Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
© 2023 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
MEE 1-7
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 IHE E MERE 17-19
“Na-ele Ndị Ọzọ Anya Otú Jehova Si Ele Ha”
Ị̀ Ga-echebara Ihe Ndị E Dere n’Oge Gara Aga Echiche?
7 Ka anyị leba anya n’ihe nwa Esa, bụ́ Jehọshafat, mere. O nwere ọtụtụ àgwà ọma, meekwa ọtụtụ ihe ọma n’ihi na ọ tụkwasịrị Chineke obi. Ma, o mekwara ihe na-adịghị mma. Dị ka ihe atụ, ya na ajọ Eze Ehab, bụ́ onye na-achị alaeze ebe ugwu, gọrọ ọgọ. Jehọshafat mechara soro Ehab buso ndị Siria agha n’agbanyeghị na onye amụma bụ́ Mịkaya gwara ya agala. Ọ fọrọ obere ka e gbuo ya n’agha ahụ. O mechaziri laghachi Jeruselem. (2 Ihe 18:1-32) Onye amụma bụ́ Jihu jụrụ ya, sị: “Ọ̀ bụ ndị ajọ omume ka e kwesịrị inyere aka, ọ̀ bụkwa ndị kpọrọ Jehova asị ka i kwesịrị ịhụ n’anya?”—Gụọ 2 Ihe E Mere 19:1-3.
Na-atụgharị Uche n’Ịhụnanya Na-adịgide Adịgide Jehova Nwere
8 Jehova chọrọ ka anyị mara na ọ hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ bụghị naanị ezughị okè anyị ka ọ na-ahụ. Ọ na-ahụkwa ihe ọma ndị anyị na-eme. (2 Ihe 16:9) Dị ka ihe atụ, o meere Eze Jehọshafat nke Juda otú ahụ. E nwere mgbe o mere iberiibe ma soro Eze Ehab nke Izrel gaa agha ka ha nata ndị Siria ala Remọt-gilied. N’agbanyeghị na narị ndị amụma ụgha anọ gwara Eze Ehab na ọ ga-emeri, Mịkaya, bụ́ ezigbo onye amụma Jehova, gwara ya na a ga-emeri ya. Ehab nwụrụ n’agha ahụ. Ọ fọdịrị obere ka e gbuo Jehọshafat. Mgbe ọ lọrutere Jeruselem, Jehova si n’aka Jihu baara ya mba maka iso Ehab gaa agha. Ma, Jihu sịrị ya: “E nwere ihe ndị dị mma a hụrụ n’ime gị.”—2 Ihe 18:4, 5, 18-22, 33, 34; 19:1-3.
9 Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, Jehọshafat gwara ndị isi, ndị Livaị, na ndị nchụàjà ka ha gaa n’obodo niile dị́ na Juda kụziere ndị mmadụ iwu Jehova. Ihe ahụ ha mere bara ezigbo uru. O mere ka ndị bi ná mba ndị gbara Juda gburugburu tụwa egwu Jehova. (2 Ihe 17:3-10) N’agbanyeghị na Jehọshafat mechara mee ihe na-adịghị mma, Jehova echefughị ihe ọma ndị ahụ o mere ná mmalite ọchịchị ya. Ihe a Baịbụl kọrọ na-eme ka anyị cheta na n’agbanyeghị na anyị ezughị okè, Jehova ga-ahụ anyị n’anya ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-eme uche ya.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Jiri Obi Gị Niile Na-efe Jehova
10 Jehọshafat bụ́ nwa Esa akwụsịghị ‘ije ije n’ụzọ nna ya Esa.’ (2 Ihe 20:31, 32) Gịnị mere Baịbụl ji kwuo otú ahụ? Jehọshafat mere ka nna ya. Ọ gbara ndị mmadụ ume ka ha chọọ Jehova. Otú o si mee ya bụ na ọ haziri ka ha jiri “akwụkwọ iwu Jehova” na-ezi ndị mmadụ ihe. (2 Ihe 17:7-10) Ọ gadịrị n’alaeze ebe ugwu nke Izrel, bụ́ ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu, ‘ka o mee ka ha laghachikwuru Jehova.’ (2 Ihe 19:4) Jehọshafat bụ eze “ji obi ya dum chọọ Jehova.”—2 Ihe 22:9.
11 Anyị niile nwere ike iso na-ekwusa ozi ọma Jehova chọrọ ka anyị na-ekwusa taa. Ị̀ na-agba mbọ ịkụziri ndị ọzọ Okwu Chineke n’ọnwa ọ bụla otú ọ ga-eru ha n’obi ka ha nwee ike ifewe Chineke? Ọ bụrụ na ị na-agba mbọ, Chineke ga-enyere gị aka inweta onye ị ga-amụwara ihe. Ị̀ na-ekpe ekpere ka Chineke nyere gị aka? Ị̀ dị njikere ịmụrụ mmadụ ihe, ọ bụrụgodị na ọ bụ oge i wepụtara ị ga-eji mee ihe ndị ọzọ? Otú ahụ Jehọshafat si gaa n’ókèala ndị Ifrem nyere ndị mmadụ aka ka ha laghachikwuru Jehova, anyị nwere ike inyere ndị na-anaghị ejekwa ozi aka. Ihe ọzọ bụ na ndị okenye ọgbakọ na-aga eleta ndị bi n’ókèala ha a chụrụ n’ọgbakọ ma gbalịa inyere ha aka, ya bụ, ndị hapụrụla àgwà ọjọọ ha.
MEE 8-14
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 IHE E MERE 20-21
“Tụkwasịnụ Jehova Bụ́ Chineke Unu Obi”
Anyị Kwesịrị Ịna-emekọ Ihe Ọnụ Ka Ọgwụgwụ Ụwa A Na-eru Nso
8 N’oge Eze Jehọshafat, nnukwu ìgwè ndị agha siri ezigbo ike bịara ịlụso ndị Chineke ọgụ. Ha si ná mba ndị ha na ndị Izrel gbara agbata obi. (2 Ihe 20:1, 2) Ndị Chineke agaghị ka ha lụso ha ọgụ n’ike aka ha. Kama, ha rịọrọ Jehova ka o nyere ha aka. (Gụọ 2 Ihe E Mere 20:3, 4.) O nweghị mgbe onye nke ọ bụla gara mee otú dị ya mma. Kama, ha niile gbakọrọ aka. Baịbụl kwuru, sị: “Ndị Juda niile guzo ọtọ n’ihu Jehova, ọbụna ụmụntakịrị ha, ndị nwunye ha na ụmụ ha.” (2 Ihe 20:13) Ha niile, ma ụmụaka ma ndị agadi, ji otu obi mee ihe Jehova kwuru, Jehova anapụta ha n’aka ndị iro ha. (2 Ihe 20:20-27) Ihe atụ a ó gosighị na ndị Chineke nwere ike imeri nsogbu ndị bịaara ha ma ọ bụrụ na ha emekọọ ihe ọnụ?
Ndị Lụrụ Di na Nwunye Ọhụrụ, Ka Ife Jehova Bụrụ Ihe Kacha Unu Mkpa ná Ndụ
7 Jehova si n’ọnụ otu onye Livaị aha ya bụ Jahazayel gwa Jehoshafat okwu, sị: “Nọrọnụ ebe unu kwesịrị ịnọ. Guzoronụ otu ebe ka unu hụ otú Jehova ga-esi zọpụta unu.” (2 Ihe 20:13-17) O doro anya na ihe ahụ abụghị otú e si alụ agha. Ma, ihe ahụ a gwara ya mee esighị n’ọnụ mmadụ, ọ bụ okwu Jehova. Jehoshafat mere ihe a gwara ya n’ihi na ọ tụkwasịrị Jehova obi. Mgbe ya na ndị ya gara izute ndị iro ha, kama idowe ndị agha n’ihu, o dowere ndị na-abụ abụ n’ihu. Jehova emechughị ya ihu. O nyeere ya aka ya emerie ndị iro ya.—2 Ihe 20:18-23.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 1271 ¶1-2
Jehoram
Ma é nweghị ihe ọzọ, ọ ga-abụ na ihe so mee ka Jehoram ghara ime ihe dị mma otú nna ya bụ́ Jehoshafat mere bụ maka na nwunye ọjọọ ya bụ́ Atalaya megharịrị ya anya. (2 Eze 8:18) Ọ bụghị naanị na Jehoram gburu ụmụnne ya ndị nwoke isii na ụfọdụ n’ime ndị isi ndị Izrel, o mekwara ka ndị ọ na-achị hapụ Jehova fewe arụsị. (2 Ihe 21:1-6, 11-14) N’oge niile ọ chịrị, nsogbu karịrị akarị n’obodo ya, ya na mba ndị ọzọ nọkwa na-ese okwu. Ịdọm bu ụzọ nupụrụ ya isi, Libna enupụkwara Juda isi. (2 Eze 8:20-22) Ịlaịja onye amụma dọrọ Jehoram aka ná ntị n’akwụkwọ ozi o degaara ya. Ọ sịrị: “Jehova ga-ebibi ndị gị, ụmụ gị, ndị nwunye gị, na ihe niile i nwere.” Ọ gwakwara Eze Jehoram, sị: “Ị ga-arịakwa ọtụtụ ọrịa. Otu n’ime ha ga-abụ ọrịa afọ. Ị ga-arịagide ya ruo mgbe eriri afọ gị ga na-awụpụta kwa ụbọchị.”—2 Ihe 21:12-15.
Ihe niile mere otú ahụ Ịlaịja si kwuo ya. Jehova kwere ka ndị Arab na ndị Filistia merie Juda ma dọrọ ndị nwunye Jehoram na ụmụ ya ndị nwoke n’agha. Chineke kwere ka ọdụdụ nwa Jehoram, bụ́ Jehoahaz, (onye a na-akpọkwa Ehazaya) gbapụ. Ma, naanị ihe mere Chineke ji kwe ka a hapụ Jehoahaz bụ n’ihi ndụ Chineke na Devid gbara inye Devid Alaeze. “Mgbe ihe a niile mechara, Jehova mere ka Jehoram rịawa ọrịa afọ na-enweghị ngwọta.” Mgbe afọ abụọ gachara, ‘eriri afọ ya wụpụtara,’ ya ejiri nwayọọ nwayọọ nwụọ. Otú ahụ ka nwoke ọjọọ a si nwụọ, “o nweghịkwa onye o wutere mgbe ọ nwụrụ.” E liri ya n’Obodo Devid, “ma, e lighị ya ebe a na-eli ndị eze.” Ehazaya nwa ya nọchiri ya, bụrụzie eze.—2 Ihe 21:7, 16-20; 22:1; 1 Ihe 3:10, 11.
MEE 15-21
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 IHE E MERE 22-24
“Jehova Na-agọzi Ndị Ji Obi Ike Na-efe Ya”
Ndị Enyi Ọjọọ Mere Ka Jehoash Hapụ Jehova
EBE niile nọ na-azụ wuruwuru na Jeruselem, bụ́ ebe ụlọ nsọ Chineke dị. E gbuola Eze Ehazaya. Ma, ị gaghị ekweta ihe mama Ehazaya, bụ́ Atalaya, meziri. O gburu ụmụ Ehazaya, bụ́ ụmụ ụmụ ya! Ị̀ maara ihe mere o ji gbuo ha?— Ọ bụ ka o nwee ike ịghọ eze kama otu onye n’ime ha ga-aghọ ya.
Ma, e gbughị otu nwa nwa Atalaya aha ya bụ Jehoash, nne nne ya amaghịkwa. Ị̀ chọrọ ịma otú e si zọọ ya ndụ?— Nwanne nna Jehoash, bụ́ Jehoshiba, zoro ya n’ụlọ nsọ Chineke. Ihe mere o ji nwee ike ime ya bụ na ọ bụ di ya, bụ́ Jehoyada, bụ Nnukwu Onye Nchụàjà. N’ihi ya, ha abụọ gbakọtara aka hụ na ọ dịghị ihe mere Jehoash.
Ndị Enyi Ọjọọ Mere Ka Jehoash Hapụ Jehova
E zoro Jehoash n’ụlọ nsọ ahụ ruo afọ isii. N’ebe ahụ ka a nọ kụziere ya ihe niile banyere Jehova Chineke na Iwu ya. Mgbe Jehoash gbara afọ asaa, Jehoyada meziri ya eze. Ị̀ chọrọ ịnụ otú Jehoyada si mee ya na ihe mechara mee nne nne Jehoash, bụ́ Eze Nwaanyị Atalaya?—
Ọ dị mma. Jehoyada zooro ezoro gaa kpọkọta ndị nche na-eche ndị eze chịrị na Jeruselem nche n’oge ahụ. Ọ gwara ha otú ya na nwunye ya si zọọ nwa Eze Ehazaya ndụ. Jehoyada kpọpụtaziri Jehoash ka ndị nche ahụ hụ ya, ha ekweta na ọ bụ ya kwesịrị ịchị obodo ahụ. Ha kpebiziri ihe ha ga-eme.
Jehoyada kpọpụtara Jehoash n’èzí ma mee ya eze. Mgbe ahụ, ndị obodo ahụ malitere “ịkụ aka, na-asị: ‘Eze, ị ga-adị ndụ!’ ” Ndị nche ahụ gbara Jehoash gburugburu ka ihe ọ bụla ghara ime ya. Mgbe Atalaya nụrụ mkpọtụ obi ụtọ ahụ, ọ gbapụtara, sị na ha gbara ya izu ọjọọ. Ma, Jehoyada nyere ndị nche ahụ iwu ka ha gbuo Atalaya, ha egbuokwa ya.—2 Ndị Eze 11:1-16.
it-1 379 ¶5
Ili Ozu, Ebe Ndị A Na-eli Ozu
A kwanyeere Nnukwu Onye Nchụàjà mere ihe dị Jehova mma aha ya bụ Jehoyada ùgwù lie ya “n’Obodo Devid n’ebe a na-eli ndị eze.” Ọ bụ naanị ya bụ onye na-esighị n’ezinụlọ ndị eze e kwuru na a kwanyeere ụdị ùgwù a.—2 Ihe 24:15, 16.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 1223 ¶13
Zekaraya
12. Ọ bụ nwa Jehoyada bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà. Mgbe Jehoyada nwụchara, Eze Jehoash kwụsịrị ife Jehova, gewezie ndị isi ndị Juda ntị kama ige ndị amụma Jehova ntị. Nwa nwanne nna ya bụ́ Zekaraya (2 Ihe 22:11) dọsiri ya na ndị Izrel ndị ọzọ aka ná ntị ike banyere ihe ọjọọ ha na-eme. Ma kama ichegharị, ha ji nkume tụgbuo ya n’ogige ụlọ nsọ. Mgbe Zekaraya nọ n’ọnụ ọnwụ, ọ sịrị: “Ka Jehova kwụọ gị ụgwọ ihe a i mere.” Jehova meere onye amụma a ihe ọ rịọrọ ya. Ihe mere anyị ji kwuo otú a bụ na ndị Siria mebiri nnukwu ihe na Juda, mmadụ abụọ n’ime ndị na-ejere Jehoash ozi gbukwara Jehoash “maka na o gburu ụmụ Jehoyada onye nchụàjà.” Baịbụl Septuagint nke Grik na Baịbụl Vulgate nke Latịn kwuru na e gburu Jehoash iji bọọ ọbọ ọbara “nwa” Jehoyada. Ma, ihe e dere n’akwụkwọ Baịbụl ndị Masoret depụtaghachiri nakwa na Baịbụl Peshitta nke Siriak bụ “ụmụ.” Ọ ga-abụ na ihe mere e ji kpọọ nwa Jehoyada bụ́ Zekaraya “ụmụ” bụ iji kwanyere ya ùgwù ruuru ya maka na ọ bụ onye amụma, bụrụkwa onye nchụàjà.—2 Ihe 24:17-22, 25.
MEE 22-28
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 IHE E MERE 25-27
“Jehova Nwere Ike Inye Gị Ihe Karịrị Ya”
it-1 1266 ¶6
Jehoash
Jehoash gbazinyekwara eze Juda ndị agha dị otu narị puku (100,000) ka ha soro ya gaa lụso ndị Ịdọm agha. Ma, n’ihi ndụmọdụ “onye nke ezi Chineke” nyere Amazaya eze Juda, Amazaya gwaziri ndị agha ahụ ka ha laa n’agbanyeghị na a kwụọla ha otu narị talent ọlaọcha (ihe dị ka ₦291,166,056). Ha were iwe na a sị ha laghachi n’ụlọ ha. Ọ ga-abụ na ihe mere ha ji wee iwe bụ n’ihi na ha agaghịzi eso nweta ihe a na-akwata n’agha. N’ihi ya, mgbe ha laghachichara n’ebe ugwu, ha gara n’obodo ndị dị n’alaeze ebe ndịda buru ọtụtụ ihe, malite na Sameria (ọ ga-abụ ebe ha na-esi aga agha) ruo Bet-horọn.—2 Ihe 25:6-10, 13.
Olee Otú Ị Ga-esi ‘Detụ Jehova Ire ma Hụ na Ọ Dị Mma’?
16 Hapụ ihe ụfọdụ maka ozi Jehova. Ọ dịghị mkpa ka anyị hapụ ihe niile na-amasị anyị iji mee Jehova obi ụtọ. (Ekli. 5:19, 20) Ma, ọ bụrụ na anyị ahapụ ijekwuru Jehova ozi n’ihi na anyị achọghị ịhapụ ihe ụfọdụ na-amasị anyị, anyị nwere ike ime ka nwa okorobịa ahụ Jizọs ji mee ihe atụ, bụ́ onye gbasiri mbọ ike ka o nweta ọtụtụ ihe kama ibute ihe gbasara ofufe Jehova ụzọ. (Gụọ Luk 12:16-21.) Otu nwanna aha ya bụ Christian bi na Frans sịrị: “Ejibughị m ike m niile na oge m niile na-ejere Jehova ozi. Anaghịkwa m ewepụtara ezinụlọ m oge kwesịrị ekwesị.” Ma, ya na nwunye ya mechara kpebie ịsụ ụzọ. Iji nwee ike ime ya, ha kwụsịrị ọrụ ha. Ha maliteziri na-ehichara ndị mmadụ ụlọ iji nweta ihe ndị dị ha mkpa. Ha mụtakwara ịna-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na ha enwechaghịzi nnukwu ihe. Obi ọ̀ dị ha ụtọ na ha hapụrụ ihe ụfọdụ iji sụwa ụzọ? Christian sịrị: “Ugbu a, ozi ọma na-atọkwu anyị ụtọ. Ọ na-amasịkwa anyị ịhụ ka ndị anyị na-amụrụ ihe na ndị anyị na-agara nletaghachi na-amụtakwụ banyere Jehova.”
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ì Nwere Onye Ndụmọdụ Na-enyere Gị Aka Ife Chineke?
MGBE Ụzaịa dị nanị afọ iri na isii, ọ ghọrọ eze nke alaeze ebe ndịda bụ́ Juda. Ọ chịrị ruo ihe karịrị iri afọ ise, site ná ngwụsị nke narị afọ nke itoolu ruo ná mmalite narị afọ nke asatọ T.O.A. Site na mgbe Ụzaịa bụ nwata, o ‘mere ihe ziri ezi n’anya Jehova.’ Olee ihe nyeere ya aka ibi ezi ndụ otú ahụ? Akụkọ ahụ kwuru, sị: “[Ụzaịa] nọ n’ịchọ Chineke n’ụbọchị Zekaraịa, onye nwere nghọta n’ihu Chineke: ma n’ụbọchị ọ na-achọ Jehova, Chineke mere ka ihe na-agara ya nke ọma.”—2 Ihe E Mere 26:1, 4, 5.
Anyị amaghị ọtụtụ ihe banyere Zekaraịa, bụ́ onye ndụmọdụ eze, ma e wezụga ihe a e kwuru banyere ya na Bible. N’agbanyeghị nke ahụ, dị ka “onye nwere nghọta n’ihu Chineke,” Zekaraịa nyeere nwa okorobịa ahụ bụ́ onye ọchịchị aka ime ihe ziri ezi. Akwụkwọ bụ́ The Expositor’s Bible na-ekwu na o doro anya na Zekaraịa bụ “nwoke maara Akwụkwọ Nsọ nke ọma, onye nwerela ọtụtụ ahụmahụ n’ofufe Chineke, na onye nwere ike ịkụziri mmadụ ihe ọ maara.” Otu ọkà mmụta Bible kwuru banyere Zekaraịa, sị: “Ọ maara amụma nke ọma . . . ọ bụkwa nwoke na-akwụwa aka ọtọ, onye nwere ọgụgụ isi nke na-atụ egwu Chineke, na ezigbo mmadụ; o yikwara ka àgwà ya ò metụtara nnọọ nke Ụzaịa.”
MEE 29–JUN 4
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 IHE E MERE 28-29
“Ị Ga-efeli Jehova n’Agbanyeghị na Ndị Mụrụ Gị Ejighị Ofufe Jehova Kpọrọ Ihe”
Na-eṅomi Ndị Ha na Jehova Bụ Ezigbo Enyi
8 Ebe Hezekaya toro dị ezigbo iche n’ebe Rut toro. A mụrụ Hezekaya ná mba na-efe Chineke. Ma, ọ bụghị ndị Izrel niile ji obi ha niile na-efe Chineke. Nna Hezekaya, bụ́ Eze Ehaz, bụ onye ọjọọ. O mere ihe gosiri na ọ naghị akwanyere ụlọ nsọ Chineke ùgwù, meekwa ka ndị Izrel fewe chi ọzọ. Ehaz surere ụfọdụ n’ime ụmụnne Hezekaya n’ọkụ iji chụọrọ arụsị àjà. Ọtụtụ ihe ọjọọ nọ na-eme mgbe Hezekaya dị obere.—2 Ndị Eze 16:2-4, 10-17; 2 Ihe E Mere 28:1-3.
Na-eṅomi Ndị Ha na Jehova Bụ Ezigbo Enyi
9 Ihe ọjọọ Ehaz nọ na-eme nwere ike ime ka nwa ya Hezekaya wesawa Jehova iwe. Taa, ụfọdụ ndị nsogbu ha na-erudịghị ka nke Hezekaya na-eche na ha kwesịrị ‘ịna-eweso Jehova oké iwe’ ma ọ bụ na-eburu nzukọ ya iwe n’obi. (Ilu 19:3) E nwere ndị na-eche na ihe ọjọọ ndị mere mgbe ha dị obere pụtara na ha ga na-ebi ndụ ọjọọ ma ọ bụ na-eme ihe ọjọọ ndị mụrụ ha mere. (Ezikiel 18:2, 3) Ma ihe a ha na-eche ọ̀ bụ eziokwu?
10 Otú Hezekaya si bie ndụ gosiri na azịza ajụjụ ahụ bụ mba. E nweghị ihe kwesịrị ime ka mmadụ wesawa Jehova iwe. Ọ bụghị ya na-akpata ihe ọjọọ na-eme ndị mmadụ. (Job 34:10) N’eziokwu, ndị nne na nna nwere ike ịkụziri ụmụ ha ime ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. (Ilu 22:6; Ndị Kọlọsi 3:21) Ma ọ pụtaghị na ọ bụ otú e si zụọ anyị ga-eme ka anyị bụrụ ezigbo mmadụ ma ọ bụ ajọ mmadụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jehova nyere anyị ikike ikpebi ihe anyị ga-eme, ya bụ na anyị nwere ike ịhọrọ ma ànyị ga na-eme ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. (Diuterọnọmi 30:19) Gịnị ka Hezekaya ji ikike ahụ Chineke nyere anyị mee?
11 Hezekaya so ná ndị kacha bụrụ ezigbo ndị eze n’agbanyeghị na nna ya so ná ndị kacha bụrụ ndị eze ọjọọ na Juda. (Gụọ 2 Ndị Eze 18:5, 6.) O kpebiri na ya agaghị amụta àgwà ọjọọ nna ya. Kama ime otú ahụ, ọ họọrọ ige ndị amụma Jehova ntị nke ọma, ya bụ, ndị amụma dị́ ka Aịzaya, Maịka, na Hosia. O gere ntị na ndụmọdụ ha na ntụziaka ha. Ọ bụ ya mere o ji dozie ọtụtụ n’ime nsogbu nna ya kpatara. O mere ka ụlọ nsọ Chineke dị́ ọcha, rịọ Chineke ka ọ gbaghara ndị Juda mmehie ha. O bibikwara arụsị ndị dị́ n’ala ha. (2 Ihe E Mere 29:1-11, 18-24; 31:1) Mgbe eze Asiria bụ́ Senakerib na-achọ ịbịa lụso Jeruselem ọgụ, Hezekaya gosiri na o nwere ezigbo obi ike na okwukwe. Ọ tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-echebe ya. Ọ gbakwara ndị ọ na-achị ume. (2 Ihe E Mere 32:7, 8) Mgbe Hezekaya mechara dị́ mpako, Jehova gbaziri ya, ya eweda onwe ya ala. (2 Ihe E Mere 32:24-26) O doro anya na Hezekaya kpara àgwà ọma anyị kwesịrị iṅomi. O kweghị ka otú e si zụọ ya mee ka ọ bụrụ onye ọjọọ. Kama ime otú ahụ, o gosiri na ọ bụ enyi Jehova.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Netan Ji Obi Ya Niile Mee Ka E Fee Chineke
Ebe Netan bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi nke na-efe Jehova, o ji obi ya dum kweta ka Devid bido iwu ụlọ ọ chọrọ iwu, nke bụ́ ụlọ mbụ a ga-anọ na-efe Jehova ofufe n’ụwa. Ma, na nke ugbu a, o doro anya na Netan kwuru ihe o chere kama ikwuchitere Jehova. N’abalị ahụ, Chineke gwara onye amụma a na-ejere ya ozi ka ọ gaa gwa eze ihe dị iche, ya bụ: na Devid agaghị ewuru Jehova ụlọ nsọ. Onye ga-ewu ya bụ otu n’ime ụmụ Devid. Ma, Netan kwukwara na Chineke ekwela Devid nkwa na ocheeze Devid ‘ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.’—2 Sam. 7:4-16.
Uche Chineke n’okwu gbasara iwu ụlọ nsọ dị iche n’uche Netan. Ma, onye amụma a dị umeala n’obi atamughị ntamu, o kweere ihe a Jehova zubere ime, ọ kwadokwara ya. Anyị kwesịrị ime ka Netan ma ọ bụrụ na e nwee otú Chineke si gbazie anyị. Ihe ndị Netan onye amụma mechara mee gosiri na o nweghị mgbe Chineke jụrụ ya. O yikarịrị ka Jehova ò jidị mmụọ nsọ ya mee ka Netan, na Gad, bụ́ onye ọhụụ, duzie Devid ya ahọpụta puku mmadụ anọ ndị ga na-eji ngwá egwú eto Jehova n’ụlọ nsọ.—1 Ihe 23:1-5; 2 Ihe 29:25.
JUN 5-11
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 IHE E MERE 30-31
“Izukọta Ọnụ Na-abara Anyị Uru”
it-1 1103 ¶2
Hezekaya
Otú Ezigbo Ofufe Si Anụ Ya Ọkụ n’Obi. Ozugbo Hezekaya ghọrọ eze mgbe ọ dị afọ iri abụọ na ise, o gosiri na ofufe Jehova na-anụ ya ọkụ n’obi. Ihe mbụ o mere bụ imepeghachi ụlọ nsọ Chineke na ịrụzi ya. Ọ kpọkọtara ndị nchụàjà na ndị Livaị, sị ha: “Ọ dị m n’obi ugbu a ka mụ na Jehova bụ́ Chineke Izrel gbaa ndụ.” Ọgbụgba ndụ a bụ iji gosi na ha ga na-erubere Jehova isi. Ihe a mere ka ọ dị ka à malitere ọgbụgba ndụ iwu ahụ ọhụrụ na Juda, ọ bụ eziokwu na ọ dị kemgbe, mana e leghaara ya anya. Hezekaya ji ịnụ ọkụ n’obi hazie ndị Livaị ka ha bido ịrụ ọrụ ha. Ọ hazikwara ha ka ha maliteghachi ịkụ egwú na ịbụ abụ otuto. Ihe a mere n’ọnwa Naịsan, mgbe e kwesịrị ime Ememme Ngabiga. Ma, ụlọ nsọ na ndị nchụàjà na ndị Livaị adịghị ọcha. Mgbe ọ na-erula n’abalị iri na isii n’ọnwa Naịsan, e meela ka ụlọ nsọ dị ọcha, weghachikwa arịa ndị dị na ya. A chụrụ àjà mkpuchi mmehie pụrụ iche maka ndị Izrel niile. Ndị isi obodo bu ụzọ weta anụ ndị a ga-eji achụ àjà mmehie maka alaeze ahụ, maka ụlọ nsọ ahụ, nakwa maka ndị Juda. Ndị ọzọ wetakwara ọtụtụ puku àjà a na-esu ọkụ.—2 Ihe 29:1-36.
it-1 1103 ¶3
Hezekaya
Ebe ọ bụ na ndị Izrel emeghị Ememme Ngabiga n’oge a na-eji eme ya n’ihi na ha adịghị ọcha, Hezekaya kpebiri ka ha mee ya mgbe otu ọnwa gachara ebe ọ bụ na iwu kwadoro ka ndị na-adịghị ọcha mee ya mgbe ahụ. O degaara ma ndị Juda ma ndị Izrel akwụkwọ ozi ka ha bịa ememme a. O nyere ndị ọgba ọsọ akwụkwọ ozi ahụ ka ha were ya gaa n’ala ahụ niile malite na Bia-shiba ruo Dan. Ọtụtụ ndị nọ na-achị ndị ọgba ọsọ ahụ ọchị. Ma, ụfọdụ ndị si ebo Asha, ebo Manase, na ebo Zebulọn wedara onwe ha ala bịa ememme a, ụfọdụ sikwa Ifrem na Ịsaka bịa. E nwekwara ọtụtụ ndị na-abụghị ndị Izrel na-efe Jehova bịara ememme a. Ọ ga-abụ na o siiri ndị ahụ bi n’alaeze ebe ugwu, bụ́ ndị na-akwado ezigbo ofufe, ike ịga ememme a. Ọ ga-abụkwa na e megidere ha ma kwaa ha emo otú e mere ndị ozi ahụ n’ihi na ihe jọgburu onwe ya n’alaeze ahụ dị ebo iri, ndị bi na ya na-efesi arụsị ike, ndị Asiria na-eyikwa ha egwu.—2 Ihe 30:1-20; Ọnụ Ọgụ. 9:10-13.
it-1 1103 ¶4-5
Hezekaya
Mgbe ha mechara Ememme Ngabiga, ha mekwara Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko ụbọchị asaa. Otú obi si tọọ ndị niile bịara ememme ahụ ụtọ mere ka ha kpebie imekwu ya ụbọchị asaa ọzọ. N’agbanyeghị na oge ahụ jọgburu onwe ya, ngọzi Jehova nọ na-ezoro ndị ya ka mmiri nke na “a ṅụrịrị nnukwu ọṅụ na Jeruselem. Malite mgbe Solomọn nwa Devid eze Izrel nọ ndụ ruo oge ahụ, e nwetụbeghị ememme dị ka nke a na Jeruselem.”—2 Ihe 30:21-27.
Ihe mechaziri mee gosiri na ndị bịara ememme ahụ abịaghị ka ha mezuo iwu kama ha ejirila obi ha niile maliteghachila ife Chineke ezigbo ofufe. Tupu ha alaghachi n’ụlọ ha, ha gara kụrie ogidi arụsị dị iche iche, gbutuokwa ogwe osisi arụsị dị iche iche ma kwatuo ebe ndị dị elu na ebe ịchụàjà ndị dị na Juda na Benjamin niile, nakwa n’Ifrem na Manase. (2 Ihe 31:1) Hezekaya mere ihe ndị ọzọ ga-amụta ihe na ya. Ọ kụrisịrị agwọ ọla kọpa Mosis kpụrụ, n’ihi na ndị Izrel ji ya mere arụsị, na-achụrụ ya àjà a na-esu ọkụ. (2 Eze 18:4) Mgbe ha mechara nnukwu ememme ahụ, Hezekaya mere ka a ghara ịkwụsị ife Chineke ezigbo ofufe. Otú o si mee ya bụ na ọ haziri ndị nchụàjà n’ìgwè n’ìgwè, mee ndokwa ka a na-akwado ozi ndị a na-eje n’ụlọ nsọ. Ọ gwara ndị Izrel na ndị Juda ka ha na-eme ihe Iwu Mosis kwuru gbasara iweta otu ụzọ n’ụzọ iri nakwa mkpụrụ mbụ a na-enye ndị Livaị na ndị nchụàjà. Ha ji obi ha niile mee ihe o kwuru.—2 Ihe 31:2-12.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
‘Unu Maara Ihe Ndị A, Unu Ga-enwe Obi Ụtọ ma Unu Na-eme Ha’
14 Otú ọzọ anyị ga-esi egosi na anyị dị umeala n’obi bụ ma anyị dị njikere ige ndị ọzọ ntị nke ọma. Jems 1:19 kwuru na anyị kwesịrị ịbụ ndị “na-anụ ihe ngwa ngwa.” Jehova mere ihe anyị kwesịrị iṅomi ma a bịa n’ige ndị ọzọ ntị. (Jen. 18:32; Jọsh. 10:14) Chegodị ihe anyị ga-amụta ná mkparịta ụka Jehova na Mozis nwere, nke e dere n’Ọpụpụ 32:11-14. (Gụọ ya.) Ọ bụ eziokwu na ọ dịghị mkpa ka Mozis kwuo uche ya tupu Jehova emee ihe ọ chọrọ ime, o gere ya ntị ma nye ya ohere ikwu otú ọ dị ya n’obi. Olee mmadụ ga-emedali obi gee onye na-emejọ ihe ntị ma mee ihe o kwuru? Jehova na-ege ntị mgbe ndị ohu ya ji okwukwe na-ekpe ekpere.
15 Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Ọ bụrụ na Jehova nwere ike iweda onwe ya ala gee ndị mmadụ ntị otú ahụ o gere Ebreham, Rechel, Mozis, Jọshụa, Manoa, Ịlaịja, na Hezekaya, ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị ịna-akwanyekwuru ụmụnna m ùgwù, gee ntị n’ihe bara uru ha na-ekwu, ma mee ihe ndị ha kwuru? È nwere onye nọ n’ọgbakọ anyị ma ọ bụ n’ezinụlọ m m kwesịrị iwepụta oge gee ntị? Olee ihe m ga-eme banyere ya? Olee otú m ga-esi eme ya?’—Jen. 30:6; Ikpe 13:9; 1 Eze 17:22; 2 Ihe 30:20.
JUN 12-18
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 IHE E MERE 32-33
“Na-agba Ndị Ọzọ Ume n’Oge Ihe Siri Ike”
it-1 204 ¶5
Asiria
Senakerib. Senakerib, nwa Sagọn nke Abụọ, lụsoro alaeze Juda ọgụ n’afọ iri na anọ (732 T.O.N.K.) nke ọchịchị Hezekaya. (2 Eze 18:13; Aịza. 36:1) Hezekaya nupụụrụ eze Asiria isi, jụ ịkwụ ụgwọ nna ya Ehaz koteere ya. (2 Eze 18:7) N’ihi ya, Senakerib bịara lụso ọtụtụ obodo ndị dị na Juda ọgụ. E kwuru na o meriri obodo iri anọ na isii (i nwere ike ịtụle Aịza. 36:1, 2). O sizi n’ebe ọ mara ụlọikwuu na Lekish zie Hezekaya ka o wetara ya talent ọlaedo iri atọ (ihe dị ka ₦5,095,185,600) nakwa narị talent ọlaọcha atọ (300) (ihe dị ka ₦873,586,320). (2 Eze 18:14-16; 2 Ihe 32:1; i nwere ike ịtụle Aịza. 8:5-8) N’agbanyeghị na a kwụrụ Senakerib ego a, o dunyere ndị bụ́ ọnụ na-ekwuchitere ya ka ha gaa gwa ndị bi na Jeruselem ka ha chịliere ya aka elu. (2 Eze 18:17–19:34; 2 Ihe 32:2-20) Jehova meziri ka e gbuo otu narị puku ndị agha na puku iri asatọ na puku ise (185,000) nke onye Asiria a na-etu ọnụ, ya alaghachizie Ninive. (2 Eze 19:35, 36) Ụmụ ya ndị nwoke abụọ mechara gbuo ya n’ebe ahụ, nwa ya ọzọ aha ya bụ Isa-hadọn anọchie ya, malite ịchị. (2 Eze 19:37; 2 Ihe 32:21, 22; Aịza. 37:36-38) E dere ihe a niile, ma e wepụ ogbugbu e gburu ndị agha Asiria, n’ihe e ji ụrọ kpụọ ndị Asiria dere akụkọ gbasara Senakerib nakwa na nke ha dere akụkọ gbasara Isa-hadọn.
Ole Ndị Taa Bụ Ndị Ọzụzụ Atụrụ Asaa na Ndị Isi Asatọ?
12 Jehova dị njikere mgbe niile imere anyị ihe anyị na-agaghị emeliri onwe anyị. Ma, ọ na-atụ anya ka anyị mee ihe niile anyị nwere ike ime. Hezekaya mere ihe o nwere ike ime. Ọ kpọrọ “ndị o mere ndị isi na ndị dike ya,” ya na ha ekpebie “ikpochi iyi ha ndị dị ná mpụga obodo ahụ . . . O nwekwara obi ike wee wuzie mgbidi dum a kwaturu akwatu ma wuo ụlọ nche n’elu ya. O wukwara mgbidi ọzọ n’ihu nke ochie, . . . ọ rụkwara ọtụtụ ube na ọta.” (2 Ihe 32:3-5) Jehova si n’aka Hezekaya, ndị isi, na ndị amụma kwesịrị ntụkwasị obi chebe ndị ya ma zụọ ha n’oge ahụ ha nọ ná nsogbu.
Ole Ndị Taa Bụ Ndị Ọzụzụ Atụrụ Asaa na Ndị Isi Asatọ?
13 Ihe ọzọ Hezekaya mere kadị ikpochi iyi na ịrụzi mgbidi obodo ahụ mkpa. Ebe ọ bụ ezigbo onye ọzụzụ atụrụ, ọ kpọkọtara ndị Izrel ma gwa ha okwu gbara ha ume. Ọ sịrị ha: “Unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ n’ihi eze Asiria nakwa n’ihi ìgwè mmadụ so ya; n’ihi na ndị nọnyeere anyị karịrị ndị nọnyeere ya. Ogwe aka nke nọnyeere ya bụ anụ ahụ́, ma, ọ bụ Jehova bụ́ Chineke anyị nọnyeere anyị inyere anyị aka na iburu anyị agha.” Hezekaya chetaara ndị Izrel na Jehova ga-alụrụ ha agha. Mgbe ha nụrụ ihe a ọ gwara ha, “ha wee malite inwe obi ike n’ihi ihe Hezekaya eze Juda kwuru.” Cheta na ọ bụ ihe a Hezekaya gwara ha mere ka obi sie ha ike. Hezekaya na ndị o mere ndị isi na ndị dike ya nakwa Maịka onye amụma na Aịzaya onye amụma gosiri na ha bụ ezigbo ndị ọzụzụ atụrụ, otú ahụ Jehova si n’ọnụ onye amụma ya kwuo.—2 Ihe 32:7, 8; gụọ Maịka 5:5, 6.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Gịnị Bụ Ezigbo Nchegharị?
11 Jehova mechara za Manase ekpere ya. Ihe ndị Manase kpere n’ekpere gosiri na ọ gbanweela. N’ihi ya, Jehova gbaghaara ya ma mee ka ọ bụrụkwa eze ọzọ. Manase ji ohere ahụ gosi n’eziokwu na o chegharịala. O mere ihe Ehab na-emeghị. Ọ gbanwere àgwà ya. Ọ gbalịsiri ike iwepụ ikpere arụsị ma gbaa ndị ọzọ ume ka ha fewe Jehova. (Gụọ 2 Ihe E Mere 33:15, 16.) Ọ dị ya mkpa inwe okwukwe na obi ike iji mee ihe a n’ihi na ruo ọtụtụ afọ, o mere ka ndị ezinụlọ ya, ndị a ma ama, na ndị ọ na-achị na-akpa àgwà ọjọọ. Ma ugbu a ọ kawara nká, ọ gbalịrị imezi ụfọdụ ihe ndị o mejọrọ. O nwere ike ịbụ ya mere nwa nwa ya aha ya bụ Josaya ji bụrụ ezigbo eze.—2 Eze 22:1, 2.
12 Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Manase mere? O mere ihe karịrị iwetu onwe ya ala. O kpere ekpere rịọ Jehova ka o meere ya ebere, gbanwee àgwà ya, gbalịakwa imezi ihe ndị o mejọrọ. O mekwara ike ya niile n’ofufe Jehova, nyekwara ndị ọzọ aka ka ha mee otú ahụ. Ihe Manase mere na-eme ka ndị mere mmehie dị oké njọ nwee olileanya na e nwere ike ịgbaghara ha mmehie ha. Akụkọ Manase na-egosi anyị na “Jehova dị mma, dịkwa njikere ịgbaghara mmehie.” (Ọma 86:5) Jehova ga-agbaghara mmadụ ma o jiri obi ya niile chegharịa.
JUN 19-25
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 IHE E MERE 34-36
“Ị̀ Na-erite Ezigbo Uru n’Okwu Chineke?”
it-1 1157 ¶4
Họlda
Mgbe Josaya nụrụ ka a na-agụpụta ihe dị ‘n’akwụkwọ e dere Iwu Mosis,’ nke Hilkaya bụ́ nnukwu onye nchụàjà chọtara n’oge a na-arụzi ụlọ nsọ, o dunyere ụmụ nwoke ụfọdụ ka ha gaa jụọ Jehova ase. Ha gakwuuru Họlda, ya agwa ha ihe Jehova kwuru. Ihe Jehova kwuru gosiri na ọdachi niile e dere “n’akwụkwọ ahụ” ga-adakwasị ndị obodo ahụ hapụrụ Chineke fewe chi ọzọ maka na ha nupụụrụ Chineke isi. Họlda kwukwara na ebe ọ bụ na Josaya wedara onwe ya ala n’ihu Jehova, ọ gaghị ahụ ahụhụ niile a ga-ata obodo ahụ kama a ga-eli ya otú e liri nna nna ya hà. A ga-eli ya n’ili ya n’udo.—2 Eze 22:8-20; 2 Ihe 34:14-28.
Na-anụrụ Ụlọ Jehova Ọkụ n’Obi!
20 Mgbe Eze Josaya mere ndokwa ka a rụzie ụlọ nsọ ahụ, Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Hilkaya “hụrụ akwụkwọ iwu Jehova, nke o nyere site n’aka Mozis.” O nyere ya odeakwụkwọ eze, bụ́ Shefan, Shefan malitekwara ịgụrụ ya Josaya. (Gụọ 2 Ihe E Mere 34:14-18.) Gịnị si na nke a pụta? Nke a wutere eze, ya adọwaa uwe ya ozugbo ma ziga ndị ga-aga jụọ Jehova ase. Chineke si n’ọnụ Họlda onye amụma nwaanyị katọọ ndị na-efe chi ọzọ n’ala Juda. Ma, Jehova hụrụ mbọ Josaya gbara ịhụ na a kwụsịrị ikpere arụsị, Jehova nwekwara mmasị n’ebe ọ nọ n’agbanyeghị na e buru amụma na a ga-ebibi mba ahụ dum. (2 Ihe 34:19-28) Olee ihe nke a na-akụziri anyị? N’ezie, anyị kwesịrị ime ka Josaya. Anyị kwesịrị ime ihe Jehova gwara anyị mee n’egbughị oge ma ghara ichefu ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị akwụsị ife Jehova otú o si chọọ. Ka obi sie anyị ike na Jehova ga-ahụ otú anyị si jiri ịnụ ọkụ n’obi na-efe ya, ọ ga-amasịkwa ya otú ahụ nke Josaya masịrị ya.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ị̀ Ga-echebara Ihe Ndị E Dere n’Oge Gara Aga Echiche?
15 N’ikpeazụ, gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe mere Eze Josaya? Chegodị ihe mere o ji nwụọ n’agha. (Gụọ 2 Ihe E Mere 35:20-22.) Josaya ‘gara ibuso’ Niko bụ́ eze Ijipt agha n’agbanyeghị na eze ahụ gwara ya na o nweghị ihe na-esere ya na ya. Baịbụl sịrị na ihe Niko kwuru “si n’ọnụ Chineke.” Gịnịzi mere Josaya ji gaa ibuso Niko agha? Baịbụl ekwughị.
16 Ma, olee otú Josaya ga-esi mara na ihe Niko kwuru si n’ọnụ Jehova? Ọ gaara ajụ Jeremaya, bụ́ otu n’ime ndị amụma na-erubere Chineke isi. (2 Ihe 35:23, 25) Ma, Baịbụl ekwughị na o mere otú ahụ. Ihe ọzọ bụ na Niko na-aga Kakemish ka ọ gaa buso “ụlọ ọzọ” agha, ọ bụghị Jeruselem. Agha ahụ agbasaghị aha Chineke. Niko akparịghịkwa Jehova ma ọ bụ ndị ya. N’ihi ya, Josaya ekwesịghị ịga buso Niko agha. Ò nwere ihe anyị ga-amụta n’ihe a? Mgbe nsogbu bịaara anyị, anyị kwesịrị ibu ụzọ tụlee ihe Jehova chọrọ ka anyị mee banyere nsogbu ahụ.
17 Ọ bụrụ na nsogbu abịara anyị, anyị kwesịrị ibu ụzọ chee ihe Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka ma mee ihe anyị kwesịrị ime. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịgakwuru ndị okenye. O nwere ike bụrụ na anyị ebula ụzọ chebara ihe ahụ echiche, meekwa nchọnchọ n’akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl. Ma, e nwere ike inwe ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru anyị kwesịrị ichebara echiche, bụ́ ihe okenye nwere ike inyere anyị aka ịtụle. Dị ka ihe atụ, nwanna nwaanyị ma na o kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma. (Ọrụ 4:20) Ma, ka e were ya na e nwere ụbọchị o bu n’obi ịga ozi ọma, ma di ya na-abụghị Onyeàmà Jehova chọrọ ka ọ nọrọ n’ụlọ n’ihi na ọ dịla anya ya na nwunye ya nọrịrị, e nwekwara ebe ọ chọrọ ịkpọ ya aga. Nwanna nwaanyị ahụ nwere ike tụlee amaokwu Baịbụl ndị kwuru gbasara irubere Chineke isi na iwu Jizọs nyere ka e kwusaa ozi ọma. (Mat. 28:19, 20; Ọrụ 5:29) Ma, o kwesịkwara icheta na nwunye kwesịrị ido onwe ya n’okpuru di ya nakwa na onye na-efe Chineke kwesịrị inwe ezi uche. (Efe. 5:22-24; Fil. 4:5) Di ya ọ̀ chọrọ ịkwụsị ya ịga ozi ọma, ka ọ̀ bụ naanị ka ya na ya nọrịa n’ụbọchị ahụ? Anyị kwesịrị iji ezi uche na-eme ihe Chineke chọrọ ma na-agbalị ka anyị nwee akọnuche dị ọcha.
JUN 26–JULAỊ 2
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | EZRA 1-3
“Kwe Ka Jehova Jiri Gị Rụọ Ọrụ”
Ị̀ Na-ahụ Ihe Zekaraya Hụrụ?
OBI dị ndị Juu niile ụtọ. Jehova Chineke “mere ka Saịrọs eze Peshia” nye iwu ka a hapụ ndị Izrel niile ndị Babịlọn dọọrọ n’agha kemgbe ọtụtụ afọ. Eze kwuru na ndị Juu nwere ike ịlaghachi n’ala nna ha ma “rụghachi ụlọ Jehova bụ́ Chineke Izrel.” (Ezra 1:1, 3) Ihe a o kwuru mere ha ezigbo obi ụtọ. Ọ pụtara na ha ga-amaliteghachi ife ezi Chineke n’ala Jehova Chineke nyere ha.
Ụgbọ Ịnyịnya na Okpueze Ga-echebe Gị
2 Zekaraya ma na ndị Juu laghachiri Jeruselem na-efe Jehova. Ha bụ ndị “mmụọ nke ezi Chineke kpaliri,” ịhapụ ụlọ ha na ihe ndị ha na-eme na Babịlọn. (Ezra 1:2, 3, 5) Ha hapụrụ obodo a ha ma nke ọma ma kwaga Jeruselem ọtụtụ n’ime ha na-ahụtụbeghị. Ịrụgharị ụlọ nsọ ahụ dị ha ezigbo mkpa. Ọ bụ ya mere ha ji dị njikere ịga ihe dị ka otu puku kilomita na narị isii n’okporo ụzọ na-adịghị larịị nke ihe ọjọọ nwere ike ime ha na ya.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ezra
1:3-6. Dị ka ndị Izrel ụfọdụ bụ́ ndị nọgidere na Babịlọn, ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova apụghị ije ozi oge nile ma ọ bụ jee ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. N’agbanyeghị nke ahụ, ha na-akwado ma na-agba ndị pụrụ ije ozi ndị dị otú ahụ ume, na-enyekwa onyinye afọ ofufo iji mee ka ọrụ nkwusa Alaeze ahụ na nke ime ndị na-eso ụzọ na-aga n’ihu.