaga imezu ihe ahụ e kpere n’ikpe. Eluigwe na ụwa ga-eme mkpatụ n’ezie! Otú ọ dị, e mesiri anyị obi ike, sị: “Jehova ga-abụrụ ndị Ya ebe mgbaba, Ọ ga-abụkwara ụmụ Israel ebe siri ike.”—Joel 3:16.
17, 18. Ole ndị ka e mere ka a mata dị ka ndị nlanarị nke oké mkpagbu ahụ, oleekwa ọnọdụ ndị ha ga-anụ ụtọ ha?
17 Mkpughe 7:9-17 na-eme ka a mata ndị lanarịrị oké mkpagbu ahụ dị ka “oké ìgwè mmadụ” nke ndị gosipụtara okwukwe n’ike mgbapụta nke ọbara Jisọs mejupụtara. Ndị a na-enweta nchebe n’ụbọchị Jehova, ebe ọtụtụ ìgwè mmadụ ndị ahụ na-agbakọtanụ nke amụma Joel ga-ezute ikpe ọmụma. Joel na-agwa ndị ahụ lanarịrịnụ, sị: “Unu ewee mara na Mụ onwe m bụ Jehova, bụ́ Chineke unu, Onye bi na Zaịọn, bụ́ ugwu nsọ m,” bụ́ ebe obibi Jehova n’eluigwe.—Joel 3:17a.
18 Amụma ahụ na-agwazi anyị na ógbè ọchịchị nke Alaeze eluigwe Chineke “ewee dị nsọ, ndị ala ọzọ agaghị agabigakwa n’ime ya ọzọ.” (Joel 3:17b) N’eluigwe na n’ógbè elu ụwa nke Alaeze eluigwe ahụ, a gaghị enwe ndị ala ọzọ, n’ihi na a ga-ejikọ mmadụ nile n’ofufe dị ọcha.
19. Olee otú Joel si kọwaa obi ụtọ paradaịs nke ndị Chineke taa?
19 Ọbụna taa, ịba ụba nke udo na-ejupụta n’etiti ndị Jehova n’ụwa ebe a. N’ịdị n’otu, ha na-akpọsa ikpe ya n’ihe karịrị ala 230 na n’ihe karịrị asụsụ 300 dị iche iche. Joel kọwara ịba ụba ha n’ụzọ mara mma: “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ, na ugwu nile ga na-abụsa mmanya vine ụtọ, mmiri ara ga na-erukwa n’ugwu nta nile, mmiri ga na-erukwa n’ebe nile nke Juda mmiri si eru.” (Joel 3:18) Ee, Jehova ga-anọgide na-awụkwasị ndị na-enye ya otuto n’ụwa nrubiga ókè nke ngọzi na ịba ụba na-enye ọṅụ nakwa oruru na-ehiwanye nne nke eziokwu dị oké ọnụ ahịa. A ga-ewepụwo ọbụbụeze Jehova n’ụta n’ụzọ nile na ndagwurugwu mkpebi ikpe, ọṅụ ga-ejupụtakwa ka ọ na-ebinyere ndị ya a gbapụtara agbapụta ruo ebighị ebi.—Mkpughe 21:3, 4.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Olee otú Jehova si napụta ndị ya n’ụbọchị Jehoshafat?
◻ Ole ndị ka Jehova mara ikpe na ha kwesịrị mbibi n’ime “ndagwurugwu mkpebi ikpe”?
◻ Olee ndị bụ ndị dike Chineke, oleekwa òkè ha ga-ekere n’ọgụ ikpeazụ ahụ?
◻ Olee obi ụtọ ndị ndị ofufe na-ekwesị ntụkwasị obi na-enwe?
[Foto dị na peeji nke 21]
A gwara Juda: ‘Unu atụla egwu n’ihi na ọ bụghị unu nwe agha nke a kama ọ bụ Chineke’
[Foto dị na peeji nke 23]
Jehova na-ama ndị iro ya aka ‘ịkpụgharị mma ogè ha ka ha bụrụ mma agha’
[Foto dị na peeji nke 24]
Bible na-eme ka a mata oké ìgwè mmadụ nke ndị lanarịrị oké mkpagbu ahụ