Akwụkwọ Amamihe nke Nwere Ozi Maka Taa
“OTU akpa amamihe juru na ya dị oké ọnụ ahịa karịa nke pearl juru,” ka nna ochie ahụ bụ́ Job kwuru, bụ́ onye obi abụọ na-adịghị ya na ọ bụ otu n’ime ndị ikom kacha baa ọgaranya n’oge ya. (Job 1:3; 28:18, NW; 42:12) N’ezie, amamihe dị nnọọ oké ọnụ ahịa karịa ihe onwunwe ma a bịa n’ihe banyere inyere mmadụ aka inwe ihe ịga nke ọma ná ndụ. “Amamihe bụ ndò, ego bụkwa ndò,” ka onye amamihe bụ́ Eze Solomọn kwuru, “ma ọkaaka nke ihe ọmụma bụ, na amamihe na-eme ka onye nwe ya dị ndụ.”—Eklisiastis 7:12.
Ma olee ebe a pụrụ ịchọta amamihe dị otú ahụ taa? Ndị mmadụ na-eji nsogbu ha ejekwuru ndị na-ede akụkụ metụtara okwu ndụmọdụ n’akwụkwọ akụkọ, ndị ọkà n’akparamàgwà mmadụ, ndị ọkà n’ihe gbasara ọrịa uche, ọbụna ndị na-edozi isi na ndị ọkwọ ụgbọala tagzi. Ndị ọkachamara a na-apụghị ịgụta ọnụ dịkwa njikere inye ndụmọdụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’isiokwu ọ bụla—ma a kwụọ ha ụgwọ kwesịrị ekwesị. Otú ọ dị, mgbe mgbe, okwu “amamihe” ndị dị otú ahụ edugawo nanị ná ndakpọ olileanya, ọbụna n’ọdachi. Oleezi otú anyị pụrụ isi chọta ezi amamihe?
Jisọs Kraịst, bụ́ onye nwere nghọta dị ukwuu n’ihe omume ụmụ mmadụ, kwuru n’otu oge, sị: “A gụkwara amamihe n’onye ezi omume site n’ọrụ ya nile.” (Matiu 11:19) Ka anyị leba anya n’ụfọdụ nsogbu na-adịkarị ná ndụ ndị mmadụ ma hụ okwu amamihe ndị nyewooro ha aka n’ezie, ndị gosikwara na ha dị oké ọnụ ahịa karịa ‘akpa pearl juru.’ Gị onwe gị kwa nwere ike ịchọta ‘akpa ahụ amamihe juru na ya’ ma rite uru site na ya.
Ị̀ Na-enwe Ịda Mbà n’Obi?
“Ọ bụrụ na narị afọ nke 20 wetara Ọgbọ Nchegbu, ọpụpụ ya na-ahụ mmalite nke Ọgbọ Ịda Mbà n’Obi,” ka International Herald Tribune nke London na-ekwu. Ọ na-agbakwụnye na “ihe ọmụmụ mba nile mbụ e mere banyere oké ịda mbà n’obi na-ekpughe ịrị elu na-agawanye n’ihu nke nsogbu ahụ gburugburu ụwa. Ná mba ndị dịgasị nnọọ iche dị ka Taiwan, Lebanọn na New Zealand, ọ́gbọ̀ nke ọ bụla na-abụ ndị o yikarịrị ka ha ga-enwe nsogbu ahụ.” A sịrị na ndị a mụrụ mgbe 1955 gasịrị yikarịrị ka ha ga-enwe oké ịda mbà n’obi karịa nne na nna ha ochie.
Ọ bụ otú ahụ ka ọ dịịrị Tomoe, bụ́ onye nwere oké ịda mbà n’obi ma nọọ ihe ka ukwuu ná ndụ ya n’ihe ndina. Ebe ọ na-enweghị ike ilekọta nwa ya nwoke dị afọ abụọ, ọ laghachiri n’ụlọ nne na nna ya. Otu onye agbata obi ya nke nwere nwa nwanyị ya na nwa nwoke Tomoe bụ ọgbọ metere ya enyi n’oge na-adịghị anya. Mgbe Tomoe gwara onye agbata obi ahụ mmetụta nke ịbụ onye na-abaghị n’ihe ọ na-enwe, onye agbata obi ya gosiri ya otu akụkụ ihe odide sitere n’otu akwụkwọ. Ọ gụrụ, sị: “Anya apụghị ịsị aka, Mkpa gị akpaghị m: ọzọkwa, isi apụghị ịsị ụkwụ, Mkpa unu akpaghị m. Kama ọ bụ ihe ahụ dị n’ahụ nke a na-eche na ha adịghị ike karị bụ ihe dị mkpa karị nke ukwuu.”a Anya mmiri jupụtara n’anya Tomoe ka ọ ghọtara na onye ọ bụla nwere ọnọdụ n’ụwa ma dị mkpa.
Onye agbata obi ahụ tụrụ aro ka o leba anya n’akwụkwọ bu okwu ndị ahụ. Tomoe kwere n’isi, ọ bụ ezie na ruo mgbe ahụ o nwebeghị ike ime ihe ọ bụla, ọbụnadị ikwe obere nkwa. Onye agbata obi ahụ na-enyekwara ya aka ịga zụọ ihe, ọ na-esokwa Tomoe akwadebe nri kwa ụbọchị. Otu ọnwa mgbe e mesịrị, Tomoe malitere ibili kwa ụtụtụ, na-asụ ákwà, na-ehicha ụlọ, na-aga azụ ihe, na-akwadebekwa nri, dị nnọọ ka odozi akụ̀ ọ bụla ga-eme. Ọ ghaghị imeri ọtụtụ ihe isi ike, ma ọ sịrị, “Obi siri m ike na ọ bụrụ nanị na mụ agbasoo okwu amamihe ndị m chọtaworo, aga m agbake.”
Site n’itinye amamihe ọ chọtaworo n’ọrụ, Tomoe meriri oge enweghị olileanya nke ịda mbà n’obi ya. Ugbu a Tomoe na-arụ ọrụ oge nile n’inyere ndị ọzọ aka itinye okwu ndị ahụ nyeere ya aka ịnagide nsogbu ya, n’ọrụ. Okwu amamihe ndị ahụ dị n’otu akwụkwọ ochie nke nwere ozi maka mmadụ nile taa.
Ị̀ Na-eche Nsogbu Ezinụlọ Ihu?
Gburugburu ụwa ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba alụkwaghịm na-arị elu. Nsogbu ezinụlọ na-amụba ọbụna ná mba Ebe Ọwụwa Anyanwụ, bụ́ ebe ndị mmadụ jibu njikọ chiri anya nke ezinụlọ ha na-akpa nganga. Olee ebe anyị pụrụ ịchọta nduzi amamihe dị na ya nke dị irè maka alụmdi na nwunye?
Tụlee ihe banyere Shugo na Mihoko, bụ́ di na nwunye nwere ọtụtụ nsogbu alụmdi na nwunye. Ha na-ese okwu n’obere ihe ọ bụla. Shugo nwere obi ọkụ, Mihoko na-azaghachikwa n’iwe mgbe ọ bụla Shugo hụtara emezighị emezi n’ebe ọ nọ. Ọbụna Mihoko chere, sị, ‘Ọ gaghị ekwe anyị omume ikwekọrịta n’ihe ọ bụla.’
Otu ụbọchị, otu nwanyị letara Mihoko ma gụọrọ ya okwu ndị a sitere n’otu akwụkwọ: “Ya mere ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke unu na-achọ ka mmadụ na-eme unu, na-emekwanụ mmadụ otú a, unu onwe unu.”b Ọ bụ ezie na o nweghị mmasị n’okpukpe, Mihoko kwetara ịmụ akwụkwọ bu okwu ndị ahụ. Mmasị ya bụ ime ka ndụ ezinụlọ ya ka mma. Ya mere mgbe a kpọrọ ya òkù ịbịa otu nzukọ bụ́ ebe a tụlere otu akwụkwọ a kpọrọ Ime Ka Ndu Ezi-na-ulo Gi Nwe Obi-utọ, Mihoko—na di ya—kwere ozugbo.c
Ná nzukọ ahụ, Shugo hụrụ na ndị bịaranụ na-etinye ihe ha na-amụ n’ọrụ n’ezie nakwa na o yiri ka hà na-enwe obi ụtọ. O kpebiri ileba anya n’akwụkwọ ahụ nwunye ya na-amụ. Otu okwu dọọrọ mmasị ya n’oge na-adịghị anya: “Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ nwere ọtụtụ nghọta: ma onye nwere obi ọkụ na-ebuli uche gbagọrọ agbagọ.”d Ọ bụ ezie na o were ya oge itinye ụkpụrụ a n’ọrụ ná ndụ ya, ndị nọ ya nso, gụnyere nwunye ya, hụrụ mgbanwe o ji nwayọọ nwayọọ na-eme.
N’ịhụ mgbanwe ndị di ya na-eme, Mihoko malitekwara itinye ihe ọ na-amụ n’ọrụ. Otu ụkpụrụ nke nyeere ya aka karịsịa bụ nke a: “Unu ekpela ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe. N’ihi na ikpe unu ji kpee ka a ga-eji kpee unu.”e Ya mere Mihoko na di ya kpebiri na ha ga na-ekwu banyere ebe ndị ha na-eme nke ọma na otú ha pụrụ isi mee ka ọ ka mma kama ịdị na-achọpụta ebe ibe ha na-emezighị emezi. Gịnị ka ọ rụpụtara? Mihoko na-echeta, sị: “O mewo m obi ụtọ n’ezie. Anyị anọwo na-eme nke a mgbe anyị na-eri nri n’anyasị ọ bụla. Ọbụna nwa anyị nwoke dị afọ atọ na-esonyere anyị ná mkparịta ụka ahụ. Ọ bụwo ihe na-enye anyị ume ọhụrụ n’ezie!”
Mgbe ezinụlọ a tinyere ndụmọdụ bara uru ha nataworo n’ọrụ, ha meriri nsogbu nọworo na-akpa mmekọrịta ha aka ọjọọ ruo n’ókè na-emebi ihe. Nye ha, nke ahụ ọ́ dịghị oké ọnụ ahịa karịa akpa pearl juru?
Ị̀ Chọrọ Inwe Ihe Ịga nke Ọma ná Ndụ?
Nye ọtụtụ ndị taa, ịkpakọba akụ̀ na ụba bụ ihe mgbaru ọsọ ha ná ndụ. Ma, otu onye ọchụ ntá ego bara ọgaranya nọ na United States bụ́ onye nyepụworo ọtụtụ narị nde dollar n’onyinye ebere kwuru n’otu oge, sị: “Ego na-adọrọ adọro nye ụfọdụ ndị, ma ọ dịghị onye pụrụ iyi ụzọ akpụkpọ ụkwụ abụọ otu mgbe.” Ole na ole na-ekweta n’eziokwu a, ma ọnụ ọgụgụ ka nta na-akwụsị ịchụso akụ̀ na ụba.
Hitoshi tolitere dị ka ogbenye, n’ihi ya o nwere ọchịchọ siri ike ịba ọgaranya. Mgbe ọ hụsịrị otú ndị ji ụgwọ si aghọgbu ndị ha ji ụgwọ, o kpebiri, sị: “Ọ bụ onye nwetara ego ahụ meriri.” Hitoshi kwenyesiri ike n’ikike ego nwere nke na o chere na a pụrụ iji ya zụta ọbụna ndụ ndị mmadụ. Iji kpakọba akụ̀ na ụba, o mikpuru onwe ya n’achụmnta ego nke itinye paịpụ mmiri, ọ rụkwara ọrụ n’afọ dum n’ezughị ike otu ụbọchị. N’agbanyeghị mgbalịsi ike ya, Hitoshi ghọtara n’oge na-adịghị anya na ọ dịghị mgbe ya, bụ́ osote onye ọrụ ngo, ga-adị ike dị ka ndị ọrụ ngo nyere ya ọrụ. Kwa ụbọchị ọ na-enwe obi nkoropụ na egwu nke ịbụ onye achụmnta ego ya dakpọrọ.
Mgbe ahụ, otu nwoke bịara n’ọnụ ụzọ Hitoshi ma jụọ ya ma ọ̀ maara na Jisọs Kraịst anwụwo n’ihi ya. Ebe Hitoshi chere na ọ dịghị onye ga-anwụ n’ihi mmadụ dị ka ya, o nwere ọchịchọ ịmatakwu ihe, o kwetakwara inwekwu mkparịta ụka. N’izu na-esonụ, o jere gee otu okwu ihu ọha, o jukwara ya anya ịnụ ndụmọdụ ahụ bụ́ ‘ime ka anya dị mfe.’ Ọkà okwu kọwara na anya “dị mfe” bụ nke a na-elepụ n’ihu nakwa nke e lekwasịrị n’ihe ime mmụọ; n’aka nke ọzọ, anya “jọrọ njọ,” ma ọ bụ nke “anyaụfụ,” bụ nke e lekwasịrị nanị n’agụụ anụ ahụ e nwere mgbe ahụ, ọ pụghịkwa ilepụ anya n’ihu. Ndụmọdụ bụ́, “Ebe akụ̀ gị dị, n’ebe ahụ ka obi gị ga-adịkwa,” ruru ya n’ahụ nke ukwuu.f Ọ dị ihe dị mkpa karịa ịkpakọba akụ̀ na ụba! Ọ nụtụbeghị ihe dị ka ya mgbe ọ bụla.
N’ịbụ onye ihe ọ na-amụ metụrụ n’ahụ, ọ malitere itinye ya n’ọrụ. Kama ịdị na-adọlị maka ego, ọ malitere itinye ihe ime mmụọ n’ọnọdụ mbụ ná ndụ ya. O tinyekwara oge n’ilekọta ọdịmma ime mmụọ nke ezinụlọ ya. Dị ka ọ na-adịkarị, nke ahụ pụtara itinye oge ka nta n’ọrụ, ma achụmnta ego ya gbanwere n’ụzọ ka mma. N’ihi gịnị?
Àgwà obi ọjọọ ya gbanwere gaa na nke ịdị nwayọọ na nke udo ka o mere ihe banyere ndụmọdụ e nyere ya. Ndụmọdụ bụ́: “Unu onwe unu, tụpụkwanụ ihe ndị a nile; bụ́ iwe, ọnụma, obi ọjọọ, nkwulu, ikwu okwu ihere na-esi n’ọnụ unu pụta: unu ekwula okwu ụgha gwarịta ibe unu; ebe unu yipụchasịworo mmadụ ochie ahụ, ya na omume ya nile, yikwasịkwa mmadụ ọhụrụ ahụ, nke a na-eme ya ka ọ dị ọhụrụ ruo ná mmazu dị ka onyinyo nke Onye kere ya si dị,”g masịrị ya karịsịa. Ịgbaso ndụmọdụ a emeghị ka ọ baa ọgaranya, ma “mmadụ ọhụrụ” ọ bụ nwere mmetụta ọma n’ebe ndị ọ na-arụrụ ọrụ nọ, ha nwekwara ntụkwasị obi na obi ike n’ebe ọ nọ. Ee, okwu amamihe ọ chọtara nyeere ya aka inwe ihe ịga nke ọma ná ndụ ya. Nye ya, ha dị nnọọ oké ọnụ ahịa n’ụzọ nkịtị karịa akpa nke pearl ma ọ bụ ego juru.
Ị̀ Ga-emeghe Akpa Ahụ?
Ị̀ pụrụ ịmata akpa ahụ amamihe juru na ya nke bawooro nnọọ ndị ahụ a kpọrọ aha n’ihe atụ ndị dị n’elu uru? Ọ bụ amamihe ndị a na-achọta n’ime Bible, bụ́ akwụkwọ a kasị ekesa na nke a pụrụ inweta n’ụzọ dị mfe n’elu ala. Ikekwe i nwere otu ma ọ bụ ị pụrụ inweta otu n’ụzọ dị mfe. Otú ọ dị, dị nnọọ ka inwe akpa nke pearl ndị dị oké ọnụ ahịa juru ma ghara iji ha eme ihe bụ ihe na-agaghị abara onye nwe ya uru, nanị mmadụ inwe Bible ga-aba uru dị nta. Gịnị ma i meghee akpa ahụ, dị ka a pụrụ ikwu ya, ma tinye ndụmọdụ Bible bụ́ nke amamihe na nke bịara n’ezi oge n’ọrụ ma hụ otú ọ pụrụ isi nyere gị aka iche nsogbu nke ndụ ihu n’ụzọ na-aga nke ọma.
Ọ bụrụgodị na e nyere gị akpa pearl juru, ị́ gaghị enwe ekele ma gbalịa ịchọpụta onye nyere gị ya ka i nwee ike ikele ya? A bịa n’ihe banyere Bible, ị̀ maara Onye nyere gị ya?
Bible na-ekpughe Isi Iyi nke amamihe ndị a na-achọta n’ime ya mgbe ọ na-asị: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru.” (2 Timoti 3:16) Ọ na-agwakwa anyị na “okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike.” (Ndị Hibru 4:12) Ọ bụ ya mere okwu amamihe ndị a na-achọta n’ime Bible ji bụrụ ndị bịara n’ezi oge ma dị irè nye anyị taa. Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ịmụta banyere Onye a na-enye ihe n’ụba, bụ́ Jehova Chineke, ka i wee nwee ike inwe atụmanya nke inweta “akpa amamihe juru na ya” nke dị na Bible—akwụkwọ amamihe nke nwere ozi maka ndị mmadụ taa.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nhota okwu ahụ sitere ná 1 Ndị Kọrint 12:21, 22.
c Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
f Matiu 6:21-23; nkọwa ala ala peji nke NW.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 4]
Okwu Amamihe Maka Ịnọgide Na-enwe Mmetụta Uche Ziri Ezi
“Ọ bụrụ na Ị rịba ajọ omume nile ama, Ja, Onyenwe anyị, ònye ga-eguzo? Ma n’aka Gị ka mgbaghara dị, ka e wee tụọ egwu Gị.”—Abụ Ọma 130:3, 4.
“Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ihu dị mma: ma e ji ihe mwute nke obi tigbuo mmụọ mmadụ.”—Ilu 15:13.
“Abụbigala onye ezi omume ókè; emekwala onwe gị onye mabigara ihe ókè: n’ihi gịnị ka ị ga-emebi onwe gị?”—Eklisiastis 7:16.
“Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.
“Unu emehiela mgbe unu na-ewe iwe: ekwela anyanwụ daa ná mkpasu iwe unu.”—Ndị Efesọs 4:26.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 5]
Okwu Amamihe Maka Ndụ Ezinụlọ Obi Ụtọ
“Mmebi echiche nile dị mgbe izù nzuzo na-adịghị: ma n’ọtụtụ ndị na-adụ ọdụ ka ha na-eguzosi ike.”—Ilu 15:22.
“Obi onye nghọta na-enweta ihe ọmụma; ọzọ, ntị ndị maara ihe na-achọ ihe ọmụma.”—Ilu 18:15.
“Mkpụrụ osisi apple ọlaedo n’ime nkata ọlaọcha ka okwu e kwuru na mgbe kwesịrị ya bụ.”—Ilu 25:11.
“Na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta; ọbụna dị ka Onyenwe anyị weere amara gbaghara unu, unu onwe unu meekwa otú a: ma n’elu ihe ndị a nile yikwasịnụ ịhụnanya, nke bụ́ ihe nkekọ nke izu okè.”—Ndị Kọlọsi 3:13, 14.
“Unu matara nke a, ụmụnna m ndị m hụrụ n’anya. Ma ka mmadụ ọ bụla bụrụ onye na-anụ ihe ọsọ ọsọ, onye na-adịghị ngwa ikwu okwu, na-adịghịkwa ngwa iwe iwe.”—Jemes 1:19.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]
Okwu Amamihe Maka Inwe Ihe Ịga nke Ọma ná Ndụ
“Ihe osìsì aghụghọ bụ ihe arụ n’anya Jehova: ma nkume ísì ihe zuru ezu bụ ihe na-atọ Ya ụtọ.”—Ilu 11:1.
“N’ihu ntipịa ka mpako na-aga, ọ bụkwa n’ihu ịsụ ngọngọ ka ịdị elu nke mmụọ mmadụ na-aga.”—Ilu 16:18.
“Obodo e tikpọrọ etikpọ nke mgbidi na-adịghị ka onye ọ bụla nke na-adịghị egbochi mmụọ ya bụ.”—Ilu 25:28.
“Ekwela ka a kpasuo gị iwe ọsọ ọsọ n’ime mmụọ gị: n’ihi na mkpasu iwe nwere ọnọdụ ya n’obi ndị nzuzu.”—Eklisiastis 7:9.
“Zipụ nri gị n’elu mmiri: n’ihi na mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ị ga-ahụ ya.”—Eklisiastis 11:1.
“Ka okwu ọ bụla nke na-ere ure ghara isi n’ọnụ unu pụta, kama ihe bụ́ ezi ihe, iwuli mmadụ elu dị ka ụlọ, dị ka mkpa si dị, ka o wee nye ndị na-anụ ya amara.”—Ndị Efesọs 4:29.
[Foto dị na peeji nke 7]
Ịmụ Bible bụ nzọụkwụ mbụ na-eduga n’ịghọ onye na-erite uru site ‘n’akpa ahụ amamihe juru na ya’